Ị̀ Pụrụ Ije Ozi n’Ubi Ala Ọzọ?
“ENWEWO m ọchịchọ mgbe nile ịbanye n’ọrụ ozi ala ọzọ. Dị ka onye na-alụbeghị nwanyị, ejere m ozi na Texas, U.S.A., bụ́ ebe e nwere mkpa dị ukwuu maka ndị nkwusa. Nwunye m bịakwutere m n’ebe ahụ mgbe anyị lụsịrị. Mgbe a mụrụ nwa anyị nwanyị, echere m, sị, ‘Nke ahụ akagbuola atụmatụ m.’ Ma Jehova na-eme ka ọchịchọ mmadụ ruo ya aka, nke ka nke ma ọ bụrụ na ha kwekọrọ n’uche ya.”—Jesse, bụ́ onye ya na nwunye ya na ụmụ ha atọ na-eje ozi ugbu a n’Ecuador.
“Echetụbeghị m n’echiche na m pụrụ ime ihe dị otú ahụ n’anataghị ọzụzụ n’ụlọ akwụkwọ ozi ala ọzọ nke Gilead. Mgbe m hụrụ otu n’ime ndị m na-amụrụ Bible ka ọ na-eme ihe omume ma ọ bụ na-eme nkwusa, o mere m obi ụtọ, ekelekwara m Jehova maka inye m ohere a.”—Karen, bụ́ nwanyị na-alụghị di nke sụrụ ụzọ ruo afọ asatọ n’Ebe Ndịda America.
“Mgbe anyị mesịrị nkwusa oge nile ruo afọ 13 na United States, mụ na nwunye m chere na ọ dị anyị mkpa ịga n’ókèala ọhụrụ. Anyị na-enwe obi ụtọ karịa ka anyị nwetụworo mbụ; ọ bụ ụzọ ndụ dị ebube n’ezie.”—Tom, bụ́ onye ya na nwunye ya, bụ́ Linda, na-asụ ụzọ n’ógbè Amazon.
Ọ bụ ndị ọnọdụ ha na-ekweghị ka ha nata ọzụzụ ozi ala ọzọ na Watchtower Bible School of Gilead kwuru okwu ekele ndị a. Ka o sina dị, ha enwetawo ọṅụ na ihe ịma aka nke ozi ala ọzọ. Olee otú nke a si mee? Ozi dị otú ahụ ọ̀ dịịrị gị?
A Chọrọ Ezi Ebumnobi
Iji nwee ihe ịga nke ọma n’ubi ala ọzọ, a chọrọ ihe karịrị inwe mmụọ nke iche ahụmahụ na-ama aka ihu. Ndị nọgidesiworo ike na ya ejiriwo ezi ebumnobi mee otú ahụ. Dị ka Pọl onyeozi, ha na-ewere onwe ha dị ka ndị ji ọ bụghị nanị Chineke kamakwa ndị mmadụ, ụgwọ. (Ndị Rom 1:14) Ha pụrụ imezuwo iwu Chineke nke ime nkwusa site n’ije ozi n’ókèala obodo ha. (Matiu 24:14) Ma ha nwere mmetụta nke ịbụ ndị ji ụgwọ, a kwalikwara ha ịga nyere ndị na-adịghị enwetakebe ohere ịnụ ozi ọma ahụ aka.
Ebumnobi ọzọ na-abụkarị ọchịchọ nke ịrụ ọrụ n’ókèala na-amị mkpụrụ karị—nke a kwesịkwara ekwesị. Ònye n’ime anyị nke ga-ahụ onye ọkụ azụ̀ ọzọ ka ọ na-enwe ihe ịga nke ọma dị ukwuu nke na-agaghị abịadewe nso n’akụkụ mmiri ebe ahụ ọ nọ? N’otu aka ahụ, akụkọ ndị na-agba ume banyere mmụba dị ukwuu a na-enwe n’ala ndị ọzọ akpaliwo ọtụtụ ndị ịga n’ebe e nwere “oké ìgwè azụ̀.”—Luk 5:4-10.
Gụkọọ Ihe Ọ Na-efu
Ọtụtụ mba adịghị ekwe ka ndị ọrụ afọ ofufo okpukpe si n’ala ọzọ bịa, na-arụ ọrụ ego. Ya mere, dị ka ọ na-adịkarị, ndị nwere ọchịchọ ije ozi ná mba ọzọ aghaghị inwere onwe ha n’ụzọ ego. Olee otú e siworo merie ihe ịma aka akụ̀ na ụba a? Ọtụtụ ndị erewo ma ọ bụ tinye ndị mmadụ n’ụlọ ha iji nweta ego dị ha mkpa. Ndị ọzọ erewo ụlọ ahịa ha. Ụfọdụ echekwawo ego iji ruo ihe mgbaru ọsọ ha. Ma, ndị ọzọ na-eme ha jee ozi n’ala ọzọ ruo otu afọ ma ọ bụ abụọ, ha alaghachi ná mba ha ịrụ ọrụ iji kpata ego, e mesịakwa, ha agaghachi iji gaa n’ihu n’ozi ha.
Otu abamuru doro anya nke dị n’ịnọ ná mba ka na-emepe emepe bụ na ọnụ ahịa ihe na-adị nnọọ ala karịa n’ala mepere emepe karị. Nke a emewo ka ụfọdụ ndị nwee ike iji obere ego ezumike nká ha na-ebi ndụ n’ụzọ na-ezuru ha. N’ezie, mmefu mmadụ na-eme ga-adaberekarị n’ụdị ndụ ọ họọrọ ibi. Ọbụna ná mba ndị ka na-emepe emepe, a pụrụ ịhụ ebe obibi ndị dị nnọọ ntụsara ahụ ma n’ọnụ ego dị nnọọ elu karị.
N’ụzọ doro anya, a ghaghị ibu ụzọ gbakọọ ihe a ga-emefu tupu a na-aga. Ma, ọ gụnyere ihe karịrị nanị ịgụkọ ihe ọ na-efu n’ụzọ akụ̀ na ụba. Ikekwe ihe ụfọdụ ndị jeworo ozi n’Ebe Ndịda America kwuru pụrụ inye ihe ọmụma.
Ihe Ịma Aka Kasị Ukwuu
“Ịmụta Spanish bụụrụ m ọgụ na mgba,” ka Markku, bụ́ onye si Finland na-echeta. “Eweere m ya na ebe ọ bụ na amaghị m asụsụ ahụ, ọ ga-adị anya tupu mụ enwee ike ije ozi dị ka ohu na-eje ozi. Lee ihe ijuanya ọ bụ mgbe a gwara m ka m duzie ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ mgbe nanị ọnwa abụọ gasịrị! N’ezie, e nwere m ọtụtụ oge nke mmechuihu. Enwere m nsogbu karịsịa n’ịkpọ aha ndị mmadụ. Otu ụbọchị, akpọrọ m Nwanna Sancho ‘Nwanna Chancho (ezì),’ agaghịkwa m echefu mgbe m kpọrọ Nwanna Nwanyị Salamea ‘Malasea (onye ọjọọ).’ N’ụzọ dabara adaba, ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị ahụ nwere nnọọ ndidi.” Markku mesịrị jee ozi ná mba ahụ dị ka onye nlekọta sekit ruo afọ asatọ, ya na nwunye ya, bụ́ Celine.
Chris, bụ́ nwunye Jesse a kpọtụrụ aha na mbụ, na-akọ, sị: “Ana m echeta oge mbụ onye nlekọta sekit letara anyị, mgbe anyị nọworo ebe a ruo nanị ọnwa atọ. Apụrụ m ịhụ na nwanna ahụ ji ihe atụ na-eme ihe, na-ekwukwa ihe dị nnọọ mma iji gbalịa iru n’obi anyị, ma apụghị m ịghọta ihe ọ na-ekwu. Anya mmiri malitere ịgba m kpọmkwem n’ime ụlọ nzukọ ebe ahụ. Ọ bụghị obere anya mmiri; ana m ebe ákwá. Mgbe a gbasara nzukọ ahụ, agbalịrị m ịkọwara onye nlekọta sekit ahụ ihe kpaliri omume ahụ m mere. O nwere nnọọ obiọma ma gwa m ihe onye ọ bụla ọzọ nọgidere na-agwa m, ‘Ten paciencia, hermana’ (‘Nwee ndidi, nwanna nwanyị’). Afọ abụọ ma ọ bụ atọ mgbe e mesịrị, anyị zutere ọzọ ma kwurịta okwu ruo minit 45, na-enwe obi ụtọ n’eziokwu ahụ bụ́ na anyị pụrụ ikwurịta okwu.”
“Ọmụmụ ihe dị oké mkpa,” ka nwanna nwoke ọzọ na-ekwu. “Ka anyị na-etinyekwu mgbalị n’ịmụ asụsụ ahụ, otú ahụ ka anyị na-emekwu ka nkà nkwurịta okwu anyị ka mma.”
Mmadụ nile na-ekweta na mgbalị ndị dị otú ahụ na-eweta ọtụtụ abamuru. Mmadụ na-azụlite ịdị umeala n’obi, ndidi, na nnọgidesi ike n’ihe mgbe ọ na-agbalị ịmụta asụsụ ọhụrụ. A na-enwe ohere dị ukwuu iji kwusaara ndị ọzọ ozi ọma. Dị ka ihe atụ, ịmụta Spanish na-enyere mmadụ aka ikwu okwu n’asụsụ nke ihe karịrị nde mmadụ 400 na-asụ gburugburu ụwa. Ọtụtụ ndị o mesịrị bụrụ na ha aghaghị ịlaghachi ná mba ha enwewo ike iji nkà asụsụ ha ka na-enyere ndị asụsụ ala nna ha bụ Spanish aka.
Gịnị Banyere Agụụ Ụlọ?
“Oge mbụ anyị bịara Ecuador na 1989,” ka Deborah, bụ́ onye so di ya, bụ́ Gary, jee ozi n’ógbè Amazon, na-echeta, “agụụ ụlọ na-agụsi m ike. Amụtara m ịdabere n’ebe ụmụnna nwoke na nwanyị nọ n’ọgbakọ nọ karị. Ha bịara yie ezinụlọ m.”
Karen, bụ́ onye a kpọtụrụ aha ná mmalite, na-ekwu, sị: “Alụsoro m agụụ ụlọ ọgụ site n’ikere òkè n’ozi kwa ụbọchị. N’ụzọ dị otú a adịghị m amụ anya arọ nrọ banyere ụlọ. Ana m eburukwa n’uche na obi dị ndị mụrụ m ụtọ n’ụlọ banyere ọrụ m na-arụ n’ubi ala ọzọ. Mama m ji okwu ndị a gbaa m ume mgbe nile: ‘Jehova pụrụ ilekọta gị n’ụzọ ka mma karịa otú m pụrụ.’”
Makiko, bụ́ onye si Japan, ji ọchị na-agbakwụnye, sị: “Mgbe m tinyesịrị otu ụbọchị zuru ezu n’ozi ubi, ike na-agwụ m nke ukwuu. Ya mere mgbe m laruru n’ebe obibi m ma malite inwe agụụ ụlọ, ụra na-eburukarị m. N’ihi ya, mmetụta ahụ anaghị adịte nnọọ anya.”
Gịnị Banyere Ụmụaka?
Mgbe ọ gụnyere ụmụaka, a ghaghị ichebara mkpa ha ndị dị ka agụmakwụkwọ echiche. N’akụkụ a, ụfọdụ ahọrọwo ka ụmụ ha nọrọ n’ụlọ na-agụ akwụkwọ ebe ndị ọzọ debanyeworo aha ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ ndị dị n’ógbè ha.
Al kpọọrọ nwunye ya, ụmụ ya abụọ, na nne ya, kwaga Ebe Ndịda America. Ọ na-ekwu, sị: “Anyị chọpụtara na itinye ụmụaka ahụ n’ụlọ akwụkwọ nyeere ha aka ịmụta asụsụ ahụ ngwa ngwa. N’ime ọnwa atọ, ha na-asụ ya nnọọ were were.” N’aka nke ọzọ, ụmụ okoro abụọ nọ n’afọ iri na ụma bụ́ ụmụ Mike na Carrie, nọ n’ụlọ na-agụ akwụkwọ site n’ụlọ akwụkwọ ọchịchị kwadoro. Nne na nna ahụ na-ekwu, sị: “Anyị chọpụtara na anyị apụghị ịhapụrụ ụmụ anyị ihe ọmụmụ ndị dị otú ahụ n’onwe ha. Anyị aghaghị ikere òkè n’ihe ọmụmụ ahụ ma jide n’aka na ụmụ okoro ahụ na-esochi usoro ihe ọmụmụ e kenyere ha anya.”
David na Janita, bụ́ ndị si Australia, na-ekwupụta mmetụta ha banyere ụmụ nwoke abụọ ha. “Anyị chọrọ ka ụmụ anyị jiri anya ha hụ otú ndị ọzọ si ebi ndụ. Ọ dị mfe iche na ụzọ ndụ anyị ji tolite bụ nke zuru ebe nile, ma n’ezie ọ bụ ọnụ ọgụgụ dị nnọọ nta na-agbaso ụzọ ndụ anyị. Ha ahụwokwa otú ụkpụrụ ọchịchị Chineke si arụ ọrụ n’ụwa nile, n’agbanyeghị mba ma ọ bụ ọdịbendị ọ bụ.”
“Adị m nanị afọ anọ mgbe ezinụlọ anyị si England kwapụ na 1969,” ka Ken na-echeta. “Ọ bụ ezie na enwere m ndakpọ olileanya na anyị ebighị n’ụlọ ájá e ji ata gbaa elu ya, dị ka m tụrụ anya ya, enwere m mmetụta na e nyere m ọzụzụ kasị mma a pụrụ inye onye na-eto eto. Ana m emere ụmụaka ndị ọzọ bụ́ ndị a na-enyeghị ọzụzụ dị otú ahụ ebere mgbe nile! N’ihi iso ndị ozi ala ọzọ na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche na-enwe mkpakọrịta dị mma, amalitere m ịsụ ụzọ inyeaka mgbe m dị afọ itoolu.” Ugbu a Ken bụ onye nlekọta na-ejegharị ejegharị.
“N’ezie Ecuador bụzi ebe obibi anyị,” ka Gabriella, bụ́ nwa nwanyị Jesse na-ekweta. “Obi dị m nnọọ ụtọ na ndị mụrụ m mere mkpebi ịbịa ebe a.”
N’aka nke ọzọ, e nweela ụmụaka ndị na-enweghị ike ikwekọ n’ihi ihe ụfọdụ, ezinụlọ ha aghaghịkwa ịlaghachi ná mba ha. Ọ bụ ya mere ibu ụzọ leta mba ọzọ tupu a na-akwaga na ya ji bụrụ ihe amamihe dị na ya. N’ụzọ dị otú a a pụrụ ime mkpebi na-adabere n’ihe ọmụma onwe onye.
Ngọzi Ndị Dị ná Nkwapụ Ahụ
N’ezie, ịkwaga n’ubi ala ọzọ na-agụnye ọtụtụ ihe ịma aka na ịchụ ọtụtụ ihe n’àjà. Ọ̀ baworo ndị ahụ werewooro nzọụkwụ ahụ uru? Ka ha kọọrọ anyị.
Jesse: “N’ime afọ iri anyị nọworo n’obodo Ambato, anyị ahụwo ka ọnụ ọgụgụ ọgbakọ sitere na 2 mụbaruo 11. Anyị enweela ihe ùgwù nke inye aka guzobe ise n’ime ọgbakọ ndị ahụ, anyị arụwokwa ọrụ n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze abụọ. Anyị enwewokwa ọṅụ nke inyere nkezi nke mmadụ abụọ anyị na-amụrụ Bible aka kwa afọ iru eru maka baptism. Nanị otu ihe ka m na-akwara ụta—ihe mere m na-ejighị bịa ebe a afọ iri tupu mgbe m bịara.”
Linda: “Ekele ndị ebe a na-enwe maka ozi ọma ahụ nakwa maka mgbalị anyị na-agba anyị ume nke ukwuu. Dị ka ihe atụ, n’otu obodo nta nke dị n’oké ọhịa, otu onye a na-amụrụ Bible nke aha ya bụ́ Alfonso ghọtara uru ọ ga-aba ịnọ n’ógbè ya na-ekwu okwu ihu ọha. Ọ ka kwabasịrị nnọọ n’ụlọ ọhụrụ ya e ji osisi wuo nke ụdị ya dị nanị ole na ole n’obodo nta ahụ. N’ikpebi na ụlọ ya bụ nanị ụlọ kwesịrị Jehova n’obodo ahụ, ọ kwafeghachiri n’ụlọ nta ya e ji ata rụọ ma nyefee ụmụnna ụlọ ya ka ha jiri ya mere Ụlọ Nzukọ Alaeze.”
Jim: “Oge anyị na-etinye n’ezie n’iso ndị mmadụ na-ekwurịta okwu n’ozi ji okpukpu iri karịa nke anyị na-etinye mgbe anyị nọ na United States. Ọzọkwa, ọnọdụ ndụ dị n’ebe a dị jụụ karị. Obi abụọ adịghị ya na e nwere oge ka ukwuu maka ọmụmụ ihe na ozi ubi.”
Sandra: “Ịhụ otú eziokwu Bible pụrụ isi gbanwee ndị mmadụ ịghọ ndị ka mma na-enye m afọ ojuju dị ukwuu. N’otu oge eso m Amada na-amụ Bible, bụ́ onye dị afọ 69 nke nwere obere ụlọ ahịa ebe a na-ere ihe e ji esi nri. Ọ nọwo mgbe mgbe na-agbanye iko mmiri abụọ n’ime iko mmiri ara ehi iri ọ bụla. Ọ gakwara n’ihu na-aghọgbu ndị ahịa ya site n’iresị ha mmiri ara ehi a a gwagburu agwagbu n’agbajughị ya n’ihe e ji atụ ya. Ma mgbe ọ mụsịrị ihe ọmụmụ ahụ dị n’okpuru isiokwu nta bụ́ ‘Ịkwụwa Aka Ọtọ Na-arụpụta Obi Ụtọ’ n’isiakwụkwọ nke 13 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, Amada kwụsịrị omume ọjọọ ndị a. Lee ihe ọṅụ ọ bụ ịhụ ka e mere ya baptism oge ụfọdụ mgbe nke ahụ gasịrị!”
Karen: “Ọ dịbeghị mgbe m dabeere nke ukwuu n’ebe Jehova nọ ma ọ bụ mgbe o ji m mee ihe n’ụzọ dị ukwuu dị ka ọ dị ugbu a. Ọbụbụenyi mụ na Jehova emiela emi ma sie ike karị.”
Gịnị Banyere Gị?
N’ime ọtụtụ afọ ndị gafeworonụ, ọtụtụ puku Ndịàmà akwagawo ná mba ọzọ iji jee ozi. Ụfọdụ na-anọ otu afọ ma ọ bụ abụọ, ndị ọzọ na-anọgide nnọọ ebe ahụ. Ha na-eji ahụmahụ, uto ime mmụọ, na ego ha aga, ná nzube nke ịkwalite ọdịmma Alaeze n’ubi ala ọzọ. Ha enweela ike ije ozi n’ógbè ebe ndị nkwusa Alaeze nọ n’ógbè ahụ na-apụghị ije ozi n’ihi ịdị ụkọ nke ọrụ ego. Ọtụtụ ndị azụọla ụgbọala injin na-arụ ọrụ na wheel ya anọ iji gazuo ókèala ndị a na-apụghị ịgaru ma e jighị ya. Ndị ọzọ, bụ́ ndị nwere mmasị ibi n’obodo ukwu, aghọọla ndị na-ewusi ọgbakọ ndị buru ibu bụ́ ndị nwere ndị okenye ole na ole, ike. Ma, n’agụpụghị onye ọ bụla, ha nile na-ekwusi ike na ha enwetawo ihe dị ukwuu ma a bịa ná ngọzi ime mmụọ karịa ka ha nyeworo.
Ị̀ pụrụ ikere òkè n’ihe ùgwù nke ije ozi n’ubi ala ọzọ? Ọ bụrụ na ọnọdụ gị nyere ohere maka ya, gịnị ma i nyochaa otú ụdị nkwapụ ahụ ga-esi kwe omume? Nzọụkwụ mbụ na nke dị oké mkpa ga-abụ idegara alaka ụlọ ọrụ Society nke dị ná mba ahụ ị na-eche echiche ije ozi na ya akwụkwọ. Ihe ọmụma a kapịrị ọnụ ndị ị ga-enweta ga-enyere gị aka ịmara ohere ndị i nwere iji nwee ihe ịga nke ọma na ya. Tụkwasị na nke a, a pụrụ ịchọta ọtụtụ aro ndị dị irè n’isiokwu bụ́ “Si n’Ala Gị na n’Etiti Ikwu Gị Pụọ,” nke dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke August 15, 1988. Site n’ime atụmatụ kwesịrị ekwesị nakwa site ná ngọzi Jehova, ikekwe gị onwe gị pụkwara inweta ọṅụ nke ije ozi n’ubi ala ọzọ.
[Foto dị na peeji nke 24]
TOM NA LINDA KA HA NỌ N’ỤZỌ ỌHỊA DỊPỤRỤ ADỊPỤ, NA-AGA N’ÓGBÈ NDỊ SHUAR INDIA
[Foto dị na peeji nke 25]
ỌTỤTỤ NA-EJE OZI NA QUITO, BỤ́ ISI OBODO ECUADOR
[Foto dị na peeji nke 25]
MAKIKO KA Ọ NA-EME NKWUSA N’UGWU ANDES
[Foto dị na peeji nke 26]
EZINỤLỌ HILBIG ANỌWO NA-EJE OZI N’ECUADOR KEMGBE AFỌ ISE