Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ndị Hibru 9:16 kwuru na onye na-agba ndụ aghaghị ịnwụ ka ọgbụgba ndụ ahụ wee dịrị irè. Ma Chineke mere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, ma ọ nwụghị. Olee ụzọ anyị pụrụ isi ghọta amaokwu nke a?
Anyị na-agụ ná Ndị Hibru 9:15-17, sị: “Ọ bụkwa n’ihi nke a ka ọ [Kraịst] bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ọ ga-abụ, ebe otu onye nwụrụ ịgbapụta mmadụ n’aka njehie nile nke dị n’okpuru ọgbụgba ndụ mbụ ahụ, ka ndị a kpọworo wee nata nkwa nke nketa ebighị ebi ahụ. N’ihi na ebe ọgbụgba ndụ dị, ọ dị mkpa ka ọnwụ nke onye [“bụ mmadụ,” NW] gbara ya dị ya. N’ihi na ọgbụgba ndụ na-eguzosi ike n’elu ndị nwụrụ anwụ: n’ihi na ò nwere ụzọ ọ ga-abụ ihe dị ike mgbe ọ bụla onye [“bụ mmadụ,” NW] gbara ya dị ndụ?”a
Jehova bụ n’ezie Onye Mere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Na Jeremaịa 31:31-34, Chineke buru amụma kpọmkwem na ya onwe ya ga-eso ndị ya banye n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Pọl onyeozi hotara akụkụ akwụkwọ nsọ nke a ná Ndị Hibru 8:8-13, nke na-egosi na Pọl ghọtara na, n’ikwu ya otú o si dị kpọmkwem, ọ bụ Chineke guzobere ọgbụgba ndụ nke a nke sitere n’aka ya.
Otú ọ dị, ná Ndị Hibru isi 9, Pọl gara n’ihu ileba anya n’ọnọdụ dị iche iche Jisọs nọ na ya n’ihe banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Kraịst bịara dị ka Onye Isi Nchụaja nke ọgbụgba ndụ nke a. N’ile ya anya site n’ụzọ ọzọ, Jisọs bụ ihe àjà e nwere n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ; ọ bụkwa nanị “ọbara Kraịst” pụrụ “ime akọ na uche anyị ka ọ dị karịa ọcha nke ukwuu hie nne pụọ n’ọrụ nile nwụrụ anwụ.” Kraịst bụkwa Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ nke a, ọbụna dị ka Mosis bụwororịị onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ Iwu ahụ.—Ndị Hibru 9:11-15.
Pọl kwuru na ọnwụ dị mkpa iji mee ka ọgbụgba ndụ dị n’etiti Chineke na mmadụ dịrị irè. Ọgbụgba ndụ iwu ahụ bụ ihe atụ. Mosis bụ onye ogbugbo ya, bụ́ onye gaje iweta nkwekọrịta nke a n’etiti Chineke na Israel anụ ahụ. Otú a, Mosis rụrụ ọrụ dị mkpa, bụrụkwa mmadụ nke ya na ụmụ Israel mekọrịtara ihe mgbe ha na-abata n’ọgbụgba ndụ ahụ. A pụrụ isi otú a lee Mosis anya dị ka onye bụ mmadụ nke mere ọgbụgba ndụ n’ihe banyere ọgbụgba ndụ Iwu ahụ nke malitere n’ebe Jehova nọ. Ma ọ̀ dịrị mkpa ka Mosis wụsịa ọbara ndụ ya ka ọgbụgba ndụ Iwu ahụ wee malite ịdị irè? Ee e. Kama nke ahụ e jiri ụmụ anụmanụ chụọ àjà, ọbara ha wee nọchie anya nke Mosis.—Ndị Hibru 9:18-22.
Gịnị banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ nke dị n’etiti Jehova na mba nke Israel ime mmụọ? Jisọs Kraịst nwere ọnọdụ ahụ dị ebube nke ịbụ onye ngabita, Onye Ogbugbo n’etiti Jehova na Israel ime mmụọ. Ọ bụ ezie na ọ bụ n’ebe Jehova nọ ka ọgbụgba ndụ ahụ malitere, ọ dabeere n’ebe Jisọs Kraịst nọ. E wezụgakwa ịbụ Onye Ogbugbo ya, Jisọs nwere mmekọrịta chiri anya n’ụzọ anụ ahụ n’etiti ya na ndị gaje ịbụ ndị mbụ a kpọbatara n’ime ọgbụgba ndụ nke a. (Luk 22:20, 28, 29) Ọzọkwa, o ruru eru iweta ihe àjà ahụ dị mkpa iji mee ka ọgbụgba ndụ ahụ dịrị irè. Àjà ahụ abụghị nke ụmụ anụmanụ efu kama ọ bụ nke ndụ mmadụ zuru okè. Ya mere, Pọl pụrụ izo aka n’ebe Kraịst nọ dị ka onye bụ mmadụ nke mere ọgbụgba ndụ n’ihe banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Mgbe ‘Kraịst banyesịrị . . . n’eluigwe onwe ya, igosi onwe ya n’ihu Chineke n’ihi anyị ugbu a,’ ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ malitere ịdị irè.—Ndị Hibru 9:12-14, 24.
N’ikwu okwu banyere Mosis na Jisọs dị ka ndị bụ mmadụ mere ọgbụgba ndụ, Pọl adịghị atụ aro na ọ dị nke ọ bụla n’ime ha ọgbụgba ndụ ndị ahụ n’otu n’otu sitere n’aka ya malite, bụ́ ndị ọ bụ Chineke n’onwe ya mere n’ezie. Kama nke ahụ, mmadụ abụọ ndị ahụ mere ihe ndị dị oké mkpa dị ka ndị ogbugbo, n’ime ka ọgbụgba ndụ ndị ahụ dịrị. N’ọnọdụ nke ọ bụlakwa, ọnwụ dị mkpa—ụmụ anụmanụ n’ọnọdụ nke Mosis, na onyinye Jisọs nyere ọbara ndụ nke ya n’ihi ndị nọ n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Okwu Grik abụọ e ji mee ihe n’ebe a maka “nke onye gbara ya” bụ ndị a sụgharịrị n’ụzọ nkịtị ịbụ “nke (onye) ahụ nke mewooro onwe ya ọgbụgba ndụ” ma ọ bụ “nke [onye] ahụ na-eme ọgbụgba ndụ.”—The Kingdom Interlinear Translation of the Greek Scriptures, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na The Interlinear Greek-English New Testament, nke Dr. Alfred Marshall sụgharịrị.