‘Ịrịọ Arịrịọ n’Ihi Ịhụnanya’
N’IHE dị ka afọ 60-61 O.A., otu ohu gbara ọsọ hapụrụ Rom ma malite njem ụla dị 1,400 kilomita ịga Kọlọsi, bụ́ obodo dị n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ nke Asia Minor. O ji ozi e ji aka dee nke ọ ga-enye onye nwe ya, nke onye dere ya bụ Pọl onyeozi. Taa, akwụkwọ ozi ahụ so n’akụkụ nke Bible, o nwekwara aha nke onye natara akwụkwọ ozi ahụ, bụ́ Faịlimọn.
Akwụkwọ ozi ahụ e degara Faịlimọn bụ ntụgharị uche na-adọrọ adọrọ, nke e dere n’ụzọ dị akọ. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mkpa karị, o nwere ihe mmụta ndị a pụrụ itinye n’omume nye ndị Kraịst taa, nke otu n’ime ha bụ abamuru nke ịrịọ ibe anyị arịrịọ n’ihi ịhụnanya ndị Kraịst. Ka anyị leba anya n’akwụkwọ nke a dị mkpirikpi ma dị ike n’ụzọ miri emi.
Onye Gbara Ọsọ Alata
Faịlimọn bụ onye Kraịst, onye a hụrụ n’anya nke ukwuu so n’ọgbakọ dị na Kọlọsi. (Faịlimọn 4, 5) Leenụ, ọgbakọ dị n’ebe ahụ ji ụlọ ya mere ebe a na-enwe nzukọ! (Amaokwu 2) Ọzọkwa, Faịlimọn matara Pọl onyeozi n’onwe ya; ọ pụrụ ịbụ na onyeozi ahụ nyere aka n’ime ka ọ ghọọ onye Kraịst. N’eziokwu, Pọl gosipụtara na ya onwe ya ekwusaghị ozi ọma na Kọlọsi. (Ndị Kọlọsi 2:1) Otú ọ dị, ọ nọrọ afọ abụọ n’Efesọs, na-ekwusa ozi ọma ruo n’ókè nke na “ndị nile ndị bi n’Esia [nke gụnyere Kọlọsi] nụrụ okwu Onyenwe anyị.” (Ọrụ 19:10) O yiri ka Faịlimọn ò so ná ndị ji ihe ha nụrụ mere ihe.
Ka o sina dị, dị ka ọtụtụ ndị bara ọgaranya n’oge ahụ, Faịlimọn nwere ndị ohu. N’oge ochie, ịgba ohu abụghị ihe rụrụ arụ mgbe nile. N’etiti ndị Juu, irenye onwe onye ma ọ bụ onye so n’ezinụlọ mmadụ n’ohu bụ ụzọ a nakweere iji kwụọ ụgwọ mmadụ ji. (Levitikọs 25:39, 40) Akwụkwọ bụ The International Standard Bible Encyclopedia kwuru banyere oge ndị Rom, sị: “Ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ndị mmadụ renyere onwe ha n’ohu n’ihi ọtụtụ ihe, karịsịa iji banye ná ndụ nke dị mfe ma nwee ntụkwasị obi karịa ịdị ndụ dị ka onye ogbenye, ịbụ onye nweere onwe ya, iji nweta ọrụ ndị pụrụ iche, na iji nọrọ n’ọkwa dị elu . . . Ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Rom renyere onwe ha n’aka ụmụ amaala Rom na-enwe olileanya ahụ ziri ezi, bụ́ nke iwu ndị Rom duziri, nke ịghọ ụmụ amaala Rom n’onwe ha mgbe a tọhapụrụ ha n’ohu.”
Otú ọ dị, nsogbu bilitere mgbe otu n’ime ndị ohu Faịlimọn, onye ikom aha ya bụ Ọnisimọs, hapụrụ ya ma gbalaga Rom, ma eleghị anya na-ezuru ego Faịlimọn iji kwụọ ụgwọ mgbapụ ya. (Amaokwu 18) Na Rom, Ọnisimọs zutere Pọl onyeozi, bụ́ onye a tụrụ mkpọrọ n’ebe ahụ.
Ohu ahụ ‘na-abaghị n’ihe n’oge gara aga’ bụ́ onye gbahapụrụ ibu ohu ya, ghọrọ onye Kraịst ugbu a. O wepụtara onwe ya ijere Pọl ozi ma jeere onyeozi ahụ a tụrụ mkpọrọ ozi ndị bara uru. Ọ bụghị ihe ijuanya na Ọnisimọs nwetara ọnọdụ ‘n’obi’ Pọl ma ghọọ “nwanna a hụrụ n’anya” nye Pọl!—Amaokwu 11, 12, 16.
Pọl onyeozi gaara enwe mmasị ka Ọnisimọs soro ya nọrọ, ma Faịlimọn nwere ikike ndị iwu kwadoro dị ka onye nwe Ọnisimọs. Otú a, Ọnisimọs ji ya dị ka ụgwọ ịlaghachi n’ije ozi nke nna ya ukwu n’ụzọ iwu. Mgbe ahụ, olee otú Faịlimọn ga-esi anabata ya? Ọ̀ ga-eji iwe kwuo ka a taa ya oké ahụhụ dị ka o nwere ikike ikwu? Ọ̀ ga-ama izi ezi nke ọbụbụ Ọnisimọs si na ya bụ onye Kraịst ibe ya aka?
Idozi Okwu n’Ịhụnanya
A kpaliri Pọl idegara Faịlimọn akwụkwọ banyere Ọnisimọs. O ji aka ya dee akwụkwọ ozi ahụ, n’ejighị onye odeakwụkwọ dị ka o na-emebu. (Amaokwu 19) Jiri minit ole na ole gụọ akwụkwọ ozi ahụ dị mkpirikpi e degaara Faịlimọn n’ozuzu ya. Ị ga-achọpụta na mgbe ọ kọwasịrị onwe ya ma rịọ ka Faịlimọn na ezinụlọ ya nweta ‘amara na udo,’ Pọl jara Faịlimọn mma maka ‘ịhụnanya na okwukwe ya n’ebe Onyenwe anyị Jisọs nọ, na n’ebe ndị nsọ nile nọ.’—Amaokwu 1-7.
Ọ gaara adịrị Pọl mfe iji ikike ya dị ka onyeozi mee ihe ma ‘na-enye Faịlimọn iwu ime ihe kwesịrị ekwesị,’ kama nke ahụ, Pọl ‘rịọrọ arịrịọ n’ihi ịhụnanya.’ O mesiri eziokwu ahụ ike nke bụ na Ọnisimọs aghọwo nwanna nke bụ onye Kraịst n’ezie, onye meworo ihe baara Pọl uru. Onyeozi ahụ kwetara, sị: “Mụ onwe m na-ezuberị ijide [Ọnisimọs] ka mụ na ya nọdụ, ka o wee na-ejere m ozi n’agbụ nke ozi ọma n’ọnọdụ gị: ma,” ka Pọl gara n’ihu ikwu, “achọghị m ime ihe ọ bụla mgbe ị na-ekwenyeghị; ka ịdị mma gị wee ghara ịdị ka a ga-asị na ọ dị n’ụzọ mkpa, kama ka o wee dị n’ụzọ ọchịchọ obi gị.”—Amaokwu 8-14.
Onyeozi ahụ si otú a gbaa Faịlimọn ume ka ọ nabata ohu ya mbụ ahụ ọzọ dị ka nwanna. “Nara ya nke ọma dị ka mụ onwe m,” ka Pọl dere. Ọ bụghị na Ọnisimọs ga-enwere onwe ya kpam kpam pụọ n’ibu ohu. Pọl adịghị eme mkpọsa ịgbanwe usoro mmekọrịta mmadụ na ibe ya dị adị n’oge ya. (Tụlee Ndị Efesọs 6:9; Ndị Kọlọsi 4:1; 1 Timoti 6:2.) Otú o sina dị, ihe ịrụ ụka adịghị ya na mmekọrịta onye bụ ohu na nna ya ukwu ga-abụ nke e webatara ihe nkekọ ndị Kraịst nke dị ugbu a n’etiti Ọnisimọs na Faịlimọn n’ime ya. Faịlimọn ga-ele Ọnisimọs anya ‘dị ka onye karịrị ohu, dị ka nwanna a hụrụ n’anya.’—Amaokwu 15-17.
Otú ọ dị, gịnị banyere ụgwọ Ọnisimọs pụrụ iji, ma eleghị anya n’ihi izu ohi? Ọzọ, Pọl rịọrọ Faịlimọn arịrịọ n’ihi enyi ha bụ, na-asị: “Ọ bụrụ na o mejọrọ gị n’ụzọ ọ bụla, ma ọ bụ na o ji gị ụgwọ ọ bụla, gụọ ya n’ụgwọ m ji gị.” Pọl kwupụtara obi ike o nwere na Faịlimọn ga-egosi mmụọ nke mgbaghara, na-eme ihe karịrị ihe ndị Pọl rịọrọ ya. Ebe ọ bụ na Pọl nwere olileanya ịbụ onye a tọhapụrụ n’oge na-adịghị anya, o mere ndokwa ọbụna ịbụ onye Faịlimọn ga-ele ọbịa n’ọdịnihu dị nso. Mgbe o kelesịrị Faịlimọn ọzọ ma rịọ ka Faịlimọn nweta “amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst,” Pọl mechiri akwụkwọ ozi ya.—Amaokwu 18-25.
Ihe Mmụta nye Ndị Kraịst Taa
Akwụkwọ Faịlimọn jupụtara n’ihe mmụta ndị a pụrụ itinye n’omume nye ndị Kraịst taa. Dị ka ihe atụ, ọ na-echetara anyị mkpa ọ dị ịgbaghara ndị ọzọ, ọbụna mgbe onye kwere ekwe ibe anyị mejọrọ anyị n’ụzọ dị oké njọ. “Ọ bụrụ na unu agbaghara mmadụ ndahie nile ha,” ka Jisọs Kraịst kwuru, “Nna unu [nke eluigwe] ga-agbagharakwa unu.”—Matiu 6:14.
Ndị nọ n’ọnọdụ ikwu ihe a ga-eme n’ọgbakọ ndị Kraịst taa pụrụ irite uru karịsịa site n’akwụkwọ Faịlimọn. Ọ bụ ihe kwesịrị ịrịba ama na Pọl hapụrụ iji ikike o nwere dị ka onyeozi mee ihe inye Faịlimọn iwu ka o mee ihe kwesịrị ekwesị. Ọzọkwa, Pọl asịghị ka a hapụ Ọnisimọs ka ọ nọrọ na Rom na-ejere Pọl ozi. Pọl kwanyeere ikike ndị ọzọ nwere n’ebe ihe onwunwe ha dị ùgwù. Ọ ghọtakwara na ọ bụ ezie na iji ikike mee ihe pụrụ ịrụpụta ime ihe e kwuru, ọ ga-aka mma ka Faịlimọn mee ihe sitere ya n’obi. Ọ rịọrọ arịrịọ site n’ịhụnanya iji kpalie mmeghachi omume sitere n’ala ala obi.
Ya mere, ọ dịghị mgbe ọ bụla ndị okenye bụ ndị Kraịst taa kwesịrị ‘ime ndị bụ ihe nketa Chineke dị ka ha bụ ndị nwe ha’ site n’iji ike ha na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi ma ọ bụ site n’iji ụzọ aka ike, nke na-akpasu iwe na-emeso ìgwè atụrụ ahụ. (1 Pita 5:1-3) Jisọs kwuru, sị: “Unu amatawo na ndị bụ isi nke mba nile ọzọ na-eme ha dị ka ndị nwe ha: ndị ukwu ha na-achịkwa ha. Ọ bụghị otú a ka ọ ga-adị n’etiti unu.” (Matiu 20:25, 26) Ndị nlekọta na-achọpụtakarị na ndị so n’ìgwè atụrụ ahụ na-azaghachi n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma n’arịrịọ ịhụnanya karịa n’iwu e tiri eti. Ndị na-enwe nkụda mmụọ na-enwe obi ekele maka ndị nlekọta ga-eji obi ọma wepụta oge ịṅa ntị n’ihe bụ nsogbu ha na inye ndụmọdụ kwere nghọta.
Akwụkwọ ozi Pọl chetakwaara ndị okenye abamuru nke ịja mma na ịdị akọ. Ọ malitere site n’ikwu na “obi ndị nsọ ezuwo ike site n’aka” Faịlimọn. (Amaokwu 7) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ịja mma nke a sitere n’obi eziokwu mere ka Faịlimọn nọrọ n’ọnọdụ nke ịnakwere ihe a ga-ekwu. N’otu aka ahụ taa, a pụrụ ibelata ịdị ike nke ndụmọdụ ma ọ bụ okwu ndụmọdụ mgbe nile site n’okwu ịja mma na-ekpo ọkụ, nke sitere n’obi eziokwu. Ndụmọdụ dị otú ahụ ekwesịghị ịbụ nke na-enweghị mmetụta ma ọ bụ nke na-adịghị akọ, kama nke “e ji nnú mee ka ọ dị ụtọ” n’ụzọ dị ukwuu ka o wee dịkwuo ụtọ ná ntị onye a na-agwa okwu.—Ndị Kọlọsi 4:6.
Pọl onyeozi kwupụtakwara obi ike o nwere na Faịlimọn ga-eme ihe ziri ezi, na-asị: “Ebe m tụkwasịworo obi n’ịṅa ntị gị ana m edegara gị akwụkwọ, n’ihi na amatara m na ị ga-eme ọbụna karị ihe m na-ekwu.” (Amaokwu 21) Ndị okenye, ùnu na-ekwupụta ụdị obi ike dị otú ahụ n’ebe ndị Kraịst ibe unu nọ? Ọ̀ bụ na nke a adịghị enyere ha aka ịchọ ime ihe ziri ezi?
N’ụzọ na-adọrọ mmasị, ndị mụrụ ụmụ na-achọpụtakarị na ikwupụta obi ike ha nwere n’ebe ụmụ ha nọ na-enwekwa mmetụta dị mma. Site n’ịmata abamuru nke nrubeisi sitere n’obi—ọchịchọ nke ime ihe karịrị nnọọ ihe a chọrọ mmadụ n’aka—ndị mụrụ ụmụ pụrụ inye ụmụ ha ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nkwanye ùgwù. Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị inye iwu ma ọ bụ ịrịọ arịrịọ, mgbe ọ bụla o kwere omume, n’olu obi ọma, nke ịhụnanya. E kwesịrị igosi inwe nghọta, nyekwa ihe mere a ga-eji mee ya. Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịja ụmụ ha mma n’ụzọ na-ekpo ọkụ mgbe o kwesịrị ka e nye ịja mma dị otú ahụ ma zerekwa ịbụ ndị na-akatọ ha nke ukwu, karịsịa n’ihu ọha.
N’otu ụzọ ahụkwa, ndị bụ di pụrụ igosipụta ọdịdị nke inwe ezi echiche na obi ọma, na-adị njikere ito nwunye ha. Nke a na-eme ka nwunye ido onwe ya n’okpuru bụrụ ihe na-enye obi ụtọ na ihe na-eweta ume ọhụrụ na ọṅụ!—Ilu 31:28; Ndị Efesọs 5:28.
E kwughị kpọmkwem otú Faịlimọn si meghachi omume banyere akwụkwọ ozi Pọl dere ya. Otú ọ dị, anyị agaghị eche na obi ike Pọl nwere n’ebe ọ nọ lara n’iyi. Ka ndị okenye, ndị mụrụ ụmụ, na ndị bụ di bụ́ ndị Kraịst taa sikwa otú ahụ nwee ihe ịga nke ọma n’ihe nile ha na-eme, ọ bụghị site n’ịmanye mmadụ amanye, inye iwu, ma ọ bụ ime n’ike, kama site ‘n’ịrịọ arịrịọ n’ihi ịhụnanya.’
[Foto dị na peeji nke 23]
Kama iji ike o nwere dị ka onyeozi mee ihe, Pọl rịọrọ Faịlimọn arịrịọ n’ihi ịhụnanya ndị Kraịst