Isi 1
Ọchịchọ Maka Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ
1, 2. Mkpa siri ike dị aṅaa ka ihe nile a kpọrọ mmadụ nwere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
UDO na ịnọ ná ntụkwasị obi bụ ihe anyị chọrọ n’elu ụwa ebe a. Mkpa e nwere maka ụdị ọnọdụ dị otú a nke a na-achọsi ike adịbeghị mgbe ọ dịsiri mkpa ike otú ọ dị taa. Nke a bụ eziokwu ọ bụghị nanị maka anyị onwe anyị n’otu n’otu kamakwa maka ezinụlọ nile nke ihe a kpọrọ mmadụ gburugburu ụwa nile.
2 Ọ bụ n’ihi nke a mere na ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ nọ ugbu a n’elu ala ji na-adị ndụ n’oge kasị mkpa! ‘Olee otú nke a pụrụ isi dị otú a,’ ka ị pụrụ ịjụ, ‘ebe anyị gamiworo ugbu a n’oge kasị dịrị egwu n’akụkọ nile mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọgbọ nke ngwá agha nuklia?’
3. (a) Gịnị ka a sị na ọ bụ ya mere mba dị iche iche ji na-enwe bọmbụ nuklia? (b) Gịnị ka echiche nkịtị ga-egosi?
3 A kọwo na ọ dịkarịa ala mba asatọ nwere ike imepụta bọmbụ nuklia. E mewokwa atụmatụ na 31 mba dị iche iche pụrụ inwe ngwá agha nuklia ka ọ na-erule afọ 2000. E kwuwo na ihe mere ha ji na-enwe bọmbụ ndị kasị n’ike bụ n’ihi nchebe, ihe mgbochi nye mba ndị ọzọ nwekwara ngwa agha, ihe iyi egwu maka iji ihe agha nuklia emegwara ihe. N’ihi ọnọdụ dị otú ahụ nke ihe na-eme n’ụwa, echiche nkịtị ga-eme ka a ghọta na mba nile kwesịrị ikweta ka ha bikọọ ọnụ, na-anagiderịta ibe ha.
4. Ọ bụ ezie na Onye Okike ahụ egbochibeghị mgbalị nile mmadụ na-eme ịchọ ịnọ ná ntụkwasị obi, nzube dị aṅaa ka o nwere banyere nke a?
4 Otú ọ dị, ọ̀ bụ udo nkịtị nke mmadụ mere ka anyị chọrọ, tinyere ịnọ ná ntụkwasị obi nke mmadụ pụrụ iweta? Ọ bụ ezie na Onye Okike ahụ egbochibeghị mgbalị dị iche iche nke mmadụ iguzobe na ime ka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi zuru ụwa ọnụ dịrị, o nwere ụzọ zuru okè nke onwe ya maka imezu ọchịchọ anyị bu pụta ụwa maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. O nwere oge nke onwe ya maka iwepụ ihe nile na-emebi ịnọ ná ntụkwasị nke ndị nwere ọchịchọ ife ya ofufe. Lee obi ụtọ anyị pụrụ inwe ịmara na oge ya maka ime nke a dị nso!
5. Gịnị ka onye ọbụ abụ e nyere ike mmụọ nsọ kwuru banyere elu ala, gịnịkwa bụ nzube nke Onye Okike ahụ maka mmadụ?
5 Ka ọtụtụ puku afọ nke ọgba aghara nke akụkọ ihe mere eme mmadụ gasịrị, a ga-atụ anya na e kwesịrị inwe ọchịchọ siri ike n’ụwa nile maka inwe udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ụwa abụwo ebe obibi nke mmadụ dị ka okike si dị site nnọọ ná mmalite nke ịdị adị mmadụ. Onye ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ kwuru, sị: “Eluigwe bụ eluigwe Jehova nwere; ma ụwa ka o nyeworo ụmụ mmadụ.” (Abụ Ọma 115:16) Site kpọmkwem ná mmalite, ọ bụ nzube ịhụnanya nke Onye Okike ahụ na mmadụ kwesịrị ịnụ ụtọ ndụ zuru ezu n’ebe obibi elu ala nke Chineke nyeworo ya.
6. N’ụzọ dị aṅaa ka nwoke mbụ ahụ na ụmụ ya ga-esi nwee ike ime omume dị ka Chineke?
6 Dị ka ihe ndekọ nke okike na Jenesis 2:7 na-ekwu, “Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, o wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” Ọ dịghị ihe e kere eke ọzọ dị ndụ n’elu ala nke ya na mmadụ nọ n’otu ogo ná ndụ ma ọ bụ n’otu ọkwá nke ikike mmadụ—inwe ike ime dị ka Chineke n’inwe ikike n’ahụ ihe. Ọzọkwa, inwe ikike nke a n’ahụ ihe adịghịrị nanị mmadụ mbụ ahụ e kere eke kamakwa ọ bụkwa nke ụmụ ha ga-enwe ma jiri mee ihe.
7. Olee otú Adam si nweta nwunye, gịnịkwa ka o kwuru mgbe e chere ya ihe okike nke a zuru okè n’ihu?
7 N’ihi nke ahụ, Onye Okike ahụ nyere Adam nwunye. Ọ gaje ịbụ nne nke mmadụ nile ga-ebi n’elu ala n’ọdịnihu. Ọ bụ ya mere na mgbe e chere ya ihe nke a zuru okè e kere eke n’ihu, nwoke ahụ pụrụ ikwu, sị: “Nke a bụ nnọọ ọkpụkpụ si n’ọkpụkpụ m pụta, na anụ ahụ si n’anụ ahụ m pụta.” N’ihi ya, ọ kpọrọ ya nwanyị nke agbụrụ nke mmadụ, ’ish·shahʹ, nke bụ ụdị na-egosi ọnọdụ ịbụ nwanyị nke okwu Hibru ahụ a sụgharịrị ịbụ mmadụ, ya bụ, ’ish.—Jenesis 2:21-23.
8. Ntụziaka ndị dị aṅaa ka Onye Okike ahụ nyere di na nwunye mbụ ahụ?
8 Onye Okike na Nna nke eluigwe ahụ gwara di na nwunye mbụ ahụ, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu.” (Jenesis 1:28) Usoro nke a bụ ihe dị nnọọ ọhụrụ n’akụkọ ihe mere eme nke ihe ndị e kere eke nwere ọgụgụ isi. E meghị ka ndị mmụọ a na-adịghị ahụ anya bi n’eluigwe dịrị site n’ịmụ ha amụ.
9. Olee otú Abụ Ọma 8:4, 5 si kọwaa nhazi ihe ndị Chineke mere?
9 Ọ bụghị ihe ijuanya na mgbe e kere ụwa, “kpakpando ụtụtụ na-etikọ mkpu ọṅụ, ụmụ Chineke nile wee tisie mkpu ọṅụ ike.” (Job 38:7) N’oge ahụ, ihe nile dị n’udo ma nwee nkwekọ n’ime eluigwe na ala nile. N’ịbụ onye nwere oké obi ụtọ n’ihi nhazi nke ihe dị iche iche nke Chineke mere, onye ọbụ abụ ahụ n’abụ ọma nke asatọ tiri mkpu banyere mmadụ, sị: “I wee mee ka ọ fọdụrụ ya nke nta ịbụ [ndị dị ka chi, NW], i jikwa nsọpụrụ na ịma mma kpube ya n’isi dị ka okpueze.” (Ọm 8 Amaokwu 4, 5) Dị ka abụ ọma nke a kwuru, Chineke tinyere ihe nile dị n’elu ụwa ebe a n’okpuru ụkwụ mmadụ.
Mmalite nke Ịchịisi Na-emegide Emegide
10. (a) Tupu a tụrụ ime nke nwa mbụ bụ́ mmadụ, gịnị dapụtara? (b) Otú a, gịnị ka a pụrụ iguzobe n’elu ihe a kpọrọ mmadụ?
10 N’ụzọ na-eju anya, tupu a tụrụ ime nwa mbụ nke mmadụ, nnupụisi tiwapụrụ n’ime nzukọ eluigwe na ala nke Jehova Chineke. Ọnọdụ ahụ pụrụ iduga ná nguzobe nke ịchịisi ọhụrụ, ọchịchị ọhụrụ dị oké ike, n’elu ihe a kpọrọ mmadụ—ma ọ bụrụ na a pụrụ ikewapụ ụmụ mmadụ ma wezụga ha pụọ n’ebe nzukọ eluigwe na ala nke Jehova dị. A pụrụ iguzobe ịchịisi imegide nke ya. Nke a kpatara e ji ghaa ụgha mbụ ahụ, na-egosipụta Jehova Chineke n’ụzọ na-abụghị ezie.
11. Site n’ikwu ihe na-abụghị ezie banyere Jehova Chineke, gịnị ka onye nnupụisi mbụ ahụ ghọrọ?
11 Ikwu okwu ụgha mbụ ahụ mere ka onye nnupụisi mbụ nke a megide Chineke bụrụ onye mbụ ghara ụgha, ekwensu mbụ, ma ọ bụ onye nkwutọ. N’ụzọ dị nnọọ iche n’ebe ọ nọ, Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ.” (Jọn 14:6) Jisọs gwara ndị okpukpe na-emegide ya, sị: “Unu onwe unu sitere ná nna unu, bụ́ Ekwensu, ọ bụkwa ihe na-agụ nna unu ka unu na-achọ ime. Onye ahụ bụ ogbu mmadụ site ná mbụ, o guzoghịkwa n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya. Mgbe ọ bụla ọ na-ekwu okwu ụgha, ọ na-ekwu ihe si n’ihe nke aka ya pụta: n’ihi na ọ bụ onye ụgha, bụrụkwa nna ya.”—Jọn 8:44.
12. (a) Olee otú Ekwensu si mee ka a ghaa ụgha mbụ, ọ̀ bụkwa mmetụta dị aṅaa ka o nwere n’ahụ Iv? (b) Mgbe Adam riri mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro n’iwu, gịnị si na ya pụta?
12 N’ikwu okwu site n’agwọ n’ogige Iden, ma ọ bụ paradaịs nke obi ụtọ, Ekwensu mere ka e chee okwu ụgha mbụ ahụ n’ihu nwanyị mbụ ahụ. O kwuru na Onye Okike ya bụ onye ụgha, si otú a na-emebi udo nke uche nke Iv. O mere ka o nwee mmetụta nke anọghị ná ntụkwasị obi n’ọnọdụ ya nke amaghị ihe, bụ́ nke o chere nanị n’echiche, n’ihi ya o riri mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro n’iwu. Ọ rụgidere di ya bụ Adam isonyere ya rie mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro n’iwu wee si otú a sonyere ya ná nnupụisi ya megide Jehova Chineke. (Jenesis 3:1-6) Di na nwunye ahụ bụ́ ndị nnupụisi tụfuru udo ha nwere n’ebe Chineke nọ wee bụrụ ndị a chụpụrụ na paradaịs obi ụtọ ahụ ka ha wee dịwazie ndụ nke anọghị ná ntụkwasị obi n’ebe n’abụghị n’ime ogige ahụ. Ndị Rom 5:12 na-akọwa ọnọdụ nke a na-akpata mwute na-ekwu, sị: “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.”
13. Nhọrọ dị aṅaa ka onye ọ bụla n’ime anyị na-aghaghị ime taa?
13 Ọnọdụ dị n’oge anyị chọrọ ka anyị mee nhọrọ doro anya. Ọ bụ nhọrọ n’etiti ịchịisi mmegide nke Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ “chi nke oge a,” na ịchịisi nke Jehova, Onye Kachasị Ihe Nile Elu na Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile nke eluigwe na ala.—2 Ndị Kọrint 4:4; Abụ Ọma 83:18.
Ụzọ A Ga-esi Nwee Udo n’Ebe Chineke Nọ
14. Udo na ịnọ ná ntụkwasị obi dị aṅaa ka anyị pụrụ ịmalite ịma ụtọ ya ọbụna ugbu a?
14 N’ụzọ wetaworo ihe mmerụ ahụ na-egbu mgbu nye onwe ha, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’etiti ụmụ mmadụ achọghị ịnakwere ma ọ bụ ikwere n’ihe Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile nyeworo maka ndị na-efe ya ofufe iji nwee udo na ịnọ ná ntụkwasị obi a kpaara ókè ọbụna n’ọnọdụ nke a a kasị kwesị ịkwara ákwá n’ihe omume nke mmadụ. Otú ọ dị, Jehova bụ “Chineke nke udo,” ọ bụkwaara anyị ihe ùgwù a gọziri agọzi ugbu a ịbanye n’udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke na-agaghị ada ada. (Ndị Rom 16:20; Ndị Filipaị 4:6, 7, 9) Ọ bụ udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke ọ na-enye òtù nke ndị ohu ya n’elu ala, nzukọ ya a na-ahụ anya, ọbụna ugbu a, ná mmezu nke nkwa ya a pụrụ ịdabere na ya mgbe ọ bụla. Ọ bụ udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke anyị pụrụ inweta nanị site n’isonyere nzukọ ya a na-ahụ anya n’elu ala.
15. Ọ̀ bụ ihe ezi uche na-adịghị n’ime ya mmadụ iche na Chineke nwere nzukọ, gịnịkwa ka Jisọs Kraịst nakweere?
15 Ọ ga-abụ ịhapụ ozizi ndị doro anya nke Akwụkwọ Nsọ bụ́ mmadụ ikwere na Chineke enweghị nzukọ, ndị a haziri ahazi, ndị ọ bụ nanị ha ka ọ na-anakwere. Jisọs Kraịst nakweere na Nna ya nke eluigwe nwere nzukọ a na-ahụ anya. Ruo Pentikọst nke 33 O.A., ọ bụ nzukọ nke ndị Juu ahụ ha na Jehova Chineke nọ ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ n’okpuru Iwu Mosis.—Luk 16:16.
16. (a) Mosis ọ̀ bụ onye ogbugbo n’etiti ole ndị? (b) N’etiti ole ndị ka Mosis ahụ Ka Ukwuu, bú Jisọs Kraịst, bụ Onye Ogbugbo?
16 Dị nnọọ ka mba Israel ochie na Jehova Chineke nọ ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ site n’onye ogbugbo ahụ bụ Mosis, otú a ka mba Israel ime mmụọ, “Israel nke Chineke,” nọ ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ site n’aka onye ogbugbo. (Ndị Galetia 6:16) Ọ bụ dị ka Pọl onyeozi degaara onye ọrụ ibe ya bụ́ onye Kraịst n’akwụkwọ, sị: “Otu Chineke dị, otu onye ogbugbo dịkwa n’agbata Chineke na mmadụ, onye ya onwe ya bụ mmadụ, bụ́ Kraịst Jisọs.” (1 Timoti 2:5) Mosis ọ̀ bụ onye ogbugbo nke dị n’etiti Jehova Chineke na ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ya? Ee e, ọ bụ onye ogbugbo dị n’etiti Chineke nke Abraham, Aịsak, na Jekọb na mba nke ụmụ ha nke anụ ahụ. N’otu aka ahụ, Mosis ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst, abụghị Onye Ogbugbo n’etiti Jehova Chineke na ihe nile a kpọrọ mmadụ. Ọ bụ Onye Ogbugbo dị n’etiti Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova Chineke, na mba Israel ime mmụọ, nke a kpaara ọnụ ọgụgụ ndị so na ya ókè ịbụ 144,000. Mba ime mmụọ nke a dị ka ìgwè atụrụ nta nke ndị Jehova yiri atụrụ.—Ndị Rom 9:6; Mkpughe 7:4.
Onye Ọzụzụ Atụrụ n’Elu Ihe Karịrị “Ìgwè Atụrụ Nta”
17. (a) Gịnị ka Jehova Chineke kenyeworo Jisọs Kraịst ịbụ? (b) Gịnị ka Jisọs gwara ndị ahụ gaje iketa Alaeze eluigwe?
17 N’Abụ Ọma 23:1, e nyere Eze Devid nke Israel oge ochie ike mmụọ nsọ ikwu, sị: “Jehova bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ; ọ dịghị ihe kọrọ m.” Jehova, bụ́ Onye Ọzụzụ Atụrụ ahụ Kasị Ukwuu, e kenyewo Jisọs Kraịst ọrụ ịbụ “onye ọzụzụ atụrụ ọma.” (Jọn 10:11) Na Luk 12:32, Jisọs n’onwe ya gwara ndị ahụ ọ bụụrụ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma okwu, sị: “Atụla egwu, ìgwè atụrụ nta; n’ihi na ọ dị Nna unu ezi mma inye unu alaeze Ya.”
18. (a) Olee ndị taa kwekọrọ n’ìgwè ahụ gwara ọgwa soro Israel hapụ Ijipt? (b) Olee ndị ka ha na-esonyere n’ụzọ chiri anya?
18 N’oge ochie, e nwere ndị na-abụghị ndị Juu, dị ka ìgwè ahụ gwara ọgwa soro mba Israel hapụ Ijipt. (Ọpụpụ 12:38) N’otu aka ahụ taa, e nwere ndị ikom na ndị inyom, bụ́ ndị raara onwe ha kpam kpam nye Chineke site na Jisọs Kraịst, ma ha abụghị ndị Israel ime mmụọ. Otú ọ dị, ha na-esonyere ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ n’ihi nrara ha raara onwe ha nye Jehova Chineke site na Jisọs Kraịst, “onye nyere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ihi mmadụ nile.” (1 Timoti 2:6) Taa, ndị a karịrị nke ukwuu 144,000 ahụ nke ndị Israel ime mmụọ n’ọnụ ọgụgụ, bụ́ ndị ga-eketa Alaeze eluigwe.
19. Gịnị ka Jisọs Kraịst kwuru iji gosi na ya ga-abụ Onye Ọzụzụ Atụrụ n’elu ihe karịrị “ìgwè atụrụ nta” ahụ?
19 Otú a, a gaje ikenye Jisọs Kraịst ọrụ mgbe oge nke Chineke ruru ịbụ Onye Ọzụzụ Atụrụ nke ìgwè atụrụ ka nnọọ ukwuu nke ndị yiri atụrụ, bụ́ ndị gaje inweta ihe nketa nke elu ala site na ya. Ọ bụ ndị a ka o bu n’uche mgbe o kwuru, sị: “Atụrụ ọzọ ka m nwekwara, ndị na-esiteghị n’ogige atụrụ nke a: aghaghị m idutekwa ndị ahụ, ha ga-anụkwa olu m; otu ìgwè atụrụ ga-adịkwa, otu onye ọzụzụ atụrụ.” N’iburu “atụrụ ọzọ” ndị a n’uche, Jọn onyeozi dekwara banyere Jisọs, sị: “Ya onwe ya bụkwa ihe ịjụrụ Chineke obi banyere mmehie nile anyị; ma ọ bụghị ihe ịjụrụ ya obi banyere nanị mmehie nke anyị onwe anyị, kama ọ bụkwa ihe ịjụrụ ya obi banyere mmehie nke ụwa dum.”—Jọn 10:16; 1 Jọn 2:2.
20. (a) Olee ọdịiche dị n’ọnụ ọgụgụ nke “atụrụ ọzọ” ahụ na nke ihe fọdụrụ n’etiti “ìgwè atụrụ nta” ahụ? (b) Gịnị ka nlekọta ọzụzụ atụrụ nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ pụtara nye ha nile?
20 Taa, e nwere ihe dị ka 8,000 mmadụ ndị na-asị na ha so n’ihe ahụ fọdụrụ nke “ìgwè atụrụ nta” ahụ nke atụrụ ime mmụọ. N’aka nke ọzọ, e nwere ọtụtụ nde ndị raara onwe ha nye, bụ́ ndị na-esonyere ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ n’ịgbaso nzọụkwụ nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst. A ga-achọta ha n’ihe karịrị 230 ala dị iche iche gburugburu ụwa. Gịnị ka nlekọta ọzụzụ atụrụ nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ pụtara nye ha nile? Ọ pụtara ịma ụtọ nke udo na ịnọ ná ntụkwasị obi! Ọ bụrụ na ha enweghị udo n’ìgwè ha, a gaghị enwe ịdị n’otu si n’obi na imekọ ihe ọnụ a na-apụghị igbubi egbubi n’etiti ha. Ọ bụrụ na ha adịghị enwerịta nchegbu ịhụnanya n’etiti onwe ha n’ihe banyere ọdịmma ime mmụọ, ha agaghị enwe ịnọ ná ntụkwasị obi nke ha na-ama ụtọ ya. Otú a, a malitewo imezu ọbụna ugbu a ọchịchọ ha maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi zuru ụwa ọnụ.
[Foto dị na peeji nke 4, 5]
Onye Okike ahụ nwere ụzọ nke ya zuru okè maka imezu ọchịchọ mmadụ maka udo na ịnọ ná ntụkwasị obi