Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 2/15 p. 10-15
  • Site Na Seder Ruo Ná Nzọpụta

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Site Na Seder Ruo Ná Nzọpụta
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ememe Ngabiga—Ememe nke Nzọpụta
  • Ihe Karịrị Nwa Atụrụ Ememe Ngabiga
  • Ọbara nke Na-azọpụta Ndụ
  • Olee Nzọpụta nke Ọ Bụ, Ọ̀ Bụkwa n’Òle Ebe?
  • ‘Mgbe A Kara Aka’
  • “Ụbọchị A Ga-abụrụ Unu Ihe Ncheta”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Otú Ememme Ngabiga na Ncheta Ọnwụ Jizọs Si Yie na Otú Ha Si Dị Iche
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2018
  • Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Ihe Omume nke Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 2/15 p. 10-15

Site Na Seder Ruo Ná Nzọpụta

“Iko nke nzọpụta nile ka m ga-ebuli, ọ bụkwa aha Jehova ka m ga-akpoku.”—ABỤ ỌMA 116:13.

1. Abụ dị aṅaa nke nọworo na-amasị ndị mmadụ eri ogologo oge pụrụ imetụta ọdịnihu gị?

OLEE otú ọ ga-esi masị gị ịnụ abụ nke isiokwu ya metụtara gị inwe ọdịnihu obi ụtọ nke dị ogologo? N’eziokwu, abụ dị otú ahụ bụ ihe na-amasị ndị mmadụ mgbe nile. Ma, ị nọ n’ọnọdụ ka nke ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ mma ịghọta abụ nke a dị mkpa na inweta ọṅụ site na ya. Ndị Juu na-akpọ ya Hallel (Otuto). N’ịbụ ndị ihe mejupụtara ya bụ Abụ Ọma 113 ruo 118, ọ na-agba anyị ume ịbụ abụ ‘Halleluja,’ ma ọ bụ “Toonụ Ja.”

2. Olee ụzọ a na-esi eji abụ nke a eme ihe, è sikwa aṅaa jikọta ya na Seder ahụ?

2 Ndị Juu na-abụ abụ Hallel ahụ ná nnọkọ Ememe Ngabiga ha, bụ́ nke ihe àmà gosiri na ha malitererịị ịbụ ya mgbe Chineke nwere ụlọ nsọ ebe a na-achụ àjà ụmụ anụmanụ. Taa, a na-abụ abụ ahụ n’ụlọ ndị Juu dị iche iche n’oge nnọkọ Ememe Ngabiga ahụ na n’oge oriri nke a na-akpọ Seder. Ma ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na-abụ abụ ahụ n’oge Seder ha matara n’ezie isi ihe dị n’Abụ Ọma 116:13: “Iko nke nzọpụta nile ka m ga-ebuli, ọ bụkwa aha Jehova ka m ga-akpọku.” Ma, ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka e ji jikọta nzọpụta na Ememe Ngabiga ahụ, ọ̀ pụkwara ịbụ na nke a metụtara nzọpụta gị?

Ememe Ngabiga—Ememe nke Nzọpụta

3. Gịnị bụ mmalite nke Seder?

3 Cheta na ndị Israel bụbu ndị ohu n’Ijipt n’okpuru Fero onye ọchịchị aka ike. N’ikpeazụ, Jehova welitere Moses iduru ndị Ya jee ná nnwere onwe ha. Mgbe Chineke wetasịrị ihe otiti itoolu n’isi ndị Ijipt, Moses mara ọkwa banyere nke iri. Jehova gaje igbu ụmụ nile e buru ụzọ mụọ n’ezinụlọ ndị Ijipt nile. (Ọpụpụ 11:1-10) Ma a pụrụ ịhapụ nke ndị Israel. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị anaa? Ha ga-egbu otu nwa atụrụ, tekwasị ọbara ya n’elu ibó ọnụ ụzọ na n’elu awara ụzọ, ma nọrọ n’ime ụlọ na-eri anụ nwa atụrụ ahụ, achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa dị iche iche na-elu ilu. N’oge Seder ahụ, Chineke “ga-agabiga” n’egbughị ụmụ ha ndị e buru ụzọ mụọ.—Ọpụpụ 12:1-13.

4, 5. Olee ụzọ Ememe Ngabiga ahụ si duje ná nzọpụta nye ọtụtụ ndị? (Abụ Ọma 106:7-10)

4 Ná mmeghachi omume banyere ihe otiti nke iri nke a, Fero gwara Moses, sị: “Bilienụ, si n’etiti ndị m pụọ, ma unu onwe unu ma ụmụ Israel; jeekwanụ, fee Jehova.” (Ọpụpụ 12:29-32) Mgbe ndị Hibru na “ọtụtụ ndị gwara ọgwa” nke ndị nwere ọmịiko n’ebe ha nọ pụrụ, Fero gbanwere obi ya wee chụsoo ha. Mgbe ahụ, Chineke jiri ọrụ ebube nyere ndị ya aka ịgbanarị ya gabiga Osimiri Uhie ahụ, ebe Fero na usuu ndị agha ya na-achụso ha nọrọ nwụọ.—Ọpụpụ 12:38; 14:5-28; Abụ Ọma 78:51-53; 136:13-15.

5 Moses gwara ndị Israel n’Osimiri Uhie ahụ, sị: “Unu atụla egwu, guzonụ onwe unu n’ebe a, hụ nzọpụta Jehova, nke ọ ga-emere unu taa.” Mgbe e mesịrị, ha bụrụ abụ, sị: “Ike m na abụ ọma m ka Jaa bụ, o wee ghọọrọ m nzọpụta: onye a bụ Chineke m, m ga-emekwa ya ka ọ dị elu.” (Ọpụpụ 14:13; 15:2) Ee, nnapụta a napụtara Israel, ma site n’ihe otiti iri ahụ ma site n’Osimiri Uhie ahụ bụ nzọpụta. Onye ọbụ abụ ahụ pụrụ ịkọwa Jehova nke ọma dị ka Chineke “nke na-arụ ọru nzọputa n’etiti ụwa.”—Abụ Ọma 68: 6, 20; 74:12-14; 78:12, 13, 22.

6, 7. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka e ji guzobe Ememe Ngabiga ahụ, ma ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka a na-eji edebe ya n’ụzọ ndị dị iche n’Ememe Ngabiga nke mbụ ahụ?

6 Ndị Hibru ga-anọgide na-eme Ememe Ngabiga ahụ dị ka ihe ncheta nke nzọpụta. Chineke sịrị: “Ụbọchị a ga-abụrụ unu ihe ncheta, unu ga-emekwa ya ka ọ bụrụ ememe unu na-emere Jehova: n’ọgbọ nile unu ka unu ga na-eme ya.” (Ọpụpụ 12:14) N’oge oriri Ngabiga, ma ọ bụ Seder ọ bụla, onye bụ nna aghaghị ichetara ezinụlọ ya nzọpụta ahụ. Jehova nyere ntụziaka, sị: “Mgbe ụmụ unu ga-asị unu, Gịnị bụ ofufe a unu nwere? na unu ga-asị, Àjà ngabiga ka ọ bụ nke a na-achụrụ Jehova, onye gabigara ụlọ nile nke ụmụ Israel n’Ijipt, mgbe o tiri ndị Ijipt ihe, o wee napụta ụlọ nile anyị.”—Ọpụpụ 12:25-27.

7 Eziokwu ahụ nke bụ na ndị Juu nọgidere ruo taa na-eme oriri Seder nke Ememe Ngabiga ahụ na-akwado na nke a bụ n’ezie ihe ndekọ nke ihe mere eme. Otú ọ dị, ụfọdụ n’ime ihe ndị ha na-eme dị iche n’ihe ndị Chineke tụziri aka ka e mee. Akwụkwọ bụ The Origins of the Seder na-asị: “E nwere nkọwa sara mbara n’ime Bible banyere Ememe Ngabiga na Ememe Achịcha Ekoghị Eko; otú ọ dị, nkọwa ndị a ekwekọghị n’ụzọ ndị e si na-eme ememe ahụ mgbe oge gasịrị. N’ụzọ bụ isi, ihe omume nke Bible lekwasịrị anya n’àjà ngabiga ahụ, bú nke na-abụkwaghị ihe bụ isi n’ihe odide ndị e dere mgbe e desịworo Bible.” Otu ihe bụ isi kpatara nke a bụ na ndị Juu enwekwaghị ụlọ nsọ ebe ha na-achụ àjà ụmụ anụmanụ.

8. Òlee ihe pụrụ iche mere anyị ga-eji tụlee ihe banyere Ememe Ngabiga ahụ?

8 Ndị Kraịst pụrụ irite uru site n’ịmụ ihe banyere ememe nile ndị Chineke nyere Israel oge ochie,a ma ka ọ dị ugbu a, akụkụ ụfọdụ nke Ememe Ngabiga ahụ kwesịrị ka anyị lebara ya anya n’ụzọ pụrụ iche. Jisọs, bụ́ onye Juu, debere Ememe Ngabiga ahụ. N’oge ikpeazụ o mere nke a, o kwuru ihe banyere nanị otu ememe ahụ Chineke kwadoro nye ndị Kraịst—Nri Anyasị Onyenwe Anyị, bụ́ ememe ncheta nke ọnwụ Jisọs. Ya mere, e jikọtara ememe ndị Kraịst nke a na Ememe Ngabiga ahụ.

Ihe Karịrị Nwa Atụrụ Ememe Ngabiga

9, 10. Olee ụzọ nwa atụrụ Ememe Ngabiga ahụ sị bụrụ àjà pụrụ iche?

9 Ndị Hibru 10:1 na-agwa anyị na ‘Iwu ahụ bụ nanị onyinyo nke ezi ihe ndị gaje ịbịa.’ Akwụkwọ Cyclopædia of Biblical, Theological, and Ecclesiastical Literature, nke M’Clintock na Strong dere, na-asị: “Ọ dịghị onyinyo ọ bụla nke ezi ihe ndị gaje ịbịa nke dị n’iwu ahụ nke ya na Ememe Ngabiga ahụ na-ama aka.” Karịsịa, nwa atụrụ Ememe Ngabiga ahụ pụtara ihe gabigara ememe ahụ e ji na-echeta ụzọ Chineke si chebe ụmụ e buru ụzọ mụọ, mesịakwa chebe ndị Hibru nile site n’Ijipt.

10 Nwa atụrụ ahụ bụ ihe pụrụ iche n’akụkụ dị iche iche. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ndị mmadụ n’otu n’otu na-eweta anụmanụ ndị e ji chụọ ọtụtụ n’ime àjà ndị ahụ a na-achụ n’okpuru Iwu Moses n’ihe metụtara mmehie ma ọ bụ amamikpe onwe onye dị iche iche, a na-esurekwa akụkụ dị iche iche nke anụmanụ ahụ n’ọkụ n’elu ebe ịchụ àjà. (Levitikọs 4:22-35) A na-enye onye nchụàjà na-eduzi ihe omume ahụ ma ọ bụ ndị nchụàjà ndị ọzọ akụkụ ụfọdụ nke ihe àjà ahụ. (Levitikọs 7:11-38) Otú ọ dị, a naghị eji nwa atụrụ pasch, ma ọ bụ Ememe Ngabiga ahụ eme ihe n’elu ebe ịchụàjà, ọ bụkwa ìgwè mmadụ na-eweta onyinye ahụ, nke na-abụkarị otu ezinụlọ, bụkwa ndị ga-eri ya.—Ọpụpụ 12:4, 8-11.

11. Olee ụzọ Jehova si ele nwa atụrụ Ememe Ngabiga ahụ anya, ọ̀ bụkwa na gịnị ka o zoro aka? (Ọnụ Ọgụgụ 9:13)

11 Jehova weere nwa atụrụ Ememe Ngabiga ahụ n’ihe dị oké ọnụ ahịa nke ukwuu nke na ọ kpọrọ ya “àjà m.” (Ọpụpụ 23:18; 34:25) Ndị ọkà mmụta ekwuwo na “àjà pasch ahụ bụ àjà nke Jehova nke kachasị mma.” N’enweghị ajụjụ ọ bụla, nwa atụrụ nke a sere onyinyo, ma ọ bụ zoo aka n’ebe àjà nke Jisọs dị. Anyị maara nke a n’ihi na Pọl onyeozi kpọrọ Jisọs ‘àjà ngabiga anyị nke a chụworo.’ (1 Ndị Kọrint 5:7) A kọwara Jisọs dị ka “Nwa Atụrụ Chineke,” na “Nwa Aturu ahu nke e gbuworo egbu.”—Jọn 1:29; Mkpughe 5:12; Ọrụ 8:32.

Ọbara nke Na-azọpụta Ndụ

12. Ọrụ dị aṅaa ka ọbara nwa atụrụ ahụ rụrụ n’Ememe Ngabiga nke mbụ ahụ?

12 Laa azụ n’Ijipt, ọbara nwa atụrụ ahụ dị oké mkpa maka nzọpụta. Mgbe Jehova gburu ụmụ e buru ụzọ mụọ, Ọ gabigara ụlọ ebe ndị e tekwasịrị ọbara n’ibó ọnụ ụzọ ha. Ọzọkwa, n’ihi na ndị Hibru ahụ anọghị na-eru újú ọnwụ nke ụmụ ha ndị e buru ụzọ mụọ, ha nọ n’ọnọdụ nke ịzọrọ ije gabiga Osimiri Uhie ahụ gaa ná nnwere onwe ha.

13, 14. Olee ụzọ o si bụrụ na ọbara Jisọs na-azọputa ndụ, dịkwa mkpa maka nzọpụta? (Ndị Efesọs 1:13)

13 Okwu banyere nzọpụta metụtakwara ọbara n’oge anyị a—ọbara Jisọs nke a wụfuru. Mgbe “[ememe] ngabiga, bụ ememe ndị Juu, dị nso” n’afọ 32 O.A., Jisọs gwara otu nnukwute ìgwè mmadụ, sị: “Onye na-eri anụ ahụ m, nke na-aṅụkwa ọbara m, o nwere ndụ ebighị ebi; mụ onwe m ga-emekwa ka o si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị ikpeazụ. N’ihi na anụ ahụ m bụ ihe oriri n’ezie, ọbara m bụkwa ihe ọṅụṅụ n’ezie.” (Jọn 6:4, 54, 55) Ndị Juu nile na-ege ya ntị ga-eburu n’uche Ememe Ngabiga ahụ nke dị nso, na e jikwa ọbara nwa atụrụ mee ihe n’Ijipt.

14 Ihe Jisọs na-ekwu okwu banyere ha n’ebe ahụ abụghị ihe nnọchianya ndị ahụ a na-eji eme ihe ná Nri Anyasị Onyenwe Anyị. E guzobeghị ememe ahụ dịịrị ndị Kraịst ruokwa mgbe otu afọ gasịrị, ya mere, ọbụna ndị ozi ahụ ndị nụrụ ihe Jisọs kwuru na 32 O.A. amaghị ihe ọ bụla banyere ya. Ma, Jisọs na-egosi na ọbara ya dị mkpa maka nzọpụta ebighị ebi. Pọl kọwara, sị: “Anyị sitere n’ọbara ya nwee mgbapụta anyị n’ime ya, bú mgbaghara nke ndahie nile anyị, dị ka akụ nke amara ya si dị.” (Ndị Efesọs 1:7) Ọ bụ nanị site ná mgbaghara nke dabeere n’ọbara Jisọs ka anyị pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi.

Olee Nzọpụta nke Ọ Bụ, Ọ̀ Bụkwa n’Òle Ebe?

15. Nye ndị Hibru ahụ nọ n’Ijipt, nzọpụta na ihe ùgwù dịgasị aṅaa ka ha nwetara, ọ̀ bụkwa gịnị ka ha na-enwetaghị? (1 Ndị Kọrint 10:1-5)

15 Ọ bụ nanị nzọpụta a kpaara ókè ka e nwetara n’Ijipt oge ochie. Ọ dịghị onye ọ bụla nke hapụrụ Ijipt nke tụrụ anya ka e nye ya ndụ ebighị ebi mgbe Ọpụpụ ahụ gasịrị. Ọ bụ eziokwu na Chineke họpụtara ndị Livaị ịbụrụ mba ahụ ndị nchụàjà, ụfọdụ ndị sitere n’agbụrụ Juda ghọkwara ndị eze ruo oge ụfọdụ, ma ndị a nile gaje ịnwụ anwụ. (Ọrụ 2:29; Ndị Hibru 7:11, 23, 27) Ọ bụ ezie na ‘ọtụtụ ndị ahụ gwara ọgwa,’ bụ́ ndị hapụkwara Ijipt enweghị otu ihe ùgwù ndị ahụ, ha na ndị Hibru ndị ahụ pụrụ inwe olileanya iru Ala Nkwa ahụ, biekwa ndụ n’enweghị nsogbu ọ bụla, na-efe Chineke ofufe. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ndị ohu Jehova nọrọ tupu oge ndị Kraịst nwere ihe ndabere ha ga-eji nwee olileanya na, mgbe oge na-aga, ha ga-enwe ike inweta ndụ ebighị ebi n’elu ala, ebe Chineke zubere ka ihe a kpọrọ mmadụ biri. Nke a ga-ekwekọ ná nkwa Jisọs nke dị na Jọn 6:54.

16. Ụdị nzọpụta dị aṅaa ka ndị ohu Chineke n’oge ochie pụrụ inwe olileanya ya?

16 Chineke jiri ụfọdụ n’ime ndị ohu ya n’oge ochie mee ihe idetu okwu ndị na-akpali akpali banyere ụwa ịbụ nke e kere ka mmadụ wee biri n’ime ya, nakwa banyere ndị ezi omume ibi n’ime ya ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37: 9-11; Ilu 2:21, 22; Aịsaịa 45:18) Ma o’lee ụzọ ndị na-efe ezi ofufe ga-esi nweta nzọpụta dị otú ahụ ma ọ bụrụ na ha anwụọ? Ọ bụ site na Chineke ịkpọghachite ha ná ndụ n’elu ala. Dị ka ihe atụ, Job kwupụtara olileanya o nwere nke bụ na a ga-echeta ya wee kpọghachite ya ná ndụ. (Job 14:13-15; Daniel 12:13) N’ụzọ doro anya, otu ụdị nzọpụta ahụ bụ gaa ná ndu ebighi ebi n’elu ala.—Matiu 11:11.

17. Bible na-egosi na ndị ọzọ pụrụ inweta ụdị nzọpụta dị aṅaa dị iche?

17 Bible na-ekwukwa okwu banyere nzọpụta gaa ná ndụ eluigwe, bụ́ ebe Jisọs Kraịst jere mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ. “[Ọ] nọ n’aka nri nke Chineke, ebe ọ gara baa n’eluigwe; e dowokwa ndị mmụọ ozi na ndị na-achị isi na ndị dị ike n’okpuru ya.” (1 Pita 3:18, 22; Ndị Efesọs 1: 20-22; Ndị Hibru 9:24) Ma Jisọs agajeghị ịbụ nanị mmadụ nke a kpọjere n’eluigwe. Chineke ekpebiwo na ọ gajekwa isite n’elu ala kpọrọ ọnụ ọgụgụ dị nta nke mmadụ ndị ọzọ. Jisọs gwara ndị ozi ya, sị: “N’ụlọ Nna m ọtụtụ ebe obibi dị; ... ana m aga idoziri unu ebe. Ọ bụrụkwa na mụ agaa idoziri unu ebe, agaje m ịbịa ọzọ, m ga-anarakwa unu nye onwe m; ka unu onwe unu wee nọọkwa ebe mụ onwe m nọ.”—Jọn 14:2, 3.

18. Gịnị mere anyị ga-eji lekwasị anya ná nzọpụta gaa ná ndụ eluigwe ugbu a?

18 Nzọpụta gaa n’isoro Jisọs dịrị n’otu ná ndụ eluigwe dị nnọọ ukwuu karịa nzọpụta ahụ a kpaara ókè nke e nwetara n’Ememe Ngabiga nke mbụ ahụ. (2 Timoti 2:10) Ọ bụ n’uhuruchi nke oriri Seder, ma ọ bụ Ngabiga, ikpeazụ dị irè ka Jisọs guzobere ememe ọhụrụ ahụ dịịrị ndị na-eso ụzọ ya, bụ́ nke lekwasịrị anya ná nzọpụta gaa ná ndụ eluigwe. Ọ gwara ndị ozi ya, sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19) Tupu anyị atụlee ụzọ ndị Kraịst kwesịrị isi na-eme ememe nke a, ka anyị tụlegodi ihe banyere mgbe anyị kwesịrị ịdị na-eme ya.

‘Mgbe A Kara Aka’

19. N’ihi gịnị ka ezi uche ji dịrị n’ime ya ijikọta Ememe Ngabiga ahụ na Nri Anyasị Onyenwe Anyị?

19 Jisọs ekwuwo, sị: “Agụụ gụsiri m ike iso unu rie oriri ngabiga nke a mgbe mụ akahụghị ahụhụ.” (Luk 22:15) Mgbe nke ahụ gasịrị, o nyere ntụziaka maka Nri Anyasị Onyenwe Anyị, bụ́ nke ndị na-eso ụzọ ya ga na-edebe dị ka ihe ncheta nke ọnwụ ya. (Luk 22:19, 20) A na-eme Ememe Ngabiga ahụ otu ugbo n’afọ. N’ihi ya, ọ bụ ihe ezi uche dị n’ime ya na a ga na-edebe Nri Anyasị Onyenwe Anyị ahụ otu ugbo n’afọ. Ọ̀ bụ ole mgbe? N’ụzọ ezi uche dị na ya, ọ ga-abụ n’oge opupu ihe ubi, n’oge Ememe Ngabiga. Nke ahụ ga-apụta mgbe Naịsan 14 (kalenda ndị Juu) dabara, kama ịnọgide na-eme ya n’ụbọchị Friday n’ihi na nke ahụ bụ ụbọchị izu nke Jisọs nwụrụ n’ime ya.

20. Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji nwee mmasị na Naịsan 14?

20 Ya mere, Naịsan 14 ga-abụ ụbọchị Pọl bu n’uche mgbe o dere, sị: “N’ihi na mgbe ọ bụla unu na-eri achịcha nke a, na-aṅụkwa iko ahụ, unu na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị ruo mgbe ọ ga-abịa.” (1 Ndị Kọrint 11:26) Ruo narị afọ abụọ mgbe nke ahụ gasịrị, ọtụtụ ndị Kraịst nọgidere na-eme ya na Naịsan 14, nọgidekwa na-abụ ndị a maara dị ka ndị Quartodeciman, nke sitere n’okwu Latin dịịrị “nke iri na anọ.” M’Clintock na Strong na-akọ, sị: “Chọọchị nile nke Asia Minor mere ememe ncheta ọnwụ Onyenwe anyị n’ụbọchị nke kwekọrọ n’abalị iri na anọ nke ọnwa Naịsan, bụ́ ụbọchị, dị ka echiche nke Chọọchị oge ochie dum ahụ si dị, a kpọgburu ya.” N’oge a, Ndịàmà Jehova na-edebe Nri Anyasị Onyenwe Anyị kwa afọ n’ụbọchị nke kwekọrọ na Naịsan 14. Otú ọ dị, ụfọdụ ahụtawo na nke a pụrụ ịdị iche n’ụbọchị ndị Juu na-eme Ememe Ngabiga ha. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị?

21. Olee mgbe e kwesịrị ịchụ àjà nwa atụrụ Ememe Ngabiga ahụ, ma gịnị ka ndị Juu na-eme taa?

21 Ubọchị ndị Juu na-abụ site n’anwụ ọdịda (n’ihe dị ka elekere isii) ruo n’anwụ ọdịda ọzọ. Chineke nyere iwu ka e gbuo nwa atụrụ Ememe Ngabiga ahụ na Naịsan 14 “n’agbata uhuruchi abụọ ahụ.” (Ọpụpụ 12:6, NW) Olee mgbe nke ahụ ga-abụ? Ndị Juu nke oge a jigidesiri echiche ndị rabaị ahụ ike nke bụ na a ghaghị igbu nwa atụrụ ahụ na nso nso ọgwụgwụ nke Naịsan 14, n’agbata mgbe anyanwụ malitere ịda (n’ihe dị ka elekere anya atọ) na mgbe anyanwụ dara kpọmkwem. N’ihi nke a, ha na-enwe oriri Seder ha mgbe anyanwụ dasịrị, mgbe Naịsan 15 maliteworo.—Mak 1:32.

22. N’ihi gịnị ka ụbọchị Ememe Ncheta ahụ pụrụ iji dị iche n’ụbọchị ndị Juu na-eme Ememe Ngabiga ha? (Mak 14:17; Jọn 13:30)

22 Otú ọ dị, e nwere ezi ihe mere anyị ga-eji ghọta okwu ahụ n’ụzọ dị iche. Deuterọnọmi 16:6 gwara ndị Israel n’ụzọ doro anya ka ha “gbuo anụ àjà ngabiga ahụ, n’uhuruchi, mgbe anyanwụ na-ada.” (nsụgharị Tanakh nke ndị Juu) Nke a gosiri na “agbata uhuruchi abụọ ahụ” na-ezo aka n’oge mmalite chi ojiji, bido n’anwụ ọdịda, (nke na-amalite Naịsan 14) ruo mgbe ọchịchịrị gbachiri. Ndị Juu nke òtù Karaiteb nke oge ochie ghọtara ya n’ụzọ dị otú a. Otú ahụkwa ka ndị Sameriac si ghọta ya ruo taa. Anyị ịnakwere na a chụrụ nwa atụrụ Ememe Ngabiga ahụ n’àjà “na mgbe ya a kara aka” na Naịsan 14, ọ bụghị na Naịsan 15, bụ otu ihe mere ụbọchị Ememe Ncheta anyị na-eji adị iche mgbe ụfọdụ site n’ụbọchị nke ndị Juu.—Ọnụ Ọgụgụ 9:2-5.

23. N’ihi gịnị ka a na-eji atụkwasị ọnwa dị iche iche na kalenda ndị Hibru, oleekwa ụzọ ndị Juu nke oge a si na-eme nke a?

23 Otu ihe ọzọ mere ụbọchị nke anyị pụrụ iji dị iche site na nke ndị Juu bụ na ha na-eji kalenda e buwororịị ụzọ ka ụkpụrụ ya aka na-eme ihe, bụ́ ụkpụrụ nke a na-eguzobeghị ruokwa narị afọ nke anọ O.A. N’iji nke a eme ihe, ha pụrụ ikwu ụbọchị ga-abụ Naịsan 1 ma ọ bụ ụbọchị ememe ndị ọzọ ọtụtụ iri afọ ma ọ bụ ọtụtụ narị afọ tupu oge ya eruo. Karịsịa, ọ na-adị mkpa ka kalenda oge ochie ahụ a na-eji ọnwa na-agụ nwee ọnwa nke iri na atọ nke a na-atụkwasị mgbe ụfọdụ ka kalenda ahụ wee kwekọọ n’oge dị iche iche e nwere n’afọ. A na-atụkwasị ọnwa nke a n’oge dị iche iche a kara aka na kalenda ndị Juu na-eji eme ihe ugbu a; n’usoro afọ iri na itoolu, a na-atụkwasị ya n’afọ nke 3, 6, 8, 11, 14, 17, na 19.

24, 25. (a) N’oge Jisọs, olee ụzọ a na-esi amata mgbe ọnwa malitere na mgbe ọ gwụsịrị, oleekwa ụzọ a na-esi ekpebi mgbe ọ dị mkpa ịtụkwasị ọnwa? (b) Olee ụzọ Ndịàmà Jehova na-esi ekpebi ụbọchị a ga-enwe Nri Anyasi Onyenwe Anyị?

24 Otú ọ dị, Emil Schürer na-asị na “n’oge Jisọs [ndị Juu] enwebeghị kalenda ọ bụla a kara aka, kama, nanị n’ihe ndabere nke ihe ndị a hụtara site n’ahụmahụ a na-enwe, ha na-amalite ọnwa ọhụrụ ọ bụla mgbe ọ bụla ọnwa ọhụrụ pụtara n’ihu igwe, n’otu aka ahụkwa, na-adabere n’ihe ha hụrụ anya” ha na-atụkwasị ọnwa mgbe ọ bụla ọ dịrị mkpa. “Ọ bụrụ na . . . a chọpụta n’oge ọgwụgwụ afọ na Ememe Ngabiga ahụ ga-adaba n’oge ahụ ehihie na abalị na-aha nhata n’oge opupu ihe ubi [n’ihe dị ka March 21], a na-enye iwu maka ntụkwasị nke otu ọnwa tupu Naịsan.” (The History of the Jewish People in the Age of Jesus Christ, Mpịakọta 1) Otú a, ọnwa ahụ a tụkwasịrị atụkwasị na-abịa n’ụzọ kwere nghọta, ọ bụghị nke e tinyere n’ụzọ ezi uche na-adịghị ya.

25 Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-ekpebi ụbọchị a ga-enwe Nri Anyasị Onyenwe Anyị n’ụzọ kwekọrọ n’usoro oge ochie ahụ. A na-amata ụbọchị ga-abụ Naịsan 1 site n’ịchọpụta ụbọchị o yiri ka à ga-ahụta ọnwa ọhụrụ ahụ nke kasị dị nso oge ahụ ehihie na abalị na-aha otu n’oge opupu ihe ubi site na Jerusalem. Ọ bụrụ na a gụọ ụbọchị iri na anọ site na mgbe ahụ, a ga-erute na Naịsan 14, nke na-adabakarị n’ụbọchị ọnwa ozuzu. (Lee Ụlọ Nche nke December 15, 1977, peji 767.) N’ịdabere n’ụkpụrụ Bible nke a, a gwawo Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa na a ga-eme Ememe Ncheta nke afọ a mgbe anyanwụ dasịrị n’April 10.

26. Akụkụ ndị ọzọ dị aṅaa nke Nri Anyasi Onyenwe Anyị kwesịrị ka anyị leba anya?

26 Ụbọchị nke a kwekọrọ na Naịsan 14, bụ mgbe Jisọs mere Ememe Ngabiga nke ikpeazụ dị irè. Otú ọ dị, ime Ememe Ncheta ahụ na-adọrọ uche gaa ná nzọpụta nke gabigara ihe a na-eji Seder ndị Juu ahụ na-echeta. Ọ dị mkpa ka anyị nile ghọta ihe a na-eme n’oge Nri Anyasị Onyenwe Anyị, ihe ọ pụtara, na ụzọ o si metụta nzọpụta anyị.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Lee Ụlọ Nche nke Augụst 15, 1980, peji 8-24.

b M’Clintock na Strong kọwara ha dị ka “otu n’ime òtù ndị kasị mee ochie, ndị kasịkwa pụta ìhè nke ụlọ nzukọ ndị Juu, ndị ihe doro ha iche bụ ịgbasosi iwu e dere ede ike nke ukwuu.”

c “A na-egbu anụ ahụ n’uhuruchi. . . N’etiti abalị ezinụlọ ọ bụla na-eri anụ ahụ . . . e mesịa ha na-esure anụ fọdụrụ na ọkpụkpụ ya n’ọkụ tupu chi abọo . . . Ụfọdụ ndị ọkà mmụta atụwo aro na ọ pụrụ ịbụ na okpukpe ndị Sameria ahụ yiri okpukpe nke Bible n’ụzọ chiri anya karị, tupu okpukpe ndị Juu nke ndị rabaị agbanwe ya.”—The Origins of the Seder.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ijikọta Ememe Ngabiga ahụ na nzọpụta?

◻ Olee ụzọ àjà Jisọs ga-esi mezuo ihe dị ukwuu karị ihe nwa atụrụ Ememe Ngabiga ahụ mezuru?

◻ Nzọpụta dị aṅaa ka a na-enweta site na Jisọs?

◻ Olee ụzọ Ndịàmà Jehova na-esi ekpebi oge kwesịrị ekwesị maka Nri Anyasi Onyenwe Anyị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya