Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lr isi 16 p. 87-91
  • Olee Ihe Dị Mkpa n’Ezie?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ihe Dị Mkpa n’Ezie?
  • Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Bụ “Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ọ̀ Bụ Iwu na Ndị Kraịst Ga-adarịrị Ogbenye?
    Teta!—2003
  • Ego Ọ̀ Bụ Mkpọrọgwụ nke Ihe Ọjọọ Niile?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ọgaranya ahụ na Lazarọs
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
lr isi 16 p. 87-91

ISI NKE 16

Olee Ihe Dị Mkpa n’Ezie?

[Foto dị na peeji nke 87]

Olee nsogbu nwoke a nwere?

OTU ụbọchị otu nwoke bịara ịhụ Jizọs. Ọ ma na Jizọs ma ihe nke ukwuu, ya mere, ọ sịrị ya: ‘Onye Ozizi, gwa nwanne m nwoke ka o nye m ụfọdụ n’ime ihe o nwere.’ Nwoke ahụ chere na ya kwesịrị inweta ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ.

A sị na ọ bụ gị bụ Jizọs, gịnị ka ị gaara ekwu?— Jizọs chọpụtara na nwoke ahụ nwere nsogbu. Ma, ihe bụ́ nsogbu abụghị na ihe nwanne ya nwere dị ya mkpa. Nsogbu nwoke ahụ bụ na ọ maghị ihe dị mkpa n’ezie ná ndụ.

Ka anyị chee echiche banyere ihe a. Gịnị kwesịrị ịbụ ihe kasị mkpa nye anyị? Ò kwesịrị ịbụ inwe ihe e ji egwuri egwu ndị mara mma, uwe ọhụrụ, ma ọ bụ ihe ndị yiri ya?— Ee e, ọ dị ihe ka nnọọ mkpa. Nke a bụkwa ihe Jizọs chọrọ ịkụzi. Ya mere, ọ kọrọ otu akụkọ banyere otu nwoke nke chefuru Chineke. Ị̀ chọrọ ịnụ akụkọ ahụ?—

Nwoke a bara ọgaranya nke ukwuu. O nwere ala na ọba dị iche iche. Ihe ndị ọ kụrụ n’ubi mere nke ọma. Ohere adịghị n’ọba ya ebe ọ ga-achịkọta ihe ubi ya nile. Gịnịzi ka ọ ga-eme? Ọ sịrị onwe ya: ‘M ga-akwatu ọba m ma wuo ndị buru ibu karị. Mgbe ahụ, m ga-achịkọta ihe ubi m nile na ezi ihe nile m nwere n’ọba ọhụrụ ndị a.’

Nwoke ahụ bara ọgaranya chere na nke a bụ ihe amamihe dị na ya ọ ga-eme. O chere na ya ma ihe nke ukwuu site n’ịkwakọba ọtụtụ ihe. Ọ sịrị onwe ya: ‘Enwere m ọtụtụ ezi ihe m kwakọbara. M ga-anọ na-eri ya ruo ọtụtụ afọ. Ugbu a, m ga-abịa tụsara ahụ́. M ga na-eri, na-aṅụ, na-emekwa onwe m obi ụtọ.’ Ma, ọ dị ihe na-ezighị ezi n’otú ọgaranya a si eche echiche. Ị̀ ma ihe ọ bụ?— Ọ nọ na-eche echiche nanị banyere onwe ya nakwa banyere otú ọ ga-esi nwee obi ụtọ. O chefuru Chineke.

[Foto dị na peeji nke 88]

Gịnị ka ọgaranya a na-eche?

Ya mere, Chineke gwara ọgaranya a okwu. Ọ sịrị ya: ‘Onye nzuzu. Ị ga-anwụ n’abalị a. Ugbu a, ònye ga-ewekọrọ ihe ndị ahụ ị kwakọbara?’ Ọgaranya ahụ, ọ̀ ga-enwe ike iri ihe ndị ahụ ma ọ nwụọ?— Ee e, onye ọzọ ga-ewere ha. Jizọs sịrị: “Otú ahụ ka ọ ga-adịrị onye na-akpakọbara onwe ya akụ̀ ma ghara ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”—Luk 12:13-21.

Ị chọghị ịdị ka ọgaranya ahụ, ka ị̀ chọrọ?— Nzube bụ́ isi o nwere ná ndụ bụ inweta ihe onwunwe. Nke ahụ bụ ihie ụzọ. Ọ na-achọ mgbe nile inwetakwu ihe. Ma, ọ bụghị “ọgaranya n’ebe Chineke nọ.”

Ọtụtụ ndị yiri ọgaranya ahụ. Ha na-achọ mgbe nile inwetakwu ihe. Ma, nke a pụrụ iduga ná nnukwute nsogbu. Dị ka ihe atụ, i nwere ihe ndị i ji egwuri egwu, ọ́ bụghị ya?— Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị e ji egwuri egwu i nwere? Gwa m.— Ọ bụrụkwanụ na otu n’ime ndị enyi gị nwere bọl ma ọ bụ nwa bebi ma ọ bụ ihe ọzọ e ji egwuri egwu ị na-enweghị? Ọ̀ ga-abụ ihe ziri ezi ma ị gbalịa ịmanye ndị mụrụ gị ịzụtara gị ya?—

A pụrụ inwe mgbe ihe e ji egwuri egwu ga-eyi ka ọ dị mkpa nke ukwuu. Ma, gịnị na-eme ya mgbe ntakịrị oge gasịrị?— Ọ na-eme ochie. Ọ pụrụ imebisị, mgbe ahụ ị gadịghị enwekwa mmasị na ya. N’ezie, i nwere ihe bara uru nke ukwuu karịa ihe e ji egwuri egwu. Ị̀ ma ihe ọ bụ?—

[Foto dị na peeji nke 89]

Olee ihe i nwere nke bara uru karịa ihe e ji egwuri egwu?

Ọ bụ ndụ gị. Ndụ gị dị mkpa nke ukwuu n’ihi na ma ị dịghị ndụ, ị gaghị enwe ike ime ihe ọ bụla. Ma, ndụ gị dabeere n’ime ihe dị Chineke mma, ọ̀ bụ na ọ dabereghị?— Ya mere, ka anyị ghara ịdị ka ọgaranya ahụ dị nzuzu, onye chefuru Chineke.

Ọ bụghị nanị ụmụaka pụrụ ime ihe nzuzu dị ka ọgaranya ahụ. Ọtụtụ ndị toruworo ogo mmadụ na-emekwa otú ahụ. Ụfọdụ n’ime ha na-achọ mgbe nile inwe ihe karịa otú ha nwere. Ha pụrụ inwe nri ga-ezuru ha n’ụbọchị, nwee uwe ha ga-eyi, nweekwa ebe ha ga-ebi. Ma, ha na-achọ inwetakwu. Ha na-achọ inwe ọtụtụ uwe. Ha na-achọkwa ụlọ ndị buru ibu karị. Ihe ndị a na-efu ego. N’ihi ya, ha na-arụsị ọrụ ike iji nweta ego buru ibu. Ka ha na-enwetakwukwa ego, otú ahụ ka ha na-achọkwu ihe ndị ọzọ.

Ụfọdụ ndị toruworo ogo mmadụ na-adị na-achụ ego mgbe nile nke na ha adịghị enwe ohere isoro ezinụlọ ha nọrọ. Ha adịghịkwa enwe ohere maka Chineke. Ego ha nwere ọ̀ pụrụ idebe ha ndụ?— Ee e, ọ pụghị. Hà pụrụ iji ego ha mee ihe mgbe ha nwụrụ?— Ee e. Nke a bụ n’ihi na ndị nwụrụ anwụ enweghị ike ime ihe ọ bụla ma ọlị.—Eklisiastis 9:5, 10.

Nke a ọ̀ pụtara na inwe ego dị njọ?— Ee e. Anyị nwere ike iji ego zụta ihe oriri na uwe. Bible na-ekwu na ego bụ ndo. (Eklisiastis 7:12) Ma, ọ bụrụ na anyị hụrụ ego n’anya, mgbe ahụ, anyị ga-aba ná nsogbu. Anyị ga-adị ka ọgaranya ahụ dị nzuzu, onye kpakọbaara onwe ya akụ̀ ma ọ bụghị ọgaranya n’ebe Chineke nọ.

Gịnị ka mmadụ ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ pụtara?— Ọ pụtara ibute Chineke ụzọ ná ndụ anyị. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ha kwere na Chineke. Ha na-eche na ọ bụ nanị ikwere bụ ihe a chọrọ. Ma, hà bụ ọgaranya n’ezie n’ebe Chineke nọ?— Ee e, ha yiri ọgaranya ahụ nke chefuru Chineke.

Ọ dịghị mgbe Jizọs chefuru Nna ya nke nọ n’eluigwe. Ọ gbalịghị ịkpata ego buru ibu. O nweghịkwa ọtụtụ ihe onwunwe. Jizọs ma ihe dị mkpa n’ezie ná ndụ. Ị̀ ma ihe ọ bụ?— Ọ bụ ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ.

[Foto ndị dị na peeji nke 91]

Gịnị ka nwatakịrị a na-eme nke dị mkpa n’ezie?

Gwagodị m, olee otú anyị pụrụ isi bụrụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ?— Anyị pụrụ ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ site n’ịdị na-eme ihe ndị dị ya mma. Jizọs sịrị: “M na-eme ihe dị ya mma mgbe nile.” (Jọn 8:29) Ọ na-atọ Chineke ụtọ mgbe anyị na-eme ihe ndị ọ chọrọ ka anyị mee. Ugbu a, ka m jụgodị gị, olee ihe ndị ị pụrụ ime ga-adị Chineke mma?— Ee, ị pụrụ ịgụ Bible, gaa nzukọ Ndị Kraịst, kpegara Chineke ekpere, nyekwara ndị ọzọ aka ịmụta banyere ya. Ihe ndị ahụ bụ ihe ndị kasị mkpa n’ezie ná ndụ.

N’ihi na Jizọs bụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ, Jehova lekọtara ya. O nyere Jizọs ụgwọ ọrụ nke ịdị ndụ ebighị ebi. Ọ bụrụ na anyị adị ka Jizọs, Jehova ga-ahụ anyị n’anya ma lekọta anyị. Ya mere, ka anyị yie Jizọs ma ghara ịdị ma ọlị ka ọgaranya ahụ nke chefuru Chineke.

Lee ụfọdụ akụkụ Bible ndị na-egosi ụzọ isi nwee echiche ziri ezi banyere ihe onwunwe: Ilu 23:4; 28:20; 1 Timoti 6:6-10; nakwa Ndị Hibru 13:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya