Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 8/1 p. 24
  • ‘Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-ezi Ihe n’Ihu Ọha na Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Nsụgharị “New World Translation”—E Dere Ya nke Ọma na n’Ụzọ Eziokwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Ịgba Àmà Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ
    Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Otu Ihe Dị Ịrịba Ama Nye Ndị Hụrụ Okwu Chineke n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 8/1 p. 24

‘Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ’

“KWA ụbọchị, n’ụlọ ukwu Chineke na n’ụlọ nke aka ha [“site n’ụlọ ruo n’ụlọ,” NW] ha adịghị ahapụ izi ihe na izisa ozi ọma Jisọs, na ọ bụ Kraịst.” (Ọrụ 5:42) Ndịàmà Jehova na-ejikarị akụkụ ihe odide nke a na nke ahụ dị n’Ọrụ Ndị Ozi 20:20 eme ihe iji nye ihe ndabere Akwụkwọ nsọ maka ọrụ nkwusa ha na-arụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Otú ọ dị, na Germany, ụfọdụ ndị na-akatọ Ndịàmà Jehova amawo ụzọ New World Translation si sụgharịa amaokwu ndị a aka, na-ekwu na ọ na-ekwu ihe asụsụ Grik mbụ ahụ na-ekwughị.

Nzọrọ ndị dị otú ahụ hà ziri ezi? Ọ dịghị ma ọlị. Otu ihe bụ na, ma ọ dịghị ihe ọzọ, nsụgharị Bible isii ndị ọzọ n’asụsụ German sụgharịrị amaokwu ndị ahụ n’otu ụzọ ahụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ Zürcher Bibel ahụ e dezigharịrị edezigharị na “Agba Ọhụrụ Ndị Ahụ” nke Rupert Storr, Franz Sigge, na Jakob Schäfer dere (nke N. Adler dezigharịrị). Ọtụtụ nsụgharị asụsụ Bekee kwekọrọ na nke a.

Ọkà mmụta onye Germany, bụ́ Hans Bruns na-akwado nsụgharị ya, bụ́ “site n’ụlọ ruo n’ụlọ,” n’Ọrụ Ndị Ozi 5:42, na-asị: “Dị ka ihe odide mbụ ahụ si dị, o yiri ka hà jere site n’ụlọ ruo n’ụlọ.” Ee, katʼ oiʹkon, bụ́ okwu asụsụ mbụ dị n’ihe odide nke a, abụghị nke a na-eji eme ihe n’echiche nke ịkọ otú ihe si mee, (“n’ụlọ”) kama ọ bụ n’echiche nke na-egosi ikesa ihe, nke pụtara n’ụzọ nkịtị “dị ka ụlọ si dị.” (ụdị ya nke na-egosi ọtụtụ ihe, bụ́ katʼ oiʹkous, nke pụtara “dị ka ụlọ dị iche iche si dị,” bụ nke a na-ahụ n’Ọrụ Ndị Ozi 20:20.) Ndị ọkà mmụta ndị ọzọ, dị ka Heinz Schürmann na-akwado ịsụgharị okwu ndị a n’ụzọ na-egosi ikesa ihe. Horst Balz na Gerhard Schneider, bụ́ ndị bipụtara otu akwụkwọ ọkọwa okwu e ji eme nnyocha n’Agba Ọhụrụ ahụ, na-ekwu na a pụrụ ịsụgharị okwu nke a ịbụ “otu ụlọ gasịa, ụlọ ọzọ.” Ọtụtụ akwụkwọ ihe ọmụma dị n’asụsụ Bekee kọwakwara amaokwu nke a n’ụzọ dị otú a.

Ọzọkwa, New World Translation meriri mmegide nile nke ndị nkatọ. Nke ka mkpa bụ na ọ bụ ihe doro anya na e nwere ihe siri ike nke dabeere na Bible maka ozi a na-eje site n’ụlọ ruo n’ụlọ. (Tụlee Matiu 10:11-14; 24:14.) Ndịàmà Jehova nwere ihe ùgwù iṅomi ndị òtù ha nke narị afọ mbụ n’ihe banyere nke a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya