Olee Otú I Si Agba Ọsọ n’Ọsọ Ndụ Ahụ?
“Ùnu amataghị na ndị na-agba ọsọ n’ebe ọsọ, ha nile na-agba ọsọ, ma ọ bụ otu onye na-agbata ihe ọsọ? Na-agbanụ otú a, ka unu wee gbata.”—1 NDỊ KỌRINT 9:24.
1. Gịnị ka Bible ji tụnyere ndụ ndị Kraịst anyị?
BIBLE na-eji ọchịchọ a na-achọ ndụ ebighị ebi atụnyere ọsọ. N’oge ọgwụgwụ nke ndụ ya, Pọl onyeozi kwuru banyere onwe ya, sị: “Agbasịwo m mgba ọma ahụ, agbasịwo m ọsọ ahụ, edebesịwo m okwukwe ahụ.” Ọ gbara ndị Kraịst ibe ya ume ime otú ihe ahụ mgbe ọ sịrị: “Ka anyị wezụgakwa ibu nile ọ bụla na mmehie ahụ nke na-ekegide anyị n’ụzọ dị mfe, ka anyị jirikwa ntachi obi na-agba ọsọ ahụ e debere anyị n’ihu.”—2 Timoti 4:7; Ndị Hibru 12:1, New World Translation.
2. Mmalite dị aṅaa na-agba ume ka anyị na-ahụ n’ọsọ nke ndụ?
2 Ntụnyere ahụ bụ nke kwesịrị ekwesị n’ihi na ọsọ ọ bụla nwere mmalite, ụzọ a ga-esi gbaa ya, na ebe a ga-akwụsị, ma ọ bụ ihe mgbaru ọsọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’usoro ọganihu nke ime mmụọ anyị iji nweta ndụ. Dị ka anyị hụworo, kwa afọ, ọtụtụ narị puku ndị mmadụ na-amalite n’ụzọ dị mma n’ọsọ nke ndụ. Dị ka ihe atụ, n’afọ ise gara aga, 1,336,429 ndị mmadụ amalitewo n’ụzọ zuru ezu ịgba ọsọ ahụ site ná nraranye na baptism ime mmiri. Mmalite dị otú ahụ a malitere n’ụzọ dị ike na-agba ume nke ukwuu. Otú ọ dị, ihe dị mkpa bụ ịnọgide na-agba ọsọ ahụ ruo mgbe e ruru n’ebe a ga-akwụsị. Ị̀ na-eme nke a?
Ọsọ nke Ndụ
3, 4. (a) Olee ụzọ Pọl si rụtụ aka ná mkpa ọ dị ịnọgide na-agba ọsọ ahụ? (b) Olee ụzọ ụfọdụ siworo daa n’ịṅa ntị na ndụmọdụ Pọl?
3 Iji mesie ike mkpa ọ dị ịnọgide na-agba ọsọ ahụ, Pọl nyere ndụmọdụ, sị: “Ùnu amataghị na ndị na-agba ọsọ n’ebe ọsọ, ha nile na-agba ọsọ, ma ọ bụ otu onye na-agbata ihe ọsọ? Na-agbanụ otú a, ka unu wee gbata.”—1 Ndị Kọrint 9:24.
4 N’eziokwu, n’egwuregwu ndị a na-eme n’oge ochie, nanị otu onye na-enweta ihe ọsọ. Otú ọ dị, n’ọsọ nke ndụ, onye ọ bụla ruru eru maka ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ. Ọ bụ ihe dị mkpa ịnọgide n’ụzọ ahụ ruo ná ngwụsị! Ọ bụ ihe obi ụtọ na ọtụtụ ejiwo ikwesị ntụkwasị obi gbaa ọsọ ahụ ruo n’ọgwụgwụ nke ndụ ha, dị ka Pọl onyeozi mere. Ọtụtụ nde nọgidekwara na-agba. Otú ọ dị, ụfọdụ adawo n’ịga n’ihu ma ọ bụ n’inwe ọganihu ruo n’ebe a ga-akwụsị. Kama nke ahụ, ha kweere ka ihe ndị ọzọ gbochie ha nke na ha dapụrụ n’ọsọ ahụ ma ọ bụ ghọọ ndị na-erughị eru n’ụzọ ụfọdụ. (Ndị Galetia 5:7) Nke a kwesịrị ime ka anyị hụ ihe mere anyị ga-eji nyocha ụzọ anyị si na-agba ọsọ n’ọsọ nke ndụ.
5. Pọl ò ji ọsọ nke ndụ na-atụnyere egwuregwu ịsọ mpi? Kọwaa.
5 A pụrụ ịjụ ajụjụ, sị: Gịnị ka Pọl bu n’uche mgbe ọ sịrị na “otu onye na-agbata ihe ọsọ“? Dị ka a rịbara ama na mbụ, ihe o bu n’uche abụghị na n’ime ndị nile malitere ịgba ọsọ nke ndụ ahụ, nanị otu onye ga-enweta nkwụghachi ụgwọ nke ndụ ebighị ebi. O doro anya na nke ahụ apụghị ịbụ otú ọ ga-esi mee, n’ihi na ọtụtụ mgbe, o mere ka ọ pụta ìhè na ọ bụ uche Chineke na e kwesịrị ịzọpụta ụdị ndị nile. (Ndị Rom 5:18; 1 Timoti 2:3, 4; 4:10; Taịtọs 2:11) Ee e, ọ dịghị ekwu na ọsọ nke ndụ bụ ịsọ mpi nke onye ọ bụla na-ekere òkè n’ime ya na-agbalị imeri ndị ọzọ nile. Ndị Kọrint ahụ maara nke ọma na ụdị mmụọ nke ịsọ mpi ahụ dị n’etiti ndị na-ekere òkè n’Egwuregwu Isthmus ha, nke a sịrị na ọ dị ùgwù n’oge ahụ ọbụna karịa Egwuregwu Olympia. Mgbe ahụ, gịnị ka Pọl bu n’uche?
6. Gịnị ka ihe a na-ekwu maka ya na-ekpughe banyere ntụle nke Pọl na-atụle onye ọsọ ahụ na ọsọ ahụ?
6 N’ihota ihe atụ nke onye na-agba ọsọ, Pọl na-atụle n’ụzọ bụ isi banyere olileanya nke ya maka nzọpụta. N’amaokwu ndị bu ụzọ, ọ kọwara ụzọ o siworo rụsie ọrụ ike ma dọgbuo onwe ya n’ọrụ n’ọtụtụ ụzọ. (1 Ndị Kọrint 9:19-22) Mgbe ahụ, n’amaokwu nke 23, o kwuru, sị: “Ma ana m eme ihe nile n’ihi ozi ọma, ka m wee ghọọ onye na-enwekọ ya.” Ọ matara na nzọpụta ya adabereghị nanị n’ihi na a họpụtara ya ịbụ onyeozi ma ọ bụ n’ihi na o tinyewo ọtụtụ afọ n’ikwusara ndị ọzọ ozi ọma. Iji wee keta òkè ná ngọzi nile nke ozi ọma ahụ, ọ ghaghị ịnọgide na-eme ihe nile o nwere ike n’ihi ozi ọma ahụ. Ọ ghaghị ịgba ọsọ na-eburu n’uche imeri, na-adọgbu onwe ya n’ụzọ dị ike dịkwa ka à ga-asị na ọ na-agba ọsọ ụkwụ n‘Egwuregwu Isthmus, ebe “otu onye na-agbata ihe ọsọ.”—Ndị Kọrint 9:24a.
7. Gịnị dị mkpa iji ‘na-agba ọsọ n’ụzọ ị pụrụ isi gbata ihe’?
7 E nwere ọtụtụ ihe anyị pụrụ ịmụta na nke a. Ọ bụ ezie na onye ọ bụla sonyere n’ọsọ ahụ na-achọ imeri, ọ bụ nanị ndị ahụ kpebisiri ike kpam kpam imeri nwere olileanya ọ bụla nke ime otú ahụ. N’ihi nke ahụ, anyị ekwesịghị ịbụ ndị onwe anyị juru afọ n’ihi na anyị esonyewo n’ọsọ ahụ. Anyị ekwesịghị iche na ihe nile ga-adị mma n’ihi na anyị ‘nọ n’eziokwu ahụ.’ Anyị pụrụ ịza aha ahụ bụ onye Kraịst, ma ànyị nwere ihe na-egosi na anyị bụ ndị Kraịst? Dị ka ihe atụ, ànyị na-eme ihe anyị maara ndị Kraịst kwesịrị ime—ije nzukọ nile nke ndị Kraịst, ikere òkè n’ozi ubi, na ihe ndị ọzọ? Ya bụrụ otú ahụ, nke ahụ kwesịrị ịja mma, anyị kwesịkwara ịgbalịsi ike ịnọgide na-enwe àgwà dị otú ahụ mara mma. Otú ọ dị, ọ̀ ga-ekwe omume na anyị pụrụ irite uru karị site n’ihe anyị na-eme? Dị ka ihe atụ, ànyị na-akwadebe mgbe nile inwe ihe anyị ga-ekwu ná nzukọ dị iche iche? Ànyị na-agbalị itinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ ná ndụ onwe anyị? Ànyị na-eleba anya n’imeziwanye nkà anyị ka anyị wee nwee ike ịgba àmà ruru ala n’agbanyeghị ihe mgbochi ndị anyị na-ezute n’ubi? Ànyị dị njikere ịnakwere ihe ịma aka nke iletaghachi ndị nwere mmasị na iduzi ọmụmụ Bible ebe obibi? “Na-agbanụ otú a, ka unu wee gbata,” ka Pọl gbara ume.—1 Ndị Kọrint 9:24b.
Nwee Njide Onwe Onye n’Ihe Nile
8. Gịnị pụrụ ịkpaliworị Pọl ịgba ndị Kraịst ibe ya ume ‘inwe njide onwe onye n’ihe nile’?
8 N’oge ọ dị ndụ, Pọl ahụwo ọtụtụ ndị kwụsịtụworo, ndị kpafuworo, ma ọ bụ ndị hapụworo ọsọ ndụ ahụ. (1 Timoti 1:19, 20; Ndị Hibru 2:1) Nke ahụ mere o ji chetara ndị Kraịst ibe ya mgbe nile na ha nọ n’ịsọ mpi siri oké ike, nke na-agakwa n’ihu n’ihu. (Ndị Efesọs 6:12; 1 Timoti 6:12) Ọ gara n’ihu ikwu otu ihe banyere ihe atụ nke onye na-agba ọsọ wee sị: “Mmadụ ọ bụla nke na-agbasi mgba ike ịka ibe ya n’egwú unu na-ejidekwa onwe ya n’ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 9:25a) N’ikwu nke a, Pọl na-ezo aka n’ihe ndị Kọrint bụ́ ndị Kraịst maara nke ọma, ya bụ, ọzụzụ siri ike nke ndị na-asọ mpi n’Egwuregwu Isthmus na-enye onwe ha.
9, 10. (a) Olee otú otu akwụkwọ si kọwaa ndị na-asọ mpi n’Egwuregwu Isthmus? (b) Gịnị karịsịa kwesịrị ịrịba ama banyere nkọwa ahụ?
9 Nke a bụ nkọwa doro anya nke onye na-asọ mpi a na-enye ọzụzụ: “N’inwe afọ ojuju nakwa n’atamughị ntamu ọ na-edebe ụkpụrụ iwu na ihe mgbochi nile nke ọzụzụ ya na-ewe ọnwa iri, nke na ọ bụrụ na o meghị otú ahụ, o nwere ike ọ gaghị eso sọọ mpi. . . . Ọ na-enwe obi ụtọ maka obere ihe isi ike, na ike ọgwụgwụ ndị ọ na-enweta, na ihe ndị ọ na-anapụ onwe ya, ọ na-agụkwa ya dị ka ihe ùgwù iji nlezianya na-ezere ihe ọ bụla nke pụrụ, n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị dị nta, imebi ohere o nwere ime nke ọma. Ọ na-ahụ ndị ikom ndị ọzọ ka ha na-eri ihe gụrụ ha, ka ha na-ezu ike mgbe ọ na-eku ume ọkụ, ka ha na-asa ahụ mgbe o ji masị ha, ka ha na-ekpori ndụ n’ụzọ dị ha mma; ma ọ na-esi ike ekworo ịbata n’uche ya, n’ihi na obi ya dị n’ụgwọ ahụ, ọzụzụ siri ike dịkwa mkpa. Ọ maara na ya agaghị eme nke ọma ma ọ bụrụ na o belata ịdị ike nke ọzụzụ ya n’ókè ọ bụla ma ọ bụ n’oge ọ bụla.”—The Expositor’s Bible, Mpịakọta nke ise, peji nke 674.
10 Ihe na-akpali mmasị karịsịa bụ nchọpụta ahụ bụ na onye na-enwe ọzụzụ ‘na-agụ ya dị ka ihe ùgwù’ ịgbaso usoro dị otú ahụ dị ike nke ịnapụ onwe onye ihe. N’ezie, “ọ na-esi ike ekworo ịbata n’uche” ya n’ihi izu ike na ntụsara ahụ nke ọ na-ahụ ndị ọzọ ka ha na-enwe. Ànyị pụrụ ịmụta ihe site na nke a? Ee, n’ezie.
11. Echiche dị aṅaa nke na-ezighị ezi ka anyị na-aghaghị ịnọ na nche megide mgbe anyị na-agba ọsọ nke ndụ?
11 Cheta okwu Jisọs nke na “obosara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mbara ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba n’ịla n’iyi, ọtụtụ ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-esi na ya na-aba. N’ihi na warara ka ọnụ ụzọ ahụ dị, mkpagide ka ụzọ ahụ dịkwa, nke na-eduba ná ndụ, ole na ole ka ha dịkwa, bụ́ ndị na-achọta ya.” (Matiu 7:13, 14) Ka ị na-agbalị ịga ‘n’ụzọ ahụ dị mkpagide,’ ị̀ na-enwe ekworo maka nnwere onwe na ntụsara ahụ nke ndị ahụ nọ n’ụzọ nke ọzọ yiri ka hà na-enweta? Ị̀ na-eche na ọ dị ihe na-efunahụ gị n’ihe ụfọdụ nke ndị ọzọ na-eme, bụ́ nke pụrụ iyi ihe ndị na-adịghị oké njọ n’onwe ha? Ọ dị mfe anyị iche otú a ma ọ bụrụ na anyị echefuo ihe mere anyị ji nakwere ụzọ nke a. “Ya mere, ndị ahụ na-eme ya ịnata okpu mmeri nke pụrụ ire ure; ma anyị onwe anyị na-eme ya ịnata okpu mmeri nke na-apụghị ire ure,” ka Pọl kwuru.—1 Ndị Kọrint 9:25b.
12. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ebube na oké aha nke ndị mmadụ chọworo dị ka okpu mmeri ahụ na-ere ure nke e nyere n’Egwuregwu Isthmus?
12 Onye meriri n’Egwuregwu Isthmus ahụ na-enweta úkwù ahịhịa ndụ pine ndị Isthmus ma ọ bụ ihe ọkụkụ ọzọ dị otú ahụ, nke na-akpọnwụ ma eleghị anya n’ime ụbọchị ma ọ bụ izu ole na ole. Otú ọ dị, ọ bụghị úkwù ahịhịa na-emebi emebi ka ndị ọsọ ahụ na-azọ kama ọ bụ ebube, ùgwù, na oké aha nke na-eso ya. Otu akwụkwọ kọrọ na mgbe onye mmeri ahụ latara ụlọ, a na-anabata ya dị ka dike na-enwe mmeri. Ọtụtụ mgbe, a na-akwatu mgbidi obodo ka ndị na-edugharị ya wee gafee, a na-ewukwa ihe ọkpụkpụ iji kwanyere ya ùgwù. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe ndị a nile, ebube ya ka bụkwa ihe na-ere ure. Taa, mmadụ ole na ole maara ndị ndị dike ahụ nwere mmeri bụ, ihe kakwa n’ọtụtụ achọghị ịma n’ezie. Ndị na-eji oge, ike, ahụ ike, na ọbụna obi ụtọ ezinụlọ ha na-achụ àjà iji nweta ike, oké aha, na akụ na ụba n’ụwa, ma bụrụ ndị na-abaghị ọgaranya n’ebe Chineke nọ, ga-achọpụta na “okpu mmeri” ihe onwunwe ha, dịkwa ka ndụ ha, bụ ihe na-agabiga nnọọ agabiga.—Matiu 6:19, 20; Luk 12:16-21.
13. Olee otú ụzọ ibi ndụ nke onye na-agba ọsọ nke ndụ ji dị iche n’ebe nke onye na-eme egwuregwu dị?
13 Ndị na-asọ mpi n’egwuregwu ịgba ọsọ pụrụ ịdị njikere ịnakwere ihe ọzụzụ ahụ dị ike chọrọ ha n’aka, dị ka ndị ahụ a kọwara n’elu, ma nanị ruo nwa oge. Ozugbo e mesịrị egwuregwu ahụ, ha na-alaghachi n’ihe ndị a na-eme ná ndụ. Ha pụkwara inwe ọzụzụ site n’oge ruo n’oge iji jigide nkà ha, ma ha adịghị agbaso otu ụzọ ahụ siri ike nke ịnapụ onwe onye ihe, ma ọ dịghị ihe ọzọ ha agaghị eme otú ahụ ruo mgbe ịsọ mpi ọzọ ruru. Ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị n’ebe ndị na-agba ọsọ ndụ ahụ nọ. Nye ha, inwe ọzụzụ na ịnapụ onwe onye ihe aghaghị ịbụ ụzọ nke ndụ.—1Timoti 6:6-8.
14, 15. N’ihi gịnị ka onye na-agba ọsọ nke ndụ na-aghaghị iji nwee njide onwe onye mgbe nile?
14 “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ,” ka Jisọs Kraịst gwara nzukọta nke ndị na-eso ụzọ ya na ndị ọzọ, “ya jụ onwe ya (ma ọ bụ, “ọ ghaghị ịsị, ‘Ee e’ gwa onwe ya,” nsụgharị Charles B. Williams) ma bulie osisi ịta ahụhụ ya, nọgidekwa na-eso m.” (Mak 8:34, NW) Mgbe anyị nakweere ọkpụkpọ òkù nke a, anyị aghaghị ịdị njikere ‘ịnọgide’ na-eme otú ahụ, ọ bụghị n’ihi na e nwere uru ụfọdụ pụrụ iche n’ịnapụ onwe onye ihe, kama n’ihi na echezighị echiche n’otu mgbe, emeghị mkpebi dị mma, pụrụ imebi ihe nile e wuliteworo, ọbụna na-etinye ọdịmma ebighị ebi anyị n’ihe ize ndụ. A na-enwekarị ọganihu ime mmụọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị nwayọọ, ma lee otú a pụrụ isi dị ngwa n’ime ka ọ ghara ịdị irè ma ọ bụrụ na anyị anọghị na nche mgbe nile!
15 Ọzọkwa, Pọl gbara ume na anyị aghaghị inwe njide onwe onye “n’ihe nile,” ya bụ, anyị aghaghị ime otú ahụ mgbe nile n’akụkụ nile nke ndụ. Ezi uche dị na nke a n’ihi na ọ bụrụ na onye a na-enye ọzụzụ na-emebiga ihe ókè ma ọ bụ na-ebi ndụ aghara, uru gịnị ka ihe mgbu anụ ahụ na ike ọgwụgwụ nile o nwetara bara? Otu ahụ ka ọ dịkwa n’ọsọ anyị na-agba maka ndụ, anyị aghaghị inwe njide onwe onye n’ihe nile. Mmadụ pụrụ ijide onwe ya n’ihe ndị dị ka ịṅụbiga mmanya ókè na ịkwa iko, ma uru nke a bara na-emebi ma ọ bụrụ na ọ dị mpako ma na-ese okwu. Ma ọ bụ, gịnị ma ọ bụrụ na ọ na-enwe ogologo ntachi obi na obi ọma n’ebe ndị ọzọ nọ, ma nwee mmehie nzuzo ná ndụ onwe ya? Ka njide onwe onye wee bụrụ nke bara uru zuru ezu, a ghaghị inwe ya “n’ihe nile.”—Tụlee Jemes 2:10, 11.
Agbala Ọsọ “n’Eleghị Anya”
16. Gịnị ka ọ pụtara bụ ịghara ịgba ọsọ “n’eleghị anya’?
16 N’ịhụ oké mgbalị dị mkpa iji mee nke ọma n’ọsọ nke ndụ, Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “Ya mere mụ onwe m na-agba ọsọ otú a, dị ka onye na-adịghị agba n’eleghị anya ihe; otú a ka m na-esu ọkpọ, dị ka onye na-adịghị apịa ifufe.” (1 Ndị Kọrint 9:26) Okwu ahụ bụ́ ‘eleghị anya’ pụtara n’ụzọ nkịtị “edoghị anya” (Kingdom Interlinear), “ahụtaghị, akaghị akara” (Lange’s Commentary). Ya mere, ịghara ịgba ọsọ “n’eleghị anya” pụtara na nye onye ọ bụla na-ekiri ihe na-emenụ, ebe onye ọsọ ahụ na-agbaga kwesịrị ido anya. Nsụgharị The Anchor Bible sụgharịrị ya ịbụ “n’ụzọ na-agbagọghị agbagọ.” Ọ bụrụ na ị hụrụ otu usoro nzọụkwụ gbagọrọ agbagọ n’ụsọ osimiri, nke na-agba gburugburu n’ebe ụfọdụ, ọbụnakwa na-aga azụ mgbe ụfọdụ, ọ ga-esiri gị ike iche na onye ahụ na-agba ọsọ ma ọlị, ma ya fọdụzie na ọ maara ebe ọ na-aga. Ma ọ bụrụ na ị hụrụ otu usoro nzọụkwụ nke dị n’ahịrị toro ogologo, nke kwụ ọtọ, nzọụkwụ nke ọ bụla dịrị n’ihu nke dị n’azụ, bụrụkwa nke nyere onwe ha ohere hà nhata, ị ga-ekwubi na nzọụkwụ ndị ahụ bụ nke onye maara kpọmkwem ebe ọ na-aga.
17. (a) Olee ụzọ Pọl si gosi na ya adịghị agba ọsọ “n’eleghị anya“? (b) Olee ụzọ anyị pụrụ isi ṅomie Pọl na nke a?
17 Ndụ Pọl gosiri n’ụzọ doro anya na ọ gbaghị ọsọ “n’eleghị anya.” O nwere ihe àmà buru ibu nke na-egosi na ọ bụ onye Kraịst na-eje ozi na onyeozi. Ihe o nwere bụ nanị otu nzube, ọ dọgbukwara onwe ya n’ọrụ nke ukwuu ná ndụ ya nile iji nweta ya. Oké aha, ike, akụ na ụba, ma ọ bụ ntụsara ahụ adọpụghị uche ya, ọ bụ ezie na ma eleghị anya ọ pụrụ inwetaworị nke ọ bụla n’ime ndị a. (Ọrụ 20:24; 1 Ndị Kọrint 9:2; 2 Ndị Kọrint 3:2, 3; Ndị Filipaị 3:8, 13, 14) Ka ị na-eleghachi anya n’ụzọ ndụ gị, ụdị ụzọ dị aṅaa ka ị na-ahụ? Ọ̀ bụ ụzọ kwụ ọtọ nke na-eduga n’ebe doro anya ka ọ̀ bụ nke na-enweghị ebe ọ na-eduga? Ọ̀ dị ihe àmà na-egosi na ị na-agba ọsọ nke ndụ? Cheta, anyị na-agba ọsọ nke a, ọ bụghị nanị iji mezuo iwu, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, kama iji ruo n’ebe nkwụsị.
18. (a) Gịnị ka a pụrụ iji tụnyere ‘ịpịa ifufe’ n’akụkụ nke anyị? (b) N’ihi gịnị ka nke ahụ ji bụrụ ụzọ dị ize ndụ ịgbaso?
18 N’igosi otú nke a si yie ihe omume egwuregwu ọzọ, Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “Otú a ka m na-esu ọkpọ, dị ka onye na-adịghị apịa ifufe.” (1 Ndị Kọrint 9:26b) N’ịsọ mpi nke anyị na-asọ maka ndụ, anyị nwere ọtụtụ ndị iro, gụnyere Setan, ụwa, na ezughị okè nke onwe anyị. Dị ka otu onye na-akụ ọkpọ n’oge ochie, anyị aghaghị inwe ike ịkụtu ha n’ala site n’ọkpọ ndị e ji nlezianya kụọ. Ọ bụ ihe obi ụtọ ịmara na Jehova Chineke na-enye anyị ọzụzụ ma na-enyere anyị aka n’ọgụ ahụ. Ọ na-enye ntụziaka n’Okwu ya, n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible, nakwa ná nzukọ nile nke ndị Kraịst. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị agụọ Bible na akwụkwọ ndị ahụ, na-agakwa nzukọ nile ma ghara itinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ, ọ̀ bụ na anyị adịghị ala mgbalị anyị n’iyi, ‘na-apịa ifufe’? Ime otú ahụ na-etinye anyị n’ọnọdụ dị ize ndụ. Anyị na-eche na anyị na-alụsi ọgụ ike, sikwa otú ahụ na-enwe mmetụta ụgha nke ịnọ ná ntụkwasị obi, ma anyị adịghị emeri ndị iro anyị. Nke ahụ mere onye na-eso ụzọ bụ́ Jemes ji nye ndụmọdụ, sị: “Ghọọnụ ndị na-eme okwu ahụ, unu abụkwala ndị na-anụ nanị, ndị na-arafu onwe unu.” Dịkwa ka ‘ịpịa ifufe’ na-agaghị eme ka ike gwụ ndị iro anyị, otú ahụkwa ka ịbụ “ndị na-anụ nanị” na-agaghị eme ka anyị bụrụ ndị na-eme uche Chineke.—Jemes 1:22; 1 Samuel 15:22; Matiu 7:24, 25.
19. Olee ụzọ anyị pụrụ isi jide n’aka na anyị agaghị aghọ ndị a jụrụ ajụ?
19 N’ikpeazụ, Pọl gwara anyị ihe mere o ji nwee ihe ịga nke ọma: “Ana m etipụta ahụ m ọnyá, meekwa ya ka ọ bụrụ ohu m: ka mụ onwe m ghara ịghọ onye a jụrụ ajụ n’ụzọ ọ bụla, mgbe m kwusasịrị okwu Chineke nye ndị ọzọ.” (1 Ndị Kọrint 9:27) Dị ka Pọl, anyị onwe anyị aghaghịkwa ịchịkwa anụ ahụ anyị na-ezughị okè kama ikwe ka ọ na-achị anyị. Ọ dị mkpa ka anyị kpochapụ mkpali, agụụ, na ọchịchọ nile nke anụ ahụ. (Ndị Rom 8:5-8; Jemes 1:14, 15) Ime otú ahụ pụrụ ịfụ ụfụ, ebe ọ bụ na okwu ahụ a sụgharịrị ịbụ ‘ntipụta ọnyá” pụtara n’ụzọ nkịtị ‘iti ọkpọ n’okpuru anya’ (Kingdom Interlinear). Otú ọ dị, ọ́ kaghị mma inwe anya ojii, dị ka pụrụ isi kwuo ya, ma dị ndụ, kama imezu ọchịchọ nile nke anụ ahụ dara ada ma nwụọ?—Tụlee Matiu 5:28, 29; 18:9; 1 Jọn 2:15-17.
20. N’ihi gịnị ka o ji dị ngwa ugbu a karịsịa inyocha ụzọ anyị si na-agba ọsọ n’ọsọ nke ndụ?
20 Taa, anyị na-eru n’ebe a ga-akwụsị n’ọsọ ahụ. Oge a ga-enye ihe ndị ahụ a na-agbata n’ọsọ dị nso. Nye ndị Kraịst e tere mmanụ, ọ bụ “ihe a na-agbata n’ọsọ nke ọkpụkpọ dị elu nke Chineke n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 3:14) Nye ndị ahụ so n’oké ìgwè mmadụ, ọ bụ ndụ ebighị ebi n’elu ala bụ paradaịs. Ebe ọ bụ na ihe a na-azọ dị ukwuu, ka anyị kpebisie ike, dị ka Pọl, na anyị agaghị ‘aghọ ndị a jụrụ ajụ.’ Ka onye ọ bụla n’ime anyị jiri obi ya nakwere ndụmọdụ ahụ bụ́ :“Na-agbanụ otú a, ka unu wee gbata.”—1 Ndị Kọrint 9:24, 27.
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị iji ndụ nke onye Kraịst tụnyere ọsọ?
◻ Olee ụzọ ọsọ nke ndụ si dị iche n’ọsọ ụkwụ?
◻ N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji nwee njide onwe onye mgbe nile nakwa “n’ihe nile”?
◻ Olee ụzọ mmadụ na-esi ghara ịgba ọsọ “n’eleghị anya”?
◻ N’ihi gịnị ka o ji dị ize ndụ ịdị ‘na-apịa nanị ifufe’?
[Foto dị na peeji nke 16]
Úkwù ahịhịa ndụ nke onye mmeri, tinyere ebube na otuto ya, bụ ihe na-agabiga agabiga