Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 2/15 p. 24-25
  • Ihe Mere Ofufe Ndị Kraịst Ji Dị Elu Karị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere Ofufe Ndị Kraịst Ji Dị Elu Karị
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kraịst Dị Elu Karịa Ndị Mmụọ Ozi na Mosis
  • Ndị Kraịst Abanye n’Izu Ike nke Chineke
  • Ịbụ Onye Nchụaja na Ọgbụgba Ndụ nke Dị Elu Karị
  • Okwukwe Dị Oké Mkpa!
  • Atụrụ Ọzọ ahụ na Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ngọzi Ndị Ka Ukwuu Site n’Ọgbụgba Ndụ Ọhụrụ Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Òtù Ndị Nchụàjà Bụ́ Ndị Eze Ndị Ga-abara Mmadụ Niile Uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 2/15 p. 24-25

Ihe Mere Ofufe Ndị Kraịst Ji Dị Elu Karị

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Hibru

JEHOVA CHINEKE webatara akụkụ ụfọdụ nke ofufe ndị dị elu karị mgbe o zitere Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst n’elu ala. Nke ahụ dị otú ahụ n’ihi na Jisọs, bụ́ Onye Guzobere Iso Ụzọ Kraịst dị elu karịa ndị mmụọ ozi na onye amụma ahụ bụ Mosis. Ịbụ onye nchụaja nke Kraịst dị elu nke ukwuu karị ma e jiri ya tụnyere nke ndị Livaị n’Israel oge ochie. Àjà nke Jisọs dịkwa elu nke ukwuu karịa anụmanụ ndị ahụ a na-eji achụ àjà n’okpuru Iwu Mosis.

E mere ka isi ihe ndị a pụta ìhè n’akwụkwọ ozi ahụ e degaara ndị Hibru. Ihe àmà gosiri na Pọl onyeozi nọ na Rom dee ya n’ihe dị ka 61 O.A., zijekwara ya ndị Hibru bụ ndị kwere ekwe nọ na Judia. Site n’oge ndị gara aga, ndị Kraịst bụ ndị Grik na ndị Esia kwere na ọ bụ Pọl dere ya, a kwadokwara nke a site n’ọmụma zuru ezu onye dere ya maara Akwụkwọ Nsọ Hibru, na ojiji o jiri mwulite nke ezi uche dị n’ime ya wee mee ihe, bụ́ ihe ndị e ji mara onyeozi ahụ. Ọ pụrụ ịbụ na ọ hapụrụ ide aha ya n’ihi asị ahụ ndị Juu kpọrọ ya, nakwa n’ihi na a maara ya dị ka “onyeozi nke ndị mba ọzọ.” (Ndị Rom 11:13) Ugbu a, ka anyị lebakwuo anya n’akụkụ ndị ahụ ka elu nke Iso Ụzọ Kraịst, dị ka e gosipụtara ha n’akwụkwọ ozi ahụ Pọl degaara ndị Hibru.

Kraịst Dị Elu Karịa Ndị Mmụọ Ozi na Mosis

Ihe mbụ e gosiri bụ ọnọdụ dị elu karị nke Ọkpara Chineke nwere. (1:1–3:6) Ndị mmụọ ozi na-akpọ isiala nye ya, ọchịchị eze ya daberekwara na Chineke. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịṅabiga ntị ókè n’ihe Ọkpara ahụ kwuru. Karịsịa, anyị kwesịrị icheta na ọ bụ ezie na nwoke ahụ bụ Jisọs dịrị ala karịa ndị mmụọ ozi, e buliri ya gaa n’ọnọdụ dị elu karịa ha, nyekwa ya ike ịchị elu ala dum mmadụ bi nke gaje ịbịa.

Jisọs dịkwa elu karịa Mosis. Ò si aṅaa dị otú ahụ? Ee, Mosis bụ nanị onye na-eje ozi n’ụlọ Chineke nke dị n’Israel. Otú ọ dị, Jehova debere Jisọs ilekọta ụlọ ahụ dum, ma ọ bụ ọgbakọ nke ndị Chineke.

Ndị Kraịst Abanye n’Izu Ike nke Chineke

Onyeozi ahụ gara n’ihu ime ka ọ pụta ìhè na o kwere omume ịbanye n’izu ike nke Chineke. (3:7–4:13) Ndị Israel ahụ a tọhapụrụ site n’ịbụ ohu n’Ijipt abanyeghị na ya n’ihi na ha nupụrụ isi, ha enweghịkwa okwukwe. Ma anyị pụrụ ịbanye n’izu ike ahụ ma ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’ebe Chineke nọ, jirikwa nrubeisi na-eso Kraịst. Ya mere, kama ịnọ na-edebe Ụbọchị Izu Ike nke a na-enwe kwa izu, anyị ga-anọ kwa ụbọchị na-enweta ngọzi dị elu karị nke izu ike site n’ọrụ nile nke ịchọ ọdịmma onwe onye.

Ịbanye n’izu ike Chineke bụ otu nkwa nke dị n’okwu ya, bụ́ nke “dịkwa nkọ karịa mma agha ọ bụla nke nwere ihu abụọ, na-adụkwa ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ.” Ọ na-eme nke a n’echiche nke bụ na ọ na-abami abami ịchọpụta mkpali na àgwà nile, ime nkewa n’etiti ọchịchọ anụ ahụ na mkpali usoro echiche. (Tụlee Ndị Rom 7:25.) Ọ bụrụ na a tụkwasị “mmụọ,” ma ọ bụ mkpali nke nsọpụrụ Chineke ná “mkpụrụ obi,” ma ọ bụ ndụ anyị dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu, anyị pụrụ ịbanye n’izu ike nke Chineke.

Ịbụ Onye Nchụaja na Ọgbụgba Ndụ nke Dị Elu Karị

Pọl gara n’ihu igosi ịdị elu karị nke ọbụbụ onye nchụaja nke Kraịst nakwa nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. (4:14–10:31) Jisọs Kraịst ahụ nke na-enweghị mmehie ọ bụla nwere ọmịiko n’ebe ụmụ mmadụ na-emehie emehie nọ n’ihi na, dị ka anyị, a nwawo ya n’akụkụ nile. Ọzọkwa, Chineke ahọpụtawo ya ịbụ “onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị.” N’adịghị ka ndị isi nchụaja bụ ndị Livaị, Jisoṣ nwere ndụ a na-apụghị ibibi ebibi, o wee si otú a bụrụ na ọ dịghị ya mkpa inwe onye ga-anọchi anya ya n’ọrụ nzọpụta ya. Ọ dịghị ya mkpa ịchụ àjà ụmụ anụmanụ, n’ihi na o jiriwo ahụ ya nke dị elu nke ukwuu karị, nke na-enweghị mmehie ọ bụla, chụọ àjà, o jiriwokwa uru nke ọbara ya banye n’eluigwe.

Ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, nke e mere ka ọ dị irè site n’ọbara Jisọs, dị elu karịa ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nwere iwu Chineke n’ime obi ha, na-enwetakwa mgbaghara mmehie. (Jeremaịa 31:31-34) Ekele ha nwere maka nke a na-akpali ha ime nkwupụta ihu ọha nke olileanya ha nakwa iso ndị kwere ekwe ibe ha na-ezukọ. N’adịghị ka ha, ndị leziri anya na-eme mmehie enweghị àjà ọ bụla fọdụụrụ mmehie.

Okwukwe Dị Oké Mkpa!

Iji wee rite uru site n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke dị elu karị, ọ dị anyị mkpa inwe okwukwe. (10:32–12:29) Ọ dịkwa anyị mkpa inwe ntachi obi ka anyị wee nata ihe Jehova kweworo ná nkwa. Dị ka ihe agbamume iji nwee ntachi obi, anyị nwere “oké ìgwè” nke ndị àmà ndị nọrọ tupu oge ndị Kraịst ndị gbara anyị gburugburu. Otú ọ dị, anyị kwesịrị ịtụle nke ọma karịsịa ụzọ na-enweghị ntụpọ ọ bụla Jisọs gbasoro n’okpuru ịta ahụhụ. N’otu echiche, a pụrụ ile ahụhụ ọ bụla nke Chineke kwere ka ọ bịakwasị anyị anya dị ka ọzụzụ nke pụrụ ịmịpụta mkpụrụ ahụ dị n’udo nke bụ ezi omume. Eziokwu ahụ nke bụ na nkwa nile nke Jehova bụ ihe a pụrụ ịdabere na ha kwesịrị ịmụbawanye ọchịchọ anyị iji “egwu Chineke na ụjọ” na-ejere ya ozi dị nsọ.

Pọl ji okwu agbamume dị iche iche mechie ozi ya. (13:1-25) Okwukwe kwesịrị ịkpali anyị igosipụta ịhụnanya ụmụnna, na-ele ndị ọbịa anya nke ọma, na-echeta ndị kwere ekwe ibe anyị ndị na-ata ahụhụ, na-asọpụrụ alụmdi na nwunye, na-ekwe “ka afọ ju [anyị] n’ihe [anyị] nwere ugbu a.” Anyị kwesịrị iṅomi okwukwe nke ndị ahụ na-edu ndú n’ọgbakọ, rubekwara ha isi. Karịsịa, anyị aghaghị izere ndapụ n’ezi ofufe, nakwere nkọcha nke Jisọs nakweere, “na-achụ àjà, bụ́ otuto nye Chineke mgbe nile,” nọgidekwa na-eme ezi ihe. Àgwà dị otú ahụ sokwa n’akụkụ ndị dị elu karị nke ezi Ịsọ Ụzọ Kraịst.

Igbe/Foto dị na peeji nke 24]

Baptism Dị Iche Iche: Akụkụ dị iche iche nke ofufe a na-efe n’ụlọ ikwuu dị n’Israel metụtara “nanị . . . ihe oriri na ihe ọṅụṅụ na ime baptism dị iche iche.” (Ndị Hibru 9:9, 10) Baptism ndị a bụ ịsachasị ihe n’usoro ofufe dị ka Iwu Mosis si chọọ ya. A na-asa arịa ndị e mere ka ha dị ọcha mmiri, ime ka a dị ọcha n’usoro ofufe gụnyekwara mmadụ ịsa uwe ya na ịsa ahụ. (Levitikọs 11:32; 14:8, 9; 15:5) Ndị nchụaja na-asa ahụ, ha na-aṅachakwa ihe ndị e ji achụ àjà nsure ọkụ ná mmiri. (Ọpụpụ 29:4; 30:17-21; Levitikọs 1:13; 2 Ihe Emere 4:6) Ma “ime baptism dị iche iche” ahụ agụnyeghị “ime iko, na ite, na ihe ọla, baptism” n’usoro ofufe nke ụfọdụ ndị Juu na-eme n’oge Mesaịa ahụ bịara; Ndị Hibru 9:10 adịghị ezokwa aka n’imikpu ná mmiri nke Jọn Onye na-eme baptism mere ma ọ bụ na baptism nke ndị ahụ na-egosipụta nrara ha raara onwe ha nye Chineke dị ka ndị Kraịst.—Matiu 28:19, 20; Mak 7:4; Luk 3:3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya