ISI NKE IRI NA ISII
Nwetara Ezinụlọ Gị Ọdịnihu Na-adịgide Adịgide
1. Gịnị bụ nzube Jehova maka ndokwa ezinụlọ?
MGBE Jehova jikọrọ Adam na Iv n’alụmdi na nwunye, Adam kwupụtara ọṅụ ya site n’ịbụ abụ uri Hibru mbụ e dekọrọ edekọ. (Jenesis 2:22, 23) Otú ọ dị, Onye Okike ahụ bu ihe karịrị nanị iwetara ụmụ ya bụ́ mmadụ ihe ụtọ n’uche. Ọ chọrọ ka ndị di na nwunye na ezinụlọ na-eme uche ya. Ọ gwara mmadụ abụọ mbụ ahụ, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ azụ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.” (Jenesis 1:28) Lee aha oké ọrụ, na-akwụ ụgwọ nke ahụ bụ! Lee ka ha na ụmụ ha n’ọdịnihu gaara esiworị nwee obi ụtọ a sị na Adam na Iv mere uche Jehova ná nrubeisi zuru ezu!
2, 3. Olee otú ezinụlọ pụrụ isi nweta obi ụtọ kasị ukwuu taa?
2 Taakwa, ezinụlọ na-enwekarịsị obi ụtọ mgbe ha rụkọrọ ọrụ ọnụ n’ime uche Chineke. Pọl onyeozi dere: “Nsọpụrụ Chineke bara uru nye ihe nile, ebe o nwere nkwa nke ndụ, ma nke ndụ ugbu a, ma nke gaje ịbịa.” (1 Timoti 4:8) Ezinụlọ nke ji nsọpụrụ Chineke na-ebi ndụ ma na-agbaso nduzi Jehova dị ka ọ dị n’ime Bible ga-enweta obi ụtọ ná “ndụ ugbu a.” (Abụ Ọma 1:1-3; 119:105; 2 Timoti 3:16) Ọbụna ma ọ bụrụ nanị otu onye òtù ezinụlọ na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, ihe na-aka mma karịa ma ọ bụrụ na ọ dịghị otu onye na-etinye ya.
3 Akwụkwọ a atụlewo ọtụtụ ụkpụrụ Bible na-etinye ihe n’obi ụtọ ezinụlọ. Eleghị anya ị rịbawo ama na ụfọdụ n’ime ha pụtara ugboro ugboro n’akwụkwọ a dum. N’ihi gịnị? N’ihi na ha bụ eziokwu ndị dị ike na-ewetara mmadụ nile ihe ọma n’akụkụ dị iche iche nke ndụ ezinụlọ. Ezinụlọ nke na-agbalịsi ike itinye ụkpụrụ Bible ndị a n’ọrụ na-achọpụta na nsọpụrụ Chineke nwere n’ezie ‘nkwa nke ndụ ugbu a.’ Ka anyị leekwa anya ọzọ n’anọ n’ime ụkpụrụ ndị a dị mkpa.
URU NKE IMERU IHE N’ÓKÈ
4. N’ihi gịnị ka imeru ihe n’ókè ji dị oké mkpa n’alụmdi na nwunye?
4 Eze Solomọn sịrị: “Obodo e tikpọrọ etikpọ nke mgbidi na-adịghị ka onye ọ bụla nke na-adịghị egbochi mmụọ ya bụ.” (Ilu 25:28; 29:11) ‘Mmadụ igbochi mmụọ ya,’ imeru ihe n’ókè, dị mkpa maka ndị chọrọ alụmdi na nwunye obi ụtọ. Ịdaba ná mmetụta uche ndị na-eweta mbibi, dị ka ọnụma ma ọ bụ oké agụụ maka ihe rụrụ arụ, ga-akpata mbibi nke na-ewe ọtụtụ afọ idozi—ma ọ bụrụ na a ga-edozili ya ma ọlị.
5. Olee otú mmadụ na-ezughị okè pụrụ isi zụlite imeru ihe n’ókè, na-enwekwa abamuru ndị dị aṅaa?
5 N’ezie, ọ dịghị nwa Adam nke pụrụ ịchịkwa anụ ahụ ya na-ezughị okè n’ụzọ zuru ezu. (Ndị Rom 7:21, 22) Ma, imeru ihe n’ókè bụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Ndị Galetia 5:22, 23) N’ihi ya, mmụọ Chineke ga-amịpụta imeru ihe n’ókè n’ime anyị ma ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere maka àgwà a, ma ọ bụrụ na anyị etinye ndụmọdụ kwesịrị ekwesị nke a na-achọta n’Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ, na ma ọ bụrụ na anyị na-eso ndị ọzọ na-egosipụta ya na-akpakọrịta ma na-ezere ndị na-adịghị egosipụta ya. (Abụ Ọma 119:100, 101, 130; Ilu 13:20; 1 Pita 4:7) Ụzọ dị otú ahụ ga-enyere anyị aka ‘ịgbanarị ịkwa iko,’ ọbụna mgbe a nwara anyị. (1 Ndị Kọrint 6:18) Anyị ga-ajụ ime ihe ike, zerekwa ma ọ bụ merie aṅụrụma. Anyị ga-echekwa mkpasu iwe na ọnọdụ ndị siri ike ihu n’ụzọ dị jụụ karị. Ka anyị nile—gụnyere ụmụaka—mụta ịzụlite mkpụrụ a dị mkpa nke mmụọ nsọ.—Abụ Ọma 119:1, 2.
ỤZỌ KWESỊRỊ EKWESỊ ISI LEE ỊBỤISI ANYA
6. (a) Gịnị bụ usoro ịbụisi nke Chineke hiwere? (b) Gịnị ka nwoke na-aghaghị icheta ma ọ bụrụ na ịbụisi ya gaje iwetara ezinụlọ ya obi ụtọ?
6 Ụkpụrụ nke abụọ dị mkpa bụ ịnakwere ịbụisi. Pọl kọwara usoro kwesịrị ekwesị mgbe ọ sịrị: “Ana m achọ ka unu mata na Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 11:3) Nke a pụtara na nwoke na-edu ndú n’ezinụlọ, nwunye ya na-eji nnọgidesi ike n’ihe na-enye nkwado, ụmụ na-eruberekwa ndị mụrụ ha isi. (Ndị Efesọs 5:22-25, 28-33; 6:1-4) Ma, rịba ama na ịbụisi na-eduba n’obi ụtọ nanị mgbe e ji ya mee ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ndị bụ di ji nsọpụrụ Chineke na-ebi ndụ maara na ịbụisi abụghị ọchịchị aka ike. Ha na-eṅomi Jisọs, bụ́ Isi ha. Ọ bụ ezie na Jisọs gaje ịbụ “isi n’elu ihe nile,” ọ ‘bịaghị ka e jeere Ya ozi, kama ka O jee ozi.’ (Ndị Efesọs 1:22; Matiu 20:28) N’ụzọ yiri nke ahụ, nwoke bụ́ onye Kraịst na-abụ isi, ọ bụghị iji meere onwe ya uru, kama iji hụ maka ọdịmma ndị nke nwunye na ụmụ ya.—1 Ndị Kọrint 13:4, 5.
7. Ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ dịgasị aṅaa ga-enyere nwunye aka imezu òkè Chineke kenyere ya n’ime ezinụlọ?
7 N’akụkụ nke ya, nwunye nke ji nsọpụrụ Chineke ebi ndụ adịghị ama di ya aka ma ọ bụ na-achọ ịchị ya. Ọ na-enwe obi ụtọ ịdị na-enye ya nkwado na iso ya rụkọọ ọrụ. Bible na-ekwu mgbe ụfọdụ banyere nwunye dị ka onye di ya “nwe” enwe, ghara ịhapụ obi abụọ ọ bụla na di bụ isi ya. (Jenesis 20:3, NW) Site n’ọlụlụ di ọ na-abata n’okpuru ‘iwu nke di ya.’ (Ndị Rom 7:2) N’otu oge ahụ, Bible na-akpọ ya “onye inyeaka kwesịrị.” (Jenesis 2:20) Ọ na-enye àgwà na ikike ndị di ya na-enweghị, ọ na-enyekwa ya nkwado dị mkpa. (Ilu 31:10-31) Bible na-ekwukwa na nwunye bụ “onye ibe,” onye so di ya na-arụkọ ọrụ ọnụ. (Malakaị 2:14, NW) Ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na-enyere di na nwunye aka ịghọta ọnọdụ ibe ha na iji mesoo onwe ha n’ụzọ nkwanye ùgwù na nsọpụrụ kwesịrị ekwesị.
“NA-ANỤ IHE ỌSỌ ỌSỌ”
8, 9. Kọwaa ụkpụrụ ụfọdụ ga-enyere mmadụ nile n’ime ezinụlọ aka iji meziwanye nkà nkwurịta okwu ha.
8 N’ime akwụkwọ a e mere ka mkpa nke nkwurịta okwu pụta ìhè mgbe mgbe. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe na-aga nke ọma karị mgbe ndị mmadụ na-ekwu okwu ma na-aṅa ibe ha ntị n’ezie. E mesiwo ya ike ugboro ugboro na nkwurịta okwu bụ nke inye enye na ịnara anara. Jemes onye na-eso ụzọ tinyere ya otú a: “Mmadụ ọ bụla bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu.”—Jemes 1:19.
9 Ọ dịkwa mkpa ịkpachara anya banyere ụzọ anyị si ekwu okwu. Okwu a na-echeghị eche, nke ise okwu, ma ọ bụ nke oké nkatọ adịghị adaba ná nkwurịta okwu na-aga nke ọma. (Ilu 15:1; 21:9; 29:11, 20) Ọbụna mgbe ihe anyị kwuru ziri ezi, ọ bụrụ na e kwuru ya n’ụzọ obi ọjọọ, nganga, ma ọ bụ enweghị mmetụta, o yikarịrị ka ọ ga-emerụ ahụ kama ime ihe ọma. Okwu ọnụ anyị kwesịrị ịdị ụtọ, “ihe e ji nnú mee ka ọ dị ụtọ.” (Ndị Kọlọsi 4:6) Okwu anyị kwesịrị ịdị ka “mkpụrụ osisi apple ọlaedo n’ime nkata ọlaọcha.” (Ilu 25:11) Ezinụlọ ndị mụtara ikwurịta okwu nke ọma ewerewo nzọụkwụ gbara ọkpụrụkpụ n’inweta obi ụtọ.
ÒKÈ DỊ MKPA ỊHỤNANYA NA-EKERE
10. Ụdị ịhụnanya dị aṅaa dị oké mkpa n’alụmdi na nwunye?
10 Okwu ahụ bụ “ịhụnanya” pụtara ugboro ugboro n’akwụkwọ a dum. Ì chetara ụdị ịhụnanya e zoro aka na ya karịsịa? Ọ bụ ezie na ịhụnanya nwoke na nwanyị (Grik, eʹros) na-ekere òkè dị mkpa n’alụmdi na nwunye, n’alụmdi na nwunye na-aga nke ọma kwa, mmetụta miri emi na ọbụbụenyi (Grik, phi·liʹa) na-etolite n’etiti di na nwunye. Ma nke dị mkpa ọbụna karị bụ ịhụnanya nke okwu Grik bụ́ a·gaʹpe na-anọchite anya ya. Nke a bụ ịhụnanya anyị na-azụlite maka Jehova, maka Jisọs, na maka ndị agbata obi anyị. (Matiu 22:37-39) Ọ bụ ịhụnanya Jehova na-egosipụtara ihe a kpọrọ mmadụ. (Jọn 3:16) Lee ka o si bụrụ ihe dị ebube na anyị pụrụ igosipụta otu ụdị ịhụnanya a maka di ma ọ bụ nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị!—1 Jọn 4:19.
11. Olee otú ịhụnanya si arụ ọrụ maka ọdịmma nke alụmdi na nwunye?
11 N’ime alụmdi na nwunye ịhụnanya a e buliri elu bụ n’ezie “ihe nkekọ nke izu okè.” (Ndị Kọlọsi 3:14) Ọ na-ekekọ di na nwunye ma na-eme ha ka ha chọọ ime ihe kasị mma maka ibe ha na maka ụmụ ha. Mgbe ezinụlọ na-eche ọnọdụ ndị siri ike ihu, ịhụnanya na-enyere ha aka imekọ ihe n’ịdị n’otu. Ka di na nwunye na-eme agadi, ịhụnanya na-enyere ha aka ịkwado na ịnọgide na-enwe ekele maka ibe ha. “Ịhụnanya . . . , ọ dịghị achọ ihe nke aka ya. . . . Ọ na-anagide ihe nile, na-ekwere ihe nile, na-ele anya ihe nile, na-enwe ntachi obi n’ihe nile. Ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.”—1 Ndị Kọrint 13:4-8.
12. N’ihi gịnị ka ịhụnanya maka Chineke n’akụkụ nke di na nwunye ji eme ka alụmdi na nwunye ha sie ike?
12 Njikọ alụmdi na nwunye na-esi ike karịsịa mgbe ọ na-abụghị nanị ịhụnanya n’etiti di na nwunye kama n’ụzọ bụ isi ịhụnanya maka Jehova nyagidere ya. (Eklisiastis 4:9-12) N’ihi gịnị? Jọn onyeozi dere, sị: “Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile O nyere n’iwu.” (1 Jọn 5:3) N’ihi ya, di na nwunye kwesịrị ịzụlite ụmụ ha ná nsọpụrụ Chineke ọ bụghị nanị n’ihi na ha hụrụ ụmụ ha n’anya nke ukwuu kama n’ihi na nke a bụ iwu Jehova. (Deuterọnọmi 6:6, 7) Ha kwesịrị izere omume rụrụ arụ ọ bụghị nanị n’ihi na ha hụrụ onwe ha n’anya kama karịsịa n’ihi na ha hụrụ Jehova n’anya, onye “ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe, ha na ndị na-akwa iko, bụ́ ndị ikom nwere nwunye na ndị inyom nwere di.” (Ndị Hibru 13:4) Ọbụna ma ọ bụrụ na onye ibe mmadụ akpata nsogbu ndị siri ike n’alụmdi na nwunye, ịhụnanya maka Jehova ga-akwali onye nke ọzọ ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ Bible. Ezinụlọ ebe ndị e ji ịhụnanya maka Jehova na-eme ka ngosirịta ịhụnanya sie ike bụ ndị nke obi ụtọ n’ezie!
EZINỤLỌ NKE NA-EME UCHE CHINEKE
13. Olee otú mkpebisi ike ime uche Chineke ga-esi nyere ndị mmadụ aka ilekwasị anya n’ihe ndị dị mkpa n’ezie?
13 Ndụ nile nke onye Kraịst dabeere n’ime uche Chineke. (Abụ Ọma 143:10) Nke a bụ ihe nsọpụrụ Chineke pụtara n’ezie. Ime uche Chineke na-enyere ezinụlọ aka ilekwasị anya ha n’ihe ndị dị mkpa n’ezie. (Ndị Filipaị 1:9, 10) Dị ka ihe atụ, Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Abịara m ikewa nwoke megide nna ya, na nwa nwanyị megide nne ya, na nwunye nwa megide nne di ya: ọ bụkwa ndị ezinụlọ mmadụ ga-abụ ndị iro ya.” (Matiu 10:35, 36) Dị ka Jisọs dọrọ aka ná ntị, ọtụtụ ụmụazụ ya abụwo ndị ndị òtù ezinụlọ ha kpagburu. Lee ọnọdụ dị mwute, nke obi mgbu ọ bụ! Ka o sina dị, nkekọ ezinụlọ ekwesịghị ịkarị ịhụnanya anyị maka Jehova Chineke na maka Jisọs Kraịst. (Matiu 10:37-39) Ọ bụrụ na mmadụ edie mmegide ezinụlọ, ndị mmegide ahụ pụrụ ịgbanwe mgbe ha hụrụ mmetụta ọma dị iche iche nke nsọpụrụ Chineke. (1 Ndị Kọrint 7:12-16; 1 Pita 3:1, 2) Ọbụna ma ọ bụrụ na nke ahụ emeghị, ọ dịghị ihe ọma ọ bụla na-adịgide adịgide a na-arụzu site n’ịkwụsị ijere Chineke ozi n’ihi mkpagbu.
14. Olee otú ọchịchọ ime uche Chineke ga-esi nyere nne na nna aka ime ihe maka ọdịmma kasịnụ nke ụmụ ha?
14 Ime uche Chineke na-enyere ndị nne na nna aka ime mkpebi ndị ziri ezi. Dị ka ihe atụ, n’ógbè ụfọdụ nne na nna na-elekarị ụmụ anya dị ka ego e tinyere n’azụmahịa, ha na-adaberekwa n’ụmụ ha ilekọta ha n’oge agadi ha. Ọ bụ ezie na o ziri ezi, kwesịkwa ekwesị ka ụmụ toworo eto lekọta nne na nna na-eme agadi, echiche dị otú ahụ ekwesịghị ime ka nne na nna chigharịa ụmụ ha ihu gaa n’ụzọ ndụ nke nchụso ihe onwunwe. Ndị nne na nna adịghị emere ụmụ ha ihe ọma ọ bụla ma ọ bụrụ na ha azụlite ha iji ihe onwunwe kpọrọ ihe karịa ihe ime mmụọ.—1 Timoti 6:9.
15. Olee otú nne Timoti, bụ́ Yunaịsi, si bụrụ ihe nlereanya magburu onwe ya nke nne mere uche Chineke?
15 Ihe nlereanya ọma n’akụkụ nke a bụ Yunaịsi, nne enyi Pọl nke na-eto eto bụ́ Timoti. (2 Timoti 1:5) Ọ bụ ezie na di ya bụ onye na-ekweghị ekwe, Yunaịsi, na nne ochie Timoti bụ́ Lọịs, nwere ihe ịga nke ọma n’ịzụlite Timoti ịgbaso nsọpụrụ Chineke. (2 Timoti 3:14, 15) Mgbe Timoti topụtara, Yunaịsi kwere ka ọ hapụ ụlọ ma were ọrụ nkwusa Alaeze dị ka onye ibe Pọl n’ozi ala ọzọ. (Ọrụ 16:1-5) Lee ka ọ na-aghaghị isiwo nwee obi ụtọ mgbe nwa ya nwoke ghọrọ onye ozi ala ọzọ pụtara ìhè! Nsọpụrụ Chineke ya dị ka onye toworo eto gosipụtara nke ọma ọzụzụ e nyere ya na nwata. N’ezie, Yunaịsi nwetara afọ ojuju na ọṅụ n’ịnụ akụkọ banyere ozi ikwesị ntụkwasị obi nke Timoti, ọ bụ ezie na ọ ghaghị ịbụ na ya ịdị na-anọnyere ya gụsiri ya ike.—Ndị Filipaị 2:19, 20.
EZINỤLỌ NA ỌDỊNIHU GỊ
16. Dị ka nwa nwoke, nchegbu kwesịrị ekwesị dị aṅaa ka Jisọs gosiri, ma gịnị bụ ebumnobi ya bụ isi?
16 A zụlitere Jisọs n’ezinụlọ na-atụ egwu Chineke, dịkwa ka onye toworo eto, o gosiri nchegbu kwesịrị ekwesị nke nwa maka nne ya. (Luk 2:51, 52; Jọn 19:26) Otú ọ dị, ebumnobi bụ isi nke Jisọs bụ imezu uche Chineke, nyekwa ya nke a gụnyere imepe ụzọ ka ụmụ mmadụ nwee ndụ ebighị ebi. Nke a ka o mere mgbe o nyere ndụ mmadụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie.—Mak 10:45; Jọn 5:28, 29.
17. Olileanya ndị dị aṅaa dị ebube ka ụzọ ikwesị ntụkwasị obi nke Jisọs na-emepere ndị na-eme uche Chineke?
17 Mgbe Jisọs nwụsịrị, Jehova kpọlitere ya gaa ná ndụ eluigwe ma nye ya ike dị ukwuu, mesịa na-eguzobe ya dị ka Eze n’Alaeze eluigwe ahụ. (Matiu 28:18; Ndị Rom 14:9; Mkpughe 11:15) Àjà Jisọs mere ka o kwe omume ịhọrọ mmadụ ụfọdụ iso ya chịa n’Alaeze ahụ. O mepekwara ụzọ ka mmadụ nile ọzọ nwere ezi obi nwee ndụ zuru okè n’ụwa nke e weghachiri n’ọnọdụ paradaịs. (Mkpughe 5:9, 10; 14:1, 4; 21:3-5; 22:1-4) Otu n’ime ihe ùgwù kasị ukwuu anyị nwere taa bụ ịkọrọ ndị agbata obi anyị ozi ọma nke a dị ebube.—Matiu 24:14.
18. Ihe ncheta dị aṅaa na agbamume dị aṅaa ka a na-enye ma ezinụlọ ma ndị mmadụ n’otu n’otu?
18 Dị ka Pọl onyeozi gosiri, ibi ndụ nsọpụrụ Chineke na-ekwe nkwa na ndị mmadụ pụrụ iketa ngọzi ndị ahụ ná ndụ “nke gaje ịbịa.” N’ezie, nke a bụ ụzọ kasị nnọọ mma isi nweta obi ụtọ! Cheta, “ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) N’ihi ya, ma ị bụ nwa ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna, di ma ọ bụ nwunye, ma ọ bụ onye toworo eto nọ nanị ya nke nwere ma ọ bụ ghara inwe ụmụ, gbalịsie ike ime uche Chineke. Ọbụna mgbe ị nọ n’okpuru nrụgide ma ọ bụ na-eche ọnọdụ ndị sibigara ike ókè ihu, echezọla ma ọlị na ị bụ ohu nke Chineke ahụ dị ndụ. Otú a, ka ihe nile ị na-eme wetara Jehova ọṅụ. (Ilu 27:11) Ka àgwà gị rụpụtakwara gị obi ụtọ ugbu a na ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ gaje ịbịa!