Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 3 p. 15-17
  • Ihe Ndị Na-aghaghị Ime n’Isi Nso

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ndị Na-aghaghị Ime n’Isi Nso
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Nzirịta Ozi
  • Bụrụnụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-agụ Akwụkwọ Mkpughe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Mkpughe na Gị Onwe Gị
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Jisọs Ejiri Agbamume Bịa
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 3 p. 15-17

Isi nke 3

Ihe Ndị Na-aghaghị Ime n’Isi Nso

1. Olee ụzọ ị pụrụ isi lanarị mmezu nke ikpe Chineke megide ụwa nke a?

I KWESỊRỊ inwe nnọọ ncheghu maka ihe ndị na-eme n’ụwa taa. N’ihi gịnị? N’ihi na ụwa nke a apụghị ịgbanarị mmezu nke ihe Chineke kpere n’ikpe. Ma gị onwe gị pụrụ ịgbanarị ya. Ị pụrụ ime nke a site n’ime ka ị ghara ịbụ ‘akụkụ nke ụwa’ nke a maworo ikpe mbibi. Nke a apụtaghị ịmalite ibi ndụ n’ụzọ ịta onwe onye ahụhụ. Ọ pụtara na mgbe ị nọ na-ama ezi ụtọ nke ndụ, na ị ga-ewezụga onwe gị site ná mmerụ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị, site n’azụmahịa anyaukwu, sitekwa n’okpukpe nke na-adịghị asọpụrụ Chineke, tinyekwara àgwà ime ihe ike na nke adịghị ọcha. N’otu mgbe ahụ, ị ghaghị ịgbaso ụkpụrụ omume dị elu nke Chineke, na-achọkwa ime uche ya. (Jọn 17:14-16; Zefanaịa 2:2, 3; Mkpughe 21:8) Akwụkwọ Bible bụ Mkpughe gosiri otú o si dịrị gị mkpa itinye akụkụ ndị a n’ọrụ ná ndụ gị, na-eme mgbanwe dị ka o si dị mkpa n’ụzọ ibi ndụ gị.

2. Okwu mmeghe dị aṅaa ka Jọn onyeozi kwuru banyere oké amụma ahụ dị ná Mkpughe, ònyekwa ka Chineke nyere ozi nke a dị oké mkpa?

2 Jọn onyeozi ji okwu ndị a malite oké amụma nke a: “Mkpughe nke Jisọs Kraịst, nke Chineke nyere ya igosi ndị ohu ya, bụ́ ihe na-aghaghị ịpụta n’isi nso.” (Mkpughe 1:1a) Nke a pụtara na ọ bụ Jisọs Kraịst e meworo ka o si n’ọnwụ bilie bụ onye sitere n’aka Chineke nata ozi nke a dị oké mkpa. Kama ịbụ nnọọ akụkụ nke Atọ n’Ime Otu nke bụ ihe omimi, a na-egosi Jisọs n’ebe a ịbụ onye nọ n’okpuru Nna ya. N’otu ụzọ ahụ, “ndị ohu” ndị ahụ na-emejupụta ọgbakọ ndị Kraịst nọkwa n’okpuru Jisọs Kraịst, nke mere na ‘ha na-eso ya ebe ọ bụla ọ na-eje.’ (Mkpughe 14:4; Ndị Efesọs 5:24) Ma olee ndị taa bụ n’ezie “ndị ohu” Chineke, oleekwa ụzọ Mkpughe si abara ha uru?

3. (a) Olee ndị bụ “ndị ohu” ahụ nọ n’okpuru Jisọs Kraịst? (b) Ọrụ dị aṅaa ka “ndị ohu” ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-arụ n’okpuru nduzi nke ndị mmụọ ozi?

3 Jọn onyeozi, onye dere Mkpughe, kọwara onwe ya dị ka otu n’ime ohu dị otú ahụ. Ọ bụ onye ikpeazụ fọdụrụ ndụ n’etiti ndị ozi ahụ, bụrụkwa otu n’ime ìgwè “ndị ohu” ahụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ndị ga-eketa ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. Taa, e nwere nanị puku ole na ole ndị a ndị fọdụrụ n’elu ala. Chineke nwekwara ndị ohu ọzọ, bụ́ oké ìgwè mmadụ, ndị nwoke, ndị nwanyị, na ụmụntakịrị, ndị ọnụ ọgụgụ ha ruru ọtụtụ nde ugbu a. N’okpuru nduzi ndị mmụọ ozi, ha na-esonyere “ndị ohu” e tere mmanụ n’ịkpọsa ozi ọma ebighị ebi nye ihe nile a kpọrọ mmadụ. Oo, lee nnọọ ka “ndị ohu” a si na-etinye uchu iji wee nyere ndị nwere obi umeala nọ n’elu ala aka ịchọta nzọpụta! (Matiu 24:14; Mkpughe 7:9, 14; 14:6) Mkpughe na-akọwa ihe ị na-aghaghị ime iji wee rite uru site n’ozi ọma ahụ na-enye ọṅụ.

4. (a) Ebe ọ bụ na ọ karịala 1,900 afọ kemgbe Jọn dere Mkpughe, ọ̀ pụrụ isi aṅaa kwuo okwu banyere “ihe ndị na-aghaghị ịpụta n’isi nso”? (b) Gịnị ka ihe àmà dị iche iche na-egosi ugbu a banyere ihe ndị ahụ e buru n’amụma?

4 Ma, olee otú Jọn pụrụ isi kwuo na a gaje igosi “ndị ohu” ndị a “ihe na-aghaghị ịpụta n’isi nso”? Ọ̀ bụ na e kwughị ihe ndị ahụ ihe karịrị 1,900 afọ gara aga? Site n’ụzọ Jehova si ele ihe anya, bụ́ onye otu puku afọ yiri nanị “ụnyahụ” n’anya ya, 1,900 afọ bụ oge dị nta ma e jiri ya tụnyere ogologo oge a na-apụghị ịgụta agụta nke o jiri mee ihe n’ike na ịkwadebe ụwa ka mmadụ wee biri n’elu ya. (Abụ Ọma 90:4) Pọl onyeozi dere ihe banyere “olileanya siri ike” nke ya onwe ya, n’ihi na ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na ịbụ eziokwu nke nkwụghachi ụgwọ ya yiri ya nnọọ ihe dị nso. (Ndị Filipaị 1:20) Otú ọ dị, taa, ihe àmà jupụtara ebe nile na ihe nile e buru n’amụma aghaghị imezu n’isi nso. Ọ dịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nlanarị nke ihe a kpọrọ mmadụ nọworo n’ihe ize ndụ otú a. Ọ bụ nanị Chineke nwere ihe ngwọta dịịrị ya!—Aịsaịa 45:21.

Ụzọ Nzirịta Ozi

5. Olee ụzọ e si zitere Jọn onyeozi ihe o dere ná Mkpughe, zigakwara ya ọgbakọ dị iche iche?

5 Mkpughe 1:1b, 2 gara n’ihu, sị: “O [Jisọs] wee site n’aka mmụọ ozi ya ziga [Mkpughe] wee gosi Jọn ohu ya [“n’ihe àmà,” NW]; onye gbara àmà nke okwu Chineke, na nke àmà Jisọs Kraịst, ka ha hà, bụ ihe ọ hụrụ.” Otú a, Jọn natara ihe odide ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ site n’aka otu mmụọ ozi. O dere ya n’akwụkwọ mpịakọta, na-ezijere ya ọgbakọ dị iche iche nke oge ya. Ọ bụụrụ anyị ihe obi ụtọ na Chineke echebewo ya maka agbamume nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 100,000 ọgbakọ dị iche iche nke ndị ohu ya dị n’otu n’elu ala ebe a taa.

6. Olee otú Jisọs si mee ka a mara ụzọ ọ ga-eji mee ihe n’inye ‘ndị ohu’ ya nri ime mmụọ taa?

6 Chineke nwere ụzọ nzirịta ozi nke o si mee ka a nụ ihe dị ná Mkpughe n’oge Jọn, Jọn bụkwa akụkụ elu ala nke ụzọ nzirịta ozi ahụ. N’otu aka ahụ, Chineke nwekwara ụzọ e si na-enye ‘ndị ohu’ ya ọzụzụ ime mmụọ taa. N’oké amụma ya banyere ‘ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a,’ Jisọs mere ka a mara ụzọ a dị ka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche, nke onyenwe ya mere onyeisi ezinụlọ ya, inye ha ihe e ji azụ ha n’oge ya.” (Matiu 24:3, 45-47) O ji òtù Jọn nke a nke ọtụtụ ndị mejupụtara na-eme ihe n’ikpughe ihe amụma ahụ pụtara.

7. (a) Olee ụzọ ihe àmà ndị ahụ a na-ahụ ná Mkpughe kwesịrị isi metụta anyị? (b) Ruo ogologo oge hà aṅaa ka ụfọdụ ndị so n’òtù Jọn ahụ kereworo òkè n’imezu ọhụụ ndị ahụ dị ná Mkpughe?

7 Jọn onyeozi dere na Jisọs gosiri ya Mkpughe ahụ ‘n’ihe àmà,’ ma ọ bụ n’ihe atụ dị iche iche. Ihe ndị a pụtara ìhè, bụrụkwa ihe na-akpali akpali inyocha ha. Ha na-egosi ịrụsi ọrụ ike, ha kwesịkwara ịkpali anyị iji ịnụ ọkụ n’obi tinye uchu n’ime ka ndị ọzọ mara ihe banyere ya na ihe ọ pụtara. Mkpughe na-egosi anyị ọtụtụ ọhụụ ndị dị oké egwu, ndị Jọn keere òkè na nke ọ bụla n’ime ha dị ka onye so na-eme ihe ndị ahụ ma ọ bụ nọrọ dị ka onye na-ekiri ekiri. Ndị ahụ nọ n’òtù Jọn, bụ́ ndị ụfọdụ n’ime ha kereworo òkè ruo ọtụtụ iri afọ ná mmezu nke ọhụụ ndị a, nwere obi ụtọ ịhụ na mmụọ Chineke ekpughewo ihe ha pụtara ka ha wee nwee ike ịkọwara ya ndị ọzọ.

8. (a) Gịnị bụ ihe pụrụ iche banyere nke ọ bụla n’ime ọhụụ nke Mkpughe? (b) Olee otú amụma Daniel si enyere anyị aka ịghọta ihe anụ ọhịa ndị dị ná Mkpughe nọchiri anya ha?

8 Ọhụụ ndị a dị ná Mkpughe apụtaghị n’usoro ha ji mee. Nke ọ bụla n’ime ha nwere oge mmezu nke ya. Ụfọdụ n’ime ọhụụ ndị ahụ na-ekwughachi okwu amụma ndị e buru tupu mgbe ahụ, bụ́ ndị na-enye ihe àmà ụfọdụ nke ga-enye aka ịkọwa ha. Dị ka ihe atụ, amụma Daniel kọwara anụ ọhịa anọ dị oké egwu, na-akọwa na ndị a sere onyinyo ọchịchị dị iche iche n’elu ala. Otú a, a na-enyere anyị aka ịghọta na anụ ọhịa ndị ahụ dị ná Mkpughe nọchiri anya ọchịchị dị iche iche, gụnyere ndị dị adị ugbu a.—Daniel 7:1-8, 17; Mkpughe 13:2, 11-13; 17:3.

9. (a) Dị ka Jọn, àgwà dị aṅaa ka ndị òtù Jọn nke oge a gosipụtaworo? (b) Jọn si aṅaa gosi ụzọ anyị ga-esi nwee obi ụtọ?

9 Jọn kwesịrị ntụkwasị obi n’ịbụ onyeàmà nye ozi ahụ nke Chineke sitere n’aka Jisọs Kraịst nye ya. Ọ kọwara nke ọma ‘ihe nile ọ hụrụ.’ Òtù Jọn ejiriwo ezi ịnụ ọkụ n’obi na-achọ nduzi site n’aka Chineke na Jisọs Kraịst ka ha wee nwee ike ịghọta amụma ahụ n’ụzọ zuru ezu, meekwa ka ndị Chineke mara isi ihe ndị dị na ya. Maka abamuru nke ọgbakọ ahụ e tere mmanụ (nakwa nke oké ìgwè mmadụ ahụ zuru mba nile ọnụ nke Chineke ga-echebe ndụ gabiga oké mkpagbu ahụ), Jọn dere, sị: “Ngọzi na-adịrị onye na-agụ, na ndị na-anụ okwu nile nke amụma nke a, ndị na-edebekwa ihe nile e deworo n’ime ya: n’ihi na oge ahụ dị nso.”—Mkpughe 1:3.

10. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime banyere Mkpughe ka anyị wee nweta obi ụtọ ahụ?

10 Ị ga-erite uru dị ukwuu site n’ịgụ Mkpughe, ọbụna karịa site n’idebe ihe nile e dere n’ime ya. Jọn kọwara n’otu n’ime akwụkwọ ozi ya, sị: “Nke a bụ ịhụnanya Chineke, ka anyị debe ihe nile o nyere n’iwu: ihe o nyere n’iwu adịghịkwa arọ. N’ihi na ihe ọ bụla nke a mụworo site na Chineke na-emeri ụwa: nke a bụkwa mmeri nke meriworo ụwa, bụ okwukwe anyị.” (1 Jọn 5:3, 4) Ị pụrụ inweta obi ụtọ kasị ukwuu site n’iwulite okwukwe dị otú ahụ!

11. (a) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe dị oké mkpa ka anyị debe okwu nile nke amụma ahụ? (b) Oge dị aṅaa ka ọ na-aghaghị ịbụ na o ruwo oké nso?

11 Ọ dị mkpa ka anyị mee ihe ngwa ngwa iji debe okwu nile nke amụma ahụ, “n’ihi na oge ahụ dị nso.” Oge a ga-eme gịnị? Oge maka mmezu nke amụma nile nke Mkpughe, gụnyere ikpe Chineke. Oge adịwo nso ka Chineke na Jisọs Kraịst mezuo ihe ikpeazụ e kpere n’ikpe megide usoro ihe Setan nke dị n’ụwa. Mgbe Jisọs nọ n’elu ala ebe a, o kwuru na ọ bụ nanị Nna ya maara “ụbọchị ahụ ma ọ bụ oge hour ahụ.” N’ilepụ anya gaa ná nsogbu ndị mụbaworo n’elu ala n’oge anyị a, Jisọs kwukwara, sị: “Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme.” Ya mere, oge a kara aka imezu mkpebi nke Chineke aghaghị ịdịworị oké nso. (Mak 13:8, 30-32) Dị ka Habakuk 2:3 kwuru: “Ọhụụ ahụ na-adịru mgbe a kara aka, ọ na-ekusikwara ọgwụgwụ ya ume ike, ọ gaghị ekwukwa okwu ụgha: ọ bụrụ na ọ laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.” Nzọpụta anyị gabiga mkpagbu ukwu ahụ dabeere n’anyị idebe Okwu amụma nke Chineke.—Matiu 24:20-22.

Igbe dị na peeji nke 15]

Ka anyị wee ghọta akwụkwọ Mkpughe, ọ dị anyị mkpa

● Inweta enyemaka nke mmụọ Jehova

● Ịmata mgbe ụbọchị Onyenwe anyị malitere

● Ịmata ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche taa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya