Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
◼Na Matiu 10:21, Jisọs ọ̀ na-adọ anyị aka ná ntị na ọtụtụ ụmụnna n’ọgbakọ ga-echigharị megide ụmụnna ime mmụọ ha?
Ee e, nke ahụ abụghị isi ihe dị n’ịdọ aka ná ntị Jisọs, nke na-agụ sị: “Nwanne ga-ararakwa nwanne ya nye n’ọnwụ, nna ga-ararakwa nwa ya nye: ụmụ ga-ebilikwa megide ndị mụrụ ha, mee ka ha nwụọ anwụ.”—Matiu 10:21.
Ihe ndị e kwuru gburugburu na-egosi na Jisọs gwara ndị ozi 12 ahụ nke a ka ọ na-ezipụ ha na njem ime nkwusa n’Israel. Akụkụ dị ukwuu n’ihe o kwuru dịịrị ndị ozi ahụ n’ụzọ bụ isi. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị na e nyere ha ike iji ọrụ ebube gwọọ ọtụtụ ọrịa, chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, na ọbụna kpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Matiu 10:1, 8; 11:1) Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ọ bụghị ndị Kraịst nile natara ike ọrụ ebube dị otú a, na-eme ka ọ pụta ìhè na n’ebe a Jisọs na-agwa otu ìgwè ndị na-ege ya ntị kpọmkwem—ndị ozi ya—okwu.
Ma, ụfọdụ n’ime ihe Jisọs kwuru gabigakwara njem nkwusa ndị ozi ahụ. Ọ gwara ha, sị: “Ma na-ezenụ mmadụ: . . . n’ihu ndị isi na ndị eze ka a ga-ekurukwa unu jee n’ihi m, ịbụrụ ha na ndị mba ọzọ àmà.” (Matiu 10:17, 18) Na njem ahụ, ọ ghaghị ịbụ na mmadụ 12 ahụ chere mmegide ihu, ma e nweghị ihe àmà na-egosi na a kpụgara ha “n’ihu ndị isi na ndị eze” iji bụrụ àmà nye “ndị mba ọzọ.”a N’afọ ndị sochiri, ndị ozi guzoro n’ihu ndị ndú, dị ka Eze Herọd Agrịpa nke Mbụ na nke Abụọ, Sajiọs Pọlọs, Galio, na ọbụna Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ Nero. (Ọrụ 12:1, 2; 13:6, 7; 18:12; 25:8-12, 21; 26:1-3) Ya mere okwu Jisọs metụtakwara oge dị n’ihu.
Okwu ndụmọdụ Jisọs gara n’ihu site n’ịdọ aka ná ntị bụ́: “Nwanne ga-ararakwa nwanne ya nye n’ọnwụ.” Ọ dịghị ekwu banyere ụmụnna ime mmụọ, dị nnọọ ka ọ na-adịghị ekwu banyere ndị nna ma ọ bụ ụmụaka ime mmụọ n’okwu ya ndị na-esonụ n’amaokwu 21: “Nna ga-ararakwa nwa ya nye: ụmụ ga-ebilikwa megide ndị mụrụ ha, mee ka ha nwụọ ọnwụ.” Ihe Jisọs bu n’uche bụ na ndị ozi ahụ pụrụ ịtụ anya ịkpọasị ma ọ bụ mmegide ọbụna site n’aka ndị ikwu.—Matiu 10:35, 36.
Ndị ozi ahụ ga-enwe mkpa ntachi obi na njem nkwusa ahụ. Jisọs gara n’ihu, sị: “Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m: ma onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.”—Matiu 10:22.
Ụfọdụ n’ime ihe Jisọs kwuru n’oge ahụ bara uru nye Ndịàmà Jehova taa. Ihe bụ isi ná nkwusa anyị bụ Alaeze ahụ. Anyị na-eje ozi anyị n’efu, na-achọkwa ndị nwere mmasị n’ozi ahụ ma ọ bụ ndị kwesịrị ịnara ya. E kwesịrị ịdị akọ. Ndị mmegide buru ibu. Mgbe ụfọdụ, ndị ikwu, ndị agbata obi, ma ọ bụ ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ na-eweta nsogbu ndị siri ike, karịsịa nye ndị obi ha ziri ezi, ndị na-amalite ịgbaso ụzọ nke ezi Iso Ụzọ Kraịst. Jisọs nyeghachiri ịdọ aka ná ntị banyere mmegide dị otú ahụ mgbe ọ na-akọwa “ihe ịrịba ama” nke ọnụnọ ya. (Matiu 24:3, 9, 10; Luk 21:16, 17) O kwughachikwara mkpa ọ dị anyị ‘iwere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ maka nzọpụta.’ Ee, ọ dị anyị mkpa inwe ntachi obi ruo ọgwụgwụ nke ndụ anyị na-adị ugbu a ma ọ bụ ruo mgbe usoro ihe dị ugbu a ga-agwụsị, anyị enweekwa ike ịbanye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ.—Matiu 24:13.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nsụgharị ndị ọzọ kpọrọ nke a “ndị ọgọ mmụọ” (The Jerusalem Bible), “ndị Jentaịl” (New International Version na nsụgharị ndị nke Moffatt na Lamsa), na “ndị na-ekpere arụsị” (The New English Bible).