IHE ỌMỤMỤ NKE 40
Izi Ezi nke Ihe E Kwuru
N’IHI gịnị ka Onye Kraịst pụrụ iji kwuo ihe na-abụghị eziokwu? Ọ pụrụ ịbụ nanị na ọ na-ekwughachi ihe ọ nụrụ, n’ewepụtaghị oge wee chọpụta ihe ndị bụ́ eziokwu. Ma ọ bụ, ọ pụrụ ikwu okwu banyere otu ihe karịa otú ọ dị, n’ihi na n’amaghị ama, ọ gụhiere ihe n’ebe ihe o kwuru si. Mgbe anyị na-elezi anya ịdị na-ekwu ihe ziri ezi ọbụna n’ụmụ obere ihe, ndị na-ege anyị ntị ga-ahụ na ha pụrụ inwe obi ike n’ịbụ eziokwu nke akụkụ ndị ka mkpa nke ozi anyị.
N’ozi Ubi. N’ịmata na ọ dị ọtụtụ ihe ha na-amụtabeghị, ọtụtụ ndị na-atụ ụjọ ịmalite ozi ubi. Ma, ha na-achọpụta n’oge na-adịghị anya na ha nwere ike ịgba àmà dị irè, n’agbanyeghị na ha maara nanị ihe ndị bụ́ isi banyere eziokwu ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? Isi ihe dị mkpa bụ ime nkwadebe.
Tupu ị gawa ozi ubi, mata isiokwu ị chọrọ ikwu banyere ya nke ọma. Gbalịa ibu ụzọ chepụta ajụjụ ndị ga-ege gị ntị pụrụ ịjụ. Chọọ azịza ndị na-eju afọ dabeere na Bible. Nke a ga-eme ka ị dị njikere iji obi ruru ala nye azịza ndị ziri ezi. Ị̀ gaje iduzi ọmụmụ Bible? Tụleghachi ihe ọmụmụ ahụ nke ọma. Jide n’aka na ị ghọtara ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ maka azịza nye ajụjụ ndị e biri ebi.
Gịnị ma ọ bụrụ na onye nwe ụlọ ma ọ bụ onye ọrụ ibe gị ajụọ ajụjụ ị na-ejikereghị ịza? Ọ bụrụ na ị maghị azịza ziri ezi nye ya, merie ọnwụnwa nke ịkọ nkọ́. “Obi onye ezi omume na-atụgharị uche n’ịza okwu.” (Ilu 15:28) Ị pụrụ inweta enyemaka dị gị mkpa n’akwụkwọ Reasoning From the Scriptures ma ọ bụ ‘n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Bible Maka Nkwurịta Okwu’ ma ọ bụrụ na e nwere ha n’asụsụ unu. Ọ bụrụ na i jighị nke ọ bụla n’ime ha, kwee nkwa na ị ga-eme nnyocha ma laghachi. Ọ bụrụ na onye ahụ jụrụ ajụjụ nwere obi eziokwu, ọ ga-echere iji nweta azịza ziri ezi. N’ezie, ọ pụrụ inwe mmasị n’ịdị umeala n’obi gị.
Iso ndị nkwusa nwere ahụmahụ na-arụ ọrụ n’ozi ubi pụrụ inyere gị aka ịzụlite nkà n’ijizi Okwu Chineke ejizi. Rịba ama akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ha na-eji eme ihe na otú ha na-esi eji ha atụgharị uche. Jiri ịdị umeala n’obi nakwere aro ọ bụla ha tụrụ ma ọ bụ mgbazi olu ọ bụla ha nyere. Onye na-eso ụzọ, nke na-anụ ọkụ n’obi, bụ́ Apọlọs ritere uru site n’enyemaka o nwetara site n’aka ndị ọzọ. Luk kọwara Apọlọs dị ka “onye ọkà okwu,” onye “makwaara Akwụkwọ Nsọ nke ọma,” nakwa onye “na-anụ ọkụ na mmụọ,” nwoke nke “na-ekwu okwu ma na-ezi ihe ndị metụtara Jizọs n’ụzọ ziri ezi.” Ma, e nwere ihe ndị ọ na-aghọtaghị. Mgbe Prisila na Akwila chọpụtara nke a, ha “kpọbatara ya n’etiti onwe ha ma kọwaara ya ụzọ Chineke n’ụzọ ziri ezi karị.”—Ọrụ 18:24-28.
“Na-ejidesi Okwu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi Aka Ike.” Ihe omume anyị ná nzukọ kwesịrị igosipụta oké nkwanye ùgwù maka ọrụ ọgbakọ na-arụ dị ka “ogidi na ihe nkwado nke eziokwu.” (1 Tim. 3:15) Iji jidesie eziokwu ahụ aka ike, ọ dị mkpa na anyị ghọtara ihe akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị anyị na-eme atụmatụ iji mee ihe n’okwu na-ekwu. Buru n’uche ihe ndị gbara ha gburugburu na nzube ha.
A pụrụ ikwughachi ihe ị nọ ná nzukọ ọgbakọ kwuo. N’eziokwu, “anyị nile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) Ma ị ga-erite uru site n’ịzụlite àgwà ndị ga-atụnye ụtụ n’ikwu okwu ziri ezi. Ọtụtụ ụmụnna nwoke bụ́ ndị debanyere aha ha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ga-aghọ ndị okenye ka oge na-aga. A na-atụ anya “ihe ka ukwuu” n’aka ndị e nyere ibu ọrụ dị otú ahụ. (Luk 12:48) Ọ bụrụ na onye okenye, n’ihi elezighị anya, enye ndụmọdụ na-ezighị ezi nke kpataara ndị òtù ọgbakọ oké nsogbu, okenye ahụ pụrụ iwetara onwe ya iwe Chineke. (Mat. 12:36, 37) Ya mere, nwanna nwoke nke ruru eru ịbụ okenye aghaghị ịbụ onye a maara maka ịdị “na-ejidesi okwu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi aka ike n’ihe metụtara nkà izi ihe ya.”—Taị. 1:9.
Lezie anya iji hụ na ihe ndị ị na-ekwu kwekọrọ ‘n’ụkpụrụ nke okwu ndị na-enye ezi ndụ,’ ndị na-apụta ìhè n’eziokwu dum nke Akwụkwọ Nsọ. (2 Tim. 1:13) Nke a ekwesịghị imenye gị ụjọ. Ikekwe ị gụchabeghị Bible dum. Nọgide na-agụ ya. Ma ka ọ dịgodị, rịba ama otú aro ndị na-esonụ pụrụ isi nyere gị aka inyocha ihe ọmụma ị na-eche echiche iji mee ihe n’izi ihe gị.
Nke mbụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe ọmụma a ò kwekọrọ n’ihe m mụtaworo site na Bible? Ọ̀ ga-eme ka ndị ga-ege m ntị bịaruo Jehova nso, ka ọ̀ na-ebuli amamihe nke ụwa elu, na-agba ndị mmadụ ume ịbụ ndị ọ na-eduzi?’ Jizọs sịrị: “Okwu gị bụ eziokwu.” (Jọn 17:17; Deut. 13:1-5; 1 Kọr. 1:19-21) Ọzọ, jiri ihe ndị e ji amụ ihe, bụ́ ndị òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche na-ewepụta, na-eme ihe nke ọma. Ha ga-enyere gị aka ọ bụghị nanị ịghọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche n’ụzọ ziri ezi kamakwa iji ezi uche jiri ha na-eme ihe ruo n’ókè kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na i mee ka okwu gị gbakwasị ụkwụ ‘n’ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ’ ma na-adabere n’ụzọ Jehova si ezi ozi mgbe ị na-akọwa ma jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ dị iche iche na-eme ihe, ihe ndị ị na-ekwu ga-ezi ezi.
Inyocha Izi Ezi nke Ihe Ọmụma. Okwu ndị a kpụ n’ọnụ, ihe ndị ọzọ kwuru, na ahụmahụ pụrụ inye aka mgbe ị na-eme ihe atụ ma jiri isi ihe ụfọdụ na-eme ihe. Olee otú ị pụrụ isi jide n’aka na ha ziri ezi? Otu ụzọ bụ isi n’ebe ndị a pụrụ ịtụkwasị obi were ha. Cheta ka i mee nchọpụta iji jide n’aka na ihe ọmụma ahụ bụ nke kasị ọhụrụ. Ndekọ ọnụ ọgụgụ na-eme ochie; ọ naghị egbu oge e nwee nchọpụta sayensị ndị ọhụrụ bụ́ ndị karịrị nke mbụ e nwere; ka mmadụ na-amụtakwukwa banyere akụkọ ihe mere eme na asụsụ oge ochie, ọ na-adị mkpa ịgbanwe nkwubi okwu ndị dabeere n’ihe ndị a mabu. Kpachara nnọọ anya ma ọ bụrụ na ị na-eche echiche iji ihe ọmụma sitere n’akwụkwọ akụkọ, telivishọn, redio, ozi sitere na kọmputa, ma ọ bụ Intanet eme ihe. Ilu 14:15 na-adụ ọdụ, sị: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla; ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” Jụọ onwe gị, sị: ‘À ma ebe m si weta ihe ọmụma a ama dị ka nke na-ekwu ihe ziri ezi? Ọ̀ dị ụzọ ọzọ a pụrụ isi nwapụta ịbụ eziokwu nke ihe ọmụma a?’ Ọ bụrụ na ị na-enwe obi abụọ banyere ịbụ eziokwu nke otu ihe, hapụ ya.
Tụkwasị n’inyocha ma à pụrụ ịtụkwasị ebe ihe ọmụma ndị ahụ si obi, jiri nlezianya tụlee otú ị na-eme atụmatụ isi jiri ihe ọmụma ahụ mee ihe. Jide n’aka na otú i si jiri ihe ndị ọzọ kwuru na ndekọ ọnụ ọgụgụ eme ihe kwekọrọ n’ọnọdụ ebe e si were ha. Ná mgbalị imesi ihe ị na-ekwu ike, kpachara anya ka “ụfọdụ ndị” ghara ịghọ “ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ,” na “ọtụtụ ndị” aghọghị “onye ọ bụla,” nakwa na “n’ọnọdụ ụfọdụ” aghọghị “mgbe nile.” Ikwubiga okwu ókè ma ọ bụ ịkọ akụkọ ndị metụtara ọnụ ọgụgụ, ókè ihe hà, ma ọ bụ otú ihe dịruru njọ, karịa otú ha dị na-eme ka a na-enyo ịbụ eziokwu ha enyo.
Mgbe ị na-ekwu ihe ziri ezi mgbe nile, a ga-abịa mara gị dị ka onye na-eji eziokwu akpọrọ ihe. Nke a na-enwe mmetụta dị mma n’otú e si ele Ndịàmà Jehova anya dị ka otu ìgwè. Nke ka mkpa, ọ na-ewetara “Jehova, Chineke nke eziokwu” nsọpụrụ.—Ọma 31:5.