Ònye Ga-alanarị ‘Ụbọchị Jehova’?
“Aha mmadụ gịnị ka unu na-aghaghị ịbụ n’ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile, na-ele anya [mbịarute, NW] nke ụbọchị ahụ nke Chineke.”—2 PITA 3:11, 12.
1. Olee ndị jiworo mmụọ na ike nke Elaịja rụọ ọrụ?
JEHOVA CHINEKE esiwo n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ họpụta ndị ha na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst ga-aghọ ndị nketakọ n’Alaeze eluigwe. (Ndị Rom 8:16, 17) Mgbe ha ka nọ n’ụwa, ndị Kraịst e tere mmanụ ejiriwo mmụọ na ike Elaịja rụọ ọrụ. (Luk 1:17) N’isiokwu bu ụzọ, anyị rịbara ama myirịta dị n’etiti ọrụ ha na ndị nke Elaịja onye amụma. Ma gịnị banyere ọrụ onye nọchiri Elaịja, bụ́ Elaịsha onye amụma?—1 Ndị Eze 19:15, 16.
2. (a) Gịnị bụ ọrụ ebube ikpeazụ nke Elaịja, na nke mbụ Elaịsha? (b) Olee ihe nnwapụta e nwere na Elaịja ejeghị eluigwe?
2 Ọrụ ebube ikpeazụ Elaịja rụrụ bụ ikewa mmiri nke Osimiri Jọdan site n’iji uwe mwụda ya tie na ya. Nke a mere ka Elaịja na Elaịsha gabiga n’ala akọrọ. Ka ha na-aga n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke osimiri ahụ, oké ifufe buuru Elaịja gaa n’ebe ọzọ n’ụwa. (Lee igbe dị na peji nke 15 nke isiokwu ya bụ “Olee Eluigwe nke Elaịja Rịgoro?”) A hapụrụ uwe mwụda Elaịja. Mgbe Elaịsha ji ya tie na Jọdan, mmiri ya kewara ọzọ, na-eme ka o nwee ike isi n’ala akọrọ laghachi. Ọrụ ebube a mere ka o doo anya na Elaịsha aghọwo onye nọchiri Elaịja n’ịkwalite ezi ofufe n’Israel.—2 Ndị Eze 2:6-15.
Àgwà Chineke Dị Oké Mkpa
3. Gịnị ka Pọl na Pita kwuru banyere ọnụnọ Jisọs na ‘ụbọchị Jehova’?
3 Ọtụtụ narị afọ mgbe ụbọchị Elaịja na Elaịsha gasịrị, ndị ozi bụ́ Pọl na Pita jikọtara ‘ụbọchị Jehova’ na-abịanụ na ọnụnọ Jisọs Kraịst na “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ka dị n’ihu mgbe ahụ. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:1, 2; 2 Pita 3:10-13) Iji lanarị oké ụbọchị Jehova—mgbe Chineke ga-ebibi ndị iro ya ma zọpụta ndị ya—anyị aghaghị ịchọ Jehova ma gosipụta ịdị nwayọọ n’obi na ezi omume. (Zefanaịa 2:1-3) Ma ụfọdụ àgwà ndị ọzọ na-apụta ìhè ka anyị na-atụle ihe omume ndị metụtara Elaịsha onye amụma.
4. Òkè dị aṅaa ka ịnụ ọkụ n’obi na-ekere n’ozi Jehova?
4 Ịnụ ọkụ n’obi maka ozi Chineke dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-alanarị ‘ụbọchị Jehova.’ Elaịja na Elaịsha nwere ịnụ ọkụ n’obi n’ozi Jehova. N’inwe ịnụ ọkụ n’obi yiri nke ahụ, ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ taa na-ejere Jehova ozi dị nsọ, na-ebutekwa ụzọ n’ikwusa ozi ọma ahụ.a Kemgbe etiti afọ ndị 1930, ha agbawo ndị nile na-anara ozi Alaeze ahụ ma na-enwe olileanya ibi n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi ume ịrara onwe ha nye Jehova ma bụrụ ndị e mere baptism. (Mak 8:34; 1 Pita 3:21) Ọtụtụ nde anabatawo agbamume a. E nwere mgbe ha nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ, nwụọkwa anwụ n’ime mmehie, ma ugbu a ha amụtawo eziokwu Chineke, ha nwere olileanya nke ndụ ebighị ebi n’elu ala paradaịs, ha na-anụkwa ọkụ n’obi n’ozi Jehova. (Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3-5) Site n’ịnụ ọkụ n’obi, nkwenye, afọ ọma, na ọrụ ọma ha ndị ọzọ, ha na-ewetara ụmụnna ime mmụọ Kraịst ka nọ n’ụwa izu ike.—Matiu 25:31-46.
5. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa imere “ụmụnna” Jisọs ihe ọma, oleekwa ihe nlereanya anyị nwere site n’ụbọchị Elaịsha?
5 Ndị meere “ụmụnna” Jisọs ihe ọma n’ihi na ndị a e tere mmanụ bụ ụmụazụ ya nwere olileanya nke ịlanarị ‘ụbọchị Jehova.’ A gọziri otu di na nwunye n’ụzọ dị ukwuu n’obodo nta bụ́ Shunem n’ihi igosi Elaịsha na onye na-ejere ya ozi obiọma na afọ ọma. Di na nwunye a enweghị nwa nwoke, di ya emewokwa agadi. Ma Elaịsha kwere nwanyị Shunem ahụ nkwa na ọ ga-amụ nwa nwoke, nke a mekwara. Mgbe otu nwa nwoke a nwụrụ ka afọ ole na ole gasịrị, Elaịsha gara Shunem ma kpọlite ya n’ọnwụ. (2 Ndị Eze 4:8-17, 32-37) Lee ụgwọ ọrụ dị ukwuu ọ bụ maka igosi Elaịsha afọ ọma!
6, 7. Olee ihe nlereanya Neaman setịpụrụ, njikọ dịkwa aṅaa ka nke a na ịlanarị ‘ụbọchị Jehova’ nwere?
6 Ịdị umeala n’obi dị mkpa iji nakwere ntụziaka dabeere na Bible site n’aka “ụmụnna” Kraịst, na-enwe olileanya nke ịlanarị ụbọchị Jehova. Onye ekpenta ahụ bụ́ onyeisi ndị agha Siria bụ́ Neaman aghaghị igosi ịdị umeala n’obi iji gbasoo aro nwa agbọghọ Israel ahụ a dọọrọ n’agha tụrụ ma chọọ ọgwụgwọ site n’ịga Israel ịchọ Elaịsha. Kama isi n’ụlọ ya pụta izute Neaman, Elaịsha zigaara ya ozi a: “Jee, saa ahụ ugbo asaa n’ime Jọdan, anụ ahụ gị ga-alaghachikwutekwa gị, ị ga-adịkwa ọcha.” (2 Ndị Eze 5:10) A kpara nganga Neaman aka, iwe wekwara ya, ma mgbe o jisịrị obi umeala gaa ma dakpuo n’ime Jọdan ugboro asaa, “anụ ahụ ya wee laghachi dị ka anụ ahụ nwa okoro nta, o wee dị ọcha.” (2 Ndị Eze 5:14) Tupu ọ laghachi, Neaman mere ogologo njem laghachi Sameria ije kelee onye amụma Jehova. N’ikpebisi ike ịghara irite uru n’ụzọ ihe onwunwe site n’ike Chineke nyere, Elaịsha pụtara izute Neaman ma jụ ịnara onyinye ọ bụla. Neaman ji obi umeala gwa Elaịsha, sị: “Ohu gị agaghị emere chi ọzọ àjà nsure ọkụ ma ọ bụ àjà ọzọ site n’ugbu a, ma ọ bụ nanị Jehova.”—2 Ndị Eze 5:17.
7 Site n’iji obi umeala na-agbaso ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ sitere n’aka ndị e tere mmanụ, a na-agọzi ọtụtụ nde n’ụba taa. Ọzọkwa, site n’igosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs, e mewo ka ndị a nwere obi eziokwu dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ. Ugbu a ha nwere ihe ùgwù nke ịbụ enyi Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. (Abụ Ọma 15:1, 2; Luk 16:9) A ga-akwụghachikwa nrara ha nye Chineke na ozi ya site na ha ịbụ ndị a ga-echebe pụọ ná mbibi ebighị ebi na-aga ịdakwasị ndị mmehie dị mpako, na-enweghị nchegharị ‘n’ụbọchị Jehova’ ahụ ji ọsọ abịaru nso.—Luk 13:24; 1 Jọn 1:7.
“Ònye Dịnyeere M? Ònye?”
8. (a) Àgwà dị aṅaa ka ndị ga-alanarị ‘ụbọchị Jehova’ nwere n’ebe ime uche Chineke dị? (b) Ọrụ dị aṅaa ka e nyere Jihu? (ch) Gịnị gaje ime Jezebel?
8 Ndị nwere olileanya ịlanarị ‘ụbọchị Jehova’ aghaghịkwa ikpebisi ike ime uche Chineke. Elaịja ji obi ike buo amụma mbibi nke ezinụlọ Ehab ahụ na-egbu ọchụ, nke na-efe Beal. (1 Ndị Eze 21:17-26) Otú ọ dị, tupu ogbugbu a ewere ọnọdụ, onye nọchiri Elaịja bụ́ Elaịsha aghaghị ịrụzu ọrụ ụfọdụ a na-arụchabeghị. (1 Ndị Eze 19:15-17) Mgbe oge Jehova ruru, Elaịsha gwara otu onye oje ozi ka ọ gaa tee Jihu bụ́ onye isi usuu ndị agha mmanụ dị ka eze ọhụrụ nke Israel. Mgbe ọ wụkwasịchara mmanụ n’isi Jihu, onye ozi ahụ gwara ya, sị: “Otú a ka Jehova, bụ́ Chineke Israel, sịrị, Etewo m gị mmanụ ịbụ eze ndị Jehova, bụ́ Israel. Ị ga-etigbukwa ụlọ Ehab, bụ́ onye nwe gị, ka M wee bọọ ọbọ ọbara ndị ohu m, bụ́ ndị amụma, na ọbara ndị ohu nile nke Jehova, n’aka Jezebel. Ụlọ nile nke Ehab ga-alakwa n’iyi.” A ga-atụpụrụ nkịta ajọ Eze Nwanyị Jezebel, a gaghị elikwa ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.—2 Ndị Eze 9:1-10.
9, 10. Olee otú okwu Elaịja siri mezuo n’ọnọdụ Jezebel?
9 Ndị ikom Jihu ghọtara izi ezi nke mmanụ e tere ya wee kpọsaa na ọ bụ eze ọhụrụ nke Israel. N’ime ihe n’ụzọ pụtara ìhè, Jihu gbagara Jezreel iji malite ọrụ ya nke igbu ndị ndú si n’ezi ofufe dapụ nke ofufe Beal. Onye mbụ akụ́ ogbugbu nke Jihu tụrụ bụ nwa nwoke Ehab, bụ́ Eze Jehoram. O si n’obodo ahụ gbapụta ịjụ ma Jihu ò jiriwo ozi udo bịa. “Gịnị bụ udo ahụ, na mgbe ịkwa iko Jezebel, bụ́ nne gị, na mgbaasị ya na-adị ọtụtụ?” ka Jihu zaghachiri. Ozugbo ahụ, akụ́ Jihu mapuru obi Jehoram.—2 Ndị Eze 9:22-24.
10 Ndị inyom na-asọpụrụ Chineke na-ezere ịdị ka Jezebel ma ọ bụ ndị yitewere ya. (Mkpughe 2:18-23) Ka Jihu na-erule Jezreel, Jezebel agbalịwo ịchọ onwe ya mma. N’isite na window leda anya, o ji iyi egwu na-apụtaghị ìhè kelee ya. Ọ jụrụ ndị ozi nwanyị ahụ, sị: “Ònye dịnyeere m? Ònye?” Ozugbo ahụ, ọnozi abụọ ma ọ bụ atọ eleda anya. Hà dịnyeere Jihu? “Tụdanụ ya,” ka ọ gwara ha. Mgbe ahụ, ha mere ihe ozugbo, si na window tụpụ ajọ Jezebel ahụ. A zọkwasịrị ya ụkwụ, ikekwe n’okpuru ụkwụ ịnyịnya ndị ahụ. Mgbe ndị mmadụ bịara ili ya, ‘ha achọtaghị ihe ọ bụla ma ọ bụghị okpokoro isi ya, na ụkwụ ya abụọ na ọbọ aka ya abụọ.’ Lee mmezu dị egwu nke okwu Elaịja ọ bụ: “Nkịta ga-eri anụ ahụ Jezebel”!—2 Ndị Eze 9:30-37.
Nkwado Sitere n’Obi Maka Ezi Ofufe
11. Ònye bụ Jehonadab, ò sikwa aṅaa gosi nkwado ya maka ezi ofufe?
11 Ndị na-atụ anya ịlanarị ‘ụbọchị Jehova’ ma dịrị ndụ ebighị ebi n’elu ala aghaghị iji obi ha nile kwadoo ezi ofufe. Ha aghaghị ịdị ka Jehonadab, ma ọ bụ Jonadab, bụ́ onye na-abụghị onye Israel nke na-efe Jehova. Ka Jihu nọgidere jiri ịnụ ọkụ n’obi na-arụzu ọrụ ya, Jehonadab chọrọ igosi nkwenye na nkwado ya. Ya mere ọ pụrụ izute eze ọhụrụ nke Israel, onye na-aga Sameria igbu ndị fọdụrụ n’ezinụlọ Ehab. N’ịhụ Jehonadab, Jihu jụrụ, sị: “Obi gị, ò ziri ezi, dị ka obi m dị n’ebe obi gị dị?” Nkwenye Jehonadab kwaliri Jihu ịgbatị aka ya ma kpọọ Jehonadab ka ọ bata n’ime ụgbọ ịnyịnya ya, na-asị: “Jesoo m, lee ekworo m na-ekworo Jehova.” N’egbughị oge, Jehonadab naara ihe ùgwù nke igosi nkwado ọ na-enye onye Jehova tere mmanụ imezu ikpe ya.—2 Ndị Eze 10:15-17.
12. N’ihi gịnị ka Jehova ji zie ezi n’ịchọ ofufe a na-ekewaghị ekewa?
12 O doro anya na nkwado sitere n’obi maka ezi ofufe kwesịrị ekwesị, n’ihi na Jehova bụ Onye Okike na Eze Eluigwe na Ala, onye na-achọ n’ụzọ ziri ezi ma kwesị ofufe anyị a na-ekewaghị ekewa. O nyere ndị Israel iwu, sị: “Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, ma ọ bụ oyiyi nke ụdị ọ bụla nke dị n’eluigwe n’elu, ma ọ bụ nke dị n’ụwa n’okpuru ya, ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa: gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe: n’ihi na Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, bụ Chineke ekworo.” (Ọpụpụ 20:4, 5) Ndị nwere olileanya ịlanarị ‘ụbọchị Jehova’ aghaghị ife nanị ya, na-eme nke ahụ “n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:23, 24) Ha aghaghị ịkwadosi ezi ofufe ike, dị ka Elaịja, Elaịsha, na Jehonadab.
13. Dị ka obi Jehonadab dịnyeere Jihu, olee ndị nakweere Eze bụ́ Mesaịa ahụ, oleekwa otú ha si egosi ǹke a?
13 Mgbe e gbusịrị ezinụlọ Ehab, Eze Jihu weere nzọụkwụ ndị ọzọ iji mata ndị na-efe Beal ma kpochapụ okpukpe ụgha a n’Israel. (2 Ndị Eze 10:18-28) Taa, a họpụtawo Eze eluigwe bụ́ Jisọs Kraịst igbuchapụ ndị iro Jehova ma wepụ ọbụbụeze Ya n’ụta. Dị ka obi Jehonadab dịnyeere Jihu, “oké igwe mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” nke Jisọs taa ji obi ha nile anakwere Kraịst dị ka Eze bụ́ Mesaịa ma na-akwado ụmụnna ime mmụọ ya nọ n’elu ala. (Mkpughe 7:9, 10; Jọn 10:16) Ha na-enye ihe àmà nke a site n’ikpe ezi okpukpe na iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekere òkè n’ozi ndị Kraịst, na-adọ ndị iro Chineke aka ná ntị banyere ‘ụbọchị Jehova’ nke ji ọsọ abịaru nso.—Matiu 10:32, 33; Ndị Rom 10:9, 10.
Ihe Omume Ndị Dị Ịrịba Ama Dị Nnọọ Nso!
14. Gịnị nọ na-echere okpukpe ụgha?
14 Jihu mere ihe iji kwụsị ofufe Beal n’Israel. N’ụbọchị anyị, site n’aka Jihu Ka Ukwuu, bụ́ Jisọs Kraịst, Chineke ga-eweta mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. N’isi nso anyị ga-ahụ mmezu nke okwu mmụọ ozi gwara Jọn onyeozi: “Mpi iri ahụ ị hụrụ, ha na anụ ọhịa ahụ, ndị a ga-akpọ nwanyị ahụ na-akwa iko asị, ha ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu bụrụkwa onye gba ọtọ, ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ. N’ihi na Chineke tinyere n’obi ha ime ìzù Ya, na ịgbata otu ìzù, na iwere alaeze ha nye anụ ọhịa ahụ, ruo mgbe a ga-emezu okwu nile nke Chineke.” (Mkpughe 17:16, 17; 18:2-5) “Mpi iri ahụ” nọchiri anya ike ọchịchị ndị kwakọbara ngwá agha bụ́ ndị na-akpa ike n’ụwa. Ọ bụ ezie na ha na Babilọn Ukwu ahụ nwere mmekọrịta ịkwa iko n’ụzọ ime mmụọ ugbu a, oge ya dị mkpirikpi. Usoro ọchịchị ụwa a ga-ebibi okpukpe ụgha, “anụ ọhịa ahụ” kwa—bụ́ Mba Ndị Dị n’Otu—ga-esoro “mpi iri ahụ” kere òkè gbara ọkpụrụkpụ n’ikpochapụ ya.b Lee oge ito Jehova ọ bụ!—Mkpughe 19:1-6.
15. Gịnị ga-eme mgbe e mere mgbalị ibibi nzukọ elu ala Chineke?
15 Mgbe mwakpo ọjọọ Eze Jihu mere megide ofufe Beal gasịrị, ezinụlọ ya chere ihu ná ndị iro Israel n’ihe metụtara ọchịchị. Eze Jisọs Kraịst ga-eme ihe yiri nke ahụ. Ike ọchịchị dị iche iche ga-adị gabiga mbibi okpukpe ụgha yiri Beal. N’okpuru mmetụta Setan Ekwensu, ndị iro a nke ọbụbụeze Jehova ga-ebu agha eleghị anya n’azụ ná mgbalị imebi nzukọ elu ala nke Chineke. (Ezikiel 38:14-16) Ma Jehova ga-eme ka Eze Jisọs Kraịst tigbuo ha site n’ibibi ha na Ha-Magedọn, “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile,” na-ewepụcha ọbụbụeze Jehova n’ụta.—Mkpughe 16:14, 16; 19:11-21; Ezikiel 38:18-23.
Iji Ịnụ Ọkụ n’Obi Elaịsha Na-eje Ozi
16, 17. (a) Olee otú anyị si mara na Elaịsha nụrụ ọkụ n’obi ruo ná njedebe nke ndụ ya? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị iji akụ́ nke eziokwu mee?
16 Ruo mgbe ‘ụbọchị Jehova’ ga-eweta usoro ihe ọjọọ nke Setan ná njedebe, ndị ohu Chineke ga-enwe obi ike, na-anụkwa ọkụ n’obi dị ka Elaịsha. E wezụga ọrụ ya dị ka onye na-ejere Elaịja ozi, Elaịsha jere ozi nanị ya dị ka onye amụma Jehova ruo ihe karịrị afọ 50! Elaịsha nụkwara ọkụ n’obi ruo kpọmkwem ná ngwụsị nke ogologo ndụ ya. N’oge na-adịghị anya tupu ọnwụ ya, nwa nwa Jihu, bụ́ Eze Jehoash, gara leta ya. Elaịsha gwara ya ka o si na window gbapụ otu akụ́. Akụ́ ahụ fegara n’akara ya, Elaịsha tikwara ná mkpu, sị: “Akụ́ nzọpụta Jehova nwere, bụ́ akụ́ nzọpụta imegide Siria: ị ga-etigbukwa Siria n’Efek, ruo mgbe ị ga-eme ka ha gwụsịa.” N’ime ihe Elaịsha kwuru, Jehoash tiziri akụ́ ya n’ala. Ma o jighị ịnụ ọkụ n’obi mee nke ahụ, na-eti ya nanị ugboro atọ. Mgbe ahụ Elaịsha kwuru na, n’ihi nke ahụ, a ga-enye Jehoash nanị mmeri atọ n’isi Siria, nke ahụ bụkwa ihe mere. (2 Ndị Eze 13:14-19, 25) Eze Jehoash etigbuchaghị ndị Siria, “ka ha gwụsịa.”
17 Otú ọ dị, n’ịnụ ọkụ n’obi yiri nke Elaịsha, ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ nọgidere na-alụ agha megide ofufe ụgha. Ndị enyi ha nwere olileanya elu ala na-eme otu ihe ahụ. Ọzọkwa, ndị nile nwere olileanya ịlanarị ‘ụbọchị Jehova’ aghaghị iburu n’uche okwu Elaịsha ahụ na-anụ ọkụ n’obi kwuru banyere iti akụ́ n’ala. Ka anyị chịrị akụ́ nke eziokwu ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eti ha—ugboro ugboro—ee, ruo mgbe Jehova kwuru na a rụzuwo ọrụ anyị ji ha arụ.
18. Olee otú anyị kwesịrị isi zaghachi n’okwu nke 2 Pita 3:11, 12?
18 N’isi nso ‘ụbọchị Jehova’ ga-eweta ajọ usoro ihe dị ugbu a ná njedebe. Ya mere ka anyị kwere ka okwu na-agba ume nke Pita onyeozi kwalie anyị. “Ebe a na-eme ka ihe ndị a nile laa n’iyi otú a,” ka Pita kwuru, “ọ̀ bụ aha mmadụ gịnị ka unu na-aghaghị ịbụ n’ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile, na-ele anya [mbịarute, NW] nke ụbọchị ahụ nke Chineke.” (2 Pita 3:11, 12) Mgbe ọkụ nke iwe Chineke site n’aka Jisọs Kraịst gbazere akụkụ nile nke usoro ihe a, nanị ndị nwere ihe ndekọ nke àgwà ziri ezi na nsọpụrụ Chineke ga-alanarị. Ịdị ọcha omume na nke ime mmụọ dị oké mkpa. Otú ahụkwa ka ịhụnanya maka ndị mmadụ ibe anyị dị, bụ́ nke a na-egosi site n’ime ihe banyere mkpa ha, karịsịa n’ụzọ ime mmụọ site n’ozi ndị Kraịst anyị.
19. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji lanarị ‘ụbọchị Jehova’?
19 Okwu na omume gị ọ̀ na-eme ka a mata gị dị ka ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi ma na-anụ ọkụ n’obi? Ọ bụrụ otú ahụ, ị pụrụ inwe olileanya nke ịlanarị ‘ụbọchị Jehova’ wee banye n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa. Ee, ị pụrụ ịlanarị ma ọ bụrụ na ị na-emere ụmụnna ime mmụọ Kraịst ihe ọma n’ihi na ha bụ ụmụazụ ya, dị ka di na nwunye Shunem ahụ siri gosi Elaịsha afọ ọma. Iji lanarị ị ghaghịkwa ịdị ka Neaman, bụ́ onye ji obi umeala nakwere ntụziaka Chineke ma ghọọ onye na-efe Jehova. Ọ bụrụ na ọ na-agụ gị agụụ ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala, ị ghaghị igosipụta nkwado sitere n’obi maka ezi ofufe, dị ka Jehonadab mere. Mgbe ahụ ị pụrụ iso n’ime ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị ga-ahụ n’isi nso mmezu nke okwu Jisọs: “Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site na ntọala nke ụwa.”—Matiu 25:34.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiakwụkwọ nke 18 na 19 nke akwụkwọ bụ́ “Ka Edo Aha-Gi Nsọ,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Lee peji nke 254-256 nke Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaghachi?
◻ Olee àgwà ụfọdụ ndị a chọrọ iji lanarị ‘ụbọchị Jehova’?
◻ Ihe nlereanya dị aṅaa ka di na nwunye Shunem ahụ setịpụrụ n’ụbọchị Elaịsha?
◻ Ihe mmụta dị aṅaa ka a pụrụ inweta n’ebe Neaman nọ?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi gbasoo ihe nlereanya Jehonadab?
◻ Olee otú 2 Pita 3:11, 12 kwesịrị isi metụta anyị?