Ndị A Chụgara Siberia!
DỊ KA VASILY KALIN SI KỌỌ
Ọ bụrụ na ị hụrụ otu nwoke nọ jụụ na-agụ Bible ka ogbunìgwè na-ada n’ike n’ike, ị́ gaghị achọ ịmata ihe mere o ji nwee ike ịnọrọ jụụ otú ahụ? Nna m hụrụ nnọọ ihe dị otú ahụ ihe karịrị afọ 56 gara aga.
Ọ BỤ na July 1942, mgbe Agha Ụwa nke Abụọ na-akpọtụ. Ka ndị agha Germany lụụrụ agha gafee obodo nna m bụ́ Vilshanitsa, dị na Ukraine, nna m banyere n’ụlọ otu onye meworo agadi. Ogbunìgwè na-agbawa ebe nile, ma nwoke ahụ nọ n’akụkụ stovu na-ahụ ọka ma na-agụ Bible.
A mụrụ m ka afọ ise gasịrị, n’ebe na-adịghị anya site n’obodo mara mma dị n’ebe ọdịda anyanwụ Ukraine bụ́ Ivano-Frankivs’k, nke bụ akụkụ Soviet Union mgbe ahụ. Nna m mesịrị kọọrọ m banyere nzute ọ na-agaghị echefu echefu o zutere nwoke ahụ, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, nakwa banyere ihe ndị na-akpata ụjọ nke afọ ndị ahụ a lụrụ agha. Ọnọdụ nile ahụ gwụrụ ndị mmadụ ike ma gbagwojuo ha anya, ọtụtụ jụkwara, sị: ‘N’ihi gịnị ka ikpe na-ezighị ezi ji hie nne otú ahụ? N’ihi gịnị ka ọtụtụ puku ndị aka ha dị ọcha ji na-anwụ? N’ihi gịnị ka Chineke ji kwere ka ọ na-eme? Ọ̀ bụ nnọọ n’ihi gịnị?’
Nna m sooro agadi nwoke ahụ nwee nkwurịta okwu dị ogologo, nke sitekwara n’obi eziokwu banyere ajụjụ ndị dị otú ahụ. Site n’ịsapeta akụkụ akwụkwọ nsọ otu otu na Bible ya, nwoke ahụ gosiri nna m azịza nye ajụjụ ndị gbagwojuworo ya anya eri ogologo oge. Ọ kọwara na Chineke zubere ime ka agha nile kwụsị n’oge ọ kara aka nakwa na ụwa ga-aghọ paradaịs mara mma.—Abụ Ọma 46:9; Aịsaịa 2:4; Mkpughe 21:3, 4.
Nna m gbalatara n’ụlọ ma tie mkpu, sị: “Ùnu ga-ekweta? E meghewo m anya n’otu ugboro mụ na Ndịàmà Jehova nwesịrị nkwurịta okwu! Achọtawo m eziokwu!” Nna m kwuru na ọ bụ ezie na ya anọwo na-agachi Chọọchị Katọlik anya, ndị ụkọchukwu enwetụbeghị ike ịza ajụjụ ya. Ya mere nna m malitere ịmụ Bible, nne m sonyekwaara ya. Ha malitekwara ịkụziri ụmụ ha atọ—nwanne m nwanyị, bụ́ onye dị nanị afọ 2, na ụmụnne m ndị nwoke, bụ́ ndị dị afọ 7 na afọ 11. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, bọmbụ bibisịrị ụlọ ha, na-ahapụrụ ha nanị otu ọnụ ụlọ nke ha ga-ebi na ya.
Nne m si n’ezinụlọ buru ibu nke nwere ụmụ nwanyị isii na otu nwoke. Nna ya bụ otu n’ime ndị bara ọgaranya karị n’ógbè ahụ, o jikwara ikike na ọnọdụ ya kpọrọ ihe. Ya mere, na mbụ, ndị ikwu megidere okpukpe ezinụlọ m chọtara ọhụrụ. Otú ọ dị, ka oge na-aga ọtụtụ n’ime ndị mmegide a kwụsịrị omume okpukpe ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, dị ka iji ihe oyiyi eme ihe, ma sonyere nne na nna m n’ezi ofufe.
Ndị ụkọchukwu kpaliri ndị mmadụ n’ihu ọha imegide Ndịàmà. N’ihi ya, ndị bi n’ógbè ahụ ga-etiwa windo ha ma yie ha egwu. N’agbanyeghị nke a, nne m na nna m nọgidere na-amụ Bible. Ya mere, ka ọ na-erule mgbe a mụrụ m na 1947, ezinụlọ anyị na-efe Jehova n’ime mmụọ na eziokwu.—Jọn 4:24.
A Chụpụ Anyị
Ana m echeta ihe mere n’isi ụtụtụ nke April 8, 1951 nke ọma, ọ bụ ezie na adị m nanị afọ anọ n’oge ahụ. Ndị agha chị nkịta batara n’ụlọ anyị. Ha gosiri anyị akwụkwọ e ji nye iwu ka a chụpụ anyị, ha nyochakwara ụlọ anyị. Ndị soja bu égbè ndị na-awụpụ mgbọ, chịrịkwa nkịta guzooro n’ọnụ ụzọ anyị, ndị ikom yi yunifọm ndị agha nọdụkwara na tebụl anyị, na-echere anyị ka anyị na-ejikere ngwa ngwa ịpụ n’ime awa abụọ e nyere anyị. Apụghị m ịghọta ihe na-emenụ, ebekwara m ákwá.
E nyere nne na nna m iwu ịbịanye aka n’otu akwụkwọ na-ekwu na ha abụkwaghị Ndịàmà Jehova nakwa na ọ gaghị adị ihe ga-ejikọ ha na ha ọzọ. Ọ bụrụ na ha abịanye aka na ya, a ga-ahapụ ha ka ha biri n’ụlọ ha na n’ala nna ha. Ma nna m kwupụtasiri ike, sị: “Enwere m obi ike na n’agbanyeghị ebe unu kpọ anyị na-aga, Chineke anyị, bụ́ Jehova, ga-anọnyere anyị.”
“Chee banyere ezinụlọ gị, banyere ụmụ gị,” ka ọfịsa ahụ rịọrọ ya. “E kwuwerị, ọ bụghị ebe ntụrụndụ ka a kpọ unu na-aga. A kpọ unu na-aga n’ime ime ebe ugwu, bụ́ ebe snow na-ada oge nile na ebe anụ bear bi n’ógbè artic na-ejegharị n’okporo ámá.”
N’oge ahụ okwu ahụ bụ́ “Siberia” na-atụ onye ọ bụla egwu, ha amaghịkwa ihe ọ bụ. Ma, okwukwe na ịhụnanya siri ike e nwere n’ebe Jehova nọ siri ike karịa ụjọ a na-atụ ihe a na-amaghị ihe ọ bụ. E tinyere ngwongwo anyị n’ụgbọ anụmanụ na-adọkpụ, e bugakwara anyị n’obodo ukwu ma tinye anyị na ezinụlọ 20 ruo 30 ndị ọzọ n’ụgbọ okporo ígwè. Otú ahụ ka anyị sikwa malite ịga n’ime ime ịkpa Siberia.
Anyị zutere ụgbọ okporo ígwè ndị ọzọ bu ndị a chụpụrụ achụpụ n’ebe ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị, anyị hụkwara ihe ndị e dere ede e kokwasịrị n’ụgbọ okporo ígwè ndị ahụ: “Ọ Bụ Ndịàmà Jehova Nọ na Ya.” Nke a bụ ụdị ịgba àmà pụrụ iche nke ya, n’ihi na ọtụtụ ndị bịara si otú a mata na a na-ebuga ọtụtụ puku Ndịàmà na ezinụlọ ha n’ebe dị iche iche nke ebe ugwu na ebe ime ime ọwụwa anyanwụ ụwa.
E nwere ihe ndekọ zuru ezu nke njide na nchụpụ a a chụpụrụ Ndịàmà Jehova n’April 1951. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Walter Kolarz dere banyere ya n’akwụkwọ ya bụ́ Religion in the Soviet Union, sị: “Nke a abụghị ọgwụgwụ nke ‘Ndịàmà’ na Russia, kama ọ bụ nanị mmalite nke akụkụ ọhụrụ nke ọrụ ime ntọghata ha. Ha gbalịdịrị ịgbasa okwukwe ha mgbe ha kwụsịrị n’ebe ndị ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị ka ha na-aga ebe a chụgara ha. Site n’ịchụpụ ha, Gọọmenti Soviet mere ihe baara ha uru iji kpọsaa okwukwe ha. E si n’obodo nta ebe ‘Ndịàmà’ nọọrọ onwe ha kpọga ha n’ógbè sara mbara karị, n’agbanyeghị na nke a bụ nanị ógbè dị egwu nke ogige ịta ahụhụ na ọrụ ike.”
Ezinụlọ m nwere ezi ihe ndabara, ebe e kwere ka anyị were nri—ntụ ọka, ọka, na àgwà. E kwere ọbụna ka nna m ochie gbuo otu ezì, ọ ghọọrọ anyị na Ndịàmà ndị ọzọ ihe oriri. A pụrụ ịnụ abụ sitere n’ala ala obi si n’ụgbọ okporo ígwè ndị ahụ apụta ka anyị na-aga. Jehova nyere anyị ume iji tachie obi.—Ilu 18:10.
Anyị mere njem ruo ihe fọrọ nke nta ka o ruo izu atọ iji gafere Russia, n’ikpeazụ anyị rutere Siberia na-ajụ oyi, nke dịpụrụ iche ma dị anya. E bururu anyị n’ebe ụgbọ okporo ígwè na-akwụsị na Toreya dị na Chunsk nke ógbè Irkutsk. Site n’ebe ahụ, a kpọọrọ anyị bakwuo n’ime ịkpa ruo n’otu obodo nta, ruo n’ebe akwụkwọ anyị kọwara dị ka “ebe obibi ebighị ebi” anyị. Ngwongwo ezinụlọ 15 bara nke ọma n’ime otu ụgbọ e ji ebu ibu n’elu snow, otu traktọ dọkpụkwaara ya gafere apịtị nke oge opupu ihe ubi ahụ. E kenyere ihe dị ka ezinụlọ 20 ibi n’ogige dị iche iche, bụ́ ndị nwere ogologo paseji na-enweghị ihe kewara ha. Ndị ọchịchị gwara ndị obodo ahụ tupu anyị erute na Ndịàmà Jehova abụghị ndị ha na ndị mmadụ ga na-emekọ ihe. Ya mere ná mmalite, ndị mmadụ tụrụ anyị egwu, ha emeghịkwa mgbalị ọ bụla iji mata anyị nke ọma karị.
Ịrụ Ọrụ n’Ebe A Chụgara Anyị
Ọrụ Ndịàmà Jehova nọ na-arụ bụ igbutu osisi, ha mekwara nke a n’ọnọdụ ndị sikarịsiri ike. E ji aka rụọ ọrụ dum—ịkwọtu ogwe osisi ndị ahụ, ịwa ha, itinye ha n’ụgbọ ndị ịnyịnya na-adọkpụ na, imesị tinye ha n’ụgbọ okporo ígwè. Ìgwè anwụ nke a na-apụghị izonahụ mere ka ọnọdụ ahụ ka njọ. Nna m tara ahụhụ dị ukwuu. Ahụ ya dum zara aza, o kpesikwara ekpere ike gwa Jehova ka o nyere ya aka ịtachi obi. Ma n’agbanyeghị ihe isi ike ahụ dum, okwukwe nke ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova nọgidere na-esi ike.
N’oge na-adịghị anya a kpọgara anyị n’obodo Irkutsk, bụ́ ebe ezinụlọ anyị biri n’ebe bụbu ogige ụlọ mkpọrọ ma rụọ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-akpụ brik. A na-eji aka si ná nnukwu ovun dị ọkụ gụpụta brik, a nọgidekwara na-amụba ọnụ ọgụgụ a chọrọ ka a na-akpụpụta, nke na ọbụna ụmụaka aghaghị inyere ndị nne na nna ha aka iji kpụtazuo ọnụ ọgụgụ a chọrọ ka ha kpụta. E chetaara anyị ọrụ ịgba ohu nke ndị Israel rụrụ n’Ijipt oge ochie.—Ọpụpụ 5:9-16.
Ọ bịara doo anya na Ndịàmà na-arụsi ọrụ ike ma na-akwụwa aka ọtọ, ha abụghị “ndị iro ndị mmadụ,” dị ka e kwuru. A chọpụtara na ọ dịghị Onyeàmà ọ bụla kparịrị ndị ọchịchị, Ndịàmà emegideghịkwa mkpebi ndị ọchịchị mere. Ọbụna okwukwe ha bịara masị ọtụtụ mmadụ.
Ndụ Ime Mmụọ Anyị
Ọ bụ ezie na e nyochara Ndịàmà ugboro ugboro—tupu a chụpụ ha, ka ha na-aga n’ụzọ, na n’ebe ndị a chụgara ha—ọtụtụ jisiri ike zoo magazin Ụlọ Nche, zookwa ọbụna Bible. Ka e mesịrị, e ji aka na ụzọ ndị ọzọ mepụtaghachi ha. E duziri nzukọ ndị Kraịst n’ogige ndị ahụ n’ụzọ chiri anya. Mgbe ọfịsa na-elekọta ogige ndị ahụ ga-abata ma hụ ka anyị gbakọrọ n’ìgwè na-abụ abụ, ọ ga-enye anyị iwu ka anyị kwụsị. Anyị ga-akwụsị. Ma mgbe ọ ga-aga n’ogige ọzọ, anyị ga-amaliteghachi ịbụ abụ. A pụghị ịkwụsị anyị.
Ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla ọrụ nkwusa anyị kwụsịrị. Ndịàmà ga-agwa onye ọ bụla nọ n’ebe ọ bụla okwu. Ụmụnne m ndị ikom ndị tọrọ m na nne na nna m gwara m ọtụtụ mgbe otú ha si jisie ike soro ndị ọzọ kerịta eziokwu Bible. N’ihi nke a, eziokwu Bible malitere iji nwayọọ nwayọọ banyewa n’obi ndị obi ha ziri ezi. Ya mere, ná mmalite afọ ndị 1950, e mere ka a mara banyere Alaeze Jehova n’ime na gburugburu Irkutsk.
Na mbụ e weere Ndịàmà dị ka ndị iro ọchịchị, ma ka e mesịrị ndị ọchịchị matara na òtù anyị bụ nanị nke okpukpe. Otú o sina dị, ndị ọchịchị gbalịrị ịkwụsị ọrụ anyị. Ya mere anyị gbakọtara n’ìgwè nta ndị ezinụlọ abụọ ma ọ bụ atọ mejupụtara maka ọmụmụ Bible ná mgbalị ime ka a ghara ịmata. E ji nlezianya mee nnyocha n’otu isi ụtụtụ February 1952. Ka e mesịrị, e jidere Ndịàmà iri, a kpọgakwara anyị bụ́ ndị fọdụrụnụ n’ebe dị iche iche. E bugara ezinụlọ anyị n’obodo nta Iskra, bụ́ nke ihe dị ka otu narị mmadụ bi na ya, dịkwa ihe dị ka kilomita 30 site n’obodo Irkutsk.
Ịtachi Obi Mgbe Ọnọdụ Gbanwere
Ndị nlekọta obodo ahụ gosiri afọ ọma anyị na-atụghị anya ya. Ndị obodo ahụ dị umeala n’obi ma nwee àgwà enyi—ọbụna ọtụtụ n’ime ha si n’ụlọ ha pụta inyere anyị aka. Ezinụlọ anyị bụ nke atọ e kenyere ibi n’otu ntakịrị ọnụ ụlọ dị ihe dị ka square mita 17. Oriọna ndị a na-agbanye mmanụ ọkụ bụ nanị ihe nyere anyị ìhè.
N’ụtụtụ echi ya e nwere ntụli aka. Nne na nna m kwuru na ha atụliwororị Alaeze Chineke aka, bụ́ nke ndị ahụ na-aghọtaghị n’ezie. Ya mere ndị òtù ezinụlọ anyị toruworo ogo mmadụ nọrọ ụbọchị ahụ dum n’ebe e ji ha eji. Ka e mesịrị, ọtụtụ ndị mmadụ jụrụ ajụjụ banyere nkwenkwe ha, nke a mekwara ka ezinụlọ m nwee ohere mara mma ikwu banyere Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ.
N’ime afọ anọ anyị biri n’obodo Iskra, e nweghị Ndịàmà ọzọ bi anyị nso anyị na ha pụrụ ịdị na-akpakọrịta. Iji pụtụ n’obodo ahụ, anyị aghaghị ịnata ọfịsa na-elekọta ogige ahụ ikike pụrụ iche, ọ na-arakwa ya ahụ inye anyị ya, ebe ọ bụ na isi ihe mere e ji chụpụ anyị bụ ka e wee kewapụ anyị n’ebe ndị ọzọ nọ. Ma, Ndịàmà gbalịrị mgbe nile ịgakwuru ibe ha iji kerịta nri ime mmụọ ọhụrụ ọ bụla ha nwetara.
Mgbe Stalin nwụsịrị na 1953, e gbubilatara afọ 25 Ndịàmà nile a mara ikpe gaara anọ n’ụlọ mkpọrọ ịbụ afọ 10. Ọ dịghịkwa ndị nọ na Siberia mkpa ịnata akwụkwọ pụrụ iche iji gagharịa. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya ndị ọchịchị bidoro ime nnyocha ma na-ejide Ndịàmà ma ọ bụrụ na ha achọpụta na ha nwere Bible ma ọ bụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. A rụrụ ogige ndị pụrụ iche maka Ndịàmà n’ógbè ndị dị nso na Irkutsk, e debekwara ihe dị ka ụmụnna nwoke 400 na ụmụnna nwanyị 200 na ha.
Ndịàmà Jehova nọ gburugburu ụwa nụrụ akụkọ banyere mkpagbu a na-akpagbu anyị na Soviet Union. Ya mere, site n’etiti afọ 1956 na February 1957, a nakweere mkpesa e dere n’ihi anyị ná mgbakọ distrikti 199 e nwere n’akụkụ ụwa dum. Ngụkọta nke mmadụ 462,936 bịaranụ kwadoro mkpesa ahụ e degaara onye bụ praịm minista Soviet n’oge ahụ bụ́ Nikolay A. Bulganin. Tinyere ihe ndị ọzọ, mkpesa ahụ rịọrọ ka a tọhapụ anyị nakwa ka e “nye [anyị] ikike inweta na ibipụta magazin Ụlọ Nche n’asụsụ Russian, Ukrainian na n’asụsụ ndị ọzọ pụrụ ịdị mkpa, tinyere akwụkwọ ndị ọzọ e ji amụ Bible bụ́ ndị ndịàmà Jehova ji eme ihe n’ụwa dum.”
Ka ọ dịgodị mgbe ahụ, a kpọgawo ezinụlọ anyị n’ime ime obodo Khudyakovo, bụ́ nke dị ihe dị ka kilomita 20 site na Irkutsk. Anyị biri ebe ahụ afọ asaa. Na 1960 nwanne m nwoke bụ́ Fyodor gawara Irkutsk, n’afọ na-eso ya nwanne m nwoke nke tọrọ m lụkwara nwanyị, nwanne m nwanyị gakwara ebe ọzọ. Mgbe ahụ, na 1962, e jidere Fyodor ma tụọ ya mkpọrọ n’ihi na ọ na-eme nkwusa.
Uto Ime Mmụọ M
Site n’obodo anyị bụ́ Khudyakovo, a na-eji ụkwụ ma ọ bụ ịnyịnya ígwè gaa ihe dị ka kilomita 20 iji soro ndị ọzọ zukọọ maka ọmụmụ Bible. Ya mere anyị gbalịrị ịkwaga Irkutsk iji na-akparu Ndịàmà ndị ọzọ nso karị. Otú ọ dị, onyeisi nke ebe anyị bi achọghị ka anyị kwapụ, o mekwara ihe nile o nwere ike ime iji gbochie ya. Otú ọ dị, mgbe oge ụfọdụ gasịrị, nwoke a malitere inwe mmasị n’ebe anyị nọ karị, anyị nwekwara ike ịkwaga n’obodo nta bụ́ Pivovarikha, nke dị ihe dị ka kilomita iri site na Irkutsk. Ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ebe ahụ, amalitekwara m ndụ ọhụrụ. E nwere ígwè Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ndị a haziri ahazi na ụmụnna ndị ikom na-elekọta ihe omume ime mmụọ na Pivovarikha. Lee ka obi si dị m ụtọ!
Ka ọ dị ugbu a enwewo m mmasị buru ibu n’eziokwu Bible, achọkwara m ka e mee m baptism. N’August 1965 emezuru m ọchịchọ m mgbe e mere m baptism n’obere Osimiri Olkhe, bụ́ ebe e mere ọtụtụ Ndịàmà ọhụrụ baptism n’oge ahụ. Nye onye na-amaghị ihe na-aganụ, o yiri ka anyị kpapụtara ịtụrụ ndụ ma na-egwu mmiri n’osimiri ahụ. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị anatara m ọrụ mbụ m dị ka onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Mgbe ahụ, na November 1965, anyị nwetara ihe ọzọ mere anyị ji ṅụrịa ọṅụ mgbe Fyodor si n’ụlọ mkpọrọ lọta.
Otú Ọrụ ahụ Si Gaa n’Ihu
Na 1965 a kpọkọtara ndị nile a chụpụrụ achụpụ, a makwara ọkwa na anyị nwere ike ịga ebe ọ bụla anyị chọrọ, si otú ahụ mechie “ebe obibi ebighị ebi” anyị. Ị̀ pụrụ iche banyere ọṅụ anyị nwere? Ọ bụ ezie na mgbe ahụ ọtụtụ n’ime anyị kwagara n’akụkụ ndị ọzọ nke mba ahụ, ndị ọzọ kpebiri ịnọgide n’ebe Jehova gọziworo ma kwado uto ime mmụọ na ọrụ anyị. Ọtụtụ n’ime ndị a azụlitewo ụmụ, ụmụ ụmụ, na ụmụ ụmụ ụmụ ha na Siberia, bụ́ ebe mesịrị bụrụ ebe a na-adịghị atụcha ụjọ.
Na 1967, ezutere m Maria, bụ́ nwa agbọghọ e sikwa Ukraine chụga ezinụlọ ya Siberia. Mgbe anyị bụ ụmụaka, anyị abụọ ebiwo n’obodo nta bụ́ Vilshanitsa dị na Ukraine. Anyị lụrụ na 1968, ka oge na-aga, e ji otu nwa nwoke, bụ́ Yaroslav, e mesịakwa otu nwa nwanyị, bụ́ Oksana, gọzie anyị.
Anyị nọgidere na-eji olili ozu na agbamakwụkwọ ezukọ n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu maka mkpakọrịta ime mmụọ. Anyị ga-ejikwa ohere ndị a kọwaara ndị ikwu na ndị enyi anyị na-abụghị Ndịàmà bịaranụ eziokwu Bible. Mgbe mgbe ndị ọrụ nche na-abịa nnọkọ ndị a, bụ́ ebe anyị na-eji Bible eme nkwusa ihu ọha banyere olileanya nke mbilite n’ọnwụ ma ọ bụ banyere ndokwa alụmdi na nwunye Jehova mere na ngọzi ndị ga-abịa n’ọdịnihu n’ụwa ọhụrụ ya.
N’otu mgbe, ka ọ fọdụrụ ntakịrị ka m kwusịa okwu n’otu olili ozu, otu obere ụgbọala kwụsịrị, ụzọ ya meghere, otu n’ime ndị ikom nọ n’ime ya pụtara ma nye m iwu ka m banye n’obere ụgbọala ahụ. Atụghị m egwu. E kwuwerị, anyị abụghị ndị omekome, nanị ndị kwere na Chineke. Otú ọ dị, akụkọ ozi ndị nọ n’ọgbakọ anyị dị n’akpa uwe m. A pụrụ ijiworị nke a jide m. Ya mere ajụrụ m ha ma m pụrụ inye nwunye m ego tupu m soro ha. Mgbe m kwuru nke ahụ, n’ihu ha kpọmkwem, m jiri nwayọọ nye ya pọọsụ m na akụkọ ozi ọgbakọ.
Malite na 1974, mụ na Maria malitere ibipụta akwụkwọ e ji amụ Bible n’ụlọ anyị na nzuzo. Ebe anyị nwere obere nwa nwoke, anyị mere nke a n’ime abalị ka o wee ghara ịma banyere ya. Otú ọ dị, n’ihi ọchịchọ ịmata ihe na-emenụ, o mere ka ọ̀ na-arahụ ụra ma mụghetụ anya ịhụ ihe anyị na-eme. Ka e mesịrị o kwuru, sị: “Ama m ndị na-emepụta magazin ndị na-ekwu banyere Chineke.” Egwu tụtụrụ anyị, ma anyị na-arịọ Jehova mgbe nile ka o chebe ezinụlọ anyị n’ọrụ a dị mkpa.
Ka e mesịrị, ndị ọchịchị bịara nwekwuo mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ, ya mere anyị mekwara atụmatụ inwe nnọkọ ukwu n’ụlọ nzukọ Mir maka nkà na ntụrụndụ dị n’obodo Usol’ye-Sibirskoye. Anyị mesiri ndị ọchịchị obodo ahụ obi ike na nzukọ anyị bụ nanị maka ọmụmụ Bible na mkpakọrịta ndị Kraịst. Ihe karịrị mmadụ 700 gbakọtara na January 1990, na-ejupụta n’ụlọ nzukọ ahụ, na-adọtakwa ọtụtụ ndị ikiri ihe na-emenụ.
Mgbe nzukọ ahụ mechiri, otu onye nta akụkọ jụrụ, sị: “Olee mgbe unu ji zụọ ụmụ unu?” O juru ya na ndị ọzọ bịaranụ anya nke na ha nọrọ ṅaa ntị ná nzukọ ihu ọha mbụ a were awa anọ. N’oge na-adịghị anya isiokwu dị mma banyere Ndịàmà Jehova pụtara n’akwụkwọ akụkọ a na-ebipụta maka ógbè ahụ. O kwuru, sị: “N’ezie mmadụ pụrụ ịmụta ihe n’aka [Ndịàmà Jehova].”
Ịṅụrị Ọṅụ ná Mmụba Dị Ukwuu
Na 1991 anyị nwere mgbakọ asaa na Soviet Union, bụ́ ndị mmadụ 74,252 bịara. Ka e mesịrị, mgbe mba ndị mejupụtaburu Soviet Union nwesịịrị onwe ha, Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova kenyere m ọrụ ịga Moscow. N’ebe ahụ a jụrụ m ma m nwere ike ịmụba òkè m na-ekere n’ọrụ Alaeze. Mgbe ahụ Yaroslav alụwo nwunye ma mụọ otu nwa nke ya, Oksana nọkwa n’afọ iri na ụma. Ya mere na 1993, mụ na Maria malitere ozi oge nile anyị na Moscow. N’otu afọ ahụ, a họpụtara m ịbụ onye nchịkọta ọrụ nke Ebe Nlekọta Ọrụ Ógbè Maka Òtù Okpukpe nke Ndịàmà Jehova na Russia.
Ugbu a mụ na Maria bi ma na-arụ ọrụ n’ihe owuwu alaka ọhụrụ anyị dị ná mpụga St. Petersburg. Ọ bụụrụ m ihe ùgwù ịbụ onye nwere ike isoro ụmụnna ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi na-elekọta ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze na-arị elu n’ike n’ike na Russia. Taa e nwere ihe karịrị nnọọ Ndịàmà 260,000 ná mba ndị mejupụtaburu Soviet Union, nanị na Russia e nwere ihe karịrị 100,000!
Mgbe mgbe mụ na Maria na-eche banyere ndị ikwu na ndị enyị anyị anyị hụrụ n’anya nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi n’ozi Alaeze ha na Siberia, bụ́ ebe ghọworo ebe obibi anyị anyị hụrụ n’anya. Taa a na-enwe mgbakọ ukwu mgbe nile n’ebe ahụ, ihe dị ka Ndịàmà 2,000 na-ejekwa ozi n’ime Irkutsk na gburugburu ya. N’eziokwu, amụma ahụ dị n’Aịsaịa 60:22 na-emezukwa n’akụkụ ahụ nke ụwa: “Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume.”
[Foto dị na peeji nke 16]
Mụ na nna m, ezinụlọ anyị, na ndị ọzọ a chụpụrụ achụpụ mgbe anyị nọ na Irkutsk na 1959
[Foto dị na peeji nke 19]
Ụmụaka ndị a chụpụrụ achụpụ nọ na Iskra
[Foto dị na peeji nke 21]
Afọ anyị lụrụ
[Foto dị na peeji nke 21]
Mụ na Maria taa