Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 44 p. 112-p. 113 para. 9
  • Jizọs Emee Ka Ebili Mmiri Dajụọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs Emee Ka Ebili Mmiri Dajụọ
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịkwụsị Oké Ifufe
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Jizọs Pụrụ Ichebe Anyị
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Jizọs Gara Ije n’Elu Mmiri
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Bịa Jegharịa n’Osimiri Galili!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 44 p. 112-p. 113 para. 9
Mgbe Jizọs na-eme ka ebili mmiri nke na-eme n’Oké Osimiri Galili dajụọ

ISI NKE 44

Jizọs Emee Ka Ebili Mmiri Dajụọ

MATIU 8:18, 23-27 MAK 4:35-41 LUK 8:22-25

  • JIZỌS EMEE KA EBILI MMIRI KWỤSỊ N’OKÉ OSIMIRI GALILI

Ike gwụchara Jizọs n’ihi ọrụ niile ọ rụrụla kemgbe taa. Ná mgbede, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka anyị gafee n’ikpere mmiri nke ọzọ,” bụ́ nke dị n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ.—Mak 4:35.

Obodo Geresa dị n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Oké Osimiri Galili. Aha ọzọ a na-akpọ obodo a bụ Dikapọlis. N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị Juu bi na Dikapọlis, ọ bụ omenala ndị Grik juru ebe ahụ.

Ọtụtụ ndị ma mgbe Jizọs si Kapaniọm pụwa. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ na e nwere ụgbọ mmiri ndị ọzọ si ná mmiri ahụ gawa n’ofe ya nke ọzọ. (Mak 4:36) Isi n’otu ofe osimiri ahụ gafere n’ofe ya nke ọzọ adịchaghị anya. Oké Osimiri Galili dị ka ọdọ mmiri dị ihe dị ka kilomita iri abụọ n’ogologo, dịrịkwa ihe dị ka kilomita iri na abụọ n’obosara. Mana, ọ dị omimi.

Ọ bụ eziokwu na Jizọs zuru okè, ike gwụrụ ya mgbe ọ kụzichaara ndị mmadụ ihe. N’ihi ya, mgbe ha kwọọrọ ụgbọ pụwa, o dinara ala n’azụ azụ ụgbọ ahụ, dewe isi n’ohiri isi, ụra eburu ya.

Ọtụtụ n’ime ndịozi ya bụ aka ochie n’ịkwọ ụgbọ mmiri, mana nke taa agaghị adịrị ha mfe. E nwere ugwu ndị gbara Oké Osimiri Galili ahụ gburugburu, elu osimiri ahụ na-adịkarịkwa ṅara ṅara. Mgbe ụfọdụ, ikuku jụrụ oyi na-esi n’ugwu ahụ na-efekwasị n’osimiri ahụ dị ṅara ṅara, ma mee ka e nwee oké ebili mmiri n’osimiri ahụ. Ọ bụ ụdị ihe a na-eme ugbu a. O gbughị oge, ebili mmiri ahụ amalite ịkụ n’ụgbọ ahụ. “Mmiri malitekwara iju n’ebe ha nọ, ha wee nọrọ n’ihe ize ndụ.” (Luk 8:23) Ma, Jizọs ka nọ n’ụra.

Ndị ahụ na-akwọ ụgbọ ahụ bụ aka ochie n’ịkwọ ụgbọ. Ha mere ihe niile ha ma ha na-eme ma e nwee ebili mmiri ka ha nwee ike ịkwọrọ ụgbọ ahụ na-aga. Mana nke taa dị iche. Ụjọ jidere ha na ha nwere ike ịnwụ, nke mere ha ji kpọtee Jizọs. Ha ji ụjọ gwa ya, sị: “Onyenwe anyị, zọpụta anyị, anyị na-aga ịla n’iyi!” (Matiu 8:25) Ezigbo ụjọ ji ndị na-eso ụzọ Jizọs na mmiri na-aga iri ha.

Mgbe Jizọs tetara, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “Gịnị mere obi ji na-amapụ unu, unu ndị okwukwe nta?” (Matiu 8:26) Jizọs baziiri ifufe na oké osimiri ahụ mba, sị: “Shịị! Daa jụụ!” (Mak 4:39) Ifufe ahụ na-efesi ike kwụsịrị, osimiri ahụ adajụọkwa. (Otú Mak na Luk si kọọ ihe a dị egwu merenụ bụ na ha bu ụzọ kwuo otú Jizọs si mee ka oké ifufe ahụ kwụsị, tupu ha akọzie otú o si gwa ha na ha enweghị okwukwe.)

Chegodị otú ihe a si metụ ndị na-eso ụzọ ya n’ahụ́. Ha ejirila anya ha hụ otú oké ebili mmiri na-amali n’ike si nnọọ dajụọ ozugbo. Ụdị ụjọ tụrụ ha ụbọchị ahụ atụtụbeghị ha mbụ. Ha jụwara ibe ha, sị: “Ònye n’ezie ka onye a bụ, n’ihi na ọbụna ifufe na oké osimiri na-erubere ya isi?” Ha garutere n’ofe ọzọ nke oké osimiri ahụ n’udo. (Mak 4:41–5:1) O nwekwara ike ya abụrụ na ụgbọ ndị ọzọ ahụ gawara n’ofe nke ọzọ nke osimiri ahụ garukwara n’udo.

Ịmara na Ọkpara Chineke nwere ikike karịrị nke ifufe na ebili mmiri na-eme ka obi sie anyị ike. Mgbe ọ ga-achịwa ụwa n’oge ọchịchị Alaeze ya, ahụ́ ga-eru mmadụ niile ala n’ihi na ọdachi ndị na-emere onwe ha agaghịkwa adị.

  • Olee ihe ndị o nwere ike ịbụ ha so kpata oké ebili mmiri ahụ mere n’Oké Osimiri Galili?

  • Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs mere mgbe o yiri ka hà nọ n’agbata ọnwụ na ndụ?

  • Gịnị mere ihe a merenụ ji kwesị ime ka obi sie anyị ike?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya