Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/00 p. 3-6
  • Iji Nkwenye Siri Ike Na-ekwusa Ozi Ọma Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iji Nkwenye Siri Ike Na-ekwusa Ozi Ọma Ahụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Ji Nkwenye Kwuo Ya
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Guzonụ Dị Ka Ndị Zuru Okè Ndị Kwezuworo Ihe Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha “Mara Ihe Iji Nweta Nzọpụta”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Ka Obi Sie Gị Ike na Ihe I Kweere Bụ Eziokwu
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 2/00 p. 3-6

Iji Nkwenye Siri Ike Na-ekwusa Ozi Ọma Ahụ

1 Ná mmalite narị afọ mbụ, Jisọs Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ na ‘ime mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ.’ (Mat. 24:14; 28:19, 20) Ndịàmà Jehova ejiriwo ntụziaka ya kpọrọ ihe nke na mgbe ọ na-erule ọgwụgwụ narị afọ nke 20, òtù ụmụnna ndị Kraịst anyị amụbaruwo ihe karịrị ndị na-eso ụzọ 5,900,000 n’ala 234. Lee iti mkpu dị ukwuu e ji too Nna anyị nke eluigwe ọ bụ!

2 Anyị abanyewo na narị afọ nke 21 ugbu a. Onye Iro anyị ji aghụghọ na-agbalị igbochi ọrụ anyị bụ́ isi nke ikwusa Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ. Ọ na-eji nrugide nke usoro ihe a eme ihe ná mgbalị ya ịdọpụ uche anyị, iri oge anyị, na iji nchụso nke ọtụtụ ihe ndị na-adịghị mkpa mee ka ike gwụ anyị. Kama ikwe ka usoro ihe a kpebiere anyị ihe dị mkpa ná ndụ, anyị na-eji Okwu Chineke na-anwapụtara onwe anyị ihe kasị mkpa—ime uche Jehova. (Rom 12:2) Nke ahụ pụtara irube isi n’agbamume Akwụkwọ Nsọ nyere ‘ikwusa okwu Ya n’oge kwesịrị, ma ọ bụ n’oge na-ekwesịghị na ijezu ozi anyị.’—2 Tim. 4:2, 5.

3 Zụlite Nkwenye Siri Ike: Ọ dị ndị Kraịst mkpa ‘iguzo dị ka ndị zuru okè, ndị na-ekwenyesi ike n’ihe nile Chineke na-achọ.’ (Kọl. 4:12, NW) A na-akọwa okwu ahụ bụ́ “nkwenye” dị ka “echiche ma ọ bụ nkweta siri ike; ọnọdụ nke ịbụ onye e mere ka o kwere.” Dị ka ndị Kraịst anyị aghaghị ịbụ ndị e mere ka ha kweta na okwu amụma nke Chineke aghaghị imezu nakwa na anyị na-ebi ugbu a kpọmkwem n’oge ọgwụgwụ. Anyị aghaghị ikwenyesi ike dị ka Pọl onyeozi, bụ́ onye kwuru na ozi ọma ahụ “bụ ike nke Chineke ruo nzọpụta nye onye ọ bụla nke kwere.”—Rom 1:16.

4 Ekwensu na-eji ndị ajọ mmadụ na ndị aghụghọ, bụ́ ndị a na-eduhie n’onwe ha, emebi ndị ọzọ ma na-eduhie ha. (2 Tim. 3:13) N’ịbụ ndị e bu ụzọ dọọ aka ná ntị banyere nke a, anyị ga-eme ihe iji mee ka nkwenye anyị nke bụ́ na anyị nwere eziokwu ahụ sikwuo ike. Kama ikwe ka nchegbu nke ndụ bịanyụọ ịnụ ọkụ n’obi anyị, anyị ga-anọgide na-ebute ọdịmma nke Alaeze ahụ ụzọ. (Mat. 6:33, 34) Anyị ekwesịghịkwa ichezọ ịdị ngwa nke oge a, ikekwe na-eche na ọgwụgwụ nke usoro ihe a dị anya. Ọ na-abịaru nso n’ike n’ike. (1 Pita 4:7) Ọ bụ ezie na anyị pụrụ iche na ikwusa ozi ọma ahụ na-enwe mmetụta dị nta n’ala ụfọdụ n’ihi àmà a gbawororịị, ọrụ ịdọ aka ná ntị ahụ aghaghị ịga n’ihu.—Ezik. 33:7-9.

5 Ajụjụ ndị dị mkpa n’oge ikpeazụ a bụ: ‘Àna m eji ọrụ ime ndị na-eso ụzọ nke Jisọs nyere akpọrọ ihe? Mgbe m na-ekwusa ozi ọma, àna m egosipụta na ekwezuru m na Alaeze ahụ dị adị n’ezie? Èkpebisiwo m ike ikere òkè dị ukwuu dị ka o kwere mee n’ozi a na-azọpụta ndụ?’ N’ịghọta ókè anyị garuworo n’oge ọgwụgwụ a, anyị aghaghị ịrịba onwe anyị na ọrụ ime nkwusa na izi ihe anyị ama. Site n’ime nke a anyị ga-azọpụta onwe anyị na ndị na-anụ olu anyị. (1 Tim. 4:16) Olee otú anyị nile pụrụ isi mee ka nkwenye anyị nwere dị ka ndị ozi sikwuo ike?

6 Ṅomie Ndị Tesalọnaịka: N’icheta nrụsi ọrụ ike nke ụmụnna nọ na Tesalọnaịka, Pọl onyeozi gwara ha, si: “Ọ bụghị nanị n’okwu ọnụ ka ozi ọma anyị bịaruru unu, kama ọ bịakwara n’ike, na n’ime Mmụọ Nsọ na [nkwenye siri ike, NW]; dị ka unu matara aha mmadụ a hụrụ na anyị bụ n’ebe unu nọ n’ihi unu. Unu onwe unu ghọkwara ndị na-eṅomi anyị na Onyenwe anyị, ebe unu weere ọṅụ nke Mmụọ Nsọ nara okwu ahụ nke ọma n’ime ọtụtụ mkpagbu.” (1 Tesa. 1:5, 6) Ee, Pọl jara ọgbakọ ndị Tesalọnaịka mma n’ihi na n’agbanyeghị oké mkpagbu, ha jiri ịnụ ọkụ n’obi na nkwenye siri ike mee nkwusa. Gịnị mere ha ji nwee ike ime nke a? Ruo n’ókè dị ukwuu, ịnụ ọkụ n’obi na nkwenye siri ike ha hụrụ n’ebe Pọl onyeozi na ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ nọ nwere mmetụta dị mma n’ahụ ha. Ò si aṅaa dị otú ahụ?

7 Ndụ Pọl kpọmkwem na nke ndị ya na ha so na-eme njem gosipụtara na mmụọ nsọ Chineke nọnyeere ha nakwa na ha ji obi ha dum kwere n’ihe ha na-ekwusa. Tupu ha agaa Tesalọnaịka, a kparịrị Pọl na Saịlas na Filipaị. N’ekpeghị ha ikpe, e tiri ha ihe, tụọ ha nga, kpọọkwa ha ọtọsị. Otú ọ dị, ahụmahụ a nke bụụrụ ha ọnwụnwa abịanyụghị ịnụ ọkụ n’obi ha nwere maka ozi ọma ahụ. Ntinye aka nke Chineke mere ka a tọhapụ ha, duje n’ịtọghata onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ na ezinụlọ ya, meekwa ka ụmụnna ndị a nọgide na-aga n’ihu n’ozi ha.—Ọrụ 16:19-34.

8 N’ike nke mmụọ nsọ Chineke, Pọl gara Tesalọnaịka. N’ebe ahụ ọ rụrụ ọrụ iji nweta ihe ndị dị ya mkpa ma tinyezie onwe ya kpam kpam n’izi ndị Tesalọnaịka eziokwu ahụ. Ọ laghị azụ n’iji ohere ọ bụla dapụtaranụ kwusaa ozi ọma ahụ. (1 Tesa. 2:9) Nkwenye siri ike nke Pọl ji mee nkwusa nwere mmetụta dị nnọọ ukwuu n’ahụ ndị nọ n’ebe ahụ nke na ụfọdụ n’ime ha kwụsịrị ikpere arụsị ha nọbu na ya ma ghọọ ndị ohu nke ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova.—1 Tesa. 1:8-10.

9 Mkpagbu egbochighị ndị ọhụrụ ahụ kwere ekwe ikwusa ozi ọma ahụ. N’ịbụ ndị okwukwe ha chọtara ọhụrụ kwaliri na n’ịbụ ndị kwezuru na ngọzi ebighị ebi ga-abụ nke ha, a kwaliri ndị Tesalọnaịka ịkpọsa eziokwu ahụ ha nabatara n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Ọgbakọ ahụ rụsiri ọrụ ike nke na akụkọ banyere okwukwe na ịnụ ọkụ n’obi ha gbasaruru akụkụ Masedonia ndị ọzọ na ọbụna ruo Akaịa. N’ihi ya, mgbe Pọl degaara ndị Tesalọnaịka akwụkwọ ozi ya nke mbụ, a maraworị ọrụ ọma ha nke ọma. (1 Tesa. 1:7) Lee ihe nlereanya dị ịrịba ama ọ bụ!

10 Ịbụ Ndị Ịhụnanya Ha Nwere n’Ebe Chineke na n’Ebe Ndị Mmadụ Nọ Kwaliri: Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe nkwenye siri ike n’onwe anyị mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma ahụ taa, dị ka ndị Tesalọnaịka nwere? Pọl dere banyere ha, sị: “Anyị na-echeta n’ewepụghị aka ọrụ nke okwukwe unu na mgbalị nke ịhụnanya unu na-agbalịsi ike.” (1 Tesa. 1:3, nkọwa ala ala peji nke NW) O doro anya na ha nwere ịhụnanya miri emi, nke si n’ala ala obi n’ebe Jehova Chineke na ndị ha kwusaara ozi ọma ahụ nọ. Ọ bụ otu ịhụnanya ahụ kwaliri Pọl na ndị ibe ya ime ka ndị Tesalọnaịka keta “ọ bụghị nanị ozi ọma nke Chineke, kama ọ bụkwa mkpụrụ obi nke aka [ha].”—1 Tesa. 2:8.

11 N’ụzọ yiri nke a, ịhụnanya miri emi anyị nwere n’ebe Jehova na n’ebe ndị mmadụ ibe anyị nọ na-akpali anyị ịchọ ikere òkè zuru ezu n’ọrụ nkwusa ahụ Chineke nyeworo anyị ka anyị rụọ. N’ịbụ ndị nwere ụdị ịhụnanya ahụ, anyị na-amata na ọ bụ ibu ọrụ Chineke nyere anyị ikwusa ozi ọma ahụ. Site n’iji ọṅụ na ekele na-atụgharị uche n’ihe nile Jehova mewooro anyị n’iduru anyị gaa ná “ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie,” a na-akpali anyị ịgwa ndị ọzọ otu eziokwu ahụ magburu onwe ya anyị ji obi anyị dum kwere.—1 Tim. 6:19.

12 Ka anyị na-aga n’ihu n’ọrụ nkwusa ahụ, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova na n’ebe ndị mmadụ nọ aghaghị ịnọgide na-eto eto. Ọ bụrụ na ọ nọgide na-eto, a ga-akpali anyị ikerekwu òkè n’ozi ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ na ịchụso ụdị ịgba àmà nile anyị nwetara ohere ya. Anyị ga-eji ohere ndị dapụtaranụ gbaara ndị ikwu, ndị agbata obi, na ndị enyị anyị àmà mberede. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtu ná ndị mmadụ pụrụ ịjụ ozi ọma anyị na-ezi ha, ụfọdụ ga-agbalịkwa igbochi mkpọsa nke Alaeze ahụ, anyị na-enwe ọṅụ n’obi anyị. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị maara na anyị emewo ike anyị ịgba àmà banyere Alaeze ahụ na inyere ndị mmadụ aka inweta nzọpụta. Jehova ga-agọzikwa mbọ anyị na-agba ịchọta ndị nwere obi eziokwu. Ọbụna mgbe nrụgide nke ndụ gbara anyị gburugburu, Setan achọọkwa ịnapụ anyị ọṅụ anyị, anyị na-enwe ike ịnọgide na-enwe nkwenye siri ike na ijigide ịnụ ọkụ n’obi anyị n’ịgbara ndị ọzọ àmà. Mgbe anyị nile mere òkè anyị, nke a na-eme ka e nwee ọgbakọ siri ike, nke nwere ịnụ ọkụ n’obi dị ka nke ahụ dị na Tesalọnaịka.

13 Akwụsịkwala n’Ihi Ọnwụnwa: Nkwenye siri ike dịkwa mkpa mgbe anyị na-enweta ọnwụnwa dị iche iche. (1 Pita 1:6, 7) Jisọs mere ka o doo ndị na-eso ụzọ ya anya na ọ bụrụ na ha esoro ya, ha ga-abụ ndị ‘mba nile ga-akpọ asị.’ (Mat. 24:9) Pọl na Saịlas nọrọ n’ọnọdụ a mgbe ha nọ na Filipaị. Ihe ndekọ dị n’Ọrụ Ndị Ozi isi nke 16 na-ekwu na a tụbara Pọl na Saịlas n’ụlọ mkpọrọ dị n’ime ma kpọọ ha ọtọsị. Dị ka ọ na-adịkarị, ụlọ mkpọrọ nke na-adị ná mpụta na-eyi ogige e ji ọnụ ụlọ nga ndị ìhè na ikuku na-abanye na ha gbaa gburugburu. Otú ọ dị, ụlọ mkpọrọ nke na-adị n’ime adịghị enwe ebe ìhè si abanye na ya, ọ dịghị enwecha ebe ikuku si abanye na ya. Pọl na Saịlas nagidere ọchịchịrị, okpomọkụ, na ísì ọjọọ nke ebe a jọgburu onwe ya a tụrụ ha mkpọrọ. Ị̀ pụrụ iche n’echiche ihe mgbu ha na-aghaghị inwewo mgbe ahụ a kpọrọ ha ọtọsị ruo ọtụtụ awa ma bụrụ ndị bu ọnyá na-agba ọbara n’azụ n’ihi ụtarị ahụ a pịara ha?

14 N’agbanyeghị ọnwụnwa ndị a, Pọl na Saịlas nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi. Ha gosipụtara nkwenye siri ike nke sitere n’ala ala obi ha, bụ́ nke wusiri ha ike ijere Jehova ozi n’agbanyeghị ule. E mere ka nkwenye siri ike ha nwere pụta ìhè n’amaokwu nke 25 nke isi nke 16, bụ́ ebe na-ekwu na Pọl na Saịlas “na-ekpe ekpere na-abụkukwa Chineke abụ.” Ọ bụ ezie na ha nọ n’ụlọ mkpọrọ nke dị n’ime, o doro ha nnọọ anya na ha nwere ihu ọma Chineke nke na ha ji olu dara ụda bụọ abụ nke ndị mkpọrọ ndị ọzọ nụrụ! Anyị aghaghị inwe nkwenye siri ike yiri nke ahụ taa mgbe anyị na-eche ule nke okwukwe anyị ihu.

15 Ọnwụnwa ndị Ekwensu na-anwa anyị dị ọtụtụ. Nye ụfọdụ ọ pụrụ ịbụ mkpagbu sitere n’ezinụlọ. Ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị na-eche ihe ịma aka nke iwu ihu. A pụrụ inweta mmegide nke ndị si n’ezi ofufe dapụ. E nwere ibu arọ nke ego na nchegbu nke ụzọ isi nweta ihe ndị e ji ebi ndụ. Ndị na-eto eto na-eche nrụgide ndị ọgbọ ihu n’ụlọ akwụkwọ. Olee otú anyị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma n’ịnagide ọnwụnwa ndị a? Gịnị dị mkpa iji gosiputa nkwenye siri ike?

16 Nke mbụ, ọ dị mkpa ka anyị na Jehova nọgide na-enwe mmekọrịta chiri anya. Mgbe Pọl na Saịlas nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ dị n’ime, ha ejighị oge ahụ mee mkpesa banyere ọnọdụ ha ná ndụ ma ọ bụ meere onwe ha ebere. Ha chigharịkwuuru Chineke n’ekpere ozugbo, jirikwa abụ too ya. N’ihi gịnị? N’ihi na ha na Nna ha nke eluigwe nwere mmekọrịta chiri anya. Ha ghọtara na ha na-ata ahụhụ n’ihi ezi omume nakwa na nzọpụta ha dị n’aka Jehova.—Abụ Ọma 3:8.

17 Mgbe anyị na-eche ọnwụnwa ihu taa, anyị onwe anyị kwa aghaghị ilegara Jehova anya. Pọl na-agba anyị ume dị ka ndị Kraịst ‘ime ka Chineke mara ihe nile anyị na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi anyị na echiche uche anyị nche.’ (Fil. 4:6, 7) Lee ihe nkasi obi ọ bụ ịmara na Jehova agaghị ahapụ nanị anyị mgbe anyị nọ n’ọnwụnwa! (Aịsa. 41:10) Ọ na-anọnyere anyị mgbe nile ma ọ bụrụhaala na anyị ejiri nkwenye ziri ezi na-ejere ya ozi.—Abụ Ọma 46:7.

18 Ihe ọzọ dị mkpa nke na-enye aka iji gosipụta nkwenye bụ iji ọrụ n’aka n’ozi Jehova. (1 Kọr. 15:58) A tụbara Pọl na Saịlas n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na ha ji ọrụ n’aka n’ikwusa ozi ọma ahụ. Hà kwụsịrị ime nkwusa n’ihi ọnwụnwa ha zutere? Ee e, ha nọgidere na-eme nkwusa ọbụna mgbe ha nọ n’ụlọ mkpọrọ, mgbe a tọhapụsịkwara ha, ha gara Tesalọnaịka ma banye n’ụlọ nzukọ ndị Juu ‘ịgwa ha okwu site n’ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ.’ (Ọrụ 17:1-3) Mgbe anyị kwenyesiri ike na Jehova ma kwere na anyị nwere eziokwu ahụ, ọ dịghị ihe ‘pụrụ ikewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke, nke dị n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.’—Rom 8:35-39.

19 Ihe Nlereanya nke Oge A nke Nkwenye Siri Ike: E nwere ọtụtụ ihe nlereanya nke ndị nọ n’oge anyị bụ́ ndị gosipụtaworo nkwenye siri ike dị ka Pọl na Saịlas. Otu nwanna nwanyị lanarịrị ogige ịta ahụhụ Auschwitz na-akọ banyere okwukwe na nkwenye siri ike nke ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị gosipụtara n’ebe ahụ. Ọ na-akọ, sị: “N’otu mgbe a na-agba anyị ajụjụ, otu ọfịsa bịakwutere m ka ọ na-akwụkwụwa aka ya. ‘Gịnị ka anyị ga-eme unu?’ ka o tiri ná mkpu. ‘Ọ bụrụ na anyị ejide unu, ọ dịghị ewute unu. Ọ bụrụ na anyị atụba unu n’ụlọ mkpọrọ, ọ dịghị ewute unu ma ọlị. Ọ bụrụ na anyị atụba unu n’ogige ịta ahụhụ, ọ dịghị enye unu nsogbu. Mgbe anyị mara unu ikpe ọnwụ, unu na-eguzo nnọọ ebe ahụ n’echegbughị onwe unu. Gịnị ka anyị ga-eme unu?’” Lee ka o si bụrụ ihe na-ewusi okwukwe ike ịhụ okwukwe ụmụnna anyị nwere n’ọnọdụ obi ịta mmiri ndị dị otú ahụ! Ha legaara Jehova anya mgbe nile maka enyemaka iji mee ka ha nọgidesie ike.

20 N’ezie anyị na-echeta nkwenye siri ike nke ọtụtụ ụmụnna anyị gosipụtara mgbe e nwere ịkpọasị agbụrụ nke pụtaworo ìhè n’afọ ndị na-adịbeghị anya. N’agbanyeghị na ha hụrụ onwe ha n’etiti ọnọdụ ndị dị ize ndụ, ụmụnna ruru eru na-etinye uche ha n’ịhụ na e nyere ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị nri ime mmụọ. Ha nile na-anọgide n’ikwesị ntụkwasị obi, na-ekwetasi ike na ‘ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide ha ga-aga nke ọma.’—Aịsa. 54:17.

21 Ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị nwoke na ụmụnna anyị nwanyị bụ́ ndị nwere ndị òtù ọlụlụ na-ekweghị ekwe na-egosipụtakwa okwukwe siri ike na ntachi obi. Otu nwanna nwoke na Guadeloupe nwetara mmegide siri ike site n’aka nwunye ya na-ekweghị ekwe. Iji kụda ya obi ma gbochie ya ịga nzukọ ndị Kraịst, ọ dịghị esi nri nwanna nwoke ahụ ga-eri ma ọ bụ saa, dee ákwà ya ede, ọ dịghịkwa akwachi ya akwachi. Ọ dịghị ekwusara nwanna nwoke ahụ okwu ruo ogologo oge. Ma site n’igosipụta nkwenye siri ike nke sitere n’ala ala obi n’ijere Jehova ozi nakwa site n’ichigharịkwuru ya n’ekpere maka enyemaka, nwanna nwoke a nwere ike wee die ha nile. Ruo ogologo oge ha aṅaa? Ruo ihe dị ka afọ 20—mgbe nwunye ya mesịrị jiri nwayọọ nwayọọ gbanwee obi ya. Ka e mesịrị, ọ pụrụ ịṅụrị ọṅụ n’ihi na nwunye ya nakweere olileanya nke Alaeze Chineke.

22 N’ikpeazụ, anyị agaghị echezọ nkwenye siri ike nke ụmụnna anyị nwoke na ụmụnna anyị nwanyị na-eto eto bụ́ ndị na-aga akwụkwọ kwa ụbọchị ma na-ezute nrụgide ndị ọgbọ na ihe ịma aka ndị ọzọ. Otu nwa agbọghọ bụ́ Onyeàmà kwuru banyere nrụgide nke ịdị ka ndị ọzọ n’ụlọ akwụkwọ, sị: “Mgbe ị nọ n’ụlọ akwụkwọ, onye ọ bụla na-agba gị ume mgbe nile ịnupụtụ isi. Ụmụaka ga-akwanyere gị ùgwù karị ma ọ bụrụ na i mee ihe na-egositụ omume nnupụisi.” Lee nrụgide nke ụmụ anyị na-eche ihu! Ha aghaghị ikpebisi ike n’uche na n’obi ha iguzogide ọnwụnwa.

23 Ọtụtụ n’ime ụmụ anyị na-eme nke ọma n’ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe n’agbanyeghị ule. Otu ihe atụ bụ nke otu nwanna nwanyị bi na France. Mgbe ha risịrị nri ehihie otu ụbọchị, ụmụ okorobịa ụfọdụ gbalịrị ịmanye ya ka o susuo ha ọnụ, ma o kpere ekpere wee guzogidesie ha ike, ya mere ụmụ okorobịa ahụ hapụrụ ya. Mgbe e mesịrị, otu n’ime ha bịaghachiri ma gwa ya na ya na-asọpụrụ ya n’ihi obi ike ya. Ọ gbaara ya àmà nke ọma banyere Alaeze ahụ, na-akọwa ụkpụrụ dị elu Jehova na-esetịpụrụ ndị nile ga-eketa òkè ná ngọzi ya. N’afọ agụmakwụkwọ ahụ, ọ kọwakwaara klas ahụ dum nkwenkwe ya.

24 Lee ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa ọ bụụrụ anyị iso ná ndị Jehova nwere mmasị iji mee ka ha jiri nkwenye siri ike na-ekwu banyere uche ya! (Kọl. 4:12) Ọzọkwa, anyị nwere ohere magburu onwe ya nke igosipụta na anyị na-eguzosi ike n’ezi ihe mgbe Onye Iro anyị yiri ọdụm, bụ́ Setan Ekwensu, na-awakpo anyị. (1Pita 5:8, 9) Echezọkwala na Jehova ji ozi Alaeze ahụ eme ka ma anyị bụ́ ndị na-ekwusa ya ma ndị na-anụ olu anyị bụrụ ndị a ga-azọpụta. Ka mkpebi ndị anyị na-eme na ụzọ ndụ anyị kwa ụbọchị gosipụta na anyị na-ebute Alaeze ahụ ụzọ. Ka anyị nọgide jiri nkwenye siri ike na-ekwusa ozi ọma ahụ!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya