Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 2/15 p. 21-23
  • Ị̀ ga-erite uru site N’obi Ebere Na-Erughịrị Mmadụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ ga-erite uru site N’obi Ebere Na-Erughịrị Mmadụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mata Uru nke Obi Ebere Na-erughịrị Mmadụ
  • Nara Obi Ebere Na-erughịrị Mmadụ
  • “Ajọ Aghụghọ Nile” nke Setan
  • Ị Pụrụ Irite Uru Site n’Obi Ebere Na-erughịrị Mmadụ
  • Obi Dị Anyị Ụtọ na Chineke Na-egosi Anyị Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Na-ekwusa Ozi Ọma Gbasara Obiọma Chineke nke Na-erughịrị Mmadụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Chineke Mere Ka Unu Si ná Mmehie Pụọ n’Ihi Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Mee Ihe Na-atọ Jehova Ụtọ Site n’Igosi Obi Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 2/15 p. 21-23

Ị̀ ga-erite uru site N’obi Ebere Na-Erughịrị Mmadụ?

“KA M na-amụtakwu ihe banyere ụkpụrụ nile nke Chineke ndị dị n’ime Bible, otú a ka m na-enwe mmetụta nke onye na-erughị eru ịnata ihu ọma na ngọzi ya,” ka Frank kwuru. A kpaliri mmasị ya na Bible n’oge ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi mmebi iwu ndị metụtara ọgwụ ọjọọ. Ọ gụrụ otu akwụkwọ bụ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh Ebia o wee doo ya anya na ihe dị n’ime akwụkwọ ahụ bụ eziokwu, mgbe a tọhapụsịrị ya n’ụlọ mkpọrọ, ọ chọtara Ndịàmà Jehova iji wee mụtakwuo ihe banyere Bible.

N’ihi gịnị ka ịmụ Bible ji mee ka o nwee mmetụta nke ịbụ onye na-erughị eru? N’ihi na ụzọ ndụ ọ na-ebi na mbụ megidere ọtụtụ n’ime ụkpụrụ ndị nke Chineke. Iji ọgwụ na-eme ihe na-ekwesịghị ekwesị, ịṅụbiga mmanya ókè na àgwà ndị ọzọ na-eweda mmadụ ala ewedawo ya ala nke ukwuu nke na n’otu oge, otu onye uwe ojii gwara ya, sị: “Biko gwa m ebe i bi? Achọrọ m ịmara ebe m ga-ebula ozu gị!”

Ma ihe mesịrị mee ka o nwee mmetụta nke onye na-erughị eru karị bụ na n’agbanyeghị otú o si gbalịsie ike, ọ bụụrụ ya ihe siri ike nke ukwuu imeri àgwà ndị a na-adịghị ọcha ndị gbamiworo mkpọrọgwụ n’ime ya. Dị ka ihe atụ, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na àgwà nke ịṅụbiga mmanya ókè rikpuru ya kpam kpam. “Adawo m ajọ ọdịda ná mgbalị m nile ọtụtụ ugbo, nke a kụdakwara m mmụọ nke ukwuu,” ka ọ sịrị. “Ọ fọrọ ntakịrị ka m kwụsị ime mgbalị nile, na-eche na ọ dịghịkwa olileanya ọ bụla dịịrị m.”

Ọ pụrụ ịbụ na ndụ ndị ọzọ dịrị n’oge gara aga eyighị nke Frank. Ma otú ọ dị, ha pụrụ inwe mmetụta dị omimi nke ịbụ ndị na-erughị eru. Nke a pụrụ ịbụ n’ihi na ha setịpụụrụ onwe ha ihe mgbaru ọsọ ndị dị oké elu n’ụzọ ezi echiche na-adịghị ya mgbe ha na-agbalị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ndị ha chere na ọ bụ ihe Chineke chọrọ ha n’aka. Mgbe ha dara ná mgbalị ha ime nke a, ha na-enwe mmetụta nke ikpe ọmụma. “Ikpe ọmụma pụrụ ịbụ ihe na-eyi oké egwu,” ka Dr. Claire Weekes kọwara n’akwụkwọ ya bụ Self-Help for Your Nerves, “karịsịa nye ndị ahụ na-agbalị isetịpụrụ onwe ha ụkpụrụ dị elu.” Gịnị ka onye Kraịst pụrụ ime ma ọ bụrụ na o nwee mmetụta ndị dị otú a nke ịbụ onye na-erughị eru?

Mata Uru nke Obi Ebere Na-erughịrị Mmadụ

“Otu ihe nyeere m aka nke ukwuu,” ka Frank kwuru, “bụ ịghọta ihe Bible kwuru ná Ndị Hibru 4:15, 16.” N’ebe ahụ, Pọl onyeozi na-echetara anyị na Jisọs bụ onye na-enye aka nke na-echegbu onwe ya banyere ndị ọzọ, bụ́ onye pụrụ ‘iji obi ya soo anyị hụkọọ ahụhụ n’adịghị ike anyị,’ onye mewokwara ka anyị nwee ike ‘ịnata amara inyere anyị aka n’oge kwesịrị ekwesị.’

Ọ̀ ga-amasị gị ịmata isi ihe dị mkpa iji merie mmetụta nke ịbụ onye na-erughị eru? Ọ bụ nke a: Cheta na Jehova Chineke na Jisọs Kraịst maara na anyị bụ ndị na-adịghị ike n’ihi ezughị okè anyị ketara eketa. Ha na-aghọta na anyi apụghị iru ọ̀tụ̀tụ̀ ezi omume nile n’ụzọ zuru okè. (Abụ Ọma 51:5; Ndị Rom 3:23; 5:12, 18; Jemes 3:2) N’ihi ya, ha adịghị atụ anya ihe karịrị otú anyị pụrụ ime n’aka anyị. Ha na-ele anya ịhụta akụkụ anyị ndị dị mma, ọ bụghị adịghị ike nile anyị. Onye ọbụ abụ ahụ jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na ị rịba ajọ omume nile ama, Jaa, [Jehova, NW] ònye ga-eguzo?” (Abụ Ọma 130:3) Ị pụrụ ịghọta na ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ iguzo. Otú ọ dị, site n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst, Jehova pụrụ iji obi ebere nye anyị ọnọdụ dị ọcha n’agbanyéghị ezughị okè anyị nile. (1 Jọn 2:2; 4:9, 10) Anyị pụrụ inweta “mgbaghara nke ndahie nile anyị”—wee si otú a bụrụ ndị e nyeere aka imeri mmetụta nile nke ịbụ ndị na-ekwesịghị ekwesi—”dị ka akụ nke amara ya si di.”—Ndị Efesọs 1:7.

Lee ya anya n’ụzọ dị otú a. Ndị nwere mmasị n’ihe osise ma ọ bụ n’ihe nkà ndị ọzọ ga-eme ihe nile ha pụrụ ime iji mezighachi ihe osise ma ọ bụ ọrụ nkà ndị ọzọ mebiri n’ebe ọ dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, mgbe otu onye ji égbè mebie otu ihe osise na-atọ ọchị nke Leonardo da Vinci sere, bụ nke dị n’Ụlọ Ngosi Ihe Nkà dị na London, England, bụ nke ọnụ ahịa ya ruru £20 nde (ihe dị ka $32 nde, U.S.) Ọ dịghị onye tụrụ aro na ebe ọ bụ na e mebiwo ihe osise ahụ, na e kwesịrị ịtụfu ya. A malitere ọrụ ozugbo imezighachi ihe osise ahụ bụ ọrụ nkà nke dịworo 487 afọ. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụ ihe dị oké ọnụ ahịa n’anya ndị nwere mmasị n’ihe osise.

Ọ̀ bụ na ị baghị uru karịa ihe osise e ji chalk na unyi see? N’anya Chineke, ị bara nnọọ uru karịa nke ahụ—n’agbanyeghị otú i nweruru ná ntụpọ site ná mmehie e ketara eketa. (Abụ Ọma 72:12-14; Matiu 20:28) Jehova Chineke, bụ́ Onye Okike ahụ nke ji nkà kee ezinụlọ mmadụ, ga-eme ihe ọ dị mkpa ime iji wetaghachi ndị nọ n’ezinụlọ ahụ n’izu okè, bụ́ ndị dị njikere inara nlekọta ihunanya ya.—Tụlee Ọrụ 3:21; Ndị Rom 8:20-22.

Nara Obi Ebere Na-erughịrị Mmadụ

Gbasoo ihe nlereanya nke Pọl onyeozi. O nwere obi ekele dị ukwuu maka amara Chineke n’iji obi ebere gbaghara ya njehie nile o meworo n’oge gara aga, tinyekwara ịnọgide na-akwado ya ná mgbalị nile ọ na-eme imeri adịghị ike ndị na-ebiliteghachi. (Ndị Rom 7: 15-25; 1 Ndị Kọrint 15:9, 10) Pọl meziri ụzọ ndụ ya ‘tipụtakwa ahụ ya ọnyá ma duzie ya dị ka ohu’ iji nọgide n’ụzọ nke Chineke na-anwapụta. (1 Ndị Kọrint 9:27) O kweghị ka anụ ahụ ya, ya na ọchịchọ anụ ahụ na mkpali echiche ya nile, duzie ya dị ka ohu.

Nara obi ebere Chineke nke na-erughịrị mmadụ, kweekwa ka o duru gị jee ná nchegharị. (Ndị Rom 2:4; 2 Ndị Kọrint 6:1) Ọ bụrụ na njehie ndị i mere n’oge gara aga na-enye gị nsogbu, mezie ha ma kwere ná nkwa Jehova nke bụ na ọ gbagharawo gị. (Aịsaịa 1:16-18; Ọrụ 2:38) Ọ bụrụ na adịghị ike ndị nọgiderenụ ka na-enye gị nsogbu, nọgide na-alụso ha ọgụ. Kpekusie Jehova ekpere ike maka enyemaka iji merie ha, na-edebekwa onwe gị n’okpuru obi ebere ya n’otu mgbe ahụ. (Abụ Ọma 55:22) N’ịkọ site n’ahụmahụ nke onwe ya, Frank na-atụ aro, sị: “Mgbe mmadụ dara mgbe ụfọdụ n’ọgụ ọ na-alụso otu àgwà ọjọọ, o kwesịghị ile ya anya dị ka ọdịda na-enweghị ngwọta, kama, dị ka ihe mkpọghachi azụ na-adị nwa oge.” Ọ bụrụ na ndị ọzọ atụkwasị ihe ná nsogbu gị site n’ịtụ anya ka i mee karịa ka ị pụrụ ime, cheta na ọ bụ Chineke ka ị na-agbalị ime ihe ga-atọ ya ụtọ, ọ bụghị mmadụ.—Ndị Galetia 1:10.

N’ọgụ ahụ ị na-alụ ime ihe dị mma, nọrọ na nche megide “ụzọ aghụghọ nile” nke Setan, bụ́ ihe a pụrụ ịkpọ “ajọ aghụghọ nile nke Ekwensu.” (Ndị Efesọs 6:11, New World Translation Reference Bible, nkọwa ala ala peji; Today’s English Version) Tụlee “ajọ aghụghọ” abụọ ndị ọ ga-eji mee ihe n’ịnwa ịnapụ gị abamuru nile nke obi ebere na-erughịrị mmadụ.

“Ajọ Aghụghọ Nile” nke Setan

Ekwensu na-eji echiche nke ịbụ onye na-abaghị uru na-eme ihe ịnwa ịdọpụ gị n’ebe Chineke nọ. Ọ bụ n’aka Setan ka mmehie ahụ nke mebiri gị si bịa. Ugbu a, ọ pụrụ ịgba echiche ahụ ume nke bụ na ị bakwaghị uru n’anya Chineke, dị ka Bildad nwara ime Job. (Job 25:4-6; Jọn 8:44) E meriwo ndị agha n’agha ọtụtụ ugbo n’ihi na ha ebuworị ụzọ daa mbà n’obi tupu ha abanye n’agha ahụ! Ya mere, ekwela ka Setan mee ka ị daa mbà n’obi. (Ndị Efesọs 6:10-13) Ịmara ụzọ aghụghọ nile nke Setan kwesịrị ịkpali gị ịlụsikwu ọgụ ike ime ihe dị mma.—2 Ndị Kọrint 2:11.

Ọ bụrụ na ịda mbà n’otu ihe ma ọ bụ n’ihe ọzọ emee ka i nwee mwute mgbe ụfọdụ, jide n’aka na ‘inwebiga mwute ókè elodaghị gị.’ (2 Ndị Kọrint 2:7) Dr. Claire Weekes kwuru okwu banyere àgwà nke ụfọdụ ndị ikwe ka ndahie ndị ha mere n’oge gara aga rikpuo ha, sị: ‘Ikwe ka amamikpe sitere n’oge gara aga gbochie ihe a na-eme n’oge dị ugbu a bụ ịdị ndụ n’ụzọ na-ebibi ihe.”—Lee Ọrụ 3:19.

À sị na anyị pụrụ imezucha ihe nile Chineke chọrọ anyị n’aka n’ụzọ zuru okè, ọ ga-abụ obi ebere nke ruuru anyị bụ́ ya inye anyị ngọzi ndị ahụ o kweworo na nkwa. Ma Jehova Chineke na Jisọs Kraịst na-egosi anyị obi ebere nke na-erughịrị anyị. Akwụkwọ bụ A Greek-English Lexicon of the New Testament, nke J. H. Thayer dere, na-akọwa isi ihe dị n’okwu ahụ Pọl onyeozi jiri mee ihe ịkọwa àgwà nke a nke Chineke, sị: “Okwu ahụ [kha’ris] nwere n’ime ya echiche nke obi ebere nke na-enye mmadụ ihe na-erughịrị ya.” Ọ dịghị ọrụ ọ bụla anyị pụrụ ịrụ nke ga-eme ka anyị ruo eru inweta ngọzi Chineke. Ọ bụ, dị ka Pọl kwuru, obi ebere nke na-erughịrị mmadụ. Ọ bụrụ na i ji obi eziokwu na-eme ihe nile ị pụrụ ime ruo ókè ike gị nile hà iji mezuo ihe ndị Chineke chọrọ gị n’aka, nwee obi ụtọ n’ime nke ahụ. Ọ dịghị ihe ọzọ Jehova chọrọ gị n’aka.

Otú ọ dị, buru n’uche otu ihe ọzọ n’ime “ajọ aghụghọ nile” nke Setan. Ọ na-eduhie ụfọdụ ndị gaa n’iche na ha pụrụ iji ohere nke obi ebere Chineke nke na-erughịrị mmadụ mere ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na ha pụrụ ịdabere n’obi ebere ya gabiga ókè. Jehova na-eji ịhụnanya na-agbaghara adịghị ike anyị nile, ma nke ahụ apụtaghị na anyị ga-akwụsị ime mgbalị imeri ha. Pọl kọwara ụfọdụ ndị, bụ́ ndị “zọworo Ọkpara Chineke ụkwụ, . . . [ndị] mewokwara mmụọ nke amara ihe ihere.” (Ndị Hibru 10:29) Ndị a egosighị nsọpụrụ ọ bụla maka ụkpụrụ ezi omume, ha mebikwara iwu Chineke otú o si masị ha, na-edebe onwe ha n’ebe a na-apụghị ịkpọghachi ha akpọghachi. Onye ahụ otu nne ji ya na Jisọs bụ Jud, onye hụrụ ihe ize ndụ ndị aghụghọ nile ndị a nke Setan na-akpata, dere, sị: “Mmadụ ụfọdụ gbebara, [n’ime ọgbakọ] . . . , ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ndị na-agha amara Chineke anyị ka ọ bụrụ agụụ ịkwa iko.”—Jud 4.

Setan pụrụ ịrafu ndị dị otú a gaa n’iche na ha pụrụ ilezi anya tinye aka n’ajọ omume wee rịọ Chineke ka ọ gbaghara mmehie ha. Ma Jehova agaghị agbaghara ndị dị otú ahụ, bụ́ ndị leziri anya na-emebi iwu ya. Ọ “na-aba ụba n’ebere” n’ebe ndị ahụ na-agbalị ife ya ofufe ruo ókè ha pụrụ ime n’agbanyeghị ezughị okè ha nile. “Ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị” ma ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị.—Ọpụpụ 34:6, 7.

Ị Pụrụ Irite Uru Site n’Obi Ebere Na-erughịrị Mmadụ

Ọ bụ ihe nkasi obi ịmara na Jehova adịghị ele gị anya nanị n’ọnọdụ gị nke ezughị okè, nke nwekwara ntụpọ. Ọ maara ihe ị pụrụ ịbụ mgbe e tinyere ike mmezi ihe nile nke àjà mgbapụta Jisọs n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu. Ya mere, jiri obi ike kpekuo Jehova ekpere dị ka onye ọbụ abụ bụ́ Devid mere. “Meere m amara, Chineke,” ka Devid sịrị, “dị ka ebere gị si dị: dị ka ịba ụba nke obi ebere gị nile si dị hichapụ njehie m nile. Sụchaa m nke ọma dị ka ákwà ka ajọ omume m pụọ n’ime m, meekwa ka m si ná mmehie m dị ọcha. N’ihi na mụ onwe m maara njehie m nile: mmehie m dịkwa n’ihu m mgbe nile. Zopụ ihu gị ná mmehie m nile, hichapụkwa ajọ omume m nile. . . . Obi tiwara etiwa na nke e gwepịara egwepịa, Chineke, ị dịghị eleda ya anya.”—Abụ Ọma 51:1-3, 9, 17.

Ọ pụrụ ịbụ na njehie na ọdịda gị nile nọgidere na-adị n’ihu gị. Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ inwe mmetụta yiri nke nwa mmefu ahụ Jisọs kọwara. Mgbe nwa okoro nke a lọghachiri mgbe o mefusịworo ihe nketa ya ná mba ndị ọzọ n’ụzọ na-eme ihere, o tiri mkpu gwa nna ya, sị: “Ekwesịghị m ka a kpọọkwa m nwa gị ọzọ.” (Luk 15:21) Otú ọ dị, nwa okorobịa nke a nwere àgwà ziri ezi. Ọ jughị ịnara obi ebere nke nna ya, ọ nwaghịkwa iji obi ebere ahụ mee ihe na-ekwesịghị ekwesị. Ya mere, nna ya ji ịhụnanya nabataghachi ya n’ime ezinụlọ ahụ. (Luk 15:20-24) Jehova nwere obi ụtọ imere ndị mmadụ na-emehie emehie otu ihe ahụ taa, bụ́ ndị na-agbalịsi ike ime uche ya.—Abụ Ọma 103:8-14; Aịsaịa 55:7.

Frank ekweghị ka echiche nke ịbụ onye na-abaghị uru rikpuo ya. Ọ naara obi ebere Chineke nke na-erughịrị mmadụ, ọ na-ejekwa ozi ugbu a dị ka onye ohu na-eje ozi n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova. “Ana m amali elu n’ihi ọṅụ ugbu a,” ka ọ sịrị, “mgbe m chetara ihe Jehova Chineke na Jisọs Kraịst mewooro anyị na ihe ha gajekwa imere anyị n’ọdịnihu!”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya