ISI NKE ATỌ
Ụbọchị Jehova—Okwu Dị Oké Mkpa
1, 2. (a) Olee okwu dị oké mkpa ndị amụma iri na abụọ ahụ rụtụchara aka na ya? (b) Olee otú ụfọdụ n’ime ndị amụma iri na abụọ ahụ si kwuo okwu kpọmkwem banyere ụbọchị Jehova?
“OKÉ ụbọchị Jehova dị nso. Ọ dị nso, o jikwa oké ọsọ na-abịa.” (Zefanaya 1:14) Ndị amụma Chineke dọrọ aka ná ntị ugboro ugboro banyere ụbọchị Jehova nke na-abịanụ. Ha na-ekwukarị otú ọbịbịa ya kwesịrị isi metụta ụzọ ndị mmadụ si ebi ndụ kwa ụbọchị, omume ha nakwa àgwà ha. Ozi ha na-achọkarị ka e mee ihe ngwa ngwa. A sị na ị nọ mgbe e ziri ozi ndị a, olee ihe ị gaara eme?
2 Ka ị na-agụ akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere, ị ga-ahụ na ha niile kwuru okwu banyere ụbọchị Jehova. Ụfọdụ n’ime ha kwuru banyere ya kpọmkwem, ebe ndị ọzọ kwuru okwu rụtụrụ aka na ya.a Ya mere, tupu ị tụlewe malite n’Isi nke Anọ ihe bara uru ndị amụma ahụ kwuru, chebara okwu ahụ pụtara ọtụtụ ugboro echiche: ụbọchị Jehova. Mmadụ isii n’ime ndị amụma ahụ kwuru okwu ahụ kpọmkwem ma ọ bụ kwuo okwu ndị ọzọ yiri ya. Joel ji okwu ndị doro anya kọwaa “oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova.” (Joel 1:15; 2:1, 2, 30-32) Emọs gwara ndị Izrel ka ha jikere izute Chineke ha, n’ihi na ụbọchị Jehova ga-abụ ụbọchị ọchịchịrị. (Emọs 4:12; 5:18) Ka e mesịrị, Zefanaya kwuru ihe ndị ahụ e kwuru na paragraf nke mbụ. Ntakịrị oge tupu e bibie Jeruselem, Obedaya dọrọ aka ná ntị, sị: “Ụbọchị Jehova nke ga-abịakwasị mba niile dị nso.”—Obedaya 15.
Dị ka mmiri ruru eru, “oké ụbọchị Jehova dị nso”
3. Gịnị mere anyị pụrụ iji kwuo na ndị amụma ahụ jere ozi mgbe ndị Juu si ebe a dọọrọ ha n’agha laa lọta kwuru banyere ụbọchị Jehova?
3 Ị ga-ahụkwa na ndị amụma abụọ e ziri ka ha gakwuru ndị Juu mgbe ha si ebe a dọrọ ha n’agha laa lọta kwukwara okwu yiri ya. Zekaraya kwuru banyere ụbọchị a ga-ebibi mba niile ndị na-ebuso Jeruselem agha. N’ụzọ doro anya, ọ kọwara ihe ga-eme ‘n’otu ụbọchị nke a maara dị ka ụbọchị Jehova.’ (Zekaraya 12:9; 14:7, 12-15) Malakaị gwara ndị Chineke banyere ọbịbịa nke “oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova.”—Malakaị 4:1-5.
4. Olee otú ụfọdụ n’ime ndị amụma iri na abụọ ahụ si rụtụ aka n’ụbọchị Jehova?
4 Ọ bụ ezie na mmadụ isii n’ime ndị amụma iri na abụọ ahụ ekwughị “ụbọchị Jehova” kpọmkwem, ha rụtụrụ aka na ya. Hosia kwuru na Jehova ga-eme ka Izrel zaa ajụjụ. Mgbe nke ahụ gasịkwara, ọ ga-eme ka Juda zaa ajụjụ. (Hosia 8:13, 14; 9:9; 12:2) Ọtụtụ mgbe, ozi ndị a bụ banyere ihe Jehova mere n’oge ahụ. Dị ka ihe atụ, Jona kwusara ikpe Chineke mara Ninive. Maịka kọwakwara ihe ga-eme mgbe Chineke ga-eme ndị nnupụisi ihe. (Jona 3:4; Maịka 1:2-5) Nehọm kwere nkwa na Jehova ga-abọ ọ́bọ̀ n’ahụ́ ndị iro Ya. (Nehọm 1:2, 3) Habakọk kpọrọ òkù ka e nwee ikpe ziri ezi. Ọ kọwakwara otú “ụbọchị ahụhụ” ga-adị. (Habakọk 1:1-4, 7; 3:16) Ozi ụfọdụ dị n’akwụkwọ ndị a rụtụrụ aka kpọmkwem n’ihe ụfọdụ ga-eme, bụ́ ndị ga-emetụta ezi Ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, Hagaị, bụ́ otu n’ime ndị amụma ahụ jere ozi mgbe ndị Juu si n’ebe a dọọrọ ha n’agha laa lọta, buru amụma na a ga-eme ka mba niile maa jijiji. (Hagaị 2:6, 7) Pọl onyeozi kwughachiri ihe ahụ e kwuru na Hagaị 2:6 iji gbaa Ndị Kraịst ume ka ha nọrọ n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị mgbe Chineke ga-ewepụ eluigwe ọjọọ nke bụ́ ihe atụ.—Ndị Hibru 12:25-29; Mkpughe 21:1.
ỤBỌCHỊ JEHOVA—GỊNỊ KA Ọ BỤ?
5, 6. Dị ka ndị amụma ahụ kwuru, olee otú ụbọchị Jehova ga-adị?
5 E nwere ezi ihe mere ị ga-eji chewe echiche otú ụbọchị Jehova ga-adị. Ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Ọ̀ dị ihe gbasara ụbọchị Jehova na otú m si ebi ndụ ugbu a nakwa ọdịnihu m?’ Dị ka ndị amụma ahụ kwuru, ụbọchị Jehova bụ oge Jehova ga-emezu ihe o kpere n’ikpe n’ahụ́ ndị iro ya. Ọ bụ ụbọchị agha. O yiri ka ihe ndị dị egwu hà ga-eme n’eluigwe n’ụbọchị ahụ nke dị egwu. “Anyanwụ na ọnwa ga-agba ọchịchịrị, kpakpando ga-akwụsị inye ìhè ha.” (Joel 2:2, 11, 30, 31; 3:15; Emọs 5:18; 8:9) Gịnị ga-eme n’ụwa a, bụ́ ebe anyị bi? Maịka kwuru, sị: “Ugwu niile ga-agbaze n’okpuru ụkwụ [Jehova], ndagwurugwu niile ga-agbawasị, dị ka mgbá aṅụ nke ọkụ gbazere, dị ka mmiri a wụpụrụ n’ebe kpọdara akpọda.” (Maịka 1:4) O nwere ike ịbụ na nkọwa a e nyere bụ ihe atụ. Ma ọ pụrụ ime ka anyị kwubie na ihe Chineke ga-eme ga-ewetara ụwa na ndị bi n’ime ya ọdachi. Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ niile ka ọ ga-ewetara ọdachi. Ndị amụma ahụ rụtụrụ aka ná ngọzi dị ukwuu nke ndị ‘na-achọ ezi ihe’ ga-enweta wee si otú ahụ dị ndụ.—Emọs 5:14; Joel 3:17, 18; Maịka 4:3, 4.
6 Ndị nke ọzọ n’ime ndị amụma iri na abụọ ahụ kọwara otú ụbọchị Jehova ga-adị n’ụzọ doro anya karị. Habakọk kọwara nnọọ otú Jehova ga-esi tidaa “ugwu ukwu niile na-adịru mgbe ebighị ebi,” kụtuokwa “ugwu nta niile na-adịru mgbe ebighị ebi,” nke bụ́ ihe atụ dabara adaba nke òtù dị iche iche nke ụmụ mmadụ, ndị pụrụ iyi ka hà na-adịru mgbe ebighị ebi. (Habakọk 3:6-12) Ee, ụbọchị Jehova “bụ ụbọchị oké iwe, ụbọchị ahụhụ na nke nhụjuanya, ụbọchị oké ifufe na nke ịtọgbọrọ n’efu, ụbọchị ọchịchịrị na nke itiri, ụbọchị ígwé ojii na nke oké ọchịchịrị.”—Zefanaya 1:14-17.
7. Gịnị bụ ihe otiti e buru n’amụma, oleekwa otú ọ pụrụ isi mezuo?
7 Cheedị echiche ụdị ahụhụ ga-adakwasị ndị na-alụso Chineke ọgụ! “Anụ ahụ́ mmadụ ga na-erekapụsị ka onye ahụ guzo ọtọ; anya mmadụ ga na-erekasị n’oghere ya, ire ya ga na-erekasịkwa n’ime ọnụ ya.” (Zekaraya 14:12) Ma ọhụụ a ọ̀ ga-emezu otú ahụ e si kwuo ya ma ọ̀ bụ n’ụzọ ihe atụ, ị ga-ahụ na ọ ga-ewetara ọtụtụ ndị ọdachi. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ire nke ndị iro Chineke ga-erekasị n’echiche bụ́ na a ga-emechi ha ọnụ ka ha kwụsị ikwu okwu ọjọọ ha na-ekwu. Anya ha ga-erekasịkwa n’echiche bụ́ na a ga-eme ka echiche ọ bụla ha chepụtara ijikọ aka megide ndị Chineke kụọ afọ n’ala.
IHE MERE CHINEKE NWERE ỊHỤNANYA GA-EJI MEE IHE
8, 9. (a) Iji ghọta ihe mere Jehova ga-eji mee ndị ajọ omume ihe, olee ihe i kwesịrị ichebara echiche? (b) Olee ihe jikọrọ iguzosi ike n’ihe ná ndụ ị na-ebi kwa ụbọchị na Jehova ime ihe?
8 Ma eleghị anya, ị nụla ka ndị mmadụ na-ajụ, sị: ‘Olee otú Chineke nke nwere ịhụnanya ga-esi mee ka ọdachi dị otú ahụ bịakwasị ndị iro ya? Ọ̀ dị mkpa ka Chineke weta mbibi n’ụwa? Ọ̀ bụ na Jizọs agbaghị anyị ume ka anyị na-ahụ ọbụna ndị iro anyị n’anya wee si otú ahụ gosi na anyị bụ ụmụ nke Nna anyị nọ n’eluigwe?’ (Matiu 5:44, 45) Iji zaa ajụjụ ndị a, cheghachi echiche azụ n’oge nsogbu ụmụ mmadụ malitere. Chineke kere di na nwunye mbụ bụ́ mmadụ n’onyinyo ya nakwa n’oyiyi ya—ha zuru okè. N’agbanyeghị nke ahụ, ha webatara mmehie na ọnwụ n’etiti ụmụ mmadụ. Mmehie na ọnwụ wee si otú ahụ bata ná ndụ anyị. Ha kwadoro Setan bụ́ Ekwensu n’okwu banyere onye o ruuru karịsịa ịchị ụmụ mmadụ. (Jenesis 1:26; 3:1-19) Kemgbe ọtụtụ narị afọ, Setan agbalịwo igosi na ọ bụrụ na e nye ụmụ mmadụ ihe pụrụ ime ka ha hapụ Jehova na ha agaghị ejere Jehova ozi. Ị manụ na Setan akụwo afọ n’ala. Jizọs Kraịst na ọtụtụ ndị ọzọ na-ejere Jehova ozi ekwesịwo ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ. Ha egosiwokwa na ha na-ejere ya ozi n’ihi ịhụnanya. (Ndị Hibru 12:1-3) Ị pụrụ icheta aha ọtụtụ ndị bụ́ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Chineke ozi.
9 Ọzọkwa, ihe iseokwu a, nke ga-akwụsị mgbe Jehova ga-eme ka mmebi iwu kwụsị, gbasara gị. Dị ka ihe atụ, ka ị na-agụ akwụkwọ iri na abụọ a, ị ga-ahụ na ụfọdụ n’ime ndị amụma ahụ rụtụrụ aka ná ndụ okomoko nke ndị leghaara ofufe Jehova anya biri. Ndị amụma ahụ dụrụ ndị Chineke ọdụ ka ‘ha chebara ụzọ ha echiche’ ma gbanwee ụzọ ha si ebi ndụ. (Hagaị 1:2-5; 2:15, 18; Emọs 3:14, 15; 5:4-6) Ee, ndị amụma ahụ na-egosi ndị mmadụ otú e si ebi ndụ. Ndị nabatara ndụmọdụ ahụ gosiri na ọ bụ Jehova bụ Eze ha wee si otú a gosi na Setan bụ onye ụgha. Jehova ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ndị dị otú ahụ ihe mgbe ọ ga-ebibi ndị iro ya.—2 Samuel 22:26.
10. Olee otú ihe Maịka hụrụ si gosikwuo ihe mere Jehova ga-eji mee ndị ọjọọ ihe?
10 E nwere ihe ọzọ mere Chineke ga-eji mee ihe. Cheghachi echiche azụ na narị afọ nke asatọ T.O.A. mgbe Maịka buru amụma na Juda. Maịka kwuru okwu banyere onwe ya dị ka à ga-asị na ọ bụ ya bụ mba ahụ wee jiri ọnọdụ ya tụnyere ubi vaịn ma ọ bụ ubi mkpụrụ osisi nke a na-ewefọghị mkpụrụ vaịn ma ọ bụ mkpụrụ fig na ya mgbe e wesịrị ihe ubi. Ọ bụ otú ahụ ka ọnọdụ dị n’etiti ndị Juda, bụ́ ebe o siri ike ịhụ ndị ziri ezi. Ndị Izrel nọ na-achụ nta ndị Izrel ibe ha, na-echebiri ha ka ha gbuo ha. Ndị ndú ha na ndị ikpe ha na-achọ naanị uru nke ha. (Maịka 7:1-4) A sị na i biri n’ebe e nwere ụdị ọnọdụ ahụ, olee otú ọ gaara adị gị? Ma eleghị anya, ị ga-emetere ndị ahụ na-adịghị ihe ha mere, bụ́ ndị a na-emegbu emegbu, ebere. Lezienụ otú Jehova si na-emetere ndị a na-emegbu emegbu ebere karị! Taa, Jehova na-enyocha ụmụ mmadụ. Gịnị ka i chere na ọ na-ahụ? Ndị mmegbu ji obi ịta mmiri na-emegbu ndị ọzọ maka uru nke ha, jirikwa ike na-awakpo ndị agbata obi ha. Ma, ndị na-eguzosi ike n’ihe dị ole na ole ma e jiri ha tụnyere ndị bi n’ụwa. Ma anyị ekwesịghị inwe obi nkoropụ. Jehova ga-ekpe ikpe ziri ezi n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe ndị a na-emegbu emegbu nọ.—Ezikiel 9:4-7.
11. (a) Olee ihe ụbọchị Jehova ga-ewetara ndị na-atụ egwu ya? (b) Mmetụta dị aṅaa ka ozi ịdọ aka ná ntị nke Jona zisara nwere n’ahụ́ ndị Ninive?
11 O doro anya na ụbọchị Jehova ga-ewetara ndị iro ya mbibi ma wetara ndị na-atụ egwu ya ma na-ejere ya ozi nzọpụta.b Maịka buru amụma na ọtụtụ mba ga-enuba n’ugwu nke ụlọ Jehova, nke ga-emekwa ka e nwee udo na ịdị n’otu n’ụwa dum. (Maịka 4:1-4) N’oge Maịka, eziokwu ahụ bụ́ na ndị amụma nọ na-ekwusa banyere ụbọchị Jehova ò mere ka ndị mmadụ gbanwee otú ha si ebi ndụ? O mere ka ndị ụfọdụ gbanwee. Cheta na mgbe Jona kwusara ikpe Jehova mara Ninive, ndị bi n’obodo ahụ, bụ́ ndị ajọ omume nakwa ndị na-eme ihe ike, ‘malitere inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ’ wee ‘hapụ ụzọ ọjọọ ha.’ N’ihi ya, Jehova ebibighị ha mgbe ahụ. (Jona 3:5, 10) Ozi banyere ikpe Jehova nke na-abịanụ mere ka ndị Ninive gbanwee otú ha si ebi ndụ!
N’ihi gịnị ka ihe ndị Ninive mere mgbe ha nụrụ ozi Jona pụrụ iji nye anyị agbamume?
OLEE OTÚ ỤBỌCHỊ AHỤ SI EMETỤTA GỊ?
12, 13. (a) Ole ndị ka ndị amụma iri na abụọ ahụ buru amụma banyere ha? (b) Gịnị mere anyị pụrụ iji kwuo na ihe ndị amụma iri na abụọ ahụ buru n’amụma rụtụrụ aka ná mmezu ha ga-enwe n’ọdịnihu?
12 Mmadụ pụrụ ịsị, ‘Ma, ndị amụma ahụ dịrị ndụ ọtụtụ narị afọ gara aga. Oleekwanụ ihe gbasara m n’ihe ha kwuru banyere ụbọchị Jehova?’ Ọ bụ eziokwu na ndị amụma ahụ dịrị ndụ ọtụtụ afọ ọbụna tupu a mụọ Jizọs, ma, anyị kwesịrị ịtụle otú ihe ha kwuru banyere ụbọchị Jehova si dị mkpa na narị afọ nke iri abụọ na otu. Olee uru anyị pụrụ irite n’ihe ha kwuru banyere ụbọchị Jehova? Ọ dị otu ihe dị mkpa nke ga-enyere anyị aka ịhụ otú ozi ha si dị mkpa, nyekwara anyị aka irite uru na ya. Ọ bụ anyị ịghọta na ndị amụma ahụ dọrọ aka ná ntị banyere ụbọchị Jehova nke ga-abịakwasị Izrel, Juda, mba ndị gbara ha gburugburu nakwa ụfọdụ mba ndị chịrị ụwa n’oge ahụ.c Ihe dị mkpa bụ na amụma ndị ahụ mezuru! Ndị Asiria busoro Sameria agha. E bibiri Juda n’afọ 607 T.O.A. N’oge na-adịghịkwa anya, a lara mba ndị gbara ya gburugburu, bụ́ ndị na-ebuso ya iro, n’iyi. N’ikpeazụ, mba ndị chịrị ụwa bụ́ Asiria na Babịlọn dara iji mezuo amụma ndị e buru kpọmkwem banyere ha.
Na Pentikọst 33 O.A., Pita kwuru na amụma Joel mezuru. Ọ na-emezukwa n’oge anyị
13 Ugbu a, chee echiche n’ihe mere n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., ogologo oge mgbe amụma ndị ahụ mezuchaworo na nke mbụ ha. N’ụbọchị ahụ, Pita onyeozi kọwara na mwụpụ ahụ a wụpụrụ mmụọ nsọ Chineke bụ mmezu nke amụma Joel. Pita kwuziri ihe e dere n’akwụkwọ Joel, sị: “A ga-eme ka anyanwụ ghọọ ọchịchịrị, meekwa ka ọnwa ghọọ ọbara tupu oké ụbọchị dị ebube nke Jehova abịa.” (Ọrụ 2:20) Nke a gosiri na amụma ndị e buru banyere ụbọchị Jehova ka ga-emezu n’ọdịnihu. Ma amụma Joel mezuru nke ugboro abụọ ya n’afọ 70 O.A. mgbe ndị agha Rom bibiri Jeruselem. N’ezie, nke ahụ bụ oge ọchịchịrị na ọbara.
14, 15. (a) Gịnị mere anyị pụrụ iji kwuo na amụma ndị e buru banyere ụbọchị Jehova gbasara anyị taa? (b) Olee mgbe anyị ga-atụ anya na ụbọchị Jehova ga-amalite?
14 Otú ọ dị, amụma Joel na amụma ndị ọzọ ndị kwuru banyere ụbọchị Jehova ka ga-enwe mmezu ikpeazụ ha nke ga-emetụta anyị bụ́ ndị dị ndụ na narị afọ nke iri abụọ na otu. N’ihi gịnị? Pita dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha “na-eburu ọbịbịa nke ụbọchị Jehova n’uche.” Onyeozi ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.” (2 Pita 3:12, 13) E nweghị eluigwe ọhụrụ (ọchịchị ọhụrụ nke Chineke na-achị) na ụwa ọhụrụ (ndị ezi omume ndị ọchịchị ahụ ga na-achị) ozugbo e bibisịrị Jeruselem n’afọ 70 O.A. Ya mere, ihe ndị ahụ e buru n’amụma banyere ụbọchị Jehova aghaghị inwe mmezu ọzọ. Ee, amụma ndị a metụtara anyị taa, bụ́ ndị dị ndụ ‘n’oge a dị oké egwu’!—2 Timoti 3:1.
15 Ụzọ niile ahụ e si kọwaa ụbọchị Jehova n’akwụkwọ iri na abụọ a ndị dị n’ime Baịbụl na-eme ka anyị chebara ihe a Jizọs Kraịst kwuru echiche: “A ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghị enwekwa ya ọzọ.” O kwuru na “ozugbo” oké mkpagbu ahụ malitesịrị, “anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghịkwa enye ìhè ya, kpakpando ga-esikwa n’eluigwe daa, a ga-emekwa ka ike nke eluigwe maa jijiji.” (Matiu 24:21, 29) Nke a na-enyere anyị aka ịmata mgbe ụbọchị Jehova ga-amalite. Ọ dị nnọọ nso. Akwụkwọ Nsọ na-egosi na oké mkpagbu ahụ ga-ebibi “Babịlọn Ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Mgbe ahụ, oké mkpagbu ahụ ga-abịa ná njedebe mgbe ụbọchị Jehova kpochapụrụ ndị iro Chineke niile n’ụwa.—Mkpughe 17:5, 12-18; 19:11-21.
16. Olee ụzọ bụ́ isi amụma ndị e buru banyere ụbọchị Jehova ga-esi mezuo?
16 Ndịàmà Jehova amatawo otú amụma ndị e buru banyere ụbọchị Jehova ga-esi mezuo. Ọtụtụ mgbe, n’ụzọ dịgasịkwa iche iche, obodo Jeruselem nke si n’ezi ofufe dapụ, obodo Sameria nke na-ekwesịghị ntụkwasị obi, ndị Idọm ahụ nwere obi ọjọọ, ndị Asiria na-eme ihe ike, na ndị Babịlọn, na-anọchi anya akụkụ dị iche iche nke okpukpe ụgha. A ga-ebibi okpukpe ahụ dum ná mmalite nke oké mkpagbu ahụ. Ka “oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova” na-aga n’ihu, a ga-ebibi ndị eze ụwa na ndị ahịa ha na ya na-akwa iko.—Joel 2:31.
DỊRỊNỤ NJIKERE
17, 18. (a) N’ihi gịnị ka Emọs ji kwuo na ahụhụ ga-adịrị ndị “agụụ ụbọchị Jehova na-agụsi ike”? (b) Gịnị ga-eme ndị na-adịghị njikere maka ụbọchị Jehova?
17 Ụfọdụ Ndị Kraịst pụrụ iche na mmezu nke amụma ndị a agaghị emetụta ha n’ihi na ọ bụ okpukpe ụgha karịsịa ka ozi banyere ikpe Chineke metụtara. Otú ọ dị, ihe Emọs gwara ndị Izrel baara mmadụ niile uru: “Ahụhụ ga-adịrị ndị agụụ ụbọchị Jehova na-agụsi ike!” N’oge Emọs, ụfọdụ ndị Izrel chere na ọ bụ naanị ngọzi ka ụbọchị Jehova ga-ewetara ha. Obi ha bụ na ọ bụ ụbọchị Chineke ga-eme ihe n’ihi ndị ya. Ụbọchị ahụ gụsiri ha agụụ ike! Ma, n’ebe ndị na-achọ naanị ọdịmma onwe ha nọ, Emọs gara n’ihu ikwu na ụbọchị Jehova ga-abụ “ọchịchịrị, ọ bụghị ìhè.” Ee, ndị Izrel ahụ ga-enweta iwe Jehova!—Emọs 5:18.
18 Mgbe ahụ, Emọs kọwara ihe ga-eme ndị ụbọchị Jehova na-agụsi ike. Chegodị echiche banyere nwoke nke na-agba ọsọ n’ihi ọdụm wee zute anụ ọhịa bea. Ka ọ nọkwa na-agba ọsọ n’ihi anụ ọhịa bea, ọ gbabara n’ụlọ. Ka ọ na-eku ume ọkụ, ọ kpọchiri ụzọ ma dabere ná mgbidi, agwọ wee taa ya. N’ụzọ ụfọdụ, nke ahụ bụ ihe ga-eme ndị na-adịghị njikere n’ezie maka ụbọchị Jehova.—Emọs 5:19.
Dị ka Maịka, na-echere Chineke nke nzọpụta
19. Olee ụzọ pụtara ìhè anyị kwesịrị isi jikere maka ụbọchị Jehova?
19 Ò nwere otú akụkọ a pụrụ isi baara gị uru? Cheta na ọ bụ ndị raara onwe ha nye Chineke ka Emọs na-agwa okwu. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dị mkpa ka ha gbanwee omume ha na àgwà ha. Ọ̀ bụ na ọ dịghị mkpa ka i nyochaa otú i si ebi ndụ iji mara ma ị dịkwa njikere maka ụbọchị ahụ dị oké mkpa, ka ọ̀ ga-adị mkpa ka i mee mgbanwe ụfọdụ? Olee otú ị pụrụ isi gosi na ị dị njikere n’ezie? O doro anya na ọ bụghị site n’ịrụ ebe mgbaba, ịkwakọba ihe oriri, na ịmụ otú e si eme ka mmiri dị ọcha ma ọ bụ site n’ịkwakọba ọlaedo, dị ka ụfọdụ ndị meworo n’ebe ụfọdụ. Zefanaya kwuru, sị: “Ma ọlaọcha ha ma ọlaedo ha agaghị enwe ike ịnapụta ha n’ụbọchị oké iwe Jehova.” Ya mere, ịdị njikere abụghị ịkwakọba ihe onwunwe. (Zefanaya 1:18; Ilu 11:4; Ezikiel 7:19) Kama nke ahụ, anyị aghaghị ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ ma na-ebi ndụ kwa ụbọchị dị ka ndị dị njikere. Ọ dị mkpa ka anyị nwee àgwà ziri ezi nakwa omume kwekọrọ na ya. Maịka kwuru, sị: “Ma mụ onwe m, m ga na-ele anya Jehova. M ga-echere Chineke nke nzọpụta m.”—Maịka 7:7.
20. Olee ihe ndị na-agaghị eme ka anyị kwụsị ichere?
20 Ọ bụrụ na ị na-echere, ị ga-egosipụta na ị dị njikere, na ị na-atụ anya ụbọchị Jehova. Ị gaghị na-echegbu onwe gị banyere mgbe ụbọchị ahụ ga-abịa ma ọ bụ afọ ole i cheworo ya. Amụma niile e buru banyere ụbọchị ahụ ga-emezu n’oge nke Jehova, ha agaghị anọ ọdụ. Jehova gwara Habakọk, sị: “N’ihi na ọhụụ a bụ maka oge a kara aka, o jikwa ọsọ na-eru ọgwụgwụ ya, ọ gaghị agha ụgha. Ọ bụrụgodị na o gbuo oge [otú ụmụ mmadụ si ele ihe anya], na-atụ anya ya; n’ihi na ọ ga-emezurịrị. Ọ gaghị anọ ọdụ [otú Jehova si ele ihe anya].”—Habakọk 2:3.
21. Olee otú ị pụrụ isi rite uru n’ihe ndị anyị ga-amụ n’akwụkwọ a?
21 N’akwụkwọ a, ị ga-amụta otú ị pụrụ isi na-echere Chineke nke nzọpụta. Olee uru ndị ị pụrụ irite n’ịgụ akwụkwọ a? Akwụkwọ a ga-atụle otu akụkụ Baịbụl nke ọ pụrụ ịbụ na ị machaghị nke ọma—akwụkwọ iri na abụọ ahụ a na-akpọ akwụkwọ Obere Ndị Amụma. Ị ga-amụta ihe ndị na-akpali iche echiche. Dị ka ihe atụ, ná Nkebi nke Abụọ, ị ga-atụle ụzọ ị ga-esi ‘chọọ Jehova’ wee dịrị ndụ. (Emọs 5:4, 6) Dabere n’ihe akwụkwọ iri na abụọ a kwuru, ị pụrụ ịhụ ụzọ ị ga-esi matakwuo Jehova nke ọma ma ghọtakwuo mkpa ọ dị ijere ya ozi, ọbụna n’ụzọ ka ukwuu. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-aghọtakwu ụdị onye Jehova bụ site n’enyemaka nke ndị amụma a. Ná Nkebi nke Atọ n’akwụkwọ a, ị ga-aghọtakwu nke ọma ihe Jehova na-atụ anya ka i mee n’otú gị na ndị ezinụlọ gị nakwa ndị ọzọ si emekọrịta ihe. Nke ahụ ga-enyere gị aka ịdị njikere maka oké ụbọchị ya. N’ikpeazụ, ná Nkebi nke Anọ, ị ga-eleba anya na ndụmọdụ ndị amụma ahụ nyere banyere otú i kwesịrị isi na-akpa àgwà ka ụbọchị Jehova na-abịarukwu nso. Ị ga-amụtakwa otú ọ pụrụ isi metụta ozi Ndị Kraịst ị na-eje. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na obi ga-adị gị ụtọ ka ị na-atụle ihe ndị amụma a kwuru banyere ihe ọdịnihu gị nwere ike ịbụ.
22. Olee ihe ị ga-achọ ime banyere ndụmọdụ dị n’akwụkwọ ndị amụma iri na abụọ ahụ dere?
22 Ì chetara ihe ndị ahụ dị oké mkpa Zefanaya kwuru, bụ́ nke e kwughachiri ná mmalite Isi nke Atọ a? (Zefanaya 1:14) Ozi ya bụ banyere ndụ Eze Josaya bụ́ onye ka na-eto eto. Mgbe ọ ka dị naanị afọ iri na isii, ọ malitere ịchọ Jehova. Mgbe ọ gbara afọ iri abụọ, ọ malitere ịlụso ikpere arụsị ọgụ dị nnọọ ka Zefanaya gbara ndị Juda nakwa ndị Jeruselem ume ka ha mee. (2 Ihe E Mere 34:1-8; Zefanaya 1:3-6) Ịdọ aka ná ntị ahụ e nyere banyere ụbọchị Jehova ò nwewo mmetụta n’otú i si ebi ndụ kwa ụbọchị dị nnọọ ka o si metụta Josaya? Ka anyị lee otú ndị amụma iri na abụọ ahụ pụrụ isi nyere onye ọ bụla n’ime anyị aka.
a Ma Aịzaya, bụ́ onye ya na ndị amụma isii mbụ n’ime ndị amụma iri na abụọ ahụ dịkọrọ ndụ, ma Ezikiel, bụ́ onye ya na ndị amụma isii ndị nke ọzọ dịkọrọ ndụ, dọrọ aka ná ntị banyere ụbọchị Jehova.—Aịzaya 13:6, 9; Ezikiel 7:19; 13:5; lee Isi nke 2 n’akwụkwọ a, paragraf nke 4-6.
b Iji matakwuo ihe àmà na-egosi na ụbọchị Jehova ga-eweta ihe ndị dị mma, biko gụọ Hosia 6:1; Joel 2:32; Obedaya 17; Nehọm 1:15; Habakọk 3:18, 19; Zefanaya 2:2, 3; Hagaị 2:7; Zekaraya 12:8, 9; na Malakaị 4:2.
c Ụfọdụ n’ime ndị amụma iri na abụọ ahụ ebughị amụma banyere otu mba naanị, kama ha buru amụma banyere ọtụtụ mba.