‘Onye Nlekọta Aghaghị Ịbụ . . . Onye Na-ejidesi Onwe Ya Ike’
“Onye ahụ nke na-elekọta nzukọ Kraịst anya aghaghị ịbụ . . . onye na-ejidesi onwe ya ike.”—TAỊTỌS 1:7, 8.
1, 2. Ihe nlereanya dị aṅaa nke njide onwe onye ka William of Orange setịpụrụ, oleekwa abamuru ndị si na ya pụta?
AKỤKỌ ihe mere eme na-enye otu ihe atụ kwesịrị nnọọ ịrịba ama nke metụtara mmadụ ịchịkwa mkpali ya nile. N’etiti narị afọ nke 16, nwa okoro onye Netherlands ahụ bụ diọkpara eze, bụ́ William of Orange so Eze Henry nke Abụọ nke France jee ịchụ nta. Eze ahụ kpugheere William atụmatụ ya na eze Spain na-eme ikpochapụ ndị Protestant nile nọ na France nakwa na Netherlands—n’eziokwu, na Krisendọm dum. Eze Henry chere na nwa okoro ahụ bụ William bụ onye na-ekpesi Katọlik ike dị ka ya onwe ya, n’ihi nke ahụ, o wee kpugheere ya atụmatụ ahụ dum. Ihe William nụrụ tụrụ ya egwu nke ukwuu n’ihi na ọtụtụ n’ime ezi ndị enyi ya bụ ndị Protestant, ma o gosipụtaghị mmetụta ọ na-enwe; kama nke ahụ, o gosiri mmasị dị ukwuu ná nkọwa nile eze ahụ nyere ya.
2 Otú ọ dị, ozugbo William pụrụ ime nke ahụ, ọ malitere ime ihe iji mebie atụmatụ ahụ, nke a mesịkwara duje na Netherlands inwere onwe ya site n’ọchịchị ndị Katọlik nke Spain. N’ihi na William nwere ike igosipụta njide onwe onye mgbe mbụ ọ nụrụ banyere atụmatụ ahụ, a maara ya dị ka “William the Silent” (William Onye Na-adịghị Ekwu Okwu). William of Orange nwere ihe ịga nke ọma nke ukwuu nke na a na-agwa anyị, sị: “Ọ bụ ya bụ onye guzobere n’ezie, nnwere onwe na ịdị ukwuu nke mba Netherlands.”
3. Olee ndị na-erite uru mgbe ndị okenye bụ ndị Kraịst na-egosipụta njide onwe onye?
3 N’ihi njide onwe onye ya, William the Silent wetaara onwe ya na ndị ya abamuru dị ukwuu. N’ụzọ a pụrụ iji tụnyere nke ahụ, ndị Kraịst bụ okenye, ma ọ bụ ndị nlekọta n’oge a, kwesịrị igosipụta mkpụrụ nke mmụọ ahụ, bụ́ njide onwe onye. (Ndị Galetia 5:22, 23) Site n’igosipụta àgwà nke a, ha na-ewetara ma onwe ha ma ọgbakọ ha abamuru. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ha egosipụtaghị njide onwe onye, nke a pụrụ ịkpata mmerụahụ dị ukwuu.
Njide Onwe Onye—Ihe A Chọrọ n’Aka Ndị Okenye
4. Ndụmọdụ dị aṅaa nke Pọl onyeozi na-emesi ya ike mkpa ọ dị ka ndị okenye gosipụta njide onwe onye?
4 Pọl, onye bụ okenye n’onwe ya, matara mkpa ọ dị inwe njide onwe onye. Mgbe ọ na-enye ndị okenye ndụmọdụ, bụ́ ndị si Efesọs bịakwute ya, ọ gwara ha, sị: “Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ ahụ dum anya.” Gụnyere ihe ndị ọzọ, ilezi onwe ha anya gụnyere mkpa nke igosipụta njide onwe onye, ilezi akparamagwa ha anya. Mgbe ọ na-edegara Timoti akwụkwọ, Pọl mere ka otu isi ihe ahụ pụta ìhè, na-asị: “Rịba onwe gị na ozizi gị ama.” Ndụmọdụ dị otú ahụ gosiri na Pọl maara mkpali ahụ dị n’ime mmadụ n’ebe ụfọdụ ndị nọ ịbụ ndị na-echegbu onwe ha karị banyere ikwusa ozi ọma karịa otú ha na-echegbu onwe ha banyere itinye ihe ha na-ekwusa n’omume. N’ihi ya, o bu ụzọ mesie ike mkpa ọ dị ilezi onwe ha anya.—Ọrụ 20:28, NW; 1 Timoti 4:16.
5. Olee ụzọ a na-esi ahọpụta ndị Kraịst bụ okenye, oleekwa ebe e dekọrọ iru eru ha nile n’ime Akwụkwọ nsọ?
5 Ka ọtụtụ afọ na-agafe, ọrụ Akwụkwọ nsọ nyere ndị okenye anọgidewo na-edowanye anya. Taa, anyị na-ahụ na a na-ahọpụta mmadụ ahọpụta ịbụ okenye. Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova ma ọ bụ ndị nnọchianya ha na-ahọpụta ndị okenye. Òtù ahụ na-anọchitekwa anya “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) N’ụzọ bụ isi, Pọl onyeozi depụtara iru eru maka ịghọ onye Kraịst bụ okenye na 1 Timoti 3:1-7 na Taịtọs 1:5-9.
6, 7. Iru eru ndị okenye dịgasị aṅaa kpọmkwem chọrọ njide onwe onye?
6 Pọl kwuru na 1 Timoti 3:2, 3 na onye nlekọta aghaghị ịbụ onye anya udo. Nke a na mkpa ọ dị ka onye bụ okenye bụrụ onye omume ya kwesịrị ekwesị chọrọ igosipụta njide onwe onye. Nwoke nke na-eru eru ịbụ onye nlekọta abụghị onye na-eti mmadụ ihe, ọ bụghịkwa onye na-alụ ọgụ. Iru eru ndị a chọkwara ka onye okenye bụrụ onye na-ejide onwe ya. Ọzọkwa, ka onye okenye wee ghara ịbụ onye na-ese okwu site n’ịṅụbiga mmanya ókè, onye na-aṅụbiga mmanya ókè, ọ ghaghị igosipụta njide onwe onye.—Leekwa nkọwa ala ala peji dị na 1 Timoti 3:2, 3, New World Translation.
7 Na Taịtọs 1:7, Pọl kwuru hoo haa na onye nlekọta aghaghị ịbụ onye na-ejidesi onwe ya ike. Otú ọ dị, rịba ama iru eru ole ndi ọzọ e depụtara n’amaokwu ndị a ndị metụtara njide onwe onye. Dị ka ihe atụ, onye nlekọta aghaghị ịbụ onye a na-apụghị ibo ebubo, ee, onye a na-apụghị ịkalu. N’ezie, onye okenye apụghị imezu ihe ndị a a chọrọ ya n’aka ọ gwụlakwa ma ọ̀ na-egosipụta njide onwe onye.
Mgbe Ọ Na-emeso Ndị Ọzọ Ihe
8. Àgwà dị aṅaa ndị ọ dị mkpa ka ndị okenye nwee mgbe ha na-enye ndụmọdụ na-emesi mkpa nke njide onwe onye ike?
8 Ọzọkwa, onye nlekọta aghaghị ịbụ onye nwere ndidi na ogologo ntachi obi mgbe ọ na-emeso ndị kwere ekwe ibe ya ihe, nke a chọkwara njide onwe onye. Dị ka ihe atụ, ná Ndị Galetia 6:1, anyị na-agụ, sị: “Ụmụnna m, a sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị mmụọ nsọ na-achị [n’ụzọ bụ isi ndị okenye], meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ; na-elezi onwe gị anya, ka a ghara ịnwakwa gị onwe gị.” Igosipụta mmụọ nke ịdị nwayọọ chọrọ njide onwe onye. N’ezie, o metụtakwara njide onwe onye, bụ́ mmadụ ilezi onwe ya anya. N’otu aka ahụ, mgbe onye nọ n’ihe isi ike kpọkuru onye okenye maka enyemaka, njide onwe onye dị mkpa nke ukwuu. N’agbanyeghị ihe onye okenye ahụ pụrụ iche banyere onye ahụ, ọ ghaghị igosi obi ọma, ndidi, na nghọta. Kama ịdị ngwa n’ịtụ aro, onye okenye aghaghị ịdị njikere ige ntị ma chọpụta site n’ọnụ onye ahụ ihe na-enye ya nsogbu n’ezie.
9. Ndụmọdụ dị aṅaa ka ndị okenye kwesịrị ibu n’uche mgbe ha na-emeso ụmụnna nọ ná mwute ihe?
9 Ndụmọdụ nke dị na Jemes 1:19 kwesịrị nnọọ ekwesị karịsịa mgbe a na-emeso onye nọ ná mwute ihe: “Unu matara nke a, ụmụnna m ndị m hụrụ n’anya. Ma ka mmadụ ọ bụla bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu, na-adịghịkwa ngwa iwe iwe.” Ee e, karịsịa mgbe o zutere mmeghachi omume nke iwe ma ọ bụ nke oké mkpali, onye okenye aghaghị ilezi anya nke ọma ka ọ ghara imeghachi ihe n’otu ụzọ ahụ. Ọ chọrọ njide onwe onye ịghara iji okwu iwe zaghachi okwu iwe, ịghara ‘inyeghachi onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ.’ (Ndị Rom 12:17) Ịzaghachi n’otu ụzọ ahụ na-eme nnọọ ka ihe dị njọ dịwanye njọ. Ya mere, n’ebe a kwa, Okwu Chineke na-enye ndị okenye ndụmọdụ dị mma, na-echetara ha na “ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ.”—Ilu 15:1.
Njide Onwe Onye ná Nzukọ Ndị Okenye na ná Nnọkọ Ikpe
10, 11. Gịnị meworo ná nzukọ dị iche iche nke ndị okenye, na-egosi mkpa nke njide onwe onye n’oge ndị dị otú ahụ?
10 Akụkụ ọzọ ebe ọ dị ndị nlekọta bụ ndị Kraịst mkpa ilezi anya iji gosipụta njide onwe onye bụ n’oge nzukọ ndị okenye. Ikwulite okwu n’ụzọ dị nro maka ọdịmma nke eziokwu na ikpe ziri ezi na-achọ oké njide onwe onye mgbe ụfọdụ. Ọ na-ewekwa njide onwe onye izere ịchọ ka ọ bụrụ nanị otu onye ka a na-anụ olu ya ná mkparịta ụka. N’ebe onye okenye nwere àgwà dị otú ahụ, ọ ga-abụ obi ọma ka onye okenye ọzọ nye ya ndụmọdụ.—Tụlee 3 Jọn 9.
11 Ọzọkwa, ná nzukọ ndị okenye, a pụrụ ịnwa onye okenye nke na-anụbiga ọkụ n’obi ókè ịmalite inwe oké mkpali, ọbụna iweli olu ya elu. Lee nnọọ ka àgwà ndị dị otú ahụ na-esi egosipụta enweghị njide onwe onye! Ha bụ n’ezie mmegbu onwe onye okpukpu abụọ. N’otu akụkụ, ruo n’ókè mmadụ na-adịghị ejide onwe ya, ọ bụ n’ókè ahụ ka ọ na-anapụ onwe ya nkwado site n’ime ka mkpali mmetụta kpuchie usoro iche echiche dị mma. N’aka nke ọzọ, ruo n’ókè onye ahụ na-egosipụta oké mkpali, o yiri ka ọ̀ na-akpasu ndị okenye ibe ya iwe, ọbụna na-eme ka ha nọrọ dị ka ndị iro. E wezụga nke ahụ, ọ gwụlakwa ma ndị okenye hà leziri anya, oké ndịrịta iche nke echiche pụrụ ịkpata nkewa n’etiti ha. Nke a na-akpatara ha onwe ha na ọgbakọ ahụ dum mmerụahụ.—Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 15:36-40.
12. Mgbe a na-eme ihe n’ọnọdụ dịgasị aṅaa ka ndị okenye na-aghaghị ilezi anya iji gosipụta njide onwe onye?
12 Njide onwe onye dịkwa ndị okenye oké mkpa ka ha wee zere ịbụ ndị na-ele mmadụ anya n’ihu ma ọ bụ ndị na-eji ike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọ dị nnọọ mfe ịdabara ọnwụnwa, ikwere ka ntụgharị uche nke mmadụ na-ezughị okè metụta ihe mmadụ na-ekwu ma ọ bụ ihe ọ na-eme! Ugboro ugboro, ndị okenye adawo n’ime ihe pụtara ìhè mgbe a hụrụ na ikpe àgwà ọjọọ mara otu n’ime ụmụ ha ma ọ bụ onye ikwu ha ọzọ. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ọ na-ewe njide onwe onye ịghara ikwere ka njikọ nke ọbara kpuchie ime ihe n’ikpe ziri ezi.—Deuterọnọmi 10:17.
13. N’ihi gịnị ka njide onwe onye ji dị mkpa karịsịa n’aka ndị okenye n’oge a na-enwe nnọkọ ikpe?
13 Ọnọdụ ọzọ ebe njide onwe onye dị oké mkpa bụ mgbe e nwere nnọkọ ikpe. Ndị okenye aghaghị igosipụta njide onwe onye dị ukwuu ka mkpali nke mmetụta ghara inwe mmetụta na-ezighị ezi n’ebe ha nọ. Ha ekwesịghị ịbụ ndị ọ na-adị mfe iji anya mmiri ghọgbuo ha. N’otu mgbe ahụ, onye okenye aghaghị ilezi anya ka oké iwe ghara ịmalite iwe ya mgbe a malitere iborịta ebubo dị iche iche, a pụkwara ikwutọ ya, dị ka ọ pụrụ ịdị mgbe a na-emeso ndị si n’ezi ofufe dapụ. N’ebe a, okwu Pọl kwesịrị nnọọ ekwesị: “Ohu nke Onyenwe anyị aghaghị ịbụ onye na-adịghị alụ ọgụ, kama ọ ghaghị ịdị nwayọọ n’ebe mmadụ nile nọ.” Ọ na-ewe njide onwe onye iji gosipụta ịdị nwayọọ n’okpuru nrụgide. Pọl gara n’ihu igosi na “ohu nke Onyenwe anyị” aghaghị ịbụ “onye na-anagide ihe ọjọọ, n’ịdị nwayọọ na-adọ ndị na-edo onwe ha imegide ya aka ná ntị.” Iji gosipụta ịdị nwayọọ ma jigidesie onwe onye ike mgbe a na-emeso mmegide na-ewe njide onwe onye dị ukwuu.—2 Timoti 2:24, 25.
Njide Onwe Onye n’Ebe Ndị Na-abụghị Nwoke Ibe Ha Nọ
14. Ezi ndụmọdụ dị aṅaa ka ndị okenye kwesịrị ịgbaso ná mmekọrịta ha na ndị na-abụghị nwoke ibe ha?
14 Ndị okenye aghaghịkwa ilezi anya nke ọma ka ha gosipụta njide onwe onye mgbe a bịara n’ihe banyere mmeso ha n’ebe ndị na-abụghị nwoke ibe ha nọ. Ọ bụ ihe na-ekwesịghị ekwesị onye okenye ije nleta ọzụzụ atụrụ n’ebe nwanna nwanyị nanị ya. Onye okenye ahụ kwesịrị ịkpọrọ okenye ọzọ ma ọ bụ ohu na-eje ozi. Ma eleghị anya, n’igosi na ya ghọtara nsogbu nke a, Pọl dọrọ okenye ahụ bụ Timoti aka ná ntị, sị: ‘Na-arịọ ndị inyom, bụ́ ndị okenye, arịrịọ dị ka ndị bụ nne; ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne nwanyị, n’ịdị ọcha nile.’ (1 Timoti 5:1, 2) A hụwo ka ndị okenye ụfọdụ na-ebikwasị nwanna nwanyị aka dị ka à ga-asị na ọ bụ omume yiri nke nna. Ma ha pụrụ ịnọ na-arafu onwe ha, n’ihi na ọ pụrụ ịbụ mkpali ihe ụtọ kama ịbụ ezi mmetụta ụmụnna ndị Kraịst dị ọcha na-akpali omume dị otú ahụ.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 7:1.
15. Olee ụzọ otu ihe mere eme si mee ka ọ pụta ìhè, bụ́ nkọcha a pụrụ iwetara aha Jehova mgbe onye okenye na-egosipụtaghị njide onwe onye?
15 Lee nnọọ otú e siworo mebiere eziokwu ahụ ihe n’ụzọ dị ukwuu n’ihi na ụfọdụ ndị okenye egosipụtaghị njide onwe onye ná mmeso ha na-emeso ụmụnna nwanyị nọ n’ọgbakọ! N’afọ ole na ole gara aga, a chụpụrụ otu onye okenye n’ọgbakọ n’ihi na ọ kwasoro otu nwanna onye Kraịst bụ nwanyị iko, onye di ya na-abụghị Onyeàmà. Kpọmkwem n’uhuruchi ụbọchị a mara ọkwa nchụpụ nke onye ahụ bụbu okenye, onye ahụ bụ di nke a kpasuru iwe bu égbè mabata n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze wee gbaa mmadụ abụọ ahụ ikpe mara égbè. Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ha nwụrụnụ, a napụtakwara ya égbè ahụ ozugbo, ma n’echi ya, otu nnukwu akwụkwọ akụkọ dere n’ihu akwụkwọ ya otu akụkọ banyere ‘ịgba égbè n’ụlọ chọọchị.’ Lee nnọọ nkọcha enweghị njide onwe onye nke onye okenye ahụ wetaara ọgbakọ na aha Jehova!
Njide Onwe Onye n’Akụkụ Ndị Ọzọ
16. N’ihi gịnị ka ndị okenye na-aghaghị ilezi anya iji gosipụta njide onwe onye mgbe ha na-ekwu okwu ihu ọha?
16 Njide onwe onye dịkwa mkpa nke ukwuu mgbe onye okenye na-ekwu okwu ihu ọha. Onye na-ekwu okwu ihu ọha kwesịrị ịbụ ihe nlereanya nke onye nwere obi ike, kwụrụkwa chịm. Ụfọdụ ndị na-anwa ime ndị na-ege ha ntị ihe ọchị site n’ikwu ọtụtụ okwu ọchị ndị e mere nanị ka e wee mee ka ndị na-ege ntị chịa ọchị. Nke a pụrụ igosipụta na onye ahụ na-adaba n’ọnwụnwa nke ime ihe ga-atọ ndị na-ege ya ntị ụtọ. Otú ọ dị, ịdaba n’ọnwụnwa bụ enweghị njide onwe onye. A pụrụ ọbụna ikwu na iri oge mgbe a na-ekwu okwu na-egosipụta enweghị njide onwe onye, dịkwa ka emeghị ezi nkwadebe.
17, 18. Ọrụ dị aṅaa ka njide onwe onye na-arụ n’onye okenye ịhazi ibu ọrụ ya dị iche iche?
17 Onye okenye ọ bụla nke na-arụsi ọrụ ike aghaghị imeri ihe ịma aka nke ịhazi ihe dị iche iche ọ na-eji oge na ike ya eme. Ọ na-ewe njide onwe onye ịghara imebiga ihe ókè gaa n’otu akụkụ ma ọ bụ n’akụkụ ọzọ. Ụfọdụ ndị okenye enwewo nchegbu dị ukwuu banyere ihe ọgbakọ chọrọ ha n’aka nke na ha elefuruwo ezinụlọ ha anya. Otú a, mgbe otu nwanna nwanyị gwara nwunye onye okenye banyere ezi nleta ọzụzụ atụrụ onye okenye ahụ letara ya, nwunye onye okenye ahụ tiri mkpu, sị: “Ọ ga-amasị m nnọọ ma a sị na ọ na-eleta m nleta ọzụzụ atụrụ mgbe ụfọdụ!”—1 Timoti 3:2, 4, 5.
18 Njide onwe onye dịkwa onye okenye mkpa iji hazie oge ọ na-etinye n’ọmụmụ ihe onwe onye na nke ọ na-etinye n’ije ozi ubi ma ọ bụ n’ime nleta ọzụzụ atụrụ. N’iburu n’uche otú obi mmadụ si bụrụ ihe dị aghụghọ, ọ dị nnọọ mfe onye okenye itinye oge dị ukwuu karịa otú o kwesịrị ime n’ihe na-enye ya ọṅụ karịa. Ọ bụrụ na ịgụ akwụkwọ na-amasị ya, ọ pụrụ ịdị na-etinye oge ka ukwuu n’ọmụmụ ihe onwe onye karịa otú o kwesịrị. Ọ bụrụ na ije ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-esitụrụ ya ike, ọ pụrụ ịchọta ihe ngọpụ ọ ga-eji lefuru ya anya ma na-etinye oge n’ime nleta ọzụzụ atụrụ.
19. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị okenye nwere nke na-emesi ya ike mkpa ọ dị ijide onwe onye?
19 Ibu ọrụ nke ichebe okwu nzuzo chọkwara ka onye okenye mụrụ anya banyere igosipụta ijidesi onwe onye ike. N’ebe a, ndụmọdụ ahụ kwesịrị ekwesị, nke bụ: “Ekpughekwala izu nzuzo nke onye ọzọ.” (Ilu 25:9) Ihe mere eme na-egosi na nke a pụrụ ịbụ iru eru nke e mebiworo karịsịa n’etiti ndị okenye. Ọ bụrụ na onye okenye nwere nwunye nke maara ihe, na-ahụkwa ya n’anya, onye ya na ya na-ekwurịta okwu nke ọma, ọ pụrụ ịdị na-enwe àgwà nke isoro ya kparịta ma ọ bụ nanị kwutetụ okwu banyere okwu ndị kwesịrị ịbụ ihe nzuzo. Ma nke a ekwesịghị ekwesị, ọ bụkwa ihe amamihe na-adịghị na ya ma ọlị. Nke mbụ, ọ na-emebi ntụkwasị obi. Ụmụnna ime mmụọ ndị nwoke na ndị nwanyị na-abịakwute ndị okenye ịkọrọ ha ihe nzuzo n’ihi na ha nwere ntụkwasị obi na a ga-ejigidesi okwu ahụ ike dị ka ihe nzuzo. Ịkọrọ nwunye mmadụ okwu nzuzo ezighị ezi, ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya, ọ bụkwa ihe na-adịghị egosi ịhụnanya n’ihi na nke a na-ebokwasị nwanyị ahụ ibu arọ ọ na-adịghị mkpa na ọ ga-eburu.—Ilu 10:19; 11:13.
20. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka ndị okenye gosipụta njide onwe onye?
20 N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, njide onwe onye dị nnọọ oké mkpa, karịsịa n’ebe ndị okenye nọ! N’ihi ịbụ ndị e nyeworo ihe ùgwù nke ịbụ ndị na-edu ndú n’etiti ndị Jehova, ha ga-aza ajụjụ ka ukwuu. Ebe e nyeworo ha ihe dị ukwuu, a ga-atụ anya ihe dị ukwuu n’aka ha. (Luk 12:48; 16:10; tụlee Jemes 3:1.) Ọ bụ ihe ùgwù na ọrụ dịịrị ndị okenye isetịpụ ezi ihe nlereanya nye ndị ọzọ. Karịa nke ahụ, ndị okenye a họpụtara ahọpụta nọ n’ọnọdụ ime ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ karị ndị ọzọ, na-adaberekarị ma hà gosipụtara njide onwe onye ma ọ bụ na ha egosipụtaghị ya. Ka a sịkwa ihe mere Pọl ji kwuo, sị: “Onye ahụ nke na-elekọta nzukọ Kraịst anya aghaghị ịbụ . . . onye na-ejidesi onwe ya ike.”
Ị̀ Na-echeta?
◻ Iru eru Akwụkwọ nsọ dị aṅaa nke ndị okenye na-egosi na ha aghaghị igosipụta njide onwe onye?
◻ N’ihi gịnị ka njide onwe onye ji dị ndị okenye mkpa mgbe ha na-emeso ndị kwere ekwe ibe ha ihe?
◻ Olee ụzọ e kwesịrị isi gosipụta njide onwe onye ná nzukọ ndị okenye?
◻ Ihe ịma aka dị aṅaa ka mkpa nke ndị okenye idebe okwu nzuzo na-eche ha n’ihu?
[Foto dị na peeji nke 20]
Igosipụta njide onwe onye dị mkpa ná nzukọ ndị okenye
[Foto dị na peeji nke 23]
Ndị Kraịst bụ okenye aghaghị igosipụta njide onwe onye, debekwa okwu nzuzo