Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 41 p. 212-216
  • Ụmụaka Ndị Na-eme Ka Chineke Nwee Obi Ụtọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụmụaka Ndị Na-eme Ka Chineke Nwee Obi Ụtọ
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nwatakịrị Nwaanyị Nyeere Otu Dike Aka
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ọ Masịrị Ya Inyere Onye Ọzọ Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Nwa Agbọghọ Nta nke Ji Obi Ike Kwuo Okwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • O Nupụrụ Isi ma Mechaa Mee Ihe A Gwara Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 41 p. 212-216

ISI NKE 41

Ụmụaka Ndị Na-eme Ka Chineke Nwee Obi Ụtọ

OLEE nwatakịrị nọ n’ụwa nke i chere kasị mee ka Jehova nwee obi ụtọ?— Ọ bụ Ọkpara ya, bụ́ Jizọs. Ka anyị kwuo banyere ihe ndị Jizọs mere iji mee ka Nna ya nke eluigwe nwee obi ụtọ.

Ezinụlọ Jizọs bi n’ebe ga-ewe ihe dị ka abalị atọ ma a gawa ya site na Jeruselem, bụ́ ebe ụlọ nsọ Jehova ahụ mara mma dị. Jizọs kpọrọ ụlọ nsọ ahụ “ụlọ Nna m.” Ya na ezinụlọ ya na-eje ebe ahụ kwa afọ ịga mee Ememe Ngabiga.

Otu afọ, mgbe Jizọs dị afọ 12, ezinụlọ ya lawara mgbe e mesịrị Ememe Ngabiga. Ha amaghị na Jizọs na ndị ikwu na ibe ha anọghị ruo mgbe ha kwụsịrị ebe ha ga-anọ zuo ike n’abalị. Ya mere, Meri na Josef laghachiri Jeruselem ozugbo ịga chọọ Jizọs. Olee ebe i chere ọ nọ?—

Ha hụrụ Jizọs n’ụlọ nsọ ahụ. Ọ nọ na-ege ndị nkụzi ntị, na-ajụkwa ha ajụjụ. Mgbe ha jụkwara ya ajụjụ, ọ na-aza ya. Azịza mara mma ndị ọ na-enye juru ha anya. Ị̀ hụla ihe mere Chineke ji nwee obi ụtọ n’ebe Ọkpara ya nọ?—

Dị ka o kwesịrị ịdị, mgbe Meri na Josef mesịrị chọta Jizọs, obi ruru ha nnọọ ala. Ma Jizọs echegbughị onwe ya. Ọ ma na ụlọ nsọ ahụ bụ ebe na-adịghị ize ndụ mmadụ nwere ike ịnọ. Ya mere ọ jụrụ ha, sị: “Ọ̀ bụ na unu amaghị na aghaghị m ịnọ n’ụlọ Nna m?” Ọ ma na ụlọ nsọ ahụ bụ ụlọ Chineke, ọ na-enwekwa mmasị ịnọ ebe ahụ.

Mgbe e mesịrị, Meri na Josef kpọọrọ Jizọs dị afọ 12 lawa Nazaret. Olee otú i chere Jizọs si mesoo ndị mụrụ ya?— Bible na-ekwu na ọ ‘nọgidere na-edo onwe ya n’okpuru ha.’ Olee ihe i chere nke ahụ pụtara?— Ọ pụtara na ọ na-erubere ha isi. Ee, o mere ihe ndị mụrụ ya gwara ya mee, ọ bụrụgodị na ọ bụ ihe dị ka ịga seta mmiri n’olulu mmiri.—Luk 2:41-52.

[Foto ndị dị na peeji nke 213]

Olee otú nwatakịrị ahụ bụ́ Jizọs si mee ka Chineke nwee obi ụtọ?

Ya mere, cheedị echiche: N’agbanyeghị na Jizọs bụ onye zuru okè, o rubeere nne na nna ya na-ezughị okè isi. Nke a ò mere ka Chineke nwee obi ụtọ?— N’ezie o mere ka o nwee obi ụtọ n’ihi na Okwu Chineke na-agwa ụmụaka, sị: “Na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi.” (Ndị Efesọs 6:1) Gị onwe gị kwa ga-eme ka Chineke nwee obi ụtọ ma ị na-erubere ndị mụrụ gị isi, dị ka Jizọs rubeere ndị mụrụ ya isi.

Ụzọ ọzọ ị pụrụ isi mee ka Chineke nwee obi ụtọ bụ site n’ịgwa ndị ọzọ banyere ya. Ụfọdụ ndị pụrụ ịsị na ndị na-eto eto ekwesịghị ịdị na-eme nke a. Ma mgbe ndị mmadụ gbalịrị ịkwụsị ụmụ okoro ime nke a, Jizọs sịrị: ‘Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị n’Akwụkwọ Nsọ, sị, “Site n’ọnụ obere ụmụaka ka Chineke ga-eme ka otuto pụta”?’ (Matiu 21:16) Ya mere, anyị nile pụrụ ịgwa ndị ọzọ banyere Jehova nakwa banyere ụdị ezigbo Chineke ọ bụ ma ọ bụrụ n’ezie na anyị chọrọ ime otú ahụ. Ọ bụrụkwa na anyị emee otú ahụ, anyị ga-eme ka Chineke nwee obi ụtọ.

Olee ebe anyị na-amụta ihe banyere Chineke, bụ́ ndị anyị pụrụ ịgwa ndị ọzọ banyere ha?— Ọ bụ site n’ọmụmụ Bible anyị na-enwe n’ụlọ. Ma anyị na-amụta ihe ndị ọzọ n’ebe ndị Chineke na-ezukọ maka ọmụmụ ihe. Ma olee otú anyị pụrụ isi mata ndị bụ́ ndị nke ya?—

Ọ dị mma, olee ihe ndị ahụ na-eme ná nzukọ ha? Hà na-akụzi ihe dị na Bible n’ezie? Hà na-agụ ya ma na-atụle ya? Ọ bụ otú ahụ ka anyị na-esi ege Chineke ntị, ọ́ bụghị ya?— Anyị ga-atụkwa anya ịnụ ihe Chineke na-ekwu ná nzukọ Ndị Kraịst, ọ́ bụghị ya?— Ma gịnị ma ọ bụrụ na ndị mmadụ ekwuo na ọ dịghị mkpa ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe Bible na-ekwu? Ị̀ ga-asị na ha bụ ndị nke Chineke?—

Lee ihe ọzọ ị ga-echebara echiche. Bible kwuru na ndị Chineke ga-abụ “otu ndị maka aha ya.” (Ọrụ 15:14) Ebe aha Chineke bụ Jehova, anyị pụrụ ịjụ ndị mmadụ ma ọ̀ bụ Jehova bụ Chineke ha. Ọ bụrụ na ha asị ee e, mgbe ahụ anyị ga-amata na ha abụghị ndị nke ya. Ndị Chineke ga na-agwakwa ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke. Ha ga na-egosipụtakwa ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ site n’idebe iwu ya.—1 Jọn 5:3.

Ọ bụrụ na ọ dị ndị ị maara na-eme ihe ndị ahụ nile, mgbe ahụ i kwesịrị isoro ha na-ezukọ maka ife ofufe. I kwesịrị ige ntị nke ọma ná nzukọ ndị a, na-azakwa ajụjụ mgbe a jụrụ ajụjụ. Ọ bụ ihe Jizọs mere mgbe ọ nọ n’ụlọ Chineke. Ọ bụrụkwa na i mee ihe ndị ahụ, ị ga-eme ka Chineke nwee obi ụtọ, dị nnọọ ka Jizọs mere ka o nwee obi ụtọ.

Ọ̀ dị ụmụaka ndị ọzọ i chetara a kpọrọ aha n’ime Bible bụ́ ndị mere ka Chineke nwee obi ụtọ?— Timoti bụ otu ihe atụ pụtara ìhè. Nna ya ekweghị na Jehova. Ma nne ya, bụ́ Yunis kwere, nne nne ya bụ́ Lọịs kwekwara. Timoti gere ha ntị ma mụta banyere Jehova.

[Foto dị na peeji nke 215]

Ọ bụ ezie na nna ya abụghị onye kwere ekwe, gịnị ka Timoti chọrọ ime?

Mgbe Timoti tolitere, Pọl onyeozi letara obodo ebe ha bi. Ọ hụrụ otú Timoti si chọsie ike ijere Jehova ozi. Ya mere ọ kpọọrọ Timoti ka o soro ya jeere Chineke ozi n’ụzọ buru ibu ọbụna karị. Ebe ọ bụla ha jere, ha na-agwa ndị mmadụ banyere Alaeze Chineke na banyere Jizọs.—Ọrụ 16:1-5; 2 Timoti 1:5; 3:14, 15.

Ma ọ̀ bụ nanị ihe atụ nke ndị nwoke na-eto eto bụ ihe atụ dị n’ime Bible banyere ndị mere ka Chineke nwee obi ụtọ?— Ọ dịghị ma ọlị. Chee echiche banyere otu nwa agbọghọ nta onye Izrel, bụ́ onye mere otú ahụ. N’oge nke ya, mba Siria na mba Izrel bụ ndị iro. Otu ụbọchị ndị Siria busoro ndị Izrel agha ma dọrọ nwa agbọghọ nta ahụ n’agha. A kpọgara ya n’ụlọ onyeisi ndị agha, onye aha ya bụ Neeman. Mgbe o ruru ebe ahụ, ọ ghọrọ onye na-ejere nwunye Neeman ozi.

Neeman malitere ịrịa ọrịa a na-akpọ ekpenta. Ọ dịghị dọkịta nwere ike inyere ya aka. Ma nwa agbọghọ nta ahụ bụ́ onye Izrel kwenyere na otu n’ime ndị ohu Chineke pụrụ iche, onye amụma, nwere ike inyere Neeman aka. Otú ọ dị, Neeman na nwunye ya adịghị efe Jehova. Nwa agbọghọ nta ahụ, ò kwesịrị ịgwa ha ihe ọ maara? Ọ bụrụ gị gịnị ka ị gaara eme?—

[Foto dị na peeji nke 216]

Olee otú nwa agbọghọ nta a bụ́ onye Izrel si mee ka Chineke nwee obi ụtọ?

Nwa agbọghọ nta ahụ sịrị: ‘A sị nnọọ na Neeman ga-ejekwuru onye amụma Jehova nọ n’Izrel, mgbe ahụ, a ga-agwọ ya ekpenta ya.’ Neeman gere nwa agbọghọ nta ahụ ntị, ọ gakwukwaara onye amụma Jehova. Mgbe o mere ihe onye amụma ahụ gwara ya ka o mee, a gwọrọ ya. Nke a mere ka Neeman ghọọ onye na-efe ezi Chineke ahụ ofufe.—2 Ndị Eze 5:1-15.

Ị̀ ga-enwe mmasị inyere mmadụ aka ịmụta banyere Jehova nakwa ihe ndị ọ pụrụ ime otú nwa agbọghọ nta ahụ mere?— Ònye ka ị pụrụ inyere aka?— Otú ọ dị, ná mmalite ha pụrụ iche na enyemaka adịghị ha mkpa. Ma ị pụrụ ịgwa ha ihe ọma dị iche iche Jehova na-eme. Ha nwekwara ike ige ntị. Ị pụrụ ijide n’aka na nke a ga-eme ka Chineke nwee obi ụtọ.

A pụrụ ịchọtakwu ihe ga-agba ndị na-eto eto ume inweta ọṅụ n’ijere Chineke ozi n’Abụ Ọma 122:1; 148:12, 13; Eklisiastis 12:1; 1 Timoti 4:12 nakwa ná Ndị Hibru 10:23-25.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya