Ahụ Ike na Obi Ụtọ—Olee Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nweta Ha?
ỌDỊWO ogologo oge mmadụ matara njikọ chiri anya nke dị n’etiti ahụ ike na obi ụtọ. Hippocrates, nke a na-eche na ọ bụ “nna nke nkà ọgwụ na ahụ ike,” kwuru, sị: “Onye nwere amamihe kwesịrị ile ahụ ike anya dị ka ngọzi kasị ukwuu mmadụ nwere.” Onye Germany bụ ọkà ihe ọmụma, bụ́ Arthur Schopenhauer kwuru, sị: “Ndị iro abụọ nke obi ụtọ mmadụ bụ ahụ ụfụ na ike ọgwụgwụ.”
N’akwụkwọ ahụ bụ Anatomy of an Illness as Perceived by the Patient, Norman Cousins kọrọ ahụmahụ ya n’iji ịchị ọchị ebuso ọrịa ya nke pụrụ iyi ndụ egwu agha. O kwuru na mgbake ya n’ọrịa ahụ sitere, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’otu akụkụ, n’ọchị ndị ahụ sitere n’ala ala obi ndị ọ na-achị mgbe ọ na-ekiri ihe omume ndị na-atọ ọchị. Ndị dọkịta a ma ama amalitewo ime nnyocha banyere ụdị mmetụta mmiri ọgwụ ụfọdụ pụrụ inwe n’ahụ, ndị a na-akpọ endorphins, ndị a na-agbanye n’ahụ mgbe anyị na-achị ọchị. Otú a, anyị pụrụ ịhụ amamihe dị n’ilu ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ: “Obi nke na-aṅụrị ọṅụ na-eme ka ahụ dị mma.” —Ilu 17:22.
Ma n’agbanyeghị nke ahụ, dị nnọọ ka ihe na-emegide echiche ahụ, ndị na-eme nnyocha achọpụtawo na inwe ezi ahụ ike adịghị emekebe ka e jide n’aka na a ga-enwe obi ụtọ, n’ihi na ọtụtụ ndị nwere ezi ahụ ike enweghị obi ụtọ. Nnyocha e mere nke dabeere ná ndejupụta akwụkwọ ajụjụ na ajụjụ ọnụ a jụrụ ihe karịrị 100,000 mmadụ dujere Jonathan Freedman ná nkwubi okwu ahụ a na-atụghị anya ya nke bụ na ihe karịrị 50 pasenti nke ndị na-enweghị obi ụtọ ná ndụ ha bụ ndị nwere ezi ahụ ike n’ụzọ bụ isi.
Ahụ Ike na Obi Ụtọ—Ná Mkpirikpi
N’ihi ya, olee ebe anyị ga-ele anya isi nweta ihe abụọ ahụ na-adịghị ekwe iru aka bụ ahụ ike na obi ụtọ? Confucius nyere nghọta na-akpali mmasị n’ọtụtụ narị afọ gara aga, sị: “A na-enwe ezi ọchịchị mgbe a na-eme ka ndị nọ ya nso nwee obi ụtọ, na-adọtakwa mmasị ndị nọ n’ebe dị anya bịa n’ebe ọ dị.” N’oge dịtụ oge anyị nso karị, onye ọchịchị bụ Thomas Jefferson kwuru na nanị ihe bụ nzube nke ọchịchị bụ “inweta ọ̀tụ̀tụ̀ obi ụtọ kasị ukwuu a pụrụ inweta enweta nye ọha mmadụ nke ndị nọ n’okpuru ya.”
N’eziokwu, ileba anya nke ọma na-ekpughe na ebe a ga-esi nweta azịza nye ọchịchọ ihe a kpọrọ mmadụ na-achọ ahụ ike na obi ụtọ lekwasịrị anya n’ezie n’otu ihe—ọchịchị.
N’ime ọgbọ nile ndị gaworo aga, ụmụ mmadụ elewo anya n’ebe ahụ—n’ọchịchị—maka obi ụtọ ha. Dị ka ihe atụ, Okwu Mkpọsa Nnwere Onwe nke mba United States nwere okwu ndị a a ma ama n’ime ya: “Anyị na-ele ya anya na eziokwu ndị a na-agbara onwe ha akaebe, na e kere mmadụ nile dị ka ndị hà nhata, na Onye Okike ha nyekwara ha ụfọdụ Ihe Ndị Ruuru ha ndị a na-apụghị ịnapụ ha anapụ, na ụfọdụ n’ime ndị a bụ Ndụ, Nnwere Onwe na nchụso nke Obi Ụtọ.” Rịba ama na ọchịchị nke e bu n’uche n’ebe ahụ kwere ndị nọ n’okpuru ya nkwa nanị inwe dị ka ihe ruuru ha, ịchụso obi ụtọ. Ruo n’ókè o metụtara ahụ ike, ọtụtụ ọchịchị dị iche iche emewo ihe e kwesịrị ịja mma nke ịkwalite usoro ihe omume dị iche iche iji meziwanye ahụ ike nke ụmụ amaala ha. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ahụ ike ọha na eze nye ihe ka n’ọtụtụ mmadụ abụwo ihe na-ekweghị iru aka.
Ma, gịnị banyere ọchịchị nke kwere nkwa inye ihe dị ukwuu ọbụna karị? Gịnị ma ọ bụrụ na o kwe nkwa, ọ bụghị nanị nchụso nke obi ụtọ, kama inwe obi ụtọ n’onwe ya? Gịnịkwa ma ọ bụrụ na o kwe nkwa, ọ bụghị ime inshọransị nke ahụ ike, kama inweta ahụ ike n’onwe ya? Ọ̀ bụ na ị gaghị aṅụrị ọṅụ na ọ bụ n’ebe ọchịchị nke a dị ka e nwere isi ihe kasịnụ nke na-eduje n’imezu ọchịchọ ihe a kpọrọ mmadụ na-achọ ahụ ike na obi ụtọ?
Ọtụtụ ndị taa pụrụ iche na nke a bụ nrọ na-apụghị imezu emezu, ma n’agbanyeghị nke ahụ, e buru amụma n’ezie banyere ọchịchị dị otú ahụ, kọwaakwa ya ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ. Anyị pụrụ ịhụ ihe ọmụma a pụrụ ịdabere na ya n’ime Bible Nsọ, ọchịchị ahụ bụkwa Alaeze Mesaịa nke Chineke.
Alaeze, ma ọ bụ Ọchịchị, nke Chineke
Ọtụtụ mgbe, Bible na-ekwu banyere “alaeze Chineke.” Ma gịnị ka ọ bụ? Akwụkwọ ọkọwa okwu bụ Webster’s New World Dictionary of the American Language kọwara “alaeze” dị ka “ọchịchị ma ọ bụ mba nke onye nọ n’isi ya bụ onye eze ma ọ bụ onye eze nwanyị.” N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, Alaeze Chineke bụ ọchịchị, ọchịchị eze nke onye nọ n’isi ya bụ Ọkpara na Eze Chineke e teworo mmanụ, bụ́ Jisọs Kraịst. Ruo ókè ha aṅaa ka ọchịchị nke a dị mkpa ná nzube Chineke? Ka okwu Jisọs zaa: “Burunụ ụzọ chọọ alaeze ya . . . A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi . . . Aghaghị m izikwa obodo nile ọzọ ozi ọma alaeze Chineke: n’ihi na e zitere m ime nke a. . . . A na-ezisa ozi ọma alaeze Chineke, mmadụ nile n’otu n’otu weere ihe ike na-aba [“na-agbalịsi ike ịbanye,” NW] n’ime ya.”—Matiu 6:33; 24:14; Luk 4:43; 16:16.
E jiri okwu ahụ bụ “alaeze” mee ihe ihe karịrị otu narị ugbo n’ime ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ banyere ndụ Jisọs, mgbe ụfọdụkwa kpọmkwem n’ihe metụtara ahụ ike na obi ụtọ. Rịba ama Matiu 9:35: “Jisọs wee na-ejegharị n’obodo na obodo nta ha nile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ nile ha, na-ekwusakwa ozi ọma nke alaeze ahụ, na-agwọkwa ọrịa nile dị iche iche na nrịarịa nile dị iche iche.” Ọ bụ ezie na Jisọs jikọtara iweta ezi ahụ ike na ozizi ya banyere Alaeze ahụ, anyị kwesịrị ịrịba ama na ọgwụgwọ ọrịa ya bụ ihe ndaba efu n’oge nkwusa na izi ihe ya. A maara ya dị ka “Onye Ozizi,” ọ bụghị dị ka “Onye Na-agwọ Ọrịa.” (Matiu 26:18; Mak 14:14; Jọn 1:38) Ọ tụkwasịghị uche ya n’ụzọ bụ isi n’ịgwọ ụmụ mmadụ ọrịa ma ọ bụ ilekọta ndị na-arịa ọrịa. Mgbe nile, nchegbu ya bụ isi bụ Alaeze ahụ. Site n’ilekọta ọrịa ụmụ mmadụ, o gosiri ọmịiko dị ukwuu o nwere, gosipụtakwa na o nwere nkwado Chineke.
Ọgwụgwọ ndị ahụ Jisọs gwọrọ rụkwara ọrụ dị ka ihe na-agba àmà mweghachi ahụ ike mmadụ nke ọ ga-emezu mgbe Alaeze Chineke weghaara ike ọchịchị zuru ezu nke ụwa. E mesighachiri nke a ike site n’ọhụụ ahụ a kọwara ná Mkpughe 22:1, 2: “O wee gosi m osimiri nke mmiri nke ndụ, na-enwu dị ka crystal, ka ọ na-esi n’ocheeze Chineke na nke Nwa Atụrụ ahụ pụta, n’etiti ama ya. N’akụkụ a na n’akụkụ nke ọzọ nke osimiri ahụ ka osisi nke ndụ dịkwa, na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ, na-enye mkpụrụ ya n’ọnwa n’ọnwa: akwụkwọ osisi ahụ bụ ihe ime ka ahụ dị mba nile ike.”
Ma olee ebe ọ ga-ekwe anyị omume inweta nke a? Ọ pụrụ iyi ihe a na-apụghị inweta enweta ịtụ anya ọgwụgwọ dị ebube otú ahụ iwere ọnọdụ n’elu ala. Otú ọ dị, cheta okwu Jisọs nke gị onwe gị pụrụ ikwuworị n’ekpere: “Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:10.
Ya mere, ọ bụ n’ọchịchị Alaeze Mesaịa nke Chineke ka e nwere olileanya anyị bụ ezie, nke a pụrụ ịdabere na ya, maka ahụ ike na obi ụtọ n’ọdịnihu. Ma otu ajụjụ ka fọdụrụ.
Ànyị Pụrụ Inwe Ahụ Ike na Obi Ụtọ Ugbu A?
Ọbụna ugbu a, anyị ịgbaso ụkpụrụ Bible pụrụ ime ka anyị nwee ike inweta ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu nke ahụ ike, tinyere obi ụtọ nke e mere ka ọ dịwanye ukwuu. Dị ka e meworo ka ọ pụta ìhè ọtụtụ mgbe n’ime magazin nke a, ndị na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị na-abụkarị ndị e chebere site ná nsogbu ahụ ike ndị na-abịa site ná mmekọahụ rụrụ arụ, ise sịga, ịṅụbiga mmanya ókè, na iji ọgwụ ọjọọ eme ihe. Ha na-enwetakwa abamuru nke ndụ dị n’udo karị, na mmekọrịta dị mma karị nke ha na ndị ikwu ha na ndị ọzọ.
Ma, anyị ahụworị na inwe ezi ahụ ike abụghị ihe na-eme ka e jide n’aka na a ga-enweta obi ụtọ nke na-adịgide adịgide. Gịnị ka ọ ga-ewe ka i wee nweta obi ụtọ dị ukwuu karị?
Ná nnyocha ahụ a kpọtụrụ aha na mbụ, Jonathan Freedman tụlere ajụjụ ahụ n’ụzọ dị omimi. O lebara anya n’ihe ndị dị ka “Ịhụnanya na Mmekọahụ,” “Ntorobịa na Afọ Ndụ,” “Mkpata Ego na Agụmakwụkwọ,” ọbụna “Obodo Ukwu na Ime Obodo.” Ọ pụrụ ịbụ ihe ga-amasị gị ịmara na ọ chọpụtara na ihe ndị a nwere mmetụta dị nta n’obi ụtọ bụ isi nke mmadụ. Dị ka ihe atụ, n’ihota ihe atụ dị iche iche nke mmadụ ndị nwere ihe onwunwe dị ukwuu ma bụrụkwa ndị na-enweghị obi ụtọ, o kwubiri, sị: “Anyị ahụwo na, n’ịbụ ihe na-eju anya ruo ókè ụfọdụ, ma mkpata ego ma agụmakwụkwọ adịghị nke yiri ka ọ̀ na-atụnye ụtụ dị ukwuu n’inwe obi ụtọ.”
Nkwubi okwu ya kwekọrọ n’ihe otu onye amamihe so dee Bible kwuru, bụ́ Pọl onyeozi, onye kwuru, sị: “Amụtawo m, n’ọnọdụ ọ bụla m nọ na ya, inwe afọ ojuju n’ebe ahụ.” (Ndị Filipaị 4:11, King James Version) Chetakwa okwu Jisọs, bụ: “Lezienụ anya, debekwanụ onwe unu ka unu ghara inwe anyaukwu ọ bụla: n’ihi na ọ bụghị n’ihe o nwebigara ókè ka ndụ mmadụ dị, o sighị n’ihe o nwere pụta.”—Luk 12:15.
N’eziokwu, Professor Freedman chọpụtara nke a: “Ọtụtụ mgbe, ka anyị na-ele anya n’okwu ndị na-enweghị obi ụtọ kwuru, bụ́ ndị yiri ka hà nwezuru ihe nile, anyị na-achọpụta na ha na-ekwu na ndụ ha enweghị isi ihe dị na ya, o nweghịkwa nduzi.” O kwukwara, sị: “Ana m ala azụ n’ime ka nke a bụrụ oké ihe, ma o yiri ka echiche mmadụ nwere banyere ihe ime mmụọ ọ̀ na-enwe mmetụta dị mma n’echiche onye ahụ banyere ihe ndị dị adị n’ezie, ebe enweghị echiche ndị ahụ na-agwagbu ma ọ bụ na-ewepụtụ ihe ruo n’ókè ụfọdụ site n’ihe ọ bụla ọzọ.”
N’oge anyị a, anyị na-ahụ ihe àmà nke eziokwu dị ná nchọpụta ndị a. Lee anya gburugburu ebe ị nọ. Ọ̀ bụ na ị dịghị ahụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ndị nile—ụfọdụ ndị nwere ihe onwunwe dị nta, ụfọdụ ndị nwere ihe onwunwe n’ebe ọ dị ukwuu—ka ha na-achụgharị obi ụtọ ma ha adịghị enweta ya n’ókè dị ukwuu? N’eziokwu, ike agwụwo ụfọdụ ndị, ha na-agbachịkwa nkịtị nọrọ n’amaghị nke ha ga-eme, ma ọtụtụ ndị na-adị ndụ ha dị ka ndị na-emeghachi otu ihe ahụ, na-achụso, ma n’achụkwuteghị mgbe ọ bụla, ihe ha na-achụso. Ụfọdụ ndị na-alụ di ma ọ bụ nwunye iji nweta obi ụtọ, ọbụna mgbe onye agbata obi ha na-agba alụkwaghịm n’ihi otu ihe ahụ. Ndị ọzọ na-eji ọrụ bogbuo onwe ha, ebe ndị ọzọ na-ahapụ ọrụ ha iji jee ezumike ogologo oge ndị pụkwara iwe oké ego. Mmadụ nile na-achụso otu ihe ahụ na-ekweghị iru aka, inwe ahụ ike na obi ụtọ. Hà na-enweta ya? ì nwetawo ya?
Ahụ Ike Gị, Obi Ụtọ Gị
Nke bụ eziokwu bụ na ị pụrụ inweta ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ahụ ike na obi ụtọ ugbu a. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?
N’ezie, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịgbalị ilekọta ahụ ike gị n’ụzọ ezi uche dị na ya, dị ka itinye ndụmọdụ Bible ndị na-aba uru n’ọrụ. Ọ ga-enyekwara gị aka ịhụ ihe dị ka ọ dị n’ezie. Nke ahụ gụnyere ịnakwere na ọrịa pụrụ ịdakwasị ahụ anyị nke na-ezughị okè, ma ghara ịbụ ndị nke ahụ wutebigara ókè mgbe o mere. Nke a pụrụ ịchọkwu mgbalị iji na-elepụ anya n’ọdịnihu n’ụzọ dị mma ka anyị na-elekwasị anya ná nkwa nke ahụ ike zuru okè n’ime ụwa ọhụrụ ahụ nke na-abịanụ.
Iji hụ ma ì nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma nke obi ụtọ ugbu a, jụọ onwe gị ajụjụ ndị a: 1. Ọ̀ bụ m na-eduzi ndụ nke onwe m ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma? 2. Mụ na onwe m na ndị gbara m gburugburu ànyị dị n’udo n’ụzọ bụ isi? 3. Ènwere m obi ụtọ n’ihe ndị m rụzuworo ná ndụ m ma e lee ha anya n’ìhè nke Bible? 4. Mụ na ezinụlọ m ànyị na-enwe obi ụtọ n’inwe ike ijere Chineke ozi?
Ruo n’ókè dị ukwuu, ọ bụ anyị ga-eme nhọrọ. Ọtụtụ n’ime anyị pụrụ inwe ahụ ike n’ụzọ bụ isi, anyị nwekwara ohere ịhọrọ inwekwa obi ụtọ. Ma anyị aghaghị inwe ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ, rụọkwa ọrụ iji nweta ha. Cheta okwu Jisọs: “Ebe akụ gị dị, n’ebe ahụ ka obi gị ga-adịkwa.” (Matiu 6:21) Anyị nwekwara ihe dabeere na Bible nke mere anyị ga-eji nwee olileanya inweta ahụ ike na obi ụtọ dị ukwuu ọbụna karị n’okpuru ọchịchị zuru okè nke Alaeze Mesaịa ahụ. N’oge ahụ, ahụ ike na obi ụtọ zuru ezu pụrụ ịbụ nke anyị.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndị nwere obi ụtọ na-enwe mmasị iso ndị ọzọ kerịta olileanya ha maka ahụ ike zuru okè