Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 6/8 p. 16-18
  • Ị Pụrụ Inweta Ntụrụndụ Dị Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị Pụrụ Inweta Ntụrụndụ Dị Mma
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Na-eme Nhọrọ
  • Ọrụ nke Ndị Mụrụ Ụmụ
  • Nweta Obi Ụtọ n’Ihe Omume Ndị Ọzọ
  • Otú Anyị Ga-esi Na-ahọrọ Ntụrụndụ Dị Mma
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Jiri Ihe Ga-amasị Jehova Na-eme Onwe Gị Obi Ụtọ
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Lezie Anya Mgbe Ị Na-ahọrọ Ihe Ndị I Ji Atụrụ Ndụ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Nnọkọ Ntụrụndụ—Rie Uru Ndị Dị na Ya, Zere Ọnyà Ndị Dị na Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 6/8 p. 16-18

Ị Pụrụ Inweta Ntụrụndụ Dị Mma

BIBLE adịghị akagbu ihe ụtọ nke ntụrụndụ, ọ dịghị ele ịnụ ụtọ nke ntụrụndụ anya dị ka igbu oge. N’ụzọ megidere nke ahụ, Eklisiastis 3:4 na-ekwu na e nwere “mgbe ịchị ọchị” na “mgbe ite egwú.”a Ndị Chineke n’Israel oge ochie nụrụ ụtọ nke ụdị ntụrụndụ dị iche iche, gụnyere egwú, ite egwú, na egwuregwu. Jisọs n’onwe ya gara nnukwu oriri agbamakwụkwọ, n’oge ọzọkwa, ‘nri ukwu iji nara Ya.’ (Luk 5:29; Jọn 2:1, 2) Ya mere Bible emegideghị inwe oge mkpori ndụ.

Otú ọ dị, ebe ihe dị ukwuu ná ntụrụndụ nke taa na-eto omume ndị na-adịghị atọ Chineke ụtọ, ajụjụ na-ebilite, Gịnị ka ị pụrụ ime iji jide n’aka na ụkpụrụ gị maka ịhọrọ ntụrụndụ bụ nke nọgidere na-adị mma?

Na-eme Nhọrọ

N’ịhọrọ ntụrụndụ ha, ndị Kraịst ga-achọ ịbụ ndị ụkpụrụ Bible duziri. Dị ka ihe atụ, ọbụ abụ bụ́ Devid dere: “Jehova na-anwa onye ezi omume: ma onye na-emebi iwu na onye na-ahụ ihe ike n’anya ka mkpụrụ obi Ya na-akpọ asị.” (Abụ Ọma 11:5) Pọl degakwaara ndị Kọlọsi akwụkwọ: “Ya mere, meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ihe ọjọọ, na anyaukwu . . . Tụpụkwanụ ihe ndị a nile; bụ́ iwe, ọnụma, obi ọjọọ, nkwulu, ikwu okwu ihere.”—Ndị Kọlọsi 3:5, 8.

Ihe dị ukwuu ná ntụrụndụ e nwere taa na-emebi ndụmọdụ a sitere n’ike mmụọ nsọ n’ezie. ‘Ma ọ dịghị mgbe m ga-eme ihe ndị ahụ m na-ahụ na TV,’ ka ụfọdụ pụrụ ịgbagha. Nke ahụ pụrụ ịdị otú ahụ. Ma ọ bụrụgodị na ntụrụndụ gị adịghị egosi ụdị mmadụ ị ga-aghọ, ọ pụrụ ikpughe ihe banyere ụdị mmadụ ị bụ abụ. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ikwu ma ị̀ bụ otu n’ime ndị “na-ahụ ihe ike n’anya” ma ọ bụ onye na-atụkwasịkarị uche ‘n’ịkwa iko, ọchịchọ ọjọọ, anyaukwu, na okwu ihere’ ma ọ bụ ì so n’etiti ndị ahụ ‘na-akpọ ihe ọjọọ asị’ n’ezie.—Abụ Ọma 97:10.

Pọl degaara ndị Filipaị akwụkwọ, sị: “Ka ihe bụ eziokwu hà, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị nsọpụrụ, ka ha hà, bụ́ ihe ziri ezi, ka ha hà, bụ́ ihe dị ọcha, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị ịhụnanya, ka ha hà, bụ́ ihe e kwuru nke ọma; ọ bụrụ na ịdị mma ọ bụla dị, ọ bụrụkwa na otuto ọ bụla dị, na-agụkọnụ ihe ndị a.”—Ndị Filipaị 4:8.

Ma akụkụ akwụkwọ nsọ a ọ̀ na-apụta na ihe nkiri sịnịma, akwụkwọ, ma ọ bụ ihe ngosi TV ọ bụla nke e nwere atụmatụ metụtara ụdị ụfọdụ nke ajọ omume, ikekwe mpụ, dị nnọọ njọ ozugbo? Ka à kagburu akwụkwọ ịkpa ọchị nile n’ihi na ha abụghị “ihe kwesịrị nsọpụrụ”? Ee e, n’ihi na okwu ndị gbara ya gburugburu na-egosi na Pọl adịghị ekwu banyere ntụrụndụ kama ntụgharị uche nke obi, nke kwesịrị ilekwasị anya n’ihe ndị na-atọ Jehova ụtọ. (Abụ Ọma 19:14) Ka o sina dị, ihe Pọl kwuru pụrụ inyere anyị aka mgbe a bịara n’ịhọrọ ntụrụndụ. N’iji ụkpụrụ dị ná Ndị Filipaị 4:8 mee ihe, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, ‘Ụdị ntụrụndụ na-amasị m ọ̀ na-eme ka m na-atụgharị uche n’ihe ndị na-adịghị ọcha?’ Ọ bụrụ otú ahụ, mgbe ahụ ọ dị anyị mkpa ime nhazigharị.

Otú ọ dị, n’ịtụ ntụrụndụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀, ndị Kraịst kwesịrị ‘ime ka mmadụ nile mara [ezi uche, NW] ha.’ (Ndị Filipaị 4:5) N’ụzọ doro anya, e nwere imebiga ihe ókè ná ntụrụndụ ndị o doro anya na ha ekwesịghị ekwesị maka ezi ndị Kraịst. E wezụga nke ahụ, onye ọ bụla kwesịrị ịtụle okwu a nke ọma ma mee mkpebi ndị ga-enye ya akọ na uche dị ọcha n’ihu Chineke na mmadụ. (1 Ndị Kọrint 10:31-33; 1 Pita 3:21) Ọ gaghị ekwesị ekwesị ikpe ndị ọzọ ikpe n’ụmụ irighiri okwu ma ọ bụ iguzobe ụkpụrụ nduzi aka ike ndị na-atụzi ihe ndị ọzọ kwesịrị ime.b—Ndị Rom 14:4; 1 Ndị Kọrint 4:6.

Ọrụ nke Ndị Mụrụ Ụmụ

Ndị mụrụ ụmụ na-arụ ọrụ dị mkpa n’okwu banyere ntụrụndụ. Pọl dere, sị: “Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha, ma nke kachasị ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Timoti 5:8) N’ihi ya, ndị mụrụ ụmụ nwere ibu ọrụ inye ndị òtù ezinụlọ ihe, ọ bụghị nanị n’ụzọ ihe onwunwe kamakwa n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ mmetụta uche. Nke a ga-agụnye ime ndokwa maka ihe ezumike dị mma.—Ilu 24:27.

Mgbe ụfọdụ a na-eleghara akụkụ a nke ndụ ezinụlọ anya. “N’ụzọ dị mwute,” ka otu onye ozi ala ọzọ nọ na Nigeria na-ekwu, “ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ na-ele ntụrụndụ anya dị ka igbu oge. N’ihi ya, a na-ahapụ ụmụaka ụfọdụ nanị ha, ha na-achọtakwa ụdị ndị enyi na-adịghị mma na ụdị mkpori ndụ na-adịghị mma.” Ndị mụrụ ụmụ, ekwela ka nke a mee! Jide n’aka na ụmụ gị nwere ntụrụndụ dị mma nke na-enye ha ume ọhụrụ n’ezie.

Ma nlezianya dị mkpa. Ndị Kraịst ekwesịghị ịdị ka ọtụtụ taa bụ́ ndị “na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:1-4) Ee, e kwesịrị idebe ntụrụndụ n’ọnọdụ ya. O kwesịrị inye ume ọhụrụ—ọ bụghị ịchịkwa ndụ mmadụ. Ya mere ọ bụghị nanị na ụdị ntụrụndụ ziri ezi dị ụmụaka nakwa ndị toworo ogo mmadụ mkpa kamakwa ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi.—Ndị Efesọs 5:15, 16.

Nweta Obi Ụtọ n’Ihe Omume Ndị Ọzọ

Ihe dị ukwuu ná ntụrụndụ na-ewu ewu na-akụziri ndị mmadụ ịnọ nkịtị kama ịdị gara gara. Dị ka ihe atụ, tụlee telivishọn. Akwụkwọ bụ́ What to Do After You Turn Off the TV na-ekwu: “Site n’ọdịdị ya [telivishọn] na-akụziri anyị ịnọ nkịtị: Ntụrụndụ, na ọbụna ịmụ ihe, na-aghọ ihe anyị na-enweta n’etinyeghị mgbalị ọ bụla, ọ bụghị ikike imepụta ihe dị gara gara nke anyị.” N’ezie, e nwere ohere maka ọbụna ntụrụndụ na-achọghị ọrụ. Ma ọ bụrụ na ọ na-ewere ihe gabigara ókè n’oge mmadụ na-ejighị ihe n’aka, ọ na-anapụ ya ohere ndị na-atọ ụtọ.

Onye na-ede akwụkwọ bụ́ Jerry Mander, bụ́ onye sịrị na ya bụ “onye òtù nke ọgbọ bu TV ụzọ,” na-akọwa oge ụfọdụ nke ịtụ ọ̀bọ̀ nke metụtara oge ọ bụ nwata: “Nchegbu sonyekọrọ ya,” ka ọ na-asị. “Ọ bụ nnọọ ihe na-adịghị atọ ụtọ, na-adịghị atọ nnọọ ụtọ nke na m ga-emesịa kpebie ime ihe—ime ihe. M ga-akpọ otu enyi na telifon, m ga-apụ n’èzí. M ga-apụ ịgba bọl. M ga-agụ akwụkwọ. M ga-eme otu ihe. N’ileghachi anya azụ, m na-ele oge ahụ nke ịtụ ọ̀bọ̀, nke ‘enweghị ihe a ga-eme,’ anya dị ka olulu ebe ikike ime ihe na-esi ebilite.” Taa, Mander na-ekwu na, ụmụaka na-eji TV eme ihe dị ka ngwọta dị mfe maka ịtụ ọ̀bọ̀. “TV na-ewepụ ma nchegbu na nkà mmepụta ihe nke pụrụ isochi,” ka ọ na-ekwukwasị.

Otú a, ọtụtụ achọpụtawo na ihe omume na-achọ nkere òkè kama ịnọ nkịtị pụrụ ịkwụghachi ụgwọ karịa ka ha chere. Ụfọdụ achọpụtawo na iso ndị ọzọ gụpụta ihe n’olu dara ụda bụ ihe na-eweta obi ụtọ. Ndị ọzọ na-achụso ihe omume ntụrụndụ, dị ka ịkpọ ngwá egwú ma ọ bụ ise ihe osise. Mgbe ahụ e nwere ohere ime ndokwa maka nnọkọ ndị dị mma.c (Luk 14:12-14) Ntụrụndụ a na-eme n’èzí nwekwara abamuru. Onye nta akụkọ Teta! na Sweden na-akọ, sị: “Ụfọdụ ezinụlọ na-aga ibi n’ụlọikwuu ma ọ bụ igbu azụ ma ọ bụ gaa mkpapụ n’ọhịa, iji ụgbọ epeepe mee njem, ịrị ugwu, na ihe ndị ọzọ. Ọ na-atọkwa ndị na-eto eto ụtọ.”

Ọdịdị nke ihe ndị na-emerụ emerụ dị ná ntụrụndụ ekwesịghị iju anyị anya. Pọl onyeozi dere na ndị mmadụ nke mba nile ‘na-ejegharị n’ihe efu nke uche ha.’ (Ndị Efesọs 4:17) Ya mere, ọ bụ nanị ihe a ga-atụ anya ya na ihe dị ukwuu n’ihe a na-ewere dị ka ihe ntụrụndụ na-akwado “ọrụ nile nke anụ ahụ.” (Ndị Galetia 5:19-21) Otú ọ dị, ndị Kraịst pụrụ ịzụ onwe ha ime mkpebi ndị dị mma banyere ụdị na ọ̀tụ̀tụ̀ nke ntụrụndụ ha. Ha pụkwara ime ntụrụndụ ihe ezinụlọ ga-emekọ ọnụ, ha pụkwara ọbụna ịnwale ihe omume ndị ọhụrụ nke ga-enye ume ọhụrụ ma nye ihe ncheta ndị dị mma ruo ọtụtụ afọ ga-abịa. Ee, ị pụrụ ịchọta ntụrụndụ dị mma!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A pụrụ ịsụgharị ụdị ndị ọzọ nke okwu Hibru a sụgharịrị “ịchị ọchị” ịbụ “igwuri egwu,” “inye ihe ntụrụndụ ụfọdụ,” “ime ememe,” ma ọ bụ “ikpori ndụ.”

b Iji nwetakwuo ihe ọmụma lee mbipụta Teta! nke March 22, 1978 (Bekee), peji nke 16-21, na December 8, 1995, peji nke 6-8.

c Iji nweta ụkpụrụ nduzi Akwụkwọ Nsọ banyere nnọkọ ntụrụndụ, lee Ụlọ Nche nke August 15, 1992, peji nke 15-20, na ỤOctober 1, 1996, peji nke 18-19.

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ntụrụndụ dị mma pụrụ ịbụ ihe na-akwụghachi ụgwọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya