Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 10/15 p. 23-28
  • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Dị n’Ilu Ahụ
  • Olee Ndị Bụ Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?
  • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Ìgwè nke Ọ Bụla?
  • Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Anyị?
  • Kraịst Bụ́ Eze Abịa Ikpe Ndị Bụ́ Atụrụ na Ndị Bụ́ Ewu Ikpe
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Mgbe Kraịst Bịara n’lke Alaeze
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Oké Ìgwè Mmadụ nke Ndị Na-efe Ezi Ofufe—Olee Ebe Ha Si Bịa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Jiri Obi Gị Niile Na-akwado Ụmụnna Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 10/15 p. 23-28

Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?

“Ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu.”—MATIU 25:32.

1, 2. N’ihi gịnị ka ilu nke atụrụ na ụmụ ewu kwesịrị iji dọrọ mmasị anyị?

JISỌS KRAỊST n’ezie bụ Onye Ozizi kasị ukwuu n’ụwa. (Jọn 7:46) Otu n’ime ụzọ izi ihe ya bụ iji ilu, ma ọ bụ ihe atụ, eme ihe. (Matiu 13:34, 35) Ndị a dị mfe ma dị ike n’inye eziokwu ime mmụọ na nke amụma ndị dị omimi.

2 N’ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ, Jisọs zoro aka n’oge ọ ga-eme ihe n’ọkwá pụrụ iche: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube Ya, Ya na . . .” (Matiu 25:31) Nke a kwesịrị ịdọrọ mmasị anyị n’ihi na ọ bụ ihe atụ nke Jisọs ji mechie azịza ya nye ajụjụ ahụ bụ́: “Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị, na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a?” (Matiu 24:3, NW) Ma gịnị ka nke a pụtara nye anyị?

3. Ná mmalite okwu ya, gịnị ka Jisọs kwuru ga-eme ngwa ngwa mkpagbu ukwu ahụ malitesịrị?

3 Jisọs buru amụma ihe omume ndị dị ịrịba ama ndị ga-abịa “ngwa ngwa” mkpagbu ukwu ahụ tiwapụsịrị, bụ́ ihe omume ndị anyị na-echere. Ọ sịrị na mgbe ahụ ka “ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ” ga-apụta. Nke a ga-emetụta “ebo nile nke ụwa” n’ụzọ dị ukwuu bụ́ ndị ga-ahụ “Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa n’elu igwe ojii nke eluigwe n’ike na oké ebube.” Nwa nke mmadụ na “ndị mmụọ ozi Ya” ga-eso. (Matiu 24:21, 29-31)a Gịnị banyere ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ? Bible ndị nke oge a na-etinye ya n’isi nke 25, ma, ọ bụ akụkụ nke nzaghachi Jisọs, na-enyekwu nkọwa banyere ọbịbịa ya n’ebube ma na-elekwasị anya na ya ikpe “mba nile” ikpe.—Matiu 25:32.

Ndị Dị n’Ilu Ahụ

4. Nhota dị aṅaa ka e hotara Jisọs ná mmalite nke ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ, oleekwa onye ọzọ e hotara?

4 Jisọs malitere ilu ahụ site n’ikwu, sị: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-abịa.” Ikekwe ị maara onye “Nwa nke mmadụ” ahụ bụ. Ndị dere Oziọma ahụ jiri okwu ahụ mee ihe ọtụtụ mgbe n’ebe Jisọs nọ. Ọbụna Jisọs n’onwe ya mere otú a, n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na-eburu n’uche ọhụụ Daniel banyere “otu onye, nke dị ka nwa nke mmadụ” nke na-abịakwute Onye Ochie ahụ ịnata “ọchịchị, na ebube, na alaeze.” (Daniel 7:13, 14; Matiu 26:63, 64; Mak 14:61, 62) Ọ bụ ezie na ọ bụ Jisọs bụ onye bụ isi n’ilu a, ọ nọghị nanị ya. Ná mmalite ntụle nke a, dị ka e hotara na Matiu 24:30, 31, ọ sịrị na mgbe Nwa nke mmadụ ‘ga-abịa n’ike na oké ebube,’ ndị mmụọ ozi ya ga-arụ ọrụ dị mkpa. N’otu aka ahụ, ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ na-egosi ka Jisọs na ndị mmụọ ozi nọ mgbe ọ ‘na-anọdụ n’ocheeze ebube ya’ ikpe ikpe. (Tụlee Matiu 16:27.) Ma Onye Ikpe ahụ na ndị mmụọ ozi ya nọ n’eluigwe, ọ̀ bụ otu ihe ahụ banyere ndị mmadụ e kwuru maka ha n’ilu ahụ?

5. Olee otú anyị pụrụ isi mata ndị bụ “ụmụnna” Jisọs?

5 Otu nle anya n’ilu ahụ na-ekpughe ìgwè atọ ndị ọ dị anyị mkpa ịmata. Tụkwasị n’atụrụ na ụmụ ewu ahụ, Nwa nke mmadụ na-atụkwasị ìgwè nke atọ ndị ịmata ndị ha bụ dị oké mkpa n’ịmata atụrụ na ụmụ ewu ahụ. Jisọs na-akpọ ìgwè nke atọ nke a ụmụnna ime mmụọ ya. (Matiu 25:40, 45) Ha aghaghị ịbụ ndị na-efe ezi ofufe, n’ihi na Jisọs sịrị: “Onye ọ bụla nke ga-eme ihe Nna m . . . na-achọ, onye ahụ bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.” (Matiu 12:50; Jọn 20:17) N’ịkpọkwu okwu aha, Pọl dere maka ndị Kraịst bụ akụkụ nke “mkpụrụ Abraham,” ndị bụkwa ụmụ Chineke. Ọ kpọrọ ndị a “ụmụnna” Jisọs na “ndị nketa nke ọkpụkpọ eluigwe.”—Ndị Hibru 2:9–3:1; Ndị Galetia 3:26, 29.

6. Olee ndị bụ “ndị dịkarịsịrị nta” n’ime ụmụnna Jisọs?

6 N’ihi gịnị ka Jisọs ji hota ‘onye dịkarịsịrị nta’ n’ime ụmụnna ya? Okwu ndị ahụ bụ nkwughachi nke ihe ndị ozi ahụ nụrụ o kwuru tupu mgbe ahụ. Mgbe o ji Jọn Baptist, bụ́ onye bu Jisọs ụzọ nwụọ, n’ihi ya kwa nwee olileanya elu ala, na-atụnyere ndị na-enweta ndụ eluigwe, Jisọs sịrị: “N’etiti ndị ndị inyom mụrụ ọ dịghị onye biliworo nke ka Jọn Baptist ukwuu: ma onye dịkarịrị nta n’alaeze eluigwe ka ya ukwuu.” (Matiu 11:11) Ụfọdụ ndị na-eje eluigwe pụrụ ịbụworị ndị a ma ama n’ọgbakọ, dị ka ndị ozi ahụ, ndị ọzọ abụrụkwa ndị a na-amachaghị otú ahụ, ma ha nile bụ ụmụnna ime mmụọ Jisọs. (Luk 16:10; 1 Ndị Kọrint 15:9; Ndị Efesọs 3:8; Ndị Hibru 8:11) Ya mere, a sịgodị na ụfọdụ yiri ndị na-adịghị mkpa n’ụwa, ha bụ ụmụnna ya, e kwesịkwara imeso ha ihe n’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ.

Olee Ndị Bụ Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?

7, 8. Gịnị ka Jisọs kwuru banyere atụrụ ahụ, ya mere gịnị ka anyị pụrụ ikwubi banyere ha?

7 Banyere ikpe atụrụ ahụ ikpe anyị na-agụ, sị: ‘Jisọs ga-asị ndị nọ n’aka nri Ya, Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site na ntọala nke ụwa: n’ihi na agụụ gụrụ m, unu wee nye m ihe M ga-eri: akpịrị kpọrọ m nkụ, unu wee kuru mmiri nye m: abụ m ọbịa, unu wee kpọbata m; agbara m ọtọ, unu wee gbokwasị m ákwà: ahụ adịghị m ike, unu wee leta m: anọ m n’ụlọ mkpọrọ, unu wee bịakwute m. Mgbe ahụ ndị ezi omume ahụ ga-aza Ya, sị, Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ Gị ka agụụ na-agụ Gị, anyị wee zụọ Gị? ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ Gị nkụ, anyị wee kuru mmiri nye Gị? Olee mgbe anyị hụkwara Gị ka Ị bụ ọbịa, anyị wee kpọbata Gị? ma ọ bụ ka Ị na-agba ọtọ, anyị wee gbokwasị Gị ákwà? Olee mgbe anyị hụkwara Gị ka ahụ na-adịghị ike, ma ọ bụ n’ụlọ mkpọrọ, anyị wee bịakwute Gị? Eze ahụ ga-azakwa, sị ha, N’ezie asị m unu, Ka ọ hà, bụ́ otú unu si mee ya nye otu onye n’ime ụmụnna m ndị a, bụ́ ndị dịkarịsịrị nta, Mụ ka unu mere ya nye.’—Matiu 25:34-40.

8 N’ụzọ doro anya, atụrụ ahụ e kpebiri na ha ruru eru ịnọ n’aka nri nsọpụrụ na nke ihu ọma nke Jisọs na-anọchite anya otu òtù nke ụmụ mmadụ. (Ndị Efesọs 1:20; Ndị Hibru 1:3) Gịnị ka ha mere, olee mgbekwa? Jisọs na-asị na ha ji obi ọma, nkwanye ùgwù, na afọ ofufo nye ya ihe oriri, ihe ọṅụṅụ, na ákwà, na-enyere ya aka mgbe ọ na-arịa ọrịa ma ọ bụ nọrọ n’ụlọ mkpọrọ. Mgbe atụrụ ahụ sịrị na ha emeghịrị Jisọs nke a n’onwe ya, o zoro aka na ha kwadoro ụmụnna ime mmụọ ya, ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ, ya mere n’echiche ahụ ha mere ya nye ya.

9. N’ihi gịnị ka ilu ahụ na-adịghị emezu na Narị Afọ Iri ahụ?

9 Ilu ahụ adịghị emezu na Narị Afọ Iri ahụ, n’ihi na n’oge ahụ, ndị ahụ e tere mmanụ agaghị abụ mmadụ na-ata ahụhụ agụụ, akpịrị ịkpọ nkụ, ọrịa, ma ọ bụ ịtụ mkpọrọ. Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime ha enwewo ahụmahụ dị otú ahụ n’oge ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. Kemgbe a chụdara Setan n’elu ụwa, o mewo ndị ahụ fọdụrụnụ ndị ọ na-eweso iwe ya n’ụzọ pụrụ iche, na-ewetara ha ịkwa emo, mmekpọ ọnụ, na ọnwụ.—Mkpughe 12:17.

10, 11. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-ejighị bụrụ ihe ezi uche dị na ya iche na atụrụ ahụ gụnyere onye ọ bụla nke meere ụmụnna Jisọs ihe ọma? (b) Ole ndị ka atụrụ ahụ na-anọchite anya ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

10 Jisọs ọ̀ na-ekwu na onye ọ bụla na-emere otu n’ime ụmụnna ime mmụọ ya ntakịrị ihe ọma, dị ka inye ha otu ógbè achịcha ma ọ bụ otu iko mmiri, ruru eru ịbụ otu n’ime atụrụ ndị a? N’eziokwu, ime ihe ọma ndị dị otú ahụ pụrụ igosi obi ọma mmadụ, ma n’ezie, o yiri ka a gụnyere ihe karịrị nke ahụ n’ebe atụrụ dị n’ilu a dị. O doro anya na Jisọs adịghị ezo aka, dị ka ihe atụ, n’ebe ndị na-ekweghị na Chineke ma ọ bụ n’ebe ndị ụkọchukwu nọ, bụ́ ndị meere otu n’ime ụmụnna ime mmụọ ya ihe ọma. N’ụzọ megidere nke ahụ, ugboro abụọ Jisọs kpọrọ atụrụ ahụ “ndị ezi omume.” (Matiu 25:37, 46) Ya mere, atụrụ ahụ aghaghị ịbụ ndị gbatawooro ụmụnna Kraịst ọsọ enyemaka ruo ogologo oge—na-enye nkwado pụtara ìhè—ma gosipụta okwukwe ruo n’ókè nke inweta nguzo ezi omume n’ihu Chineke.

11 N’ime narị afọ ndị gara aga, ọtụtụ ndị, dị ka Abraham, enwewo nguzo ezi omume. (Jemes 2:21-23) Noa, Abraham, na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ ndị ga-eketa ndụ n’ime Paradaịs n’okpuru Alaeze Chineke. N’oge ndị na-adịbeghị anya ọtụtụ nde ndị ọzọ amalitewo ife ezi ofufe dị ka atụrụ ọzọ ma soro ndị ahụ e tere mmanụ ghọọ “otu ìgwè atụrụ.” (Jọn 10:16; Mkpughe 7:9) Ndị a nwere olileanya elu ala matara ụmụnna Jisọs dị ka ndị nnọchianya Alaeze ahụ, n’ihi ya kwa nyere ha aka—n’ụzọ nkịtị na n’ụzọ ime mmụọ. Jisọs na-ewere ihe atụrụ ọzọ ahụ na-emere ụmụnna ya nọ n’elu ala dị ka ihe a na-emere ya. A ga-ekwupụta ndị dị otú ahụ nọ ndụ mgbe ọ ga-abịa ikpe mba nile ikpe dị ka atụrụ.

12. N’ihi gịnị ka atụrụ ahụ pụrụ iji jụọ otú ha siworo meere Jisọs ihe ọma?

12 Ọ bụrụ na atụrụ ọzọ ahụ so ndị ahụ e tere mmanụ na-ekwusa ozi ọma ahụ ugbu a ma na-enyere ha aka, n’ihi gịnị ka ha ga-eji jụọ, sị: “Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ Gị ka agụụ na-agụ Gị, anyị wee zụọ Gị? ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ Gị nkụ, anyị wee kuru mmiri nye Gị?” (Matiu 25:37) A pụrụ inwe ọtụtụ ihe kpatara ya. Ihe a bụ ilu. Jisọs ji ya gosi nchegbu dị omimi o nwere maka ụmụnna ime mmụọ ya; o so ha na-enwe mmetụta ha, soro ha na-ata ahụhụ. Jisọs ekwuolarị na mbụ, sị: “Onye na-anara unu nke ọma, ọ bụ Mụ onwe m ka ọ na-anara nke ọma, onye na-anarakwa Mụ onwe m nke ọma na-anara Onye zitere m nke ọma.” (Matiu 10:40) N’ihe atụ a, Jisọs na-agbatịpụ ụkpụrụ ahụ, na-egosi na ihe e meere (ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ) ụmụnna ya na-eru ọbụna n’eluigwe; ọ dị ka a ga-asị na e meere ya n’eluigwe. Ọzọkwa, n’ebe a Jisọs na-emesi ụkpụrụ Jehova maka ikpe ikpe ike, na-eme ka o doo anya na ikpe Chineke, ma ọ bụ nke dị mma ma ọ bụ nke ịma ikpe, dị irè ma zie ezi. Ụmụ ewu ahụ apụghị inye ihe ngọpụ bụ́, ‘A sị nnọọ na anyị hụrụ gị ihu na ihu.’

13. N’ihi gịnị ka ndị yiri ụmụ ewu pụrụ iji kpọọ Jisọs “Onyenwe anyị”?

13 Ozugbo anyị ghọtara oge e jiri nye mkpebi ikpe ahụ e gosiri n’ilu a, anyị ga-enwe nghọta ka doo anya banyere ndị ụmụ ewu ahụ bụ. Mmezu ya bụ mgbe ‘ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụta ìhè n’eluigwe: mgbe ahụ ka ebo nile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka Ọ na-abịa . . . n’ike na oké ebube.’ (Matiu 24:29, 30) Ndị ga-alanarị mkpagbu ahụ ga-abịakwasị Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ ndị mesoworo ụmụnne Eze ahụ ihe n’ụzọ ịsọ oyi pụrụ ugbu a ịdị na-akpọ Onye Ikpe ahụ “Onyenwe anyị” n’ọnwụ ọnwụ na-atụ anya ịzọpụta ndụ ha.—Matiu 7:22, 23; tụlee Mkpughe 6:15-17.

14. Dabere na gịnị ka Jisọs ga-ekpe atụrụ na ụmụ ewu ahụ ikpe?

14 Ikpe Jisọs agaghị adabere ná nzọrọ ọnwụ ọnwụ nke ndị na-ejebu chọọchị, ndị na-ekweghị na Chineke, ma ọ bụ ndị ọzọ. (2 Ndị Tesalọnaịka 1:8) Kama nke ahụ, onye ikpe ahụ ga-atụleghachi ọnọdụ obi na omume ndị mmadụ mesoro “otu onye n’ime [ụmụnna ya] ndị a, bụ́ ndị dịkarịsịrị nta,” n’oge gara aga. N’ụzọ a pụrụ ịnakwere, ọnụ ọgụgụ nke ndị Kraịst e tere mmanụ fọrọ n’elu ala na-adalata. Otú ọ dị, ruo ogologo oge ndị ahụ e tere mmanụ ndị na-emejupụta “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nọgidere na-enye nri ime mmụọ na nduzi, ndị gaje ịghọ atụrụ nwere ohere nke imere òtù ohu ahụ ihe ọma, dị nnọọ ka ‘oké ìgwè mmadụ ahụ sitere mba nile, na ebo nile, na ndị nile’ meworo.—Mkpughe 7:9, 14.

15. (a) Olee otú ọtụtụ ndị siworo gosipụta onwe ha ịbụ ndị yiri ụmụ ewu? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji zere ikwu ma mmadụ ọ̀ bụ atụrụ ma ọ bụ ewu?

15 Olee otú e siworo mesoo ụmụnna Kraịst na ọtụtụ nde atụrụ ọzọ ndị sonyeere ha dị ka otu ìgwè atụrụ? Ọ pụrụ ịbụ na ọtụtụ ndị awakpobeghị n’onwe ha ndị nnọchiteanya Kraịst, ma ọ dịbeghịkwa mgbe ha mesoro ndị ya n’ụzọ ịhụnanya. N’ịhọrọ ụwa ajọ omume, ndị ahụ yiri ụmụ ewu na-ajụ ozi Alaeze ahụ, ma ha na-anụ ya n’onwe ha ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ. (1 Jọn 2:15-17) Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ọ bụ Jisọs bụ onye a họpụtara inye mkpebi ikpe. Ọ dịghịrị anyị ikpebi ndị bụ atụrụ na ndị bụ ụmụ ewu.—Mak 2:8; Luk 5:22; Jọn 2:24, 25; Ndị Rom 14:10-12; 1 Ndị Kọrint 4:5.

Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Ìgwè nke Ọ Bụla?

16, 17. Ọdịnihu dị aṅaa ka atụrụ ahụ ga-enwe?

16 Jisọs nyere mkpebi ikpe ya banyere atụrụ ahụ, sị: “Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site na ntọala nke ụwa.” Lee aha ọkpụkpọ òkù na-ekpo ọkụ nke ahụ bụ—“Bịanụ”! Na gịnị? Ná ndụ ebighị ebi, dị ka o kwupụtara ya ná nchịkọta, sị: “Ndị ezi omume ga-aba ná ndụ ebighị ebi.”—Matiu 25:34, 46.

17 N’ilu nke talent ndị ahụ, Jisọs gosiri ihe a chọrọ n’aka ndị ga-eso ya chịa achịa n’eluigwe, ma n’ilu nke a, ọ na-egosi ihe a na-atụ anya ya n’aka ndị Alaeze ahụ ga-achị. (Matiu 25:14-23) N’ịkpọ okwu aha, n’ihi nkwado ha ji obi ha dum kwadoo ụmụnna Jisọs, atụrụ ahụ na-enweta ọnọdụ na gburugburu elu ala n’Alaeze ya. Ha ga-enwe ndụ n’elu ala paradaịs—olileanya nke Chineke kwadebeere ha “site na ntọala nke ụwa” nke ụmụ mmadụ a pụrụ ịgbapụta agbapụta.—Luk 11:50, 51.

18, 19. (a) Jisọs ga-enye mkpebi ikpe dị aṅaa banyere ụmụ ewu ahụ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ụmụ ewu ahụ agaghị eche ịta ahụhụ ebighị ebi ihu?

18 Lee ka ikpe a mara ụmụ ewu ahụ si dị iche! “Mgbe ahụ Ọ ga-asịkwa ndị nọ n’aka ekpe Ya, Pụọnụ n’ihu m, ndị a na-abụ ọnụ, gaa n’ọkụ ebighị ebi ahụ nke e doziworo nye ekwensu na ndị mmụọ ozi ya: n’ihi na agụụ gụrụ m, ma unu enyeghị m ihe M ga-eri: akpịrị kpọrọ m nkụ, ma unu ekughị mmiri nye m: abụ m ọbịa, ma unu akpọbataghị m; agbara m ọtọ, ma unu egbokwasịghị m ákwà; ahụ adịghị m ike, anọkwa m n’ụlọ mkpọrọ, ma unu eletaghị m. Mgbe ahụ ndị ahụ ga-azakwa, sị, Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ Gị ka agụụ na-agụ Gị, ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ Gị nkụ, ma ọ bụ ka Ị bụ ọbịa, ma ọ bụ ka Ị na-agba ọtọ, ma ọ bụ ka ahụ na-adịghị Gị ike, ma ọ bụ ka Ị nọ n’ụlọ mkpọrọ, ma anyị ejereghị Gị ozi? Mgbe ahụ Ọ ga-aza ha, sị, N’ezie asị m unu, Ka ọ hà, bụ otú unu na-emeghị ya nye otu onye n’ime ndị a dịkarịsịrị nta, Mụ ka unu na-emeghị ya nye.”—Matiu 25:41-45.

19 Ndị na-amụ Bible maara na nke a apụghị ịpụta na mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke ndị yiri ụmụ ewu ga-ata ahụhụ n’ime ọkụ ebighị ebi. Ee e, n’ihi na ụmụ mmadụ bụ mkpụrụ obi; ha enweghị mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. (Jenesis 2:7; Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4) Site n’ịma ụmụ ewu ahụ ikpe gaa “n’ọkụ ebighị ebi,” Onye Ikpe ahụ bu n’uche mbibi nke na-enweghị olileanya ọdịnihu, bụ́ nke ga-abụkwa ọgwụgwụ na-adịgide adịgide nye Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya. (Mkpughe 20:10, 14) N’ihi ya, Onye Ikpe nke Jehova na-esetịpụ amamikpe abụọ na-emegide ibe ha. Ọ na-agwa atụrụ ahụ, sị, “Bịanụ”; ụmụ ewu ahụ, “Pụọnụ n’ihu m.” Atụrụ ahụ ga-enweta “ndụ ebighị ebi.” Ụmụ ewu ahụ ga-anata ‘ahụhụ ebighị ebi.’—Matiu 25:46.b

Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Anyị?

20, 21. (a) Ndị Kraịst nwere ọrụ dị aṅaa dị mkpa ịrụ? (b) Nkewa dị aṅaa na-aga n’ihu ugbu a? (ch) Gịnị ga-abụ ọnọdụ ndị mmadụ mgbe ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ malitere imezu?

20 Ndị ozi anọ ahụ bụ́ ndị nụrụ nzaghachi Jisọs banyere ihe àmà nke ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a nwere ọtụtụ ihe ịtụle. Ọ ga-adị ha mkpa ịmụrụ anya na ịnọ na nche. (Matiu 24:42) Ọ ga-adịkwa ha mkpa ịrụ ọrụ ịgba àmà ahụ e hotara na Mak 13:10. Ndịàmà Jehova ji ume nile na-ekere òkè n’ọrụ ahụ taa.

21 Otú ọ dị, gịnị ka nghọta ọhụrụ a banyere ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ pụtara nye anyị? Ndị mmadụ amalitelarị isonyere akụkụ dị iche iche. Ụfọdụ nọ ‘n’ụzọ ahụ sara mbara nke na-eduje n’ịla n’iyi,’ ebe ndị ọzọ na-agbalị ịnọgide ‘n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduje ná ndụ ebighị ebi.’ (Matiu 7:13, 14) Ma oge Jisọs ga-ekwupụta mkpebi ikpe ikpeazụ banyere atụrụ na ụmụ ewu ahụ e gosiri n’ilu ahụ ka dị n’ihu. Mgbe Nwa nke mmadụ bịara n’ọkwá nke Onye Ikpe, ọ ga-ekpebi na ọtụtụ ezi ndị Kraịst—n’ezie “oké ìgwè mmadụ” nke atụrụ raara onwe ha nye—ga-eru eru ịgabiga akụkụ ikpeazụ nke ‘oké mkpagbu’ ahụ wee banye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. Olileanya ahụ kwesịrị ịbụ isi iyi nke ọṅụ ugbu a. (Mkpughe 7:9, 14) N’aka nke ọzọ, ọnụ ọgụgụ bara ụba ndị si ná “mba nile” ga-egosipụtaworị onwe ha ịbụ ndị yiri ụmụ ewu na-akpọ ekwo nkụ. Ha “ga-apụ jee baa n’ahụhụ ebighị ebi.” Lee ahụ efe ọ ga-abụrụ ụwa!

22, 23. Ebe ọ bụ na mmezu nke ilu ahụ ka dị n’ihu, n’ihi gịnị ka ọrụ nkwusa anyị taa ji dị mkpa?

22 Ọ bụ ezie na ikpe ikpe ahụ dị ka a kọwara ya n’ilu ahụ bụ n’ọdịnihu dị nso, ọbụna ugbu a ihe dị mkpa na-ewere ọnọdụ. Anyị bụ ndị Kraịst na-ekere òkè n’ọrụ na-azọpụta ndụ nke ịkpọsa ozi na-akpata nkewa n’etiti ndị mmadụ. (Matiu 10:32-39) Pọl dere, sị: “N’ihi na, Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya. Hà ga-esikwa aṅaa kpọkuo Onye ahụ ha a ka ekweghị na Ya? ma hà ga-esi aṅaa kwere n’Onye ahụ ha a ka anụghị okwu Ya? ma hà ga-esi aṅaa nụ ma onye na-ekwusa anọghị?” (Ndị Rom 10:13, 14) Ozi ihu ọha anyị na-eji aha Chineke na ozi nzọpụta ya erute ndị mmadụ n’ihe karịrị 230 ala. Ụmụnna Kraịst e tere mmanụ ka na-ebutekwa ụzọ n’ọrụ a. Ihe dị ka nde ise nke atụrụ ọzọ ahụ esonyewokwara ha ugbu a. Ndị mmadụ gburugburu ụwa na-aṅakwa ntị n’ozi ahụ ụmụnna Jisọs na-akpọsa.

23 A na-ekpughe ọtụtụ ndị nye ozi anyị ka anyị na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma ọ bụ na mberede. Ndị ọzọ pụrụ ịnụ banyere Ndịàmà Jehova na ihe ndị anyị na-ekwusa n’ụzọ ndị anyị na-amaghị. Mgbe oge ikpe ruru, ruo n’ókè ha aṅaa ka Jisọs ga-atụleru ibu ọrụ e nwekọrọ ọnụ na iru eru nke ezinụlọ? Anyị apụghị ikwu, ọ baghịkwa uru ịkọ nkọ. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 7:14.) Ọtụtụ ndị ugbu a na-ama ụma leghara anya, kwaa emo, ma ọ bụ kere òkè ná mkpagbu pụtara ìhè nke ndị Chineke. N’ihi ya, ugbu a bụ oge dị oké mkpa; ndị dị otú ahụ pụrụ ịdị na-aghọ ndị Jisọs ga-ama ikpe dị ka ụmụ ewu.—Matiu 10:22; Jọn 15:20; 16:2, 3; Ndị Rom 2:5, 6.

24. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka ndị mmadụ n’otu n’otu zaghachi n’ụzọ dị mma? (b) Ọmụmụ ihe a enyeworo gị aka n’onwe gị inwe àgwà dị aṅaa n’ebe ozi gị dị?

24 Otú ọ dị, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọtụtụ ndị na-aṅa ntị, mụọ Okwu Chineke, ma ghọọ Ndịàmà nke Jehova. Ụfọdụ ndị yiri ụmụ ewu ugbu a pụrụ ịgbanwe ma ghọọ ndị yiri atụrụ. Ihe dị mkpa bụ na ndị na-aṅa ntị ma na-akwado ihe fọdụrụ n’ime ụmụnna Kraịst n’ụzọ pụtara ìhè si otú a ugbu a na-enye ihe àmà nke ga-abụ ebe mgbakwasị ụkwụ iji debe ha n’aka nri Jisọs mgbe ọ ga-anọdụ ala n’ocheeze ya inye mkpebi ikpe. A na-agọzi ndị a, a ga-anọgidekwa na-agọzi ha. Ya mere, ilu a kwesịrị ịkpali anyị ịrụ ọrụ ịnụ ọkụ n’obi ka ukwuu n’ozi ndị Kraịst. Tupu oge agafee, anyị chọrọ ime ihe nile anyị pụrụ ime iji kpọsaa ozi ọma Alaeze ahụ wee si n’ụzọ dị otú ahụ nye ndị ọzọ ohere ịṅa ntị. Ọ dịziiri Jisọs inye mkpebi ikpe, nke ịma ikpe ma ọ bụ nke dị mma.—Matiu 25:46.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee Ụlọ Nche nke February 15, 1994, peji nke 16-21.

b Akwụkwọ bụ́ El Evangelio de Mateo na-ekwu, sị: “Ndụ ebighị ebi bụ ndụ na-enweghị mgbanwe; ihe megidere ya bụ ntaramahụhụ na-enweghị mgbanwe. Nkọwaaha Grik bụ́ aionios n’ụzọ bụ isi adịghị egosi ogologo oge, kama ọdịdị. Ntaramahụhụ ahụ na-enweghị mgbanwe bụ ọnwụ ebighị ebi.”—Onye prọfesọ laworo ezumike nká, bụ́ Juan Mateos (Pontifical Biblical Institute, Rome) na Professor Fernando Camacho (Theological Center, Seville), Madrid, Spain, 1981.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Myirịta ndị dị aṅaa nke dị n’agbata Matiu 24:29-31 na Matiu 25:31-33 na-egosi na ilu nke atụrụ na ụmụ ewu ahụ nwere mmezu ọdịnihu, ọ̀ bụkwa olee mgbe?

◻ Olee ndị bụ “ndị dịkarịsịrị nta” n’ime ụmụnna Jisọs?

◻ Olee otú ojiji Jisọs ji okwu bụ́ “ndị ezi omume” mee ihe si enyere anyị aka ịmata ndị ndị a na-anọchite anya ha na ndị ha na-adịghị anọchite anya ha?

◻ Ọ bụ ezie na ilu ahụ ga-emezu n’ọdịnihu, n’ihi gịnị ka ọrụ nkwusa anyị ji dị mkpa ma dị ngwa ugbu a?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 24]

RỊBA AMA MYIRỊTA NDỊ AHỤ

Matiu 24:29-31 Matiu 25:31-33

Mgbe mkpagbu ukwuu ahụ malitesịrị, Nwa nke mmadụ abịa

Nwa nke mmadụ abịa

Abịa n’oké ebube Abịa n’ebube ma nọkwasị

n’ocheeze ya nke ebube

Ya na ndị mmụọ ozi anọrọ Ndị mmụọ ozi esoro ya bịa

Ebo nile nke ụwa ahụ ya Mba nile ezukọọ; e kpee ụmụ

ewu ikpe n’ikpeazụ

(mkpagbu ukwu ahụ akwụsị)

[Ebe E Si Nweta Foto]

Garo Nalbandian

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya