Ndị Nlekọta Na-ejegharị Ejegharị—Onyinye n’Ụdị Mmadụ
“Mgbe ọ rịgoro n’elu o bupụrụ ndị a dọtara n’agha; o nyere onyinye n’ụdị mmadụ.”—NDỊ EFESỌS 4:8, NW.
1. Olee ọrụ ọhụrụ a mara ọkwa ya na magazin a na 1894?
IHE karịrị otu narị afọ gara aga, Ụlọ Nche mara ọkwa ihe ọhụrụ. A kọwara ya dị ka “Ngalaba Ọzọ nke Ọrụ Ahụ.” Gịnị ka ihe omume ọhụrụ a gụnyere? Ọ bụ mmalite nke ọrụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị n’oge a. Mbipụta September 1, 1894, nke magazin a kọwara na malite mgbe ahụ gaa n’ihu ụmụnna ruru eru ga na-eleta ìgwè Ndị Mmụta Bible dị iche iche ‘ná nzube nke iwuli ha elu n’eziokwu.’
2. Ndị nlekọta sekit na distrikti nwere ọrụ dịgasị aṅaa?
2 Na narị afọ mbụ O.A., ndị nlekọta dị ka Pọl na Banabas letara ọgbakọ ndị Kraịst. Ndị ikom a kwesịrị ntụkwasị obi nwere ebumnobi nke “iwuli” ọgbakọ dị iche iche elu. (2 Ndị Kọrint 10:8) Taa, e ji ọtụtụ puku ndị ikom na-eme nke a n’ụzọ dị n’usoro gọzie anyị. Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova ahọpụtawo ha dị ka ndị nlekọta sekit na distrikti. Onye nlekọta sekit na-eleta ihe dị ka ọgbakọ 20 ruo otu izu maka nke ọ bụla ihe dị ka ugboro abụọ n’afọ, na-enyocha ihe ndekọ, na-ekwu okwu ihu ọha, ma na-esoro ndị nkwusa Alaeze nọ n’ógbè ahụ na-ekere òkè n’ozi ubi. Onye nlekọta distrikti na-abụ onye isi oche maka nke ọ bụla ná mgbakọ sekit a na-enwe kwa afọ maka ọtụtụ sekit, na-esoro ọgbakọ ndị ha na-eleta n’izu ahụ eje ozi ubi, ma na-enye agbamume site n’okwu ndị dabeere na Bible.
Mmụọ Ha nke Ịchụ Onwe Onye n’Àjà
3. N’ihi gịnị ka o ji dị ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị mkpa inwe mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà?
3 Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-anọ na njem mgbe nile. Nke a n’onwe ya chọrọ mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà. Ịga site n’otu ọgbakọ gaa n’ọzọ pụrụ isi ike ọtụtụ mgbe, ma ndị ikom a na ndị nwunye ha na-eji omume ọṅụ eme otú ahụ. Otu onye nlekọta sekit kwuru, sị: “Nwunye m na-enye m nkwado karịsịa ma ghara ịdị na-eme mkpesa . . . O kwesịrị ịja mma nke ukwuu maka mmụọ ya nke ịchụ onwe onye n’àjà.” Ụfọdụ ndị nlekọta sekit na-aga ihe karịrị kilomita 1,000 site n’otu ọgbakọ gaa n’ọzọ. Ọtụtụ na-anya ụgbọala, ma ndị ọzọ na-eji ụgbọ njem ọha na eze, ịnyịnya ígwè, ịnyịnya, ma ọ bụ ụkwụ aga site n’otu ebe gaa n’ọzọ. Otu onye nlekọta sekit bụ́ onye Africa ọbụna aghaghị iji ụkwụ gafere otu mmiri, na-ekuru nwunye ya n’ubu ya, iji garuo n’otu ọgbakọ. Ná njem ozi ala ọzọ ya, Pọl onyeozi aghaghị ịnagide okpomọkụ na oyi, agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, ịmụ anya, ihe ize ndụ dị iche iche, na mkpagbu ọjọọ. O nwekwara “nchegbu . . . banyere nzukọ Kraịst nile”—ahụmahụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-enwekarị taa.—2 Ndị Kọrint 11:23-29.
4. Mmetụta dị aṅaa ka nsogbu ahụ ike pụrụ inwe ná ndụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha?
4 Dị ka onye ibe Pọl bụ́ Timoti, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha na-enwe nsogbu ahụ ike mgbe ụfọdụ. (1 Timoti 5:23) Nke a na-ewetara ha nrụgide ka ukwuu. Otu nwunye onye nlekọta sekit na-akọwa, sị: “Iso ụmụnna nọrọ mgbe nile bụ ndọlị mgbe ahụ na-adịghị m. Mgbe nkwụsị ịhụ nsọ malitere, nke a esiworo m ike karịsịa. Nanị ịkwakọta ngwongwo anyị nile kwa izu na ịga ebe ọzọ bụ ezigbo ihe ịma aka. Ọtụtụ mgbe, aghaghị m ịkwụsị ma kpegara Jehova ekpere inye m ume iji gaa n’ihu.”
5. N’agbanyeghị ule dị iche iche, mmụọ dị aṅaa ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha gosiworo?
5 N’agbanyeghị nsogbu ahụ ike na ule ndị ọzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha na-achọta ọṅụ n’ozi ha ma na-egosipụta ịhụnanya iji onwe onye achụ àjà. Ụfọdụ etinyewo ndụ ha n’ihe ize ndụ iji nye enyemaka ime mmụọ n’oge mkpagbu ma ọ bụ ịlụ agha. Mgbe ha na-eleta ọgbakọ, ha egosipụtawo mmụọ yiri nke Pọl, onye gwara ndị Kraịst bụ́ ndị Tesalọnaịka, sị: “Anyị ghọrọ ndị dị nwayọọ n’etiti unu, dị ka mgbe nwanyị nke na-azụ nwa na-elezi ụmụ nke aka ya anya nke ọma: otú a, ebe unu dị anyị n’obi nke ukwuu, ọ dịịrị anyị ezi mma ime ka unu keta, ọ bụghị nanị ozi ọma nke Chineke, kama ọ bụkwa mkpụrụ obi nke aka anyị, n’ihi na e mere ka unu bụrụ ndị anyị hụrụ n’anya.”—1 Ndị Tesalọnaịka 2:7, 8.
6, 7. Olee mmetụta dị mma nke ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-arụsi ọrụ ike pụrụ inwe?
6 Dị ka ndị okenye ndị ọzọ n’ọgbakọ ndị Kraịst, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị “na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ime okwu Chineke na ozizi.” Ndị okenye nile dị otú ahụ kwesịrị “nsọpụrụ okpukpu abụọ.” (1 Timoti 5:17) Ihe nlereanya ha pụrụ ịba uru ma ọ bụrụ na ‘mgbe anyị kirisịrị ọpụpụ nke ibi obi ha, anyị eṅomie okwukwe ha.’—Ndị Hibru 13:7.
7 Mmetụta dị aṅaa ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ụfọdụ nweworo n’ahụ ndị ọzọ? “Lee mmetụta magburu onwe ya Nwanna P—— nwere ná ndụ m!” ka otu Onyeàmà Jehova dere. “Ọ bụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na Mexico malite n’afọ 1960 gaa n’ihu. Dị ka obere nwa, ana m eji atụmanya na ọṅụ echere ọbịbịa ya. Mgbe m dị afọ iri, ọ gwara m, sị, ‘Gị onwe gị kwa ga-abụ onye nlekọta sekit.’ N’ime afọ iri na ụma ndị siri ike, m na-achọgakarị ya n’ihi na ọ na-enwe mgbe nile okwu amamihe ọ ga-enye. Ihe kasị echegbu ya bụ ịzụ ìgwè atụrụ ahụ! Ugbu a m bụ onye nlekọta sekit, m na-agbalị mgbe nile inye ndị na-eto eto oge na isetịpụrụ ha ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke dị ka o meere m. Ọbụna n’afọ ndị ikpeazụ nke ndụ ya, n’agbanyeghị ọrịa obi, Nwanna P—— na-achọ mgbe nile inye okwu agbamume. Nanị otu ụbọchị tupu ọ nwụọ na February 1995, o so m jee otu ụbọchị mgbakọ pụrụ iche ma setịpụrụ otu nwanna nwoke na-atụ ụkpụrụ ụlọ ihe mgbaru ọsọ ndị mara mma. Nwanna ahụ tinyere akwụkwọ ozugbo maka ije ozi na Betel.”
E Nwere Mmasị n’Ebe Ha Nọ
8. Olee ndị bụ “onyinye n’ụdị mmadụ” ndị a kọwara n’Efesọs isi nke 4, oleekwa otú ha si abara ọgbakọ uru?
8 A kpọrọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị okenye ndị ọzọ nwetara ihu ọma nke inwe ọrụ ije ozi site n’obiọma Chineke na-erughịrị mmadụ “onyinye n’ụdị mmadụ.” (NW) Dị ka onye nnọchiteanya Jehova na Isi nke nzukọ ahụ, Jisọs enyewo ndị ikom ime mmụọ a ka e wee wulie anyị elu n’otu n’otu ma ruo ntozu okè. (Ndị Efesọs 4:8-15) Onyinye ọ bụla kwesịrị ka e nye ekele maka ya. Nke a bụ eziokwu karịsịa banyere onyinye nke na-ewusi anyị ike ịnọgide na-ejere Jehova ozi. Ya mere, mgbe ahụ, olee otú anyị pụrụ isi gosipụta ekele anyị maka ọrụ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị? N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosi na anyị ‘na-asọpụrụ ndị dị otú a’?—Ndị Filipaị 2:29.
9. N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi gosi ekele maka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị?
9 Mgbe a mara ọkwa banyere nleta onye nlekọta sekit, anyị pụrụ ịmalite mewe atụmatụ ikere òkè zuru ezu n’ihe omume ọgbakọ maka izu ahụ. Ikekwe anyị pụrụ iwepụtakwu oge iji kwadoo ndokwa ozi ubi n’oge nleta ahụ. Anyị pụrụ inwe ike ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ahụ. N’ezie anyị ga-achọ itinye aro nke onye nlekọta sekit n’ọrụ iji meziwanye ozi anyị. Mmụọ dị otú ahụ nke ịnabata aro ga-abara anyị uru, ọ ga-emesikwa ya obi ike na nleta ya bụ nke bara uru. Ee, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eleta ọgbakọ iji wulie anyị elu, ma ọ dịkwa ha onwe ha mkpa ka e wulie ha elu n’ụzọ ime mmụọ. Ọ dị mgbe ụfọdụ agbamume dị Pọl mkpa, ọ rịọkwara ndị Kraịst ibe ya ọtụtụ mgbe ka ha kpeere ya ekpere. (Ọrụ 28:15; Ndị Rom 15:30-32; 2 Ndị Kọrint 1:11; Ndị Kọlọsi 4:2, 3; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:25) Ekpere na agbamume anyị dị ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nke oge a mkpa n’otu aka ahụ.
10. Olee otú anyị pụrụ isi nye aka ime ka ọrụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị bụrụ ihe ọṅụ?
10 Ànyị agwawo onye nlekọta sekit na nwunye ya otú anyị si enwe mmasị ná nleta ha? Ànyị na-ekele ya maka ndụmọdụ na-enye aka ọ na-enye anyị? Ànyị na-eme ka ọ mara mgbe aro ndị ọ tụrụ banyere ozi ubi mụbara ọṅụ anyị n’ozi ahụ? Ọ bụrụ na anyị mee otú a, nke a ga-enye aka ime ka ọrụ ya bụrụ ihe ọṅụ. (Ndị Hibru 13:17) Otu onye nlekọta sekit na Spain kwuru okwu karịsịa banyere otú ya na nwunye ya si eji kaadị i meela ndị ha nwetaworo mgbe ha letasịrị ọgbakọ akpọrọ ihe nke ukwuu. “Anyị na-edebe kaadị ndị a ma na-agụ ha mgbe anyị na-enwe nkụda mmụọ,” ka ọ na-ekwu. “Ha bụ isi iyi nke ezi agbamume.”
11. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji mee ka nwunye ndị nlekọta sekit na distrikti mara na a hụrụ ha n’anya ma nwee mmasị n’ebe ha nọ?
11 Nwunye onye nlekọta na-ejegharị ejegharị n’ezie na-erite uru site n’okwu ịja mma. Ọ chụwo àjà ndị dị ukwuu iji nyere di ya aka n’akụkụ a nke ije ozi. Ụmụnna nwanyị a na-ekwesị ntụkwasị obi na-ahapụ ọchịchọ kwesịrị ekwesị nke inwe ebe obibi nke ha na, n’ọtụtụ ọnọdụ, nke inwe ụmụ. Ada Jefta bụ otu n’ime ndị ohu Jehova nke ji obi ya hapụ ohere ya nke inwe di na ezinụlọ n’ihi nkwa nna ya kwere. (Ndị Ikpe 11:30-39) Olee otú e si lee àjà ya anya? Ndị Ikpe 11:40 na-ekwu, sị: “Ụmụ ndị inyom Israel na-eje kwa afọ ịkọ akụkọ nwa nwanyị Jefta onye Gilead ụbọchị anọ n’afọ.” Lee ka o si dị mma mgbe anyị tinyere mgbalị ịgwa nwunye ndị nlekọta sekit na distrikti na a hụrụ ha n’anya ma nwee mmasị n’ebe ha nọ!
“Unu Echezọla Ile Ndị Ọbịa nke Ọma”
12, 13. (a) Olee ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ e nwere maka ile ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha ọbịa? (b) Gosi otú ụdị ile ọbịa ahụ pụrụ isi bara ma onye lere ma onye e lere ya uru.
12 Ile ọbịa bụ ụzọ ọzọ isi gosi ịhụnanya na ekele maka ndị nọ n’ọrụ njegharị ndị Kraịst. (Ndị Hibru 13:2) Jọn onyeozi jara Gaịọs mma maka ile ndị na-eleta ọgbakọ dị ka ndị ozi ala ọzọ na-ejegharị ejegharị ọbịa. Jọn dere, sị: “Onye m hụrụ n’anya, ị na-eme ihe kwesịrị ntụkwasị obi n’ọrụ ọ bụla ị rụrụ n’ebe ndị bụ ụmụnna anyị, ndị bụkwa ndị ọbịa, nọ; ndị gbara àmà ịhụnanya gị n’ihu nzukọ Kraịst: ndị ị ga-eme nke ọma idupụ ha n’ije ha dị ka o kwesịrị imere Chineke: n’ihi na ọ bụ n’ihi Aha ahụ ka ha pụrụ, na-anaraghị ihe ọ bụla n’aka ndị mba ọzọ. Ya mere anyị onwe anyị ji ụgwọ ịkpọbata mmadụ dị otú a, ka anyị wee bụrụkwa ndị sooro eziokwu ahụ na-arụkọ ọrụ.” (3 Jọn 5-8) Taa, anyị pụrụ ime ka ọrụ nkwusa Alaeze ahụ gaa n’ihu site n’ile ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha ọbịa dị otú ahụ. N’ezie, ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ijide n’aka na ebe obibi na ihe oriri dị mma, ma otu onye nlekọta distrikti kwuru, sị: “Mmekọrịta anyị na ụmụnna apụghị ịbụ nke dabeere ná ndị pụrụ imere anyị ihe. Anyị agaghịdị achọ inye echiche ahụ. Anyị aghaghị ịdị njikere ịnakwere ile ọbịa nke nwanna anyị ọ bụla, ma ọ bara ọgaranya ma ọ dara ogbenye.”
13 Ile ọbịa pụrụ ịbara onye lere na onye e lere ya uru. “N’ezinụlọ m, anyị nwere omume nke ịkpọ ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị òkù ịnọnyere anyị,” ka Jorge na-echeta, onye bụbu onye nlekọta sekit nke na-eje ozi ugbu a na Betel. “Echere m na nleta ndị a nyeere m aka karịa otú m matara mgbe ahụ. N’oge uto m, enwere m nsogbu ime mmụọ. Nke a nyere nne m nsogbu ma ọ maghị nnọọ otú ọ ga-esi nye aka, n’ihi ya kwa ọ rịọrọ onye nlekọta sekit ahụ ka o soro m kwurịta okwu. Na mbụ m zeere ya, ebe m na-atụ ụjọ ịbụ onye a katọrọ. Ma omume enyi ya mere ka m soro ya kwurịta okwu n’ikpeazụ n’atụghị egwu. Ọ kpọrọ m iso ya rie ihe n’otu Monday, emeghekwara m obi m n’ihi na m ji n’aka na ọ na-aghọta m. Ọ ṅara ntị nke ọma. Aro ya ndị bara uru dị irè n’ezie, amalitekwara m inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ.”
14. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee ekele kama ịdị na-akatọ ndị okenye na-ejegharị ejegharị?
14 Onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-agbalị inyere ndị na-eto eto ma ndị toworo eto aka n’ụzọ ime mmụọ. Mgbe ahụ, n’ezie, anyị kwesịrị igosi ekele anyị maka mgbalị ya. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na anyị akatọọ ya n’ihi adịghị ike ya ma ọ bụ jiri ya n’ụzọ na-adịghị mma tụnyere ndị ọzọ letaworo ọgbakọ? Ma eleghị anya, nke a ga-abụ nnọọ ihe na-akụda mmụọ. Ọ bụghịrị Pọl ihe na-agba ume ịnụ nkatọ nke ọrụ ya. N’ụzọ doro anya, ndị Kraịst ụfọdụ bụ́ ndị Kọrint nọ na-ekwu okwu ndị na-adịghị mma banyere ọdịdị na ikike ikwu okwu ya. Ya onwe ya hotara ndị nkatọ dị otú ahụ dị ka ndị na-asị: “Akwụkwọ ozi ya dị arọ dịkwa ike; ma ọnụnọ nke ahụ ya n’etiti anyị adịghị ike, okwu ya bụkwa ihe a kpọrọ ihe efu.” (2 Ndị Kọrint 10:10) Otú ọ dị, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-anụkarị okwu ekele ịhụnanya.
15, 16. Olee otú ịhụnanya na ịnụ ọkụ n’obi nke ndị kwere ekwe ibe ha gosiri si emetụta ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha?
15 Otu onye nlekọta sekit na Latin America na-aga ije otu ụbọchị zuru ezu n’ụzọ apịtị iji leta ụmụnna ime mmụọ ya ndị nwoke na ndị nwanyị bi n’otu ógbè ndị agha okpuru na-achị. “Ọ na-emetụ n’ahụ ịhụ ụzọ ụmụnna ahụ si egosi ekele ha maka nleta ahụ,” ka ọ na-ede. “Ọ bụ ezie na mụ aghaghị ime mgbalị dị ukwuu iji ruo n’ebe ahụ, na-eche ọtụtụ ihe ize ndụ na ihe isi ike ihu, e ji ịhụnanya na ịnụ ọkụ n’obi ụmụnna ahụ na-egosi akwụghachi ihe a nile ụgwọ ọrụ.”
16 Otu onye nlekọta sekit n’Africa na-ede, sị: “N’ihi ịhụnanya ụmụnna ahụ gosiri anyị, anyị hụrụ ókèala Tanzania n’anya nke ukwuu! Ụmụnna dị njikere ịmụta ihe n’aka anyị, obi dịkwa ha ụtọ ịkpọ anyị n’ebe obibi ha.” E nwere mmekọrịta ịhụnanya na nke obi ụtọ n’etiti Pọl onyeozi na di na nwunye bụ́ ndị Kraịst na narị afọ mbụ bụ́ Akwila na Priska. N’ezie, Pọl kwuru banyere ha, sị: “Keleenụ Priska na Akwila ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ n’ime Kraịst Jisọs, mmadụ ndị tọgbọrọ olu nke aka ha n’ihi ndụ m; ndị ọ bụghị nanị mụ onwe m na-ekele, kama nzukọ Kraịst nile nke ndị mba ọzọkwa.” (Ndị Rom 16:3, 4) Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha nwere ekele inwe dị ka ndị enyi ha Akwila na Priska nke oge a bụ́ ndị na-eme mgbalị pụrụ iche ile ọbịa na inye mkpakọrịta ndị enyi.
Iwusi Ọgbakọ Dị Iche Iche Ike
17. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na amamihe dị ná ndokwa maka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ebeekwa ka ha si enweta ntụziaka ha?
17 Jisọs kwuru, sị: “A gụkwara amamihe n’onye ezi omume site n’ọrụ ya nile.” (Matiu 11:19) Amamihe dị ná ndokwa inwe ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị pụtara ìhè n’ihi na ọ na-enye aka iwusi ọgbakọ ndị Chineke ike. N’oge njem ozi ala ọzọ nke abụọ nke Pọl, ya na Saịlas n’ụzọ gara nke ọma ‘gabigara n’ime Siria na Silisịa, na-eme ka nzukọ Kraịst guzosie ike.’ Akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi na-agwa anyị, sị: “Mgbe ha na-agabiga n’obodo nile, ha wee na-enye n’aka ha iwu ahụ idebe, bụ́ nke ndị ozi na ndị okenye nọ na Jerusalem nyererịị. Ya mere a na-enye nzukọ Kraịst ike n’okwukwe anyị, ọnụ ọgụgụ ha na-ababigakwa ụba ókè kwa ụbọchị.” (Ọrụ 15:40, 41; 16:4, 5) Ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị nke oge a na-enweta ntụziaka ime mmụọ site n’Akwụkwọ Nsọ na mbipụta dị iche iche nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” dị ka ndị Kraịst ọzọ nile.—Matiu 24:45.
18. Olee otú ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị si ewusi ọgbakọ dị iche iche ike?
18 Ee, ndị okenye na-ejegharị ejegharị aghaghị ịnọgide na-eri ihe na table ime mmụọ Jehova. Ha aghaghị ịmara ụzọ na ụkpụrụ nduzi ndị nzukọ Chineke na-agbaso nke ọma. Mgbe ahụ ndị ikom dị otú ahụ pụrụ ịbụrụ ndị ọzọ ezigbo ngọzi. Site n’ihe nlereanya ọma ha nke ịnụ ọkụ n’obi n’ozi ubi, ha pụrụ inyere ndị kwere ekwe ibe ha aka imeziwanye n’ozi ndị Kraịst. Okwu ndị dabeere na Bible nke ndị okenye a bịara nleta na-ekwu na-ewuli ndị na-ege ntị elu n’ụzọ ime mmụọ. Site n’inyere ndị ọzọ aka itinye ndụmọdụ nke Okwu Chineke n’ọrụ, isoro ndị Jehova n’ụwa nile na-ejekọ ozi ọnụ, ma jiri ndokwa ime mmụọ ndị Chineke meworo site n’aka ‘ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi’ na-eme ihe, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-ewusi ọgbakọ ndị ha nwere ihe ùgwù ije leta ike.
19. Olee ajụjụ ndị fọdụrụ ka a zaa ha?
19 Mgbe nzukọ Jehova guzobere ọrụ ndị okenye na-ejegharị ejegharị n’etiti Ndị Mmụta Bible n’ihe dị ka otu narị afọ gara aga, magazin a kwuru, sị: “Anyị ga-elepụ anya maka ihe ndị ọ ga-arụpụta nakwa nduzi ọzọkwa nke Onyenwe anyị.” Nduzi Jehova apụtawo ìhè n’ụzọ doro anya. N’ihi ngọzi ya na n’okpuru nlekọta nke Òtù Na-achị Isi, a mụbawo ma meziwanye ọrụ a n’ime afọ ndị gafeworonụ. N’ihi ya, a na-eme ka ọgbakọ Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa guzosie ike n’okwukwe ma na-amụba n’ọnụ ọgụgụ kwa ụbọchị. Dị ka ihe àmà na-egosi, Jehova na-agọzi mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà nke onyinye ndị a n’ụdị mmadụ. Ma olee otú ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị pụrụ isi rụọ ọrụ ha n’ụzọ gara nke ọma? Gịnị bụ ebumnobi ha? Olee otú ha pụrụ isi rụpụta ihe kasị mma?
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaghachi?
◻ Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ọrụ ndị nlekọta sekit na distrikti?
◻ N’ihi gịnị ka o ji dị ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị mkpa inwe mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà?
◻ Olee otú a pụrụ isi gosi ekele maka ọrụ ndị okenye na-ejegharị ejegharị na nwunye ha?
◻ Gịnị ka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị pụrụ ime iji mee ka ọgbakọ dị iche iche guzosie ike n’okwukwe?
[Foto dị na peeji nke 10]
Ịdị na-eme njem mgbe nile chọrọ mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà
[Foto dị na peeji nke 13]
Ì lewo ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha ọbịa?