Mishnah na Iwu Chineke Nyere Mosis
“ANYỊ na-amalite n’echiche nke na anyị sonyere ná mkparịta ụka gamiworo agami banyere isiokwu ndị anyị na-apụghị ịghọta . . . Ọ dị anyị ka a ga-asị na anyị nọ n’ebe nchere ndị njem n’otu ọdụ ụgbọelu dị anya. Anyị na-aghọta okwu ndị mmadụ na-ekwu, ma ihe ha bu n’uche na nchegbu ha na-agbagwoju anyị anya, karịsịa, site n’ịdị ngwa dị n’ụda olu ha.” Nke a bụ otú ọkà mmụta bụ́ onye Juu bụ́ Jacob Neusner si akọwa mmetụta ndị na-agụ ihe pụrụ inwe mgbe mbụ ha gụrụ Mishnah. Neusner na-agbakwụnye, sị: “Mishnah enweghị mbido. Ọ na-agwụ na mberede.”
N’akwụkwọ bụ́ A History of Judaism, Daniel Jeremy Silver kpọrọ Mishnah “akụkụ ihe odide dị mkpa nke okpukpe ndị Juu nke ndị rabaị.” N’ezie, ọ gara n’ihu na-ekwu, sị: “Mishnah nọchiri Bible dị ka ihe ọmụmụ bụ isi nke agụmakwụkwọ (ndị Juu) na-aga n’ihu.” Gịnị mere akwụkwọ e dere n’ụdị siri nnọọ ike nghọta ga-eji ghọọ ihe dị oké mkpa?
A pụrụ ịchọta otu akụkụ azịza ya n’okwu a nke e kwuru na Mishnah: “Mosis natara Torah na Saịnaị wee nyefee ya Joshua, Joshua nyefee ya ndị okenye, ndị okenye nyefeekwa ya ndị amụma. Ndị amụma nyefekwara ya ndị ikom nke mgbakọ ukwu ahụ.” (Avot 1:1) Mishnah na-azọrọ na ya na-ekwu banyere ihe ọmụma e nyefere Mosis n’Ugwu Saịnaị—akụkụ a na-edeghị ede nke Iwu Chineke nyere Israel. E lere ndị ikom nke ọgbakọ ukwu ahụ (ndị e mesịrị kpọọ Sanhedrin) anya dị ka akụkụ nke ahịrị dị ogologo nke ndị ọkà mmụta maara ihe, ma ọ bụ ndị amamihe, ndị nyefere ozizi ụfọdụ site n’okwu ọnụ site n’otu ọgbọ gafee n’ọgbọ ọzọ ruo mgbe e mesịrị dekọọ ndị a na Mishnah. Ma nke ahụ ọ̀ dabeere n’eziokwu? Ònye n’ezie dere Mishnah, maka gịnịkwa? Ihe dị n’ime ya ò sitere n’aka Mosis na Saịnaị? Ò nwere ihe ọ pụtara nye anyị taa?
Okpukpe Ndị Juu Na-enweghị Ụlọ Nsọ
Nkwenkwe n’iwu Chineke e nyere n’ọnụ tụkwasị n’Iwu Mosis ahụ e dere ede bụ ihe a na-amaghị mgbe a na-ede Akwụkwọ Nsọ site n’ike mmụọ nsọ.a (Ọpụpụ 34:27) Mgbe ọtụtụ narị afọ gasịrị ndị Farisii bụ ìgwè ahụ nọ n’ime okpukpe ndị Juu nke zụlitere ma kwalite echiche a. Na narị afọ mbụ O.A., ndị Sadusii na ndị Juu ndị ọzọ megidere nkụzi a nke na-esiteghị na Bible. Otú ọ dị, ruo ogologo oge ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem bụ́ ebe bụ isi nke ofufe ndị Juu, okwu banyere iwu e nyere n’ọnụ nọ n’ọkwá nke abụọ. Ofufe n’ụlọ nsọ ahụ nyere ịdị adị nke onye Juu ọ bụla ọdịdị na ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nkwụsi ike.
Otú ọ dị, na 70 O.A., mba ndị Juu chere ọgba aghara okpukpe nke ruru ọ̀tụ̀tụ̀ a na-echetụbeghị n’echiche ihu. Ndị agha Rom bibiri Jerusalem, e gbukwara ihe karịrị otu nde ndị Juu. Ụlọ nsọ ahụ, ebe bụ isi nke ndụ ime mmụọ ha, adịkwaghị ọzọ. Ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’Iwu Mosis, nke chọrọ àjà na ije ozi ndị nchụàjà n’ụlọ nsọ ahụ, bụ ihe na-agaghị ekwe omume. Ntọala nke okpukpe ndị Juu adịkwaghị. Onye ọkà mmụta Talmud bụ́ Adin Steinsaltz na-ede, sị: “Mbibi ahụ . . . na 70 O.A. emewo ka mwughachi nke ọdịdị nile nke ndụ okpukpe dịrị mkpa ọsọ ọsọ.” Ha wughachikwara ya.
Ọbụna tupu e bibie ụlọ nsọ ahụ, Yohanan Ben Zakkai onye na-eso ụzọ a na-akwanyere ùgwù nke onye ndú ndị Farisii bụ́ Hillel, natara ikike site n’aka Vespasian (onye gaje ịghọ eze ukwu n’isi nso) ibufe ebe ofufe ndị Juu na Sanhedrin site na Jerusalem gaa Yavneh. Dị ka Steinsaltz na-akọwa, mgbe mbibi Jerusalem gasịrị, Yohanan Ben Zakkai “chere ihe ịma aka nke iguzobere ndị mmadụ ebe ofufe ọhụrụ ihu na inyere ha aka ime mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ ọhụrụ ahụ ebe ọ bụ na aghaghị iche ịnụ ọkụ n’obi okpukpe ihu gaa n’ebe ọzọ e lekwasịrị anya ugbu a Ụlọ Nsọ ahụ na-adịkwaghị.” Ebe ọhụrụ ahụ e lekwasịrị anya bụ iwu e nyere n’ọnụ.
Ebe e tikpọsịworo ụlọ nsọ ahụ, ndị Sadusii na ịrọ òtù ndị ọzọ nke ndị Juu enyeghị nhọrọ ọzọ juru afọ. Ndị Farisii ghọrọ ndị isi nke ndị Juu, na-edozi mmegide ahụ. N’imesi ịdị n’otu ike, ndị rabaị nọ n’isi kwụsịrị ịkpọ onwe ha ndị Farisii, aha nke jupụtara n’echiche nke ịrọ òtù na nkewa. A bịara mara ha nanị dị ka ndị rabaị, “ndị amamihe nke Israel.” Ndị amamihe a ga-eguzobe usoro nkwenkwe nke ga-anabata echiche ha nke iwu e nyere n’ọnụ. Ọ ga-abụ usoro ime mmụọ nke mwakpo ụmụ mmadụ na-agaghị emetụta ka ụlọ nsọ ahụ.
Iwusi Iwu ahụ E Nyere n’Ọnụ Ike
Ọ bụ ezie na ụlọ akwụkwọ ndị rabaị dị na Yavneh (kilomita 40 n’ebe ọdịda anyanwụ Jerusalem) bụzi ebe bụ isi ugbu a, ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ ndị na-akụzi iwu e nyere n’ọnụ malitere ibilite n’Israel nile ọbụnakwa n’ebe ndị dị anya dị ka Babịlọn na Rom. Otú ọ dị, nke a kpatara otu nsogbu. Steinsaltz na-akọwa, sị: “Ruo ogologo oge nile ndị amamihe nile zukọtara ọnụ, mgbe ọ bụkwa otu òtù ndị ikom (na Jerusalem) na-arụ ọrụ nkà mmụta, e chebere nkwekọ nke ọdịnala. Ma mmụba nke ndị nkụzi na nguzobe nke ụlọ akwụkwọ ndị dị iche kpatara . . . ụbara nke ụdị na ụzọ ndị e si ekwu okwu.
A kpọrọ ndị nkụzi nke iwu ahụ e nyere n’ọnụ Tannaim, okwu e nwetara site n’okwu Aramaic pụtara “ịmụ ihe,” “ikwughachi ihe,” ma ọ bụ “izi ihe.” Nke a mesiri ike ụzọ ha si na-amụ ma na-ezi iwu e nyere n’ọnụ site n’ikwughachi na iburu ya n’isi n’ụzọ siri ike. Iji mee ka iburu ọdịnala e nyere n’ọnụ n’isi gaa ngwa ngwa, e gbubilatara ụkpụrụ nduzi ma ọ bụ ọdịnala ọ bụla ịbụ nkebi okwu dị nkenke. Ruo n’ókè okwu dị nkenke, otú ahụ ka ọ na-aka mma. A chọrọ ụdị abụ uri ya, nke a chọrọ mma, e kwekwara nkebi okwu ndị ahụ n’ukwe, ma ọ bụ bụọ ha n’abụ. Ma, a hazighị ụkpụrụ nduzi ndị a ahazi, ha dịgasịkwa iche site n’otu onye nkụzi gaa n’onye nkụzi ọzọ.
Rabaị mbụ nyere ọtụtụ ọdịnala ndị e nyere n’ọnụ ụdị na ọdịdị bụ́ isi bụ Akiba ben Joseph (c. 50-135 O.A.). Banyere ya, Steinsaltz na-ede, sị: “Ndị ha na ya biri n’otu mgbe jiri ọrụ ya tụnyere ọrụ onye ọrụ ngo nke na-aga n’ubi ma wụnyejuo ihe ọ bụla ọ hụrụ na mberede n’ime nkata ya, lọghachizie n’ụlọ ma hazie ụdị ọ bụla iche. Akiba amụwo ọtụtụ isiokwu ndị a na-ahazighị ahazi ma doo ha n’ụdị dịgasị iche iche.”
Na narị afọ nke abụọ O.A.—ihe karịrị afọ 60 mgbe mbibi Jerusalem gasịrị—Bar Kokhba duziri nnupụisi nke abụọ gbara ọkpụrụkpụ nke ndị Juu megide Rom. Ọzọkwa, nnupụisi wetara ọdachi. Akiba na ndị na-eso ụzọ ya so n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu nde ndị Juu e gburu. E tisasịrị olileanya ọ bụla nke iwughachi ụlọ nsọ ahụ ka Eze Ukwu Hadrian nke Rom kwuru ka ndị Juu ghara ịga Jerusalem, e wezụga n’oge ememe ncheta mbibi ụlọ nsọ ahụ.
Tannaim ndị dịrị ndụ mgbe Akiba nwụsịrị ahụtụbeghị ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem. Ma ụkpụrụ a tụrụ maka ọmụmụ ihe n’ọdịnala nke iwu e nyere n’ọnụ ghọrọ “ụlọ nsọ,” ma ọ bụ ebe bụ isi nke ofufe ha. Tannaim ikpeazụ, Judah ha-Nasi, weghaara ọrụ Akiba na ndị na-eso ụzọ ya malitere n’ime ka ọdịdị nke iwu e nyere n’ọnụ siwanye ike.
Ihe E Ji Mee Mishnah
Judah ha-Nasi bụ nwa Hillel na Gameliel.b N’ịbụ onye a mụrụ n’oge nnupụisi nke Bar Kokhba, ọ ghọrọ onye isi ógbè ndị Juu n’Israel n’ọgwụgwụ nke narị afọ nke abụọ nakwa ná mmalite nke narị afọ nke atọ O.A. Utu aha ahụ bụ́ ha-Nasi pụtara “onye isi,” na-egosi ọnọdụ ọ nọ n’anya ndị Juu ibe ya. A na-ezokarị aka n’ebe ọ nọ dị ka nanị Rabaị. Judah ha-Nasi bụ onye isi nke ma ụlọ akwụkwọ nke ya ma Sanhedrin, na mbụ na Bet She’arim, e mesịakwa na Sepphoris dị na Galili.
N’ịmata na esemokwu ha na Rom n’ọdịnihu pụrụ itinye kpọmkwem mgbasa nke iwu e nyere n’ọnụ n’ihe ize ndụ, Judah ha-Nasi kpebisiri ike inye ya ọdịdị ga-eme ka e chebe ya. Ọ kpọkọtara ndị ọkà mmụta kasị pụta ìhè nke oge ya n’ụlọ akwụkwọ ya. A rụrụ ụka banyere isiokwu na ọdịnala ọ bụla nke iwu e nyere n’ọnụ. E jikọtara nkwubi okwu nke mkparịta ụka ndị a gaa ná nkebi okwu ndị dị nkenke pụrụ iche, n’ịgbaso ụkpụrụ siri ike nke ihe odide abụ uri Hibru.
A haziri nkwubi okwu ndị a gaa ná nkebi, ma ọ bụ Iwu isii gbara ọkpụrụkpụ, na-adabere n’isiokwu ndị bụ isi. Judah kerisịrị ndị a gaa ná nkebi, ma ọ bụ ihe odide 63. Oké usoro ime mmụọ ahụ ezuola ugbu a. Ruo ugbu a, a gbasawo ọdịnala ndị dị otú ahụ n’ọnụ mgbe nile. Ma dị ka ihe nchebe ọzọ, e weere nzọụkwụ ikpeazụ iji weta mgbanwe ndị gbara ọkpụrụkpụ—nke idetu ihe nile edetu. A kpọrọ usoro ukwu a e dere ede nke nwere iwu ahụ e nyere n’ọnụ n’ime ya Mishnah. Aha ahụ bụ́ Mishnah sitere n’okwu Hibru bụ́ sha·nahʹ, nke pụtara “ikwughachi ihe,” “ịmụ ihe,” ma ọ bụ “izi ihe.” Ya na okwu Aramaic tenaʼʹ, nke tan·na·ʼimʹ, sitere na ya bụ otu ihe, bụ́ okwu e ji mee ihe n’ebe ndị nkụzi Mishnah nọ.
Nzube Mishnah abụghị iguzobe ụkpụrụ na-enweghị mgbagha. O mere ihe karị banyere ihe ndị iwu na-emetụtaghị, na-ewere ya na onye na-agụ ya maara ụkpụrụ ndị bụ isi. N’ezie, ọ chịkọtara ihe ndị e kwurịtara n’ụlọ akwụkwọ nke ndị rabaị n’oge Judah ha-Nasi. E mere Mishnah ịbụ ndepụta nke iwu e nyere n’ọnụ maka inwekwu nrụrịta ụka, ụdị, ma ọ bụ usoro bụ isi, nke a ga-agbakwasị ụkwụ na ya.
Kama ikpughe ihe ọ bụla e nyere Mosis n’Ugwu Saịnaị, Mishnah na-enye nghọta ná ntolite nke iwu e nyere n’ọnụ, echiche nke malitere n’ebe ndị Farisii nọ. Ihe ọmụma e dekọrọ na Mishnah na-eme ka a ghọtakwuo okwu ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nakwa ná nkwurịta okwu ụfọdụ n’etiti Jisọs Kraịst na ndị Farisii. Otú ọ dị, ọ dị mkpa ịkpachara anya n’ihi na echiche ndị a na-achọta na Mishnah na-egosipụta echiche ndị Juu malite na narị afọ nke abụọ O.A. Mishnah bụ njikọ dị n’agbata oge ụlọ nsọ nke abụọ na Talmud.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka inwetakwu ihe ọmụma, tụlee peji nke 8-11 nke broshuọ bụ́ Will There Ever Be a World Without War?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Lee isiokwu bụ́ “Gameliel—Ọ Kụziiri Sọl nke Tasọs Ihe,” n’Ụlọ Nche nke July 15, 1996.
[Igbe dị na peeji nke 26]
Nkebi Dị Iche Iche nke Mishnah
E kebisịrị Mishnah gaa n’Iwu isii. Ihe mejupụtara nke a bụ akwụkwọ nta ma ọ bụ ihe odide 63, ndị e kewasịrị gaa n’isiakwụkwọ na mishnayot, ma ọ bụ paragraf dị iche iche (ọ bụghị amaokwu).
1. ZERAIM (Iwu Ọrụ Ubi)
Ihe odide ndị a gunyere nkwurịta okwu banyere ekpere e kpere n’elu ihe oriri nakwa metụta ọrụ ubi. Ha gụnyekwara ụkpụrụ nduzi maka ịnakọta onyinye otu ụzọ n’ụzọ iri, òkè ndị nchụaja, ịchịkọta ihe ubi, na afọ Izu Ike.
2. MOED (Oge Ndị Dị Nsọ, Ememe Dị Iche Iche)
Ihe odide ndị dị n’Iwu a na-atụle iwu ndị metụtara Ụbọchị Izu Ike, Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, na ememe ndị ọzọ.
3. NASHIM (Ndị inyom, Iwu Alụmdi na Nwunye)
Ndị a bụ ihe odide ndị na-ekwu banyere alụmdi na nwunye na ịgba alụkwaghịm, nkwa, ndị Naziraịt, na okwu metụtara inyo mmadụ maka ịkwa iko.
4. NEZIKIN (Mmebi Ihe na Iwu Banyere Ihe Ruuru Mmadụ)
Ihe odide ndị dị n’Iwu a kọwazuru isiokwu ndị metụtara iwu ihe ruuru mmadụ na ihe onwunwe, ụlọikpe na ntaramahụhụ dị iche iche, ọrụ Sanhedrin, ikpere arụsị, ịṅụ iyi, na Ụkpụrụ Omume nke Ndị Nna (Avot).
5. KODASHIM (Àjà)
Ihe odide ndị a na-ekwu banyere ụkpụrụ ndị metụtara onyinye anụmanụ na mkpụrụ akụ́kụ́ tinyekwara ọdịdị nke ụlọ nsọ ahụ.
6. TOHAROT (Ememe Okpukpe Ido Ọcha)
Iwu a gụnyere ihe odide na-ekwu banyere ịdị ọcha ememe okpukpe, ịsa ahụ, ịkwọ aka, ọrịa akpụkpọ ahụ, na adịghị ọcha nke ihe dị iche iche.
[Igbe dị na peeji nke 28]
Mishnah na Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst
Matiu 12:1, 2: “N’oge ahụ Jisọs gara n’etiti ubi ọka n’ụbọchị izu ike; ma agụụ na-agụ ndị na-eso ụzọ Ya, ha wee malite ịghọ oko ọka, na ịta ya. Ma ndị Farisii, mgbe ha hụrụ ya, ha sị Ya, Lee, ndị na-eso ụzọ Gị na-eme ihe na-ezighị ezi n’iwu ime n’ụbọchị izu ike.” Akwụkwọ Nsọ Hibru amachibidoghị ihe ndị na-eso ụzọ Jisọs mere iwu. Ma n’ime Mishnah anyị na-achọta ndepụta nke ọrụ 39 nke ndị rabaị machibidoro iwu n’Ụbọchị Izu Ike.—Shabbat 7:2.
Matiu 15:3: “Ọ [Jisọs] zara, sị ha, N’ihi gịnị ka unu onwe unu na-ejehiekwa n’ihe Chineke nyere n’iwu n’ihi ozizi e nyere unu n’aka?” Mishnah kwetara àgwà a. (Sanhedrin 11:3) Anyị na-agụ, sị: “A chọrọ ịgbasosi [ndebe nke] okwu Ndị Odeakwụkwọ ike karịa [ndebe nke] okwu Iwu [e dere ede]. Ọ bụrụ na mmadụ asị, ‘Ọ dịghị iwu ji mmadụ iyi phylactery’ nke na o mehiere okwu nke Iwu ahụ, e kwesịghị ịta ya ụta; [ma ọ bụrụ na o kwuo sị], ‘E kwesịrị inwe n’ime ha nkebi ise’, nke na o tinyere ihe n’okwu Ndị Odeakwụkwọ, e kwesịrị ịta ya ụta.”—The Mishnah, nke Herbert Danby dere, peji nke 400.
Ndị Efesọs 2:14: “N’ihi na Ya onwe ya [Jisọs] bụ udo anyị, Onye mere ihe abụọ ka ha bụrụ otu ihe, Onye kwadakwara mgbidi etiti nke ngige.” Mishnah na-asị: “N’ime Ugwu Ụlọ Nsọ e nwere ihe nkebichi (Soreg), dị [mita 6] n’ịdị elu.” (Middot 2:3) A machibidoro ndị Jentaịl iwu ịgafe ebe a ma banye n’obí ime. Ọ pụrụ ịbụ na Pọl onyeozi zoro aka ná mgbidi a n’ụzọ ihe atụ n’idegara ndị Efesọs akwụkwọ na 60 ma ọ bụ 61 O.A., mgbe ọ ka guzo. Mgbidi ihe atụ ahụ bụ ọgbụgba ndụ iwu ahụ, nke kewaworo ndị Juu na ndị Jentaịl ruo ogologo oge. Otú ọ dị, ná ndabere nke ọnwụ Kraịst na 33 O.A., e wepụrụ mgbidi ahụ.