Ndị Okenye, Na-ekpenụ Ikpe n’Ezi Omume
“Na-anụnụ ikpe n’etiti ụmụnne unu, na-ekpekwanụ ikpe ezi omume.”—DEUTERỌNỌMI 1:16.
1. N’okwu banyere ikpe ikpe, nnyefe dị aṅaa nke ikike werewooro ọnọdụ, gịnịkwa ka nke a pụtara nye ndị ikpe bụ́ mmadụ?
DỊ KA Onye Ikpe Kasị Elu, Jehova enyewo Ọkpara ya ikike ikpe ikpe. (Jọn 5:27) N’aka nke ya, dị ka Isi nke ọgbakọ ndị Kraịst, Kraịst na-eji òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nke nwekwara uche na Òtù Na-achị Isi ya eme ihe ịhọpụta ndị okenye, bụ́ ndị na-arụ ọrụ dị ka ndị ikpe n’oge ụfọdụ. (Matiu 24:45-47; 1 Ndị Kọrint 5:12, 13; Taịtọs 1:5, 9) Dị ka ndị ikpe nnọchianya, ndị a ji ya dị ka ụgwọ ịgbaso n’ụzọ chiri anya ihe nlereanya nke Ndị Ikpe nke eluigwe, Jehova na Kraịst Jisọs.
Kraịst—Onye Ikpe Bụ́ Ihe Nlereanya
2, 3. (a) Amụma dị aṅaa banyere Mesaịa na-ekpughe àgwà ndị Kraịst nwere dị ka Onye Ikpe? (b) Isi ihe ndị dị aṅaa kwesịrị ịrịba ama karịsịa?
2 Banyere Kraịst dị ka Onye Ikpe, e dere n’ụzọ amụma, sị: “Mmụọ nke Jehova ga-enwekwa ọnọdụ ya n’ahụ ya, bụ́ mmụọ nke amamihe na nghọta, mmụọ nke ndụmọdụ na ịdị ike, mmụọ nke ihe ọmụma na egwu Jehova; ọzọ, ihe na-atọ ya ụtọ bụ egwu Jehova: ọ bụghịkwa dị ka anya ya abụọ si ahụ ka ọ ga-ekpe ikpe, ọ bụghịkwa dị ka ntị ya abụọ si anụ ka ọ ga-aba mba: kama ọ ga-eji ezi omume kpee ndị na-enweghị ike ikpe, ọ ga-ejikwa izi ezi baa mba banyere ndị dị umeala n’obi n’ụwa.”—Aịsaịa 11:2-4.
3 Rịba ama n’amụma ahụ àgwà ndị mere Kraịst ji nwee ike ‘ikpe elu ụwa dum mmadụ bi ikpe n’ezi omume.’ (Ọrụ 17:31) Ọ na-ekpe ikpe n’ụzọ kwekọrọ ná mmụọ Jehova, amamihe, nghọta, ndụmọdụ, na ihe ọmụma Chineke. Rịbakwa ama na ọ na-ekpe ikpe n’egwu Jehova. Otú a, “oche ikpe Kraịst” bụ ihe nnọchianya nke “oche ikpe Chineke.” (2 Ndị Kọrint 5:10; Ndị Rom 14:10) Ọ na-eji nlezianya ekpe ikpe n’ụzọ Chineke si ekpe ha. (Jọn 8:16) Ọ dịghị ekpe ikpe nanị site n’ihe anya ya hụrụ ma ọ bụ site nanị n’ihe ọ nụrụ. Ọ na-ekpe ikpe n’eziokwu n’ihi ndị dị umeala n’obi na ndị dị ala. Lee aha Onye Ikpe dị ebube ọ bụ! Leekwa aha ihe nlereanya mara mma ọ bụụrụ ndị mmadụ na-ezughị okè bụ́ ndị a na-akpọtụrụ ịrụ ọrụ n’òtù ikpe n’oge a!
Ndị Ikpe Elu Ala
4. (a) Gịnị ga-abụ otu n’ime ọrụ nke 144,000 n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Kraịst? (b) Amụma dị aṅaa na-egosi na a ga-ahọpụta ndị Kraịst e tere mmanụ dị ka ndị ikpe n’oge ha ka nọ n’ụwa?
4 Akwụkwọ nsọ na-egosi na obere ọnụ ọgụgụ ahụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ, na-amalite ná ndị ozi 12 ahụ, ga-abụ ndị ha na Kraịst Jisọs ga-eso kpee ikpe n’oge ọchịchị Narị Afọ Iri ahụ. (Luk 22:28-30; 1 Ndị Kọrint 6:2; Mkpughe 20:4) E kpere ihe fọdụrụ ná ndị Israel ime mmụọ ahụ e tere mmanụ ikpe n’onwe ha, weghachikwa ha n’afọ 1918-1919. (Malakaị 3:2-4) Banyere mweghachi nke a nke Israel ime mmụọ, e buru n’amụma, sị: “M ga-emekwa ka ndị ikpe gị laghachi dị ka na mbụ, m ga-emekwa ka ndị na-adụ gị ọdụ laghachi dị ka ná mmalite.” (Aịsaịa 1:26) Otú a, dị nnọọ ka o meworo “ná mmalite” nke Israel anụ ahụ, Jehova enyewo ihe ahụ fọdụrụ e weghachiri eweghachi ndị ikpe na ndị ndụmọdụ ezi omume.
5. (a) Olee ndị e mere ka ha “nọdụ dị ka ndị ikpe” mgbe e weghachisịrị Israel ime mmụọ, oleekwa ụzọ e si gosipụta ha n’akwụkwo Mkpughe? (b) Site n’aka ole ndị ka e si enyere ndị nlekọta e tere mmanụ aka ugbu a n’ọrụ ikpe, oleekwa ụzọ e si enye ndị a ọzụzụ ịghọ ndị ikpe ka mma?
5 Iji malite, ndị ahụ “maara ihe” e mere ka ha “nọdụ dị ka ndị ikpe” bụcha ndị okenye e tere mmanụ. (1 Ndị Kọrint 6:4, 5) A na-egosipụta ndị nlekọta e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi, kwesịkwa nsọpụrụ n’akwụkwọ Mkpughe dị ka ndị nọ n’aka nri Jisọs, ya bụ, n’okpuru nchịkwa na ntụziaka ya. (Mkpughe 1:16, 20; 2:1) Kemgbe 1935, ndị ahụ e tere mmanụ enwetawo nkwado guzosiri ike nke “oké ìgwè mmadụ” nọworo na-amụba, bụ́ ndị olileanya ha bụ ịlanarị ‘oké mkpagbu ahụ’ na ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ paradaịs. (Mkpughe 7:9, 10, 14-17) Ka “ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ” na-eru nso, Òtù Na-achị Isi ahụ e tere mmanụ na-ahọpụta ọtụtụ n’ime ndị a karị ije ozi dị ka ndị okenye na ndị ikpe n’ihe ruru 66,000 ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile.a (Mkpughe 19:7-9) Site n’ụlọ akwụkwọ pụrụ iche a na-enye ha ọzụzụ ibu ibu ọrụ n’ime “ụwa ọhụrụ” nke ọha mmadụ. (2 Pita 3:13) Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze, nke e duziri ná ngwụsị afọ 1991 n’ọtụtụ mba, kwusiri okwu ike n’idozi okwu ikpe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ndị okenye na-eje ozi dị ka ndị ikpe ji ya dị ka ụgwọ iṅomi Jehova na Kraịst Jisọs, ndị ikpe ha nile bụ eziokwu, bụrụkwa ezi omume.—Jọn 5:30; 8:16; Mkpughe 19:1, 2.
Ndị Ikpe ‘Na-ebi Obi n’Egwu’
6. N’ihi gịnị ka ndị okenye na-eje ozi na kọmitii ikpe ga-eji ‘na-ebi obi n’egwu’?
6 Ọ bụrụ na Kraịst n’onwe ya na-ekpe ikpe n’egwu Jehova nakwa site ná mmụọ Ya, lee ka o si kwesị ekwesị karị na ndị okenye na-ezughị okè ga-eme otú ahụ! Mgbe e kenyere ha ọrụ ije ozi na kọmitii ikpe, ha kwesịrị ‘ibi obi n’egwu,’ na-akpọku ‘Nna, bụ́ onye na-ekpe ikpe n’eleghị mmadụ anya n’ihu’ inyere ha aka ikpe ikpe n’ezi omume. (1 Pita 1:17) Ha kwesịrị icheta na ihe ha na-eme metụtara ndụ ndị mmadụ, “mkpụrụ obi” ha, dị ka ndị “ga-aza ajụjụ.” (Ndị Hibru 13:17) N’ihe banyere nke a, n’ezie ha ga-azakwa ajụjụ n’ihu Jehova banyere mkpehie ikpe ọ bụla ha gaara ekpezi. N’okwu o kwuru banyere Ndị Hibru 13:17, J. H. A. Ebrard dere, sị: “Ọ bụ ọrụ dịịrị onye na-azụ atụrụ ilekọta mkpụrụ obi ndị e nyere ya ka o lekọta, . . . ọ ghaghịkwa ịza ajụjụ banyere ha nile, banyere ndị ahụ fuworo efu site ná mmejọ ya. Nke a bụ okwu siri ike. Ka onye ozi ọ bụla nke okwu ahụ tụlee, na o jiriwo afọ ofufo nakwere oké ibu ọrụ nke a [siri ike].”—Tụlee Jọn 17:12; Jemes 3:1.
7. (a) Gịnị ka ndị ikpe nke oge ugbu a kwesịrị icheta, gịnịkwa kwesịrị bụ nzube ha? (b) Ihe mmụta ndị dị aṅaa ka ndị okenye kwesịrị inweta na Matiu 18:18-20?
7 Ndị okenye nọ n’òtù ikpe kwesịrị icheta na ndị bụ Ndị Ikpe n’ezie nke okwu ikpe ọ bụla bụ Jehova na Kraịst Jisọs. Cheta ihe a gwara ndị ikpe n’Israel: “Ọ bụghị mmadụ ka unu na-ekpere ikpe, kama ọ bụ Jehova; ọ nọnyekwaara unu n’okwu ikpe unu. Ma ugbu a ka oké egwu Jehova dịkwasị unu. . . . Otú a ka unu ga-eme, ikpe agaghị amakwa unu.” (2 Ihe Emere 19:6-10) Site n’iji nsọpụrụ na-atụ egwu, ndị okenye na-ekpe ikpe kwesịrị ime ihe nile ha nwere ike iji jide n’aka na Jehova ‘nọnyeere ha n’okwu ikpe ha’ n’ezie. Mkpebi ha kwesịrị igosipụta n’ụzọ ziri ezi ụzọ Jehova na Kraịst si ele okwu ahụ anya. Ihe ọ bụla ha ga-eji ụzọ ihe atụ ‘kee agbụ’ (maa ikpe) ma ọ bụ ‘tọhapụ’ (kwuo na ikpe amaghị) n’elu ala kwesịrị ịbụ ihe ghọworo ihe e kere agbụ ma ọ bụ tọhapụ n’eluigwe—dị ka e kpughere site n’ihe e deworo n’Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee. Ọ bụrụ na ha ekpekuo Jehova ekpere n’aha Jisọs, Jisọs ‘ga-anọ n’etiti ha’ inyere ha aka. (Matiu 18:18-20; Ụlọ Nche, February 15, 1988, peji nke 9) Ọnọdụ a nọ na ya n’oge a na-anụ okwu ikpe kwesịrị igosi na Kraịst nọ n’ezie n’etiti ha.
Ndị Na-azụ Atụrụ Oge Nile
8. Gịnị bụ ibu ọrụ bụ isi nke ndị okenye n’ebe ìgwè atụrụ ahụ nọ, dị ka Jehova na Jisọs Kraịst mere ihe atụ ya? (Aịsaịa 40:10, 11; Jọn 10:11, 27-29)
8 Ndị okenye adịghị ekpe ikpe n’oge nile. Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ oge nile. Ha bụ ndị na-agwọ agwọ, ọ bụghị ndị na-enye ahụhụ. (Jemes 5:13-16) Echiche bụ isi dị n’okwu Grik maka onye nlekọta (e·piʹsko·pos) bụ nke nlekọta na-echebe echebe. Akwụkwọ bụ́ Theological Dictionary of the New Testament kwuru, sị: “Iji mee ka ọzụzụ atụrụ [na 1 Pita 2:25] zuo ezu, okwu ahụ bụ́ [e·piʹsko·pos] na-enye echiche nke ọrụ ọzụzụ atụrụ nke ilekọta ma ọ bụ iche nche.” Ee, ọrụ bụ isi ha nwere bụ ilekọta atụrụ ndị ahụ na iche ha nche, idebe ha n’ime ìgwè atụrụ ahụ.
9, 10. (a) Olee ụzọ Pọl si mesie ibu ọrụ mbụ nke ndị okenye ike, ya mere ajụjụ dị aṅaa ka a pụrụ ịjụ? (b) Gịnị ka okwu Pọl kwuru n’Ọrụ Ndị Ozi 20:29 pụtara, ya mere olee ụzọ ndị okenye pụrụ isi gbalịa ibelata ọnụ ọgụgụ nke okwu ikpe?
9 N’ịgwa ndị okenye nke ọgbakọ Efesọs okwu, Pọl onyeozi kwusiri okwu ike n’ebe o kwesịrị: “Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ ahụ nile anya, nke mmụọ nsọ siteworo n’etiti ya họpụta unu ịbụ ndị nlekọta ya, ka unu na-azụ nzukọ Chineke dị ka atụrụ, nke o ji ọbara Ọkpara ya onwe ya zụta.” (Ọrụ 20:28, NW) Pọl mere ka ịzụ atụrụ pụta ìhè, ọ bụghị inye ahụhụ. Ndị okenye ụfọdụ pụrụ ime nke ọma ịtụgharị uche n’ajụjụ na-esonụ: ‘Ànyị pụrụ ichebe oge buru ibu nke dị mkpa iji mee nnyocha ma lebara okwu ikpe anya ma ọ bụrụ na anyị etinyekwuo oge na mgbalị n’ọzụzụ atụrụ?’
10 N’eziokwu, Pọl dọrọ aka ná ntị megide “agụ jọgburu onwe ha.” Ma ọ̀ bụ na ọ katọghị ndị a maka ‘emeghịrị ìgwè atụrụ ahụ ebere’? (Ọrụ 20:29) Ọ bụkwa ezie na ihe o bu n’uche bụ na ndị nlekọta ahụ kwesịrị ntụkwasị obi kwesịrị ịchụpụ “agụ” ndị a, ọ̀ bụ na okwu ya adịghị egosi na ndị okenye kwesịrị imeso ndị ọzọ so n’ìgwè atụrụ ahụ ‘n’obi ebere’? Mgbe otu atụrụ dara mbà n’ụzọ ime mmụọ ma kwụsị ijere Chineke ozi, gịnị dị ya mkpa—iti ihe ka ọ̀ bụ ọgwụgwọ, inye ahụhụ ka ọ̀ bụ ịzụ ya dị ka atụrụ? (Jemes 5:14, 15) Ya mere, ndị okenye kwesịrị isetịpụ oge mgbe nile maka ọrụ ọzụzụ atụrụ. Nke a pụrụ ime ka e nwee obi ụtọ nke itinye oge dị ala n’ọtụtụ okwu ikpe ndị na-ewe oge, bụ́ ndị na-emetụta ndị Kraịst dabaworo ná mmehie. N’ezie, nchegbu mbụ nke ndị okenye kwesịrị ịbụ ka e nwee izu ike na ume ọhụrụ, si otú a na-akpalite udo, ịdị jụụ, na ịnọ ná ntụkwasị obi n’etiti ndị Jehova.—Aịsaịa 32:1, 2.
Ije Ozi dị ka Ndị Ọzụzụ Atụrụ na Ndị Ikpe Na-eweta Uru
11. N’ihi gịnị ka eleghị mmadụ anya n’ihu nakwa “amamihe ahụ nke si n’elu” ji dị ndị okenye na-eje ozi na kọmitii ikpe mkpa?
11 Inwekwu ọzụzụ atụrụ siri ike tupu onye Kraịst azọhie ụkwụ pụrụ ibelata ọnụ ọgụgụ nke okwu ikpe a na-enwe n’etiti ndị Jehova. (Tụlee Ndị Galetia 6:1.) Otú o sina dị, n’ihi mmehie na ezughị okè nke mmadụ, ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst pụrụ ileba anya n’okwu ndị metụtara ime ajọ omume site n’oge ruo n’oge. Ụkpụrụ ndị dị aṅaa kwesịrị iduzi ha? Ụkpụrụ ndị a agbanwebeghị kemgbe oge Mosis ma ọ bụ oge ndị Kraịst mbụ. Okwu Mosis gwara ndị ikpe n’Israel ka dịkwa irè: “Na-anụnụ ikpe n’etiti ụmụnne unu, na-ekpekwanụ ikpe ezi omume . . . Unu amatala ihu mmadụ n’ikpe.” (Deuterọnọmi 1:16, 17) Eleghị mmadụ anya n’ihu bụ ihe e ji amata “amamihe ahụ nke si n’elu,” amamihe nke dị oké mkpa maka ndị okenye na-eje ozi na kọmitii ikpe. (Jemes 3:17; Ilu 24:23) Amamihe dị otú ahụ ga-enyere ha aka ịghọta ọdịiche dị n’etiti adịghị ike na ajọ omume.
12. N’echiche dị aṅaa ka o ji dị mkpa ka ndị ikpe ghara ịbụ nanị ndị ezi omume kama ndị ọma?
12 Ndị okenye aghaghị ‘ikpe ikpe n’ezi omume,’ n’ikwekọ n’ụkpụrụ Jehova nile nke ihe ziri ezi na ihe ọjọọ. (Abụ Ọma 19:9) Ma, ka ha na-agbalị ịbụ ndị ezi omume, ha kwesịkwara ịgbalị ịbụ ndị ọma, n’echiche nke ọdịiche ahụ Pọl mere ná Ndị Rom 5:7, 8. Ka ọ na-ekwu okwu n’amaokwu ndị a n’isiokwu ya bụ́ “Ezi Omume,” akwụkwọ ahụ bụ́ Insight on the Scriptures kwuru, sị: “Ojiji e ji okwu Grik ahụ mee ihe na-egosi na onye a rịbara ama maka, ma ọ bụ a maara site, n’ịdị mma bụ onye na-eme ihe ọma (onye na-achọ imere ndị ọzọ ihe ọma ma ọ bụ ihe ga-abara ha uru) na onye a na-erite uru n’aka ya (na-egosipụta ịdị mma dị otú ahụ n’ụzọ pụtara ìhè). Ihe bụ nchegbu ya abụghị ime nanị ihe ikpe ziri ezi chọrọ ya n’aka kama ọ na-eme karị nke a, na-abụ onye a kpaliri site n’ichere ndị ọzọ echiche ziri ezi na ọchịchọ nke ime ihe ga-abara ndị ọzọ uru na inyere ha aka.” (Mpịakọta nke 2, peji nke 809) Ndị okenye na-abụghị nanị ndị ezi omume kamakwa ndị ọma ga-emeso ndị mere ihe ọjọọ ná nchebara echiche obi ọma. (Ndị Rom 2:4) Ha kwesịrị ịchọ igosi obi ebere na ọmịiko. Ha kwesịrị ime ihe nile ha pụrụ ime iji nyere onye ahụ mere ihe ọjọọ aka ịhụ mkpa ọ dị ichegharị, ọ bụ ezie na ọ pụrụ iyi ka ọ̀ nabataghị mgbalị ha na mbụ.
Àgwà Ziri Ezi n’Oge Ikpe
13. (a) Mgbe onye okenye na-arụ ọrụ dị ka onye ikpe, gịnị ka ọ na-adịghị akwụsị ịbụ? (b) Ndụmọdụ dị aṅaa nke Pọl nyere na-emetụtakwa mgbe a na-anụ okwu ikpe?
13 Mgbe ọnọdụ mere ka ọ dị mkpa ka a nụrụ okwu ikpe, ndị nlekọta ekwesịghị ichefu na ha ka bụkwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ha na ìgwè atụrụ Jehova na-emekọ ihe, n’okpuru “onye ọzụzụ atụrụ ọma.” (Jọn 10:11) Ndụmọdụ ahụ Pọl nyere maka inyere atụrụ ndị nọ n’ihe isi ike aka mgbe nile metụtara n’otu ụzọ ahụ n’oge a na-anụrụ okwu ikpe. O dere, sị: “Ụmụnna m, a sị na ọ bụ ezie na a nwụde mmadụ mgbe ọ nọ ná ndahie ọ bụla, unu onwe unu, bụ́ ndị mmụọ nsọ na-achị, meenụ ka mmadụ dị otú a guzozie n’ime mmụọ nke ịdị nwayọọ; na-elezi onwe gị anya, ka a ghara ịnwakwa gị onwe gị. Na-eburịtanụ ibu na-anyị ibe unu, na-edebezukwanụ iwu Kraịst n’ụzọ dị otú a.”—Ndị Galetia 6:1, 2.b
14. Olee ụzọ ndị nlekọta kwesịrị isi lee ịnụrụ okwu ikpe anya, gịnịkwa kwesịrị ịbụ àgwà ha n’ebe onye mere ihe ọjọọ nọ?
14 Kama ile onwe ha anya dị ka ndị ikpe kasị elu, ndị zukọrọ inye ahụhụ, ndị okenye na-eje ozi na kọmitii ikpe kwesịrị ile ịnụrụ okwu ahụ anya dị ka akụkụ ọzọ nke ọrụ ọzụzụ atụrụ ha. Otu n’ime atụrụ Jehova nọ ná nsogbu. Gịnị ka ha pụrụ ime iji zọpụta ya? Oge ọ̀ gawo inyere atụrụ nke a kpafuworo site n’ìgwè atụrụ aka? Anyị ga-atụ anya na ọ gaghị adị otú ahụ. Ndị okenye kwesịrị inwe echiche ziri ezi banyere igosi obi ebere n’ebe nke a ga-ekwesị ekwesị. Ọ bụghị na ha kwesịrị iwetu ụkpụrụ Jehova ala ma ọ bụrụ na e mewo mmehie dị oké njọ. Ma ha ịmata banyere ọnọdụ ọ bụla pụrụ iduba na ya ga-enyere ha aka igosi obi ebere n’ebe o kwere mee. (Abụ Ọma 103:8-10; 130:3) Ọ bụ ihe mwute ikwu na ụfọdụ ndị na-eme ihe ọjọọ na-agba isi akwara nke na a na-amanye ndị okenye igosi nguzosi ike, ọ bụ ezie na ọ bụghị n’aka ike.—1 Ndị Kọrint 5:13.
Nzube nke Ịnụrụ Okwu Ikpe
15. Mgbe nsogbu siri oké ike bilitere n’etiti ndị mmadụ, gịnị ka e kwesịrị ibu ụzọ kpebie?
15 Mgbe nsogbu siri ike bilitere n’etiti ndị mmadụ, ndị okenye maara ihe ga-ebu ụzọ kpebie ma ndị nke ahụ metụtara agbalịwo idozi okwu ahụ n’aka ha, ná mmụọ nke Matiu 5:23, 24 ma ọ bụ Matiu 18:15. Ọ bụrụ na nke a adawo, ma eleghị anya ndụmọdụ sitere n’aka otu onye okenye ma ọ bụ abụọ ga-ezu. Nnọkọ ikpe dị mkpa nanị ma ọ bụrụ na e mewo mmehie dị oké njọ nke pụrụ iduga n’ịchụpụ n’ọgbakọ. (Matiu 18:17; 1 Ndị Kọrint 5:11) A ghaghị inwe ihe ndabere sitere n’Akwụkwọ nsọ maka iguzobe kọmitii ikpe. (Lee Ụlọ Nche, September 15, 1989, peji nke 18.) Mgbe e guzobere otu, e kwesịrị ịhọrọ ndị okenye kasị ruo eru maka okwu ahụ kpọmkwem.
16. Gịnị ka ndị okenye na-agbalị imezu site n’ịnụrụ okwu ikpe?
16 Gịnị ka ndị okenye na-agbalị imezu site n’ịnụrụ okwu ikpe? Na nke mbụ, ọ gaghị ekwe omume ikpe ikpe n’ezi omume ọ gwụla ma a maara ihe bụ eziokwu. Dị ka ọ dị n’Israel, a ghaghị ‘ịjụ ase nke ọma’ n’okwu ndị siri oké ike. (Deuterọnọmi 13:14; 17:4) Ya mere otu ihe mere e ji anụrụ okwu ikpe bụ iji chọpụta ihe ndị bụ eziokwu n’okwu ahụ. Ma a pụrụ, e kwesịkwara ime nke a site n’ịhụnanya. (1 Ndị Kọrint 13:4, 6, 7) Ozugbo a matara eziokwu ndị ahụ, ndị okenye ga-eme ihe ọ bụla dị mkpa iji chebe ọgbakọ ma jigide n’ime ya ụkpụrụ nile dị elu nke Jehova na nrugharị na-enweghị mgbochi nke mmụọ ya. (1 Ndị Kọrint 5:7, 8) Otú ọ dị, otu n’ime nzube ndị mere e ji anụrụ okwu ikpe bụ iji zọpụta onye mmehie nọ n’ihe ize ndụ, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee ma ọlị.—Tụlee Luk 15:8-10.
17. (a) Olee ụzọ e kwesịrị isi mesoo onye e boro ebubo n’oge a na-anụrụ okwu ikpe, n’ihi nzube dịkwa aṅaa? (b) Gịnị ka nke a ga-achọ n’aka ndị so na kọmitii ikpe ahụ?
17 E kwesịghị imeso onye e boro ebubo n’ụzọ ọzọ na-abụghị dị ka atụrụ Chineke. E kwesịrị imeso ya omume n’obi ebere. Ọ bụrụ na e mewo mmehie (ma ọ bụ ọtụtụ mmehie), nzube nke onye na-ekpe ikpe n’ezi omume ga-abụ inyere onye mmehie ahụ aka ịgbanwe, ịghọta ezighị ezi nke ụzọ ya, ichegharị, wee si otú a bụrụ onye a napụtara site “n’ọnyà Ekwensu.” Ọ ga-achọ ‘nkà izi ihe,’ ‘izi ihe n’ịdị nwayọọ.’ (2 Timoti 2:24-26; 4:2) Gịnị ma ọ bụrụ na onye mmehie ahụ amata mgbe ahụ na ya emehiewo, obi ya wee pịa ya ụtarị n’ezie, o wee rịọ Jehova maka mgbaghara? (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 2:37.) Ọ bụrụ na kọmitii ahụ ji n’aka na o ji ezi obi na-achọ enyemaka, dị ka ọ na-adịkarị, ọ gaghị adị mkpa ịchụpụ ya.—Lee Ụlọ Nche, July 1, 1983, peji nke 31, paragraf 1.
18. (a) Olee mgbe kọmitii ikpe kwesịrị igosipụta nguzosi ike n’ịchụpụ onye mere ihe ọjọọ? (b) N’ihi ọnọdụ dị aṅaa na-egbu mmụọ ka ndị okenye kwesịrị ịdọgbu onwe ha n’ọrụ n’ihi atụrụ ndị na-akpafu akpafu?
18 N’aka nke ọzọ, mgbe ndị so na kọmitii ikpe zutere ọnọdụ doro anya nke ịdapụ n’ezi ofufe n’enweghị mwute, ịma ụma nupụ isi megide iwu nile nke Jehova, ma ọ bụ oké ajọ omume, ibu ọrụ ha bụ ichebe ndị ọzọ so n’ọgbakọ site n’ịchụpụ onye ahụ dara iwu nke na-enweghị nchegharị. Ọ bụghị ọrụ dịịrị kọmitii ikpe ahụ isoro onye ahụ mere ihe ọjọọ nọkọọ mgbe mgbe ma ọ bụ tinye ya okwu n’ọnụ, na-agbalị ịmanye ya ka o chegharịa, ma ọ bụrụ na o doro anya na o nweghị mwute nke onye Chineke.c N’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, ndị a na-achụpụ n’ọgbakọ n’ụwa nile eruwo ihe dị ka 1 pasentị nke ndị nkwusa. Nke ahụ pụtara na n’ime ihe dị ka otu narị atụrụ ka fọdụrụ n’ìgwè atụrụ ahụ, otu na-efu efu—ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo nwa oge. Ịtụle oge na mgbalị ọ na-ewe iji webata mmadụ n’ìgwè atụrụ ahụ, ọ́ bụghị ihe na-egbu mmụọ ịmara na a na-arara ọtụtụ iri puku ‘nye n’aka Setan’ kwa afọ?—1 Ndị Kọrint 5:5.
19. Gịnị ka ndị okenye na-eje ozi na kọmitii ikpe na-agaghị echefu, ya mere gịnị ga-abụ nzube ha?
19 Ndị okenye na-amalite ileba anya n’okwu ikpe kwesịrị icheta na ihe ka ọtụtụ n’ime mmehie a na-eme n’ọgbakọ metụtara adịghị ike, ọ bụghị ajọ omume. Ọ dịghị mgbe ha kwesịrị ichefu ihe atụ Jisọs banyere atụrụ furu efu, nke o mechiri site n’okwu ndị ahụ bụ: “Asị m unu, na otú a ọṅụ ga-adị n’eluigwe n’isi otu onye mmehie nke na-echegharị, karị n’isi [iri itoolu na itoolu] ndị ezi omume, ndị nchegharị na-adịghị mkpa.” (Luk 15:7) N’ezie, ‘Jehova . . . ezubeghị ka onye ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.’ (2 Pita 3:9) Site n’enyemaka Jehova, ka kọmitii ikpe nile nọ n’ụwa mee ike ha nile iweta ọṅụ n’eluigwe site n’inyere ndị ajọ omume aka ịhụ mkpa ọ dị ichegharị ma malite ịga ije ọzọ n’okporo ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.—Matiu 7:13, 14.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka ọnọdụ nke ndị okenye so n’atụrụ ọzọ n’ihe banyere aka nri Kraịst, lee akwụkwọ ahụ bụ́ Revelation—Its Grand Climax At Hand!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., na-ebipụta, peji nke 136, ntụaka ala ala peji.
b Lee Ụlọ Nche, September 15, 1989, peji nke 19.
c Lee Ụlọ Nche, December 1, 1981, peji nke 25, paragraf 24.
Ajụjụ Ntụleghachi
◻ N’ịgbaso ihe nlereanya nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu na Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma, gịnị kwesịrị ịbụ nzube bụ isi nke ndị okenye?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka ndị okenye pụrụ isi belata ọnụ ọgụgụ nke okwu ikpe?
◻ N’echiche dị aṅaa ka o ji dị mkpa ka ndị ikpe ghara ịbụ nanị ndị ezi omume kamakwa ndị ọma?
◻ Olee ụzọ e kwesịrị isi mesoo onye mere ihe ọjọọ n’oge a na-anụrụ okwu ikpe, n’ihi nzube dịkwa aṅaa?
◻ N’ihi gịnị ka ịchụpụ mmadụ ga-eji bụrụ ihe ikpeazụ a ga-eme mgbe a nwalesịworo ụzọ ndị ọzọ?
[Foto dị na peeji nke 16]
N’ebe e bu ụzọ mee ọzụzụ atụrụ, a pụrụ izere ọtụtụ okwu ikpe
[Foto dị na peeji nke 18]
Ọbụna n’oge a na-anụrụ okwu ikpe, ndị okenye kwesịrị ịgbalị ịgbazi onye mere ihe ọjọọ ná mmụọ nke ịdị nwayọọ