Mara Otú I Kwesịrị Isi Zaghachi
AJỤJỤ ụfọdụ yiri ngwugwu e kechiri ekechi. Ọ bụ ihe dị n’ime ya bụ ihe kasị mkpa. Ihe kpalitere ajụjụ na-adịkarị mkpa karịa ajụjụ ahụ n’onwe ya.
Ọbụna mgbe onye jụrụ ajụjụ ahụ chọsiri azịza ya ike, gị ịmara otú i kwesịrị isi zaghachi pụrụ ịgụnye ịmara ókè ị ga-ekwuru okwu na akụkụ ị ga-esi malite ịza ajụjụ ahụ. (Jọn 16:12) Mgbe ụfọdụ, dị ka Jizọs mere ka ndịozi ya mara, mmadụ pụrụ ịchọ inweta ihe ọmụma ọ na-ekwesịghị inweta ma ọ bụ nke na-agaghị abara ya uru n’ezie.—Ọrụ 1:6, 7.
Akwụkwọ Nsọ na-enye anyị ndụmọdụ, sị: “Kwenụ ka okwu unu dịrị n’amara mgbe nile, bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.” (Kọl. 4:6) Ya mere, tupu anyị azaghachi, ọ dị anyị mkpa ịtụle, ọ bụghị nanị ihe anyị na-aga ikwu, kama otú anyị ga-esi kwuo ya.
Chọpụta Ihe Bụ́ Echiche Onye ahụ Jụrụ Ajụjụ
Ndị Sadusii nwara iji ajụjụ banyere mbilite n’ọnwụ nke otu nwanyị nke lụworo di ọtụtụ ugboro mata Jizọs n’ọnyà. Otú ọ dị, Jizọs maara na ha ekwenyeghị n’ezie ná mbilite n’ọnwụ. Ya mere ná nzaghachi ya, ọ zara ajụjụ ha n’ụzọ lebaara echiche ha hiere ụzọ anya nke bụ́ isi ihe kpatara ajụjụ ahụ. N’iji arụmụka bụ́ ọkpọka na ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ a maara nke ọma eme ihe, Jizọs kọwapụtara otu ihe ha na-echebatụbereghị echiche na mbụ—ihe àmà doro anya na Chineke gaje n’ezie ime ka ndị nwụrụ anwụ bilite. Azịza ya juru ndị na-emegide ya anya nke na ha tụrụ egwu ịjụ ya ajụjụ ọzọ.—Luk 20:27-40.
Iji mara otú i kwesịrị isi zaghachi, ị ghaghị n’otu aka ahụkwa ịchọpụta ihe bụ́ echiche nke ndị jụrụ gị ajụjụ na ihe ndị na-echegbu ha. Dị ka ihe atụ, nwa klas gị ma ọ bụ onye ọrụ ibe gị nwere ike ịjụ gị ihe mere na ị dịghị agba Krismas. Gịnị mere o ji na-ajụ? Ọ̀ chọrọ ịmata n’ezie ihe kpatara ya, ka ọ̀ bụ nanị na ọ nọ na-eche ma à na-enyekwa gị ohere ikpori ndụ? Iji chọpụta, ọ pụrụ ịdị mkpa ka ị jụọ ya ihe mere o ji jụọ ajụjụ ahụ. Mgbe ahụ zaghachi ya dabere n’ihe o kwuru. I nwekwara ike iji ohere ahụ gosi otú ịgbaso nduzi Bible si echebe anyị pụọ n’ihe dị iche iche metụtara ememe ahụ bụ́ ndị ghọwooro ndị mmadụ ihe mgbakasị ahụ́ na ibu arọ.
Ka e were ya na a kpọrọ gị ka ị gwa ìgwè ụmụ akwụkwọ okwu banyere Ndịàmà Jehova. Mgbe i kwusịrị okwu, ha pụrụ ịjụ ajụjụ dị iche iche. Ọ bụrụ na ajụjụ ha yiri ndị e ji ezi obi jụọ na ndị na-enweghị ihe ọzọ e bu n’obi jụọ, azịza dị mfe ma gaa kpọmkwem n’ihe a chọrọ pụrụ ịkasị mma. Ọ bụrụ na ajụjụ ndị ahụ na-egosipụta ajọ mbunobi ọha mmadụ nwere, ị pụrụ ịrụpụta ihe ka mma site n’ibu ụzọ kwuo okwu dị mkpirikpi banyere ihe ọ pụrụ ịbụ ya mere ndị mmadụ jiri nwee echiche ha nwere banyere okwu ndị dị otú ahụ na ihe mere Ndịàmà Jehova ji ahọrọ ikwe ka Bible na-esetịpụrụ ha ụkpụrụ ha ga-agbaso. Ọtụtụ mgbe, ọ na-aba uru ile ajụjụ ndị dị otú ahụ anya dị ka ihe na-echegbu ndi mmadụ, ọ bụghị dị ka ihe ịma aka—ọ bụ ezie na ha pụrụ ịjụworị ha n’ụzọ ịma aka. Ya mere, nzaghachi gị bụ ohere i nwere iji mee ka ndị na-ege gị ntị nwee echiche sara mbara karị, mee ka ha mara ihe bụ́ eziokwu, ma kọwaa ihe ndabere sitere n’Akwụkwọ Nsọ anyị nwere maka ihe ndị anyị kwere.
Olee otú ị ga-esi meghachi omume n’ebe onye were gị n’ọrụ nọ bụ́ onye na-achọghị inye gị ohere iji gaa mgbakọ? Nke mbụ, lee ya anya otú o si ele ya anya. Gị ikwe nkwa na ị ga-arụfe oge ọrụ n’oge ọzọ ọ̀ pụrụ inye aka? Ọ bụrụ na ị kọwaara ya na ihe a na-ezi ná mgbakọ anyị na-enyere anyị aka ịbụ ndị ọrụ na-akwụwa aka ọtọ na ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, nke ahụ ọ̀ pụrụ ime ka ọ gbanwee obi ya? Ọ bụrụ na i gosi na i bu ọdịmma ya n’uche, ma eleghị anya ọ ga-enyekwa gị ohere ime ihe ọ chọpụtara na ọ dị mkpa ná ndụ gị. Gịnịkwanụ ma ọ chọọ ka i mee omume akwụwaghị aka ọtọ? Ọjụjụ doro anya nke e jikọtara ya na otu isi ihe sitere n’Akwụkwọ Nsọ ga-egosi ebe ị kwụ. Ma, à pụrụ ịrụpụta ihe ka mma ma ọ bụrụ na i buru ụzọ soro ya tụgharịa uche na onye ọ bụla nke dị njikere ịghachitere ya ụgha ma ọ bụ izuru ya ohi nwekwara ike ịghara ya ụgha ma ọ bụ izu ya ohi?
N’aka nke ọzọ, ikekwe ị bụ nwa akwụkwọ nke na-achọghị ikere òkè n’ihe omume ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị a na-eme n’ụlọ akwụkwọ. Cheta na ikekwe onye nkụzi gị adịghị ele ihe anya otú i si ele ya, ọ bụkwa ọrụ ya ịhụ na onye ọ bụla nọ na klas na-erube isi. Ihe ịma aka ndị na-eche gị ihu bụ (1) igosi na ị na-echebara ihe na-echegbu ya echiche, (2) iji nkwanye ùgwù kọwaa ebe ị kwụ, na (3) ịkwụsi ike maka ihe ị maara na ọ ga-atọ Jehova ụtọ. Iji rụpụta ihe kasị mma, a pụrụ ịchọ ihe karịrị nanị ikwupụta ihe i kwenyere n’ụzọ dị mfe nakwa n’ụzọ a kapịrị ọnụ. (Ilu 15:28) Ọ bụrụ na ị bụ nwatakịrị, obi abụọ adịghị ya na nne gị ma ọ bụ nna gị ga-enyere gị aka kwadebe ihe ị ga-ekwu.
Mgbe ụfọdụ, a pụrụ ịchọ ka i gosi na ebubo ndị onye nwere ike ọchịchị boro gị abụghị eziokwu. Onye uwe ojii, onye nnọchiteanya gọọmenti, ma ọ bụ ọkàikpe nwere ike ịsị ka ị zaa ajụjụ banyere irube isi n’otu iwu, nnọpụiche gị dị ka Onye Kraịst, ma ọ bụ echiche gị banyere ikere òkè n’ememe ịhụ mba n’anya. Olee otú i kwesịrị isi zaghachi? ‘N’obi dị nwayọọ na ná nkwanye ùgwù miri emi,’ ka Bible na-adụ ọdụ. (1 Pita 3:15) Ọzọkwa, jụọ onwe gị ihe mere okwu ndị a ji dị mkpa, jirikwa nkwanye ùgwù kweta na ha dị mkpa. Gịnịzi ka ị ga-eme? Pọl onyeozi zoro aka n’ihe iwu ndị Rom kwadoro ruuru mmadụ, ya mere ị pụrụ izo aka n’ihe ndị iwu kwadoro ruuru mmadụ. (Ọrụ 22:25-29) Ikekwe ihe ndị bụ́ eziokwu banyere nguzo Ndị Kraịst oge mbụ nakwa nke Ndịàmà Jehova n’ụwa nile ga-eme ka ụzọ onye ahụ na-anọchite anya gọọmenti si ele ihe anya sakwuo mbara. Ma ọ bụ i nwere ike ịkọwapụta otú ịnakwere ikike Chineke si akpali ndị mmadụ n’ezie irube isi karị mgbe nile n’iwu ndị kwesịrị ekwesị ụmụ mmadụ tiri. (Rom 13:1-14) N’ọnọdụ dị otú ahụ, a pụrụ ịnakwere ihe dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ị ga-ekwu bụ́ nke mere i ji kwere ihe i kweere.
Otú Onye Jụrụ Ajụjụ Si Ele Akwụkwọ Nsọ Anya
Mgbe ị na-ekpebi otú ị ga-esi zaghachi, ọ pụkwara ịdị gị mkpa ịtụle otú onye jụrụ gị ajụjụ si ele Akwụkwọ Nsọ anya. Jizọs mere nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ ndị Sadusii jụrụ banyere mbilite n’ọnwụ. Ebe ọ maara na ọ bụ nanị ihe odide Mozis ka ha nakweere, Jizọs ji ihe ndekọ dị ná Mpịakọta Ise ahụ kwuo okwu, tupu o kwuo ihe o kwuru, ọ sịrị: “Ma, na a na-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ka ọbụna Mozis mere ka a mara.” (Luk 20:37) Gị onwe gị kwa pụrụ ịhụ ya dị ka ihe bara uru ihota ebe dị iche iche na Bible bụ́ ndị onye ị na-agwa okwu kwenyere, marakwa.
Gịnị ma ọ bụrụ na onye ị na-agwa okwu adịghị ele Bible anya dị ka o kwusie o bie? Rịba ama ihe Pọl onyeozi mere n’okwu o kwuru n’Ariopagọs, dị ka e dekọrọ ya n’Ọrụ 17:22-31. O sooro ha kerịta eziokwu ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ n’ehotaghị ebe ọ bụla kpọmkwem site na Bible. N’ebe ọ dị mkpa, ị pụrụ ime otu ihe ahụ. N’ebe ụfọdụ, gị na mmadụ aghaghị inwe mkparịta ụka ọtụtụ ugboro tupu i zoo aka kpọmkwem na Bible. Mgbe i webatara Bible, ọ pụrụ ịbụrụ gị ihe amamihe dị na ya ibu ụzọ kwuo nanị ihe ụfọdụ mere o ji kwesị ekwesị ka e chebara ya echiche kama ikwu hoo haa na ọ bụ Okwu Chineke. Otú ọ dị, nzube gị kwesịrị ịbụ ịgba àmà n’ụzọ doro anya banyere nzube Chineke, na, ka oge na-aga, ime ka onye ị na-agwa okwu jiri aka ya hụ ihe Bible na-ekwu. Bible na-eme ka e kwenye n’ihe karịa ihe ọ bụla anyị onwe anyị nwere ike ikwu.—Hib. 4:12.
“Dịrị n’Amara Mgbe Nile”
Lee ka o si kwesị ekwesị na a gwara ndị na-ejere Jehova, bụ́ onye na-eme amara n’onwe ya, ozi, ka okwu ha “dịrị n’amara mgbe nile, bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ”! (Kọl. 4:6; Ọpụ. 34:6) Nke a pụtara na anyị kwesịrị ikwu okwu n’obiọma, ọbụna mgbe ọ pụrụ iyi ka o kwesịghị onye a na-agwa ya. Okwu anyị kwesịrị ịdị ụtọ, ọ bụghị okwu iwe ma ọ bụ okwu e kwuru n’ejighị akọ.
Ọtụtụ ndị na-enwe oké nrụgide, a na-agwakwa ha okwu ọjọọ kwa ụbọchị. Mgbe anyị kpọtụụrụ ndị dị otú ahụ, ha pụrụ ikwu okwu n’iwe. Olee otú anyị kwesịrị isi zaghachi? Bible na-asị: “Ọzịza okwu dị nro na-eme ka ọnụma laghachi azụ.” Ọzịza okwu dị otú ahụ pụkwara ime ka obi onye na-ele ihe anya n’ụzọ dị iche dajụọ. (Ilu 15:1; 25:15) Nye ndị a na-emeso omume n’ụzọ ọjọọ kwa ụbọchị, omume na ụda olu na-egosi obiọma pụrụ ịmasị ha nke na ha nwere ike ige ntị n’oziọma anyị na-eweta.
Anyị enweghị mmasị n’iso ndị na-adịghị akwanyere eziokwu ùgwù na-arụrịta ụka. Kama nke ahụ, ihe anyị chọrọ bụ isoro ndị ga-enye anyị ohere ime ya tụgharịa uche n’Akwụkwọ Nsọ. N’agbanyeghị ọnọdụ anyị zutere, anyị na-eburu n’obi na anyị kwesịrị iji obiọma na nkwenye siri ike zaghachi na nkwa dị oké ọnụ ahịa ndị Chineke kwere bụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi.—1 Tes. 1:5.
Mkpebi Onwe Onye na Okwu Ndị Metụtara Akọ na Uche
Mgbe onye a na-amụrụ Bible ma ọ bụ onye kwere ekwe ibe gị jụrụ gị ihe ọ ga-eme banyere otu ọnọdụ, olee otú i kwesịrị isi zaghachi? Ị pụrụ ịma ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ gị. Ma onye ọ bụla aghaghị iburu ihe si ná mkpebi ndị ọ na-eme ná ndụ pụta. (Gal. 6:5) Pọl onyeozi kọwara na ya gbara ndị ya meere nkwusa ume inwe “nrubeisi site n’okwukwe.” (Rom 16:26) Nke ahụ bụ ezi ihe nlereanya anyị ga-agbaso. Onye na-eme mkpebi nanị iji mee ihe ga-amasị onye na-akụziri ya Bible, ma ọ bụ onye ọzọ, bụ mmadụ ka ọ na-ejere ozi, ọ naghị adị ndụ site n’okwukwe. (Gal. 1:10) Ya mere, azịza dị mfe, nke gara kpọmkwem n’ihe a chọrọ nwere ike ọ gaghị abụ maka ezi ọdịmma nke onye ahụ na-ajụ ajụjụ.
Ya mere, olee otú ị pụrụ isi zaghachi n’ụzọ kwekọrọ ná nduzi Bible? Ị pụrụ ịdọrọ uche gaa n’ụkpụrụ Bible ndị kwesịrị ekwesị na ihe atụ ndị dị n’ihe ndekọ Bible. N’ọnọdụ ụfọdụ, i nwere ike igosi ya otú e si eme nnyocha ka o wee chọpụta ụkpụrụ na ihe atụ ndị ahụ n’onwe ya. I nwedịrị ike ịtụle ụkpụrụ ndị ahụ na uru ihe atụ ndị ahụ bara n’egosighị otú ha siri metụta ọnọdụ a na-ekwu maka ya. Jụọ onye ahụ ma ọ̀ dị ihe ọ hụrụ n’ime ha nke nwere ike inyere ya aka ime mkpebi amamihe dị na ya. Gbaa ya ume ka ọ tụlee ụzọ ime ihe nke ga-ewetara Jehova obi ụtọ, na-eburu ụkpụrụ na ihe atụ ndị a n’uche. N’ụzọ dị otú a ị na-enyere ya aka ‘ịzụ ikike nghọta ya ịmata ọdịiche dị n’ihe ziri ezi na ihe ọjọọ.’—Hib. 5:14.
Ịza Ajụjụ ná Nzukọ Ọgbakọ
Nzukọ ọgbakọ Ndị Kraịst na-enyekarị anyị ohere ime nkwupụta nke okwukwe anyị n’ihu ọha. Otu ụzọ anyị si eme nke a bụ site n’ịza ajụjụ. Olee otú anyị kwesịrị isi aza ajụjụ? O kwesịrị ịbụ n’ọchịchọ nke ịgọzi, ma ọ bụ ikwu okwu ọma banyere Jehova. Nke ahụ bụ ihe ọbụ abụ bụ́ Devid mere mgbe ọ nọ “n’ime mkpọkọta mmadụ nile.” (Ọma 26:12) Anyị kwesịkwara ịza ajụjụ n’ụzọ ga-agba ndị kwere ekwe ibe anyị ume, na-akpali ha “inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ,” dị ka Pọl onyeozi gbara ume ka e mee. (Hib. 10:23-25) Ịmụ ihe a ga-amụ tupu oge eruo pụrụ inyere anyị aka imezu nke a.
Ọ bụrụ na a kpọọ gị ịza ajụjụ, mee ka okwu gị dị mfe, doo anya, ma dị nkenke. Ekwula okwu n’ihe dum dị na paragraf ahụ; kwuo okwu nanị n’otu isi ihe. Ọ bụrụ na ị zaa nanị otu akụkụ nke ajụjụ ahụ, nke ahụ ga-enye ndị ọzọ ohere ịtụkwasị ihe. Ọ na-aba uru karịsịa iwepụta isi ihe dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha n’ihe ọmụmụ ahụ. Mgbe ị na-eme nke ahụ, gbalịa ịdọrọ uche gaa n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ nke metụtara kpọmkwem isi ihe a na-atụle. Mụta iji okwu nke aka gị na-aza ajụjụ kama ịgụpụta ya agụpụta site na paragraf. Enyela onwe gị nsogbu ma ọ bụrụ na azịza gị ezichaghị ezi. Nke ahụ na-eme onye ọ bụla na-aza ajụjụ site n’oge ruo n’oge.
O doro anya na ịmara otú anyị kwesịrị isi zaghachi na-agụnye ihe karịrị ịma ihe bụ́ azịza nke otu ihe kpọmkwem. Ọ na-achọ nghọta. Ma lee ka o si enye afọ ojuju mgbe i nyere azịza nke si gị n’obi na nke metụrụ ndị ọzọ n’obi!—Ilu 15:23.