Ịdị n’Otu Ndị Kraịst Ọ̀ Na-enye Ohere Maka Ndịrịta Iche?
ỊDỊ n’otu n’ọgbakọ ndị Kraịst dị mkpa. Adịghị n’otu ná nkweta ozizi ga-akpalite oké arụmụka, esemokwu, na ọbụna ibu iro. (Ọrụ 23:6-10) Bible na-ekwu na “Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama Ọ bụ Chineke nke udo.” (1 Ndị Kọrint 14:33) N’ihi ya, a dụrụ ndị Kraịst ọdụ ka ha na-ekwu otu ihe na ka e mee ka ha dị n’otu n’otu uche ahụ na n’otu izu ahụ.—1 Ndị Kọrint 1:10.
Okwu ndị a na akụkụ Bible ndị yiri ha hà na-agba ume nkwekọ na-adịghị agbanwe agbanwe n’etiti ndị Kraịst n’ụzọ ọ bụla? (Jọn 17:20-23; Ndị Galetia 3:28) Ezi Iso Ụzọ Kraịst dị ka a kọwara ya na Bible ọ̀ na-akatọ ndịrịta iche mgbe a bịara n’àgwà mmadụ n’otu n’otu? À na-atụ anya ka ndị Kraịst nile kwekọọ n’otu ụdị nke ọdịdị na-adịghị agbanwe agbanwe?
Chineke Na-akpali Obi Anyị n’Otu n’Otu
Ụfọdụ ndị kwenyesiri ike na Bible bụ nanị ngwá ọrụ ọzọ maka ịchịkwa ọha mmadụ otú o si masị onye. N’ezie, ịrọ òtù ụfọdụ ejiriwo ya mee ihe otú ahụ ọtụtụ mgbe n’ụzọ na-ezighị ezi. Otú ọ dị, Jisọs nyere nkọwa dị nnọọ iche banyere Akwụkwọ Nsọ na Chineke Onye Chepụtara ya. Ọ kọwara Chineke dị ka onye nwere mmasị dị ukwuu n’ihe ọ bụla o kere eke.
Na Jọn 6:44, Jisọs kọwara, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịbịakwute m, ọ bụrụ na Nna Nke zitere m adọghị ya.” Ngwaa e jiri mee ihe n’ebe a adịghị atụ aro na Chineke na-adọkpụrụ ndị mmadụ, megide ọchịchọ ha. Kama, Chineke na-eji nwayọọ na-adọrọ, na-akpali obi. Dị ka otu onye ọkà mmụta Bible si tinye ya, e nwere ‘mmetụta sitere n’aka Chineke ịkpali uche ikwenye.’ Onye Okike adịghị ele ezinụlọ mmadụ anya dị ka nanị ìgwè mmadụ. Ọ na-enyocha ụmụ mmadụ n’otu n’otu ma jiri nwayọọ na-adọtara onwe ya ndị obi ha ziri ezi.—Abụ Ọma 11:5; Ilu 21:2; Ọrụ 13:48.
Rịba ama otú Pọl onyeozi si na-eme mgbanwe. Ọ ghọtara mkpa pụrụ iche nke ndị mmadụ n’otu n’otu, na-ekwetakwa na echiche ụfọdụ bụ ihe a na-ahụkarị kpọmkwem n’ụfọdụ mba ma ọ bụ nzụlite. Mgbe ahụ ọ gbanwere ụzọ njekwu ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. O dere, sị: “N’ebe ndị Juu nọ m wee dị ka onye Juu, ka m wee rite ndị Juu n’uru. . . . N’ebe ndị na-adịghị ike nọ m ghọrọ onye na-adịghị ike, ka m wee rite ndị na-adịghị ike n’uru: aghọwo m ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ, ka m wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ.”—1 Ndị Kọrint 9:20-22.
N’ụzọ doro anya, Pọl akpụzighị ndị mmadụ ime omume n’otu ụzọ kpọmkwem ma ọ bụ mesoo ha nile omume n’otu ụzọ. O nyere ha agbamume a: “Ka okwu unu dị n’amara mgbe nile, ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mata otú unu na-aghaghị ịza mmadụ nile ọ bụla.” (Ndị Kọlọsi 4:6) Ee, Pọl na ndị Kraịst ndị ọzọ aghaghị ịnakwere ma kwanyere ịdị iche nke onye nke ọ bụla ùgwù iji nyere ya aka.
Nzube Mbụ nke Chineke
Nkwanye ùgwù a maka mmadụ dị ka onye nwere àgwà dị iche na-adịgide mgbe mmadụ ghọsịrị akụkụ nke ọgbakọ ndị Kraịst. Ndị Chineke adịghị ahapụ ihe ndị e ji mara ha n’ime myirịta zuru ezu na nkwekọ n’ihe nile na-amasị ndị nọ n’isi. Kama, ha nwere ụdị mmadụ dị nnọọ iche iche ma nwee ikike, àgwà, na echiche dịgasị iche iche. A dịghị ele àgwà nke onye nke ọ bụla anya dị ka ihe na-enye nsogbu ma ọ bụ ihe mkpasu iwe. Ọ bụ akụkụ nke nzube mbụ Chineke.
N’ihi ya, n’ime ụwa ọhụrụ e kwere ná nkwa na Bible maka ndị ezi omume, izu okè n’etiti ụmụ mmadụ ga-enye ohere maka ịdị iche dị ukwuu. (2 Pita 3:13) N’okpuru isiokwu bụ́ “Perfection” (Izu Okè), akwụkwọ nkà ihe ọmụma Bible bụ́ Insight on the Scripturesa na-ekwu ihe ndị na-esonụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Otú ọ dị, izu okè apụtaghị ngwụsị nke ndịrịta iche, dị ka ndị mmadụ na-echekarị. Ụmụ anụmanụ, bụ́ ndị si ‘n’ọrụ zuru okè’ nke Jehova pụta (Je[nesis] 1:20-24; De[uterọnọmi] 32:4), nwere ndịrịta iche buru ibu.”
Insight na-agbakwụnye, sị: “N’otu aka ahụ izu okè nke mbara Ụwa abụghị ihe na-ekwekọghị ná ndịrịta iche, mgbanwe, ma ọ bụ ịdị iche; ọ na-enye ohere maka ihe ndị dị mfe na ihe ndị dị mgbagwoju anya, ihe a na-achọghị mma na ihe a chọrọ mma, ihe gbara ụka na ihe na-atọ ụtọ, ihe na-adịghị mụrụ mụrụ na ihe dị mụrụ mụrụ, ala ahịhịa na oké ọhịa, ugwu na ndagwurugwu. Ọ na-agụnye ịdị ọhụrụ na-akpali akpali nke mmalite oge opupu ihe ubi, ikpo ọkụ nke oge okpomọkụ tinyere igwe ya na-acha anụnụ anụnụ, ịma mma nke ụcha oge mgbụsị akwụkwọ, ịma mma na-enweghị ntụpọ nke snow ka dara ọhụrụ. (Je[nesis] 8:22) Ụmụ mmadụ zuru okè ga-esi otú a ghara ịbụ ndị a kpụziri inwe otu ọdịdị mmadụ, nkà, na ikike.”
Nchegbu Maka Ndị Ọzọ
Otú ọ dị, ezi Iso Ụzọ Kraịst na-akatọ iji ichebara onwe onye nanị echiche na-eleghara ndị nọ anyị gburugburu anya. Pọl onyeozi chere akụkụ nile nke ndụ na àgwà ya nche nke ọma iji zere ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ. O kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara ọgbakọ dị na Kọrint, sị: “Anyị adịghị eme ihe ịsụ ngọngọ ọ bụla n’ihe ọ bụla, ka a ghara ịta ije ozi anyị ụta.” (2 Ndị Kọrint 6:3) Mgbe ụfọdụ, anyị aghaghị ịchịkwa ọchịchọ onwe anyị ma bute mkpa ndị ọzọ ụzọ karịa nhọrọ anyị. Dị ka ihe atụ, Pọl degaara ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ, sị: “Ọ dị mma ka ị ghara iri anụ, ma ọ bụ ịṅụ mmanya vine, ma ọ bụ ime ihe ọ bụla nke nwanna gị ga-asụ ngọngọ n’ime ya.”—Ndị Rom 14:21.
N’otu aka ahụ taa, mmadụ nwere ike họrọ ịghara ịṅụ mmanya na-aba n’anya n’ihu onye nwere ihe isi ike ịchịkwa otú o si aṅụ mmanya. (1 Ndị Kọrint 10:23, 24) A na-eme nke a, ọ bụghị ná nrụgide ikwenyekọ, kama dị ka omume obiọma na ịhụnanya magburu onwe ya. “Kraịst anyị emeghịkwa ihe tọrọ Onwe ya ụtọ.” Jisọs bụ mmadụ mgbe ahụ, ma ọ dịghị azọrọ nhọrọ onwe ya n’ajụghị ase banyere mmetụta ndị ọzọ.—Ndị Rom 15:3.
Ma, otu n’ime akụkụ kasị enye ume ọhụrụ nke ezi Iso Ụzọ Kraịst bụ nkwanye ùgwù o nwere maka nnwere onwe na nhọrọ onwe onye n’agabigaghị ụkpụrụ nduzi Bible. Ọ na-ezi na Chineke mere anyị ịdịgasị iche na ịpụgasị iche. Ná 1 Ndị Kọrint 2:11, anyị na-agụ, sị: “Ònye n’etiti mmadụ matara ihe nile nke mmadụ, ma ọ bụghị mmụọ nke mmadụ ahụ, nke dị n’ime ya?” Anyị na-agbalị ịghọta ndị ọzọ ruo n’ókè o kwere mee. Ma amaokwu a na-egosi na onye ọ bụla n’ime anyị nwere ihe ndị pụrụ iche nke nanị anyị na Onye Okike anyị na-aghọta. Anyị nwere “mmadụ zoro ezo nke mkpụrụ obi” nke anyị na-ekpughe dị ka anyị si chọọ.—1 Pita 3:4.
Ịdị n’Otu na Ndịrịta Iche —Nguzozi Chọrọ Nlezianya
Pọl onyeozi setịpụrụ ihe nlereanya ọma nke nguzozi ndị Kraịst. Ọ bụ ezie na o nwere ikike dị ka onyeozi nke Kraịst, ọ kpachaara anya ka ọ ghara ịmanye ndị ọzọ ịnakwere echiche ya.
Dị ka ihe atụ, Pọl nwere echiche siri nnọọ ike banyere abamuru nke alụghị di ma ọ bụ nwunye n’ime ụwa nke a na-ezughị okè. Ya onwe ya enweghị nwunye mgbe o dere, sị: “Ndị [lụrụ] ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ ha,” na, “ngọzi dịkarịịrị [nwanyị di ya nwụrụ] ma a sị na ọ nọgidere otú ọ dị, dị ka izu m si dị.” Eziokwu ahụ bụ na okwu ya ghọrọ akụkụ nke Okwu Chineke e dere site n’ike mmụọ nsọ na-egosi na ọ dịghị ihe dị njọ n’echiche ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ kọwakwara, sị: “A sịkwa na ọ bụ ezie na ị lụrụ nwunye, i mehieghị.”—1 Ndị Kọrint 7:28, 40.
Dị ka ihe àmà na-egosi, ihe ka ọtụtụ n’ime ndị ozi bụ ndị ikom lụrụ nwunye, dị ka Pọl kwetara n’okwu bụ́: “Ọ̀ ga-abụ na anyị enweghị ike ikuru nwunye, bụ́ nwanna nwanyị n’ime Kraịst, jegharịa, dị ka ndị ozi fọdụrụ na-emekwa, ha na ụmụnne Onyenwe anyị, na Sifas?” (1 Ndị Kọrint 9:5) Ndị Kraịst maara na n’okwu a ha pụrụ ime nhọrọ ndị dị iche na nke Pọl, ọ ka ga-akwanyekwara ha ùgwù.
E kwewo mgbe nile ka ndị na-efe Chineke gosipụta okwukwe ha n’ikwekọ n’ụdị mmadụ ha pụrụ iche. N’eziokwu, ọbụna Chineke kwere ka ndị dere Bible jiri ụdị ide ihe nke ha mee ihe mgbe ha na-ede ihe. Dị ka ihe atụ, Nehemaịa dị umeala n’obi ọ bụ ezie na o dere akụkọ ya na-eji nnọchiaha na-ezo aka n’onwe onye. (Nehemaịa 5:6, 19) N’aka nke ọzọ, n’ihi obi umeala, Jọn onyeozi ejitụghị aha nke ya mee ihe n’ime ihe ndekọ Oziọma ya, o zokebeghịkwa aka n’ebe onwe ya nọ. Chineke kwadoro ụdị ide ihe abụọ ahụ ma mee ka e chekwaa ha n’ime Bible.
A na-achọta ihe atụ nke nguzozi na inwe ezi uche ndị yiri nke ahụ n’ime Akwụkwọ Nsọ dum. N’ụzọ doro anya, ịdị n’otu ndị Kraịst na-enye ohere maka ndịrịta iche. N’ezie, ịdị iche nke nzụlite na echiche pụrụ iduga n’adịghị n’otu mgbe a na-enweghị àgwà ime mmụọ. (Ndị Rom 16:17, 18) Ma mgbe anyị ‘yikwasịrị onwe anyị ịhụnanya, nke bụ ihe nkekọ nke izu okè,’ anyị na-amụta ịnakwere na inwe mmasị n’ụdị mmadụ ndị pụrụ iche nke ndị ọzọ.—Ndị Kọlọsi 3:14.
“N’ihi ya na-akpọbatanụ ibe unu,” ka Bible na-ekwu, “dị ka Kraịst anyị kpọbatakwara unu, ka e wee nye Chineke otuto.” (Ndị Rom 15:7) Site n’enyemaka nke mmụọ Chineke, ndị Kraịst pụrụ inweta nguzozi chọrọ nlezianya nke ijigide ịdị n’otu ka ha na-anụ ụtọ ọtụtụ ụdị ọdịdị mmadụ ndị pụrụ iche n’ime ọgbakọ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]
Onye Okike adịghị ele ezinụlọ mmadụ anya dị ka nanị ìgwè mmadụ
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 15]
Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ihe ndị pụrụ iche nke nanị anyị na Onye Okike anyị na-aghọta