Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 9/1 p. 30-31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwere Isi Mgbaka
    Teta!—2004
  • Isi Akpakọghịzi Ọtụtụ Ndị Ọnụ n’Ụwa A
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
  • 4 | Ndụmọdụ Baịbụl Na-enye Na-aba Ezigbo Uru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
  • Chineke Kwere Nkwa na Ọ Ga-eme Ka Isi Zuo Ndị Mmadụ Okè
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 9/1 p. 30-31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ̀ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ka onye Kraịst gakwuru onye ọrụ ahụ ike nke uche?

Akụkọ ndị sitere n’ala ụfọdụ na-egosi na e nwewo mmụba nke ọrịa mmetụta uche na ọrịa uche na “mgbe ikpeazụ” ndị a. (2 Timoti 3:1) Ndị Kraịst na-enwe ezi ọmịiko mgbe o metụtara ndị kwere ekwe ibe ha, ma ha na-aghọta na onye ọ bụla aghaghị ikpebiri onwe ya ma ọ ga-achọ ọgwụgwọ maka ọrịa ya, ọ bụrụkwa otú ahụ, ụdị ọgwụgwọ ọ ga-abụ.a “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.” (Ndị Galetia 6:5) Ụfọdụ, bụ́ ndị na-arịa ọrịa isi mgbaka, ọrịa uche nke metụtaworo ụbụrụ, oké ịda mbà n’obi, nsogbu àgwà nrụgide na-eri isi, imerụ onwe onye ahụ, na ọrịa ndị ọzọ na-egbu mgbu, enwewo ike ibitụ ndụ na-enweghị nsogbu mgbe ha nwetasịrị enyemaka ziri ezi nke ndị ọkachamara.

N’ebe ụfọdụ ọ ghọọla ihe na-ewu ewu ịchọ ọgwụgwọ. N’ọtụtụ ọnọdụ onye ọrịa ahụ enweghị ajọ ọrịa uche kama o nwere ihe isi ike ịnagide ụfọdụ ọnọdụ ná ndụ. Otú ọ dị, ọ bụ Bible na-enye enyemaka kasị dị irè n’ime ihe banyere nsogbu ndị siri ike nke ndụ. (Abụ Ọma 119:28, 143) Site na Bible, Jehova na-enye amamihe, ikike iche echiche, na ezi ihe ọmụma—ihe ndị na-ewusi anyị ike n’ụzọ echiche na n’ụzọ mmetụta uche. (Ilu 2:1-11; Ndị Hibru 13:6) Ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi pụrụ ikwupụta ihe dị ha n’obi n’echeghị echiche nke ọma mgbe ụfọdụ n’ihi oké mgbagwoju anya dị n’ime ha. (Job 6:2, 3) Jemes 5:13-16 na-agba ndị dị otú ahụ ume ịkpọtụrụ ndị okenye maka enyemaka na ndụmọdụ. Onye Kraịst pụrụ ịdị na-arịa ọrịa ime mmụọ, ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ onye ọnọdụ a na-apụghị ịgbanwe ma ọ bụ nchekasị na-enye nsogbu nke ukwuu, ma ọ bụ ọ pụrụ iche na ya bụ onye nwetara ikpe na-ezighị ezi. (Eklisiastis 7:7; Aịsaịa 32:2; 2 Ndị Kọrint 12:7-10) Onye dị otú ahụ pụrụ inweta enyemaka n’aka ndị okenye, bụ́ ndị ‘ga-ete ya mmanụ’—ya bụ, jiri nkà nye ndụmọdụ na-akasi obi nke Bible—“kpeekwa ekpere n’isi ya.” Gịnị ga-esi na ya pụta? “Ekpere nke okwukwe ahụ ga-azọpụtakwa onye ahụ ahụ na-adịghị ike, Onyenwe anyị ga-emekwa ka o bilie [pụta ná nkụda mmụọ ya ma ọ bụ mmetụta ya nke ịbụ onye Chineke gbahapụrụ].”

Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na nsogbu na mgbagwoju anya nke uche anọgide n’agbanyeghị enyemaka nke ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ ji nkà nye? Ụfọdụ ndị nọ n’ọnọdụ a ahọrọla inwe ezi nnyocha ahụ. (Tụlee Ilu 14:30; 16:24; 1 Ndị Kọrint 12:26.) Nsogbu elu ahụ pụrụ ịbụ ihe na-akpata nsogbu uche ma ọ bụ mmetụta uche. N’ọnọdụ ụfọdụ, ịgwọ nsogbu dị otú ahụ enyewo onye na-arịa ọrịa mmetụta uche ahụ efe.b Ọ bụrụ na a chọtaghị nsogbu elu ahụ ọ bụla, onye dibịa ahụ, ma a rịọ ya ka o mee otú ahụ, pụrụ ịtụ aro ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike nke uche a pụrụ ịgakwuru. Gịnịzi ka i kwesịrị ime? Dị ka e kwuru, nke a bụ mkpebi nke onye ọ bụla na-aghaghị inyochara onwe ya. Ndị ọzọ ekwesịghị ịkatọ ma ọ bụ ikpe ya ikpe.—Ndị Rom 14:4.

Ka o sina dị, a ghaghị iji amamihe mee ihe, kpacharakwa anya ịghara ichezọ ụkpụrụ Bible. (Ilu 3:21; Eklisiastis 12:13) N’ihe banyere ọrịa elu ahụ, ụdị nhọrọ ọgwụgwọ dị iche iche na-eche ndị ọrịa ihu, site n’ọgwụ ndị a na-ejikarị eme ihe gaa n’ọgwụgwọ ndị dị ka iji ihe ndị sitere n’okike agwọ ọrịa, iji usoro ịdụnye agịga n’ahụ na-agwọ ọrịa, na inye ọgwụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ndị dị nta. E nwekwara ụdị ndị ọrụ ahụ ike nke uche dịgasị iche iche. N’etiti ha bụ ndị na-eji ime nnyocha agwọ ọrịa uche na ndị ọzọ, bụ́ ndị pụrụ ịbanye n’akụkọ onwe onye nke onye ọrịa ahụ iji chọpụta ihe ndị kpatara àgwà a na-adịghị ahụkebe ma ọ bụ mmetụta uche na-egbu mgbu. Ndị na-esite n’akparamàgwà agwọ ọrịa uche pụrụ ịgbalị inyere onye ọrịa ahụ aka ịmụta ụdị àgwà ndị ọhụrụ. Ụfọdụ ndị na-agwọ ọrịa uche kwenyere na e kwesịrị iji ọgwụ agwọ ihe ka n’ọtụtụ ọrịa uche.c Dị ka a kọrọ, ndị ọzọ na-atụ aro nri na vitamin.

Ndị ọrịa na ezinụlọ ha kwesịrị ilezi anya mgbe ha na-atụle nhọrọ ndị a. (Ilu 14:15) N’ụzọ dị mkpa, Prọfesọ Paul McHugh, onye nduzi nke Ngalaba Ọrịa Uche na Sayensị Akparamàgwà dị na Mahadum Nkà Mmụta Ọgwụ nke Johns Hopkins, kwuru na ọrụ ahụ ike uche “bụ nkà mmụta ọgwụ bụ́ isi. O nweghị ụzọ dị mfe a ga-esi enweta nnwapụta aro nile a na-atụ ọbụna ka ọ na-eme ihe banyere ọrịa nile nke akụkụ ndị kasị mgbagwoju anya nke ndụ mmadụ—uche na akparamàgwà.” Ọnọdụ a na-enye ohere maka omume a na-adịghị ahụkebe na wayo, nakwa ọgwụgwọ ndị sitere n’ezi obi nke pụrụ imerụ ahụ kama ime ihe dị mma.

E kwesịkwara ikwu na ọ bụ ezie na ndị ọkà n’ịgwọ ọrịa uche na ndị ọkà n’akparamàgwà nwere akara ugo mmụta ntụkwasị ọrụ aka, ọtụtụ ndị ọzọ na-enweghị akara iru eru ọ bụla na-arụ ọrụ dị ka ndị ndụmọdụ ma ọ bụ ndị ọkà n’ịgwọ ọrịa na-enweghị nduzi. Ụfọdụ ndị emefuwo ego dị ukwuu n’ịgakwuru ndị dị otú ahụ na-erughị eru.

E nwere ihe ndị a ga-atụle ọbụna ma e nwee ndị ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike nke uche bụ́ ndị a zụrụ azụ, ndị ruru eru. Mgbe anyị na-ahọrọ dọkịta ahụ ike ma ọ bụ dọkịta na-awa ahụ, anyị aghaghị ijide n’aka na ọ ga-akwanyere echiche anyị dabeere na Bible ùgwù. N’otu aka ahụ, ọ ga-adị ize ndụ ịgakwuru ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike nke uche bụ́ onye na-adịghị akwanyere echiche omume na okpukpe anyị ùgwù. Ọtụtụ ndị Kraịst na-agbalịsi ike, n’agbanyeghị nsogbu uche na nke mmetụta uche, inwe “otu echiche uche nke Kraịst Jisọs nwere.” (Ndị Rom 15:5, NW) Ndị dị otú ahụ na-echegbu onwe ha n’ụzọ ziri ezi banyere àgwà nke onye ọ bụla pụrụ imetụta echiche ma ọ bụ àgwà ha. Ụfọdụ ndị na-agwọ ọrịa na-ele mgbochi ọ bụla ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nyere dị ka ihe na-adịghị mkpa na nke pụrụ imerụ ahụ ike nke uche ahụ. Ha pụrụ ịkwado, ọbụna tụọ aro, omume ndị a katọrọ na Bible, dị ka ndina ụdị onwe ma ọ bụ ekwesịghị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye.

Echiche ndị a so n’ihe Pọl onyeozi kpọrọ “ihe ahụ a na-akpọ ihe ọmụma n’ụzọ ụgha, ha na nguzogide ya nile.” (1 Timoti 6:20) Ha na-ekwugide eziokwu banyere Kraịst ma bụrụ akụkụ nke “ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu” nke ụwa a. (Ndị Kọlọsi 2:8) Ụkpụrụ Bible doro anya: “Ọ dịghị amamihe dị, ọ dịghịkwa nghọta dị, ọ dịghịkwa ndụmọdụ dị, ná ncherịta ihu Jehova.” (Ilu 21:30) Ndị ọrụ ahụ ike nke uche bụ́ ndị na-akpọ “ihe ọjọọ ezi ihe, ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ” bụ “mkparịta nile ọjọọ.” Kama inye aka ịgwọ uche na-awagharị awagharị, ha “na-emebi omume ọma.”—Aịsaịa 5:20; 1 Ndị Kọrint 15:33.

Ya mere onye Kraịst chere na ọ dị mkpa ịgakwuru ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike nke uche kwesịrị inyocha iru eru, àgwà, na aha ọma nke onye ọrụ ahụ nwere nakwa ihe ọgwụgwọ ọ bụla a tụrụ aro ya pụrụ ịkpata. Ọ bụrụ na onye Kraịst nwere nsogbu apụghị imere onwe ya nke a, eleghị anya ezi enyi ma ọ bụ onye ikwu tozuru okè pụrụ inye aka. Onye Kraịst na-ejighị n’aka amamihe nke otu ọgwụgwọ pụrụ ịchọpụta na isoro ndị okenye nọ n’ọgbakọ kwurịta okwu na-enye aka—ọ bụ ezie na ọ bụ ya nwe mkpebi ikpeazụ (ma ọ bụ ndị mụrụ ya, ma ọ bụ mkpebi di na nwunye jikọrọ aka mee).d

Sayensị pụrụ ime ihe dị ukwuu taa karịa n’oge gara aga iji belata nhụjuanya. Ma, e nwere ọtụtụ ọrịa—ma nke elu ahụ ma nke uche—ndị a na-agaghị agwọtali ugbu a na nke a na-aghaghị ịtachiri obi gabiga usoro ihe a. (Jemes 5:11) Ka ọ dị ugbu a “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” ndị okenye, na ndị ọzọ nile nọ n’ọgbakọ na-agbatịpụ aka nke ọmịiko na nkwado nye ndị ọrịa. Jehova n’onwe ya kwa na-enye ha ume iji tachie obi ruo oge ahụ dị ebube mgbe ọrịa na-agaghị adịkwa ọzọ.—Matiu 24:45; Abụ Ọma 41:1-3; Aịsaịa 33:24.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Mgbe ụfọdụ a pụrụ ịgwa mmadụ ka ọ gaa nnyocha ọrịa uche, eleghị anya mgbe a na-achọ iwe ya n’ọrụ gbagotere agbagote. Ma mmadụ ọ̀ ga-ekwe ka e mee ya ụdị nnyocha ahụ ma ọ bụ na ọ gaghị ekwe bụ mkpebi onwe onye, ma e kwesịrị ịrịba ama na nnyocha ọrịa uche abụghị ọgwụgwọ ọrịa uche.

b Lee “Imeri n’Agha A Na-ebuso Obi Ịda Mbà,” ná mbipụta Ụlọ Nche nke March 1, 1990.

c Ụfọdụ ọrịa uche yiri ka ọ na-anata ọgwụ ndị kwesịrị ekwesị nke ọma. A ghaghị iji nlezianya jiri ọgwụ ndị a na-eme ihe n’okpuru nduzi nke dibịa ma ọ bụ ndị dibịa ọrịa uche, bụ́ ndị nwere nkà na ahụmahụ, ebe a pụrụ inwe ihe ndị siri ike ọ pụrụ ịrụpụta ma ọ bụrụ na a gbanweghị ọ̀tụ̀tụ̀ ọgwụ a na-enye n’ụzọ ziri ezi.

d Lee isiokwu bụ́ “Ọrịa Uche—Mgbe O Jidere Onye Kraịst” ná mbipụta Ụlọ Nche nke October 15, 1988.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya