Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 29 p. 181-p. 185 para. 2
  • Ọdịdị Ụda Olu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọdịdị Ụda Olu
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Kwuru Okwu n’Ụzọ Doro Anya
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Kpachara Anya Maka “Olu Ndị Bịara Abịa”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • “Nkwekọ Ụda Olu nke Na-adabakọ n’Oge Magburu Onwe Ya”
    Teta!—1997
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 29 p. 181-p. 185 para. 2

IHE ỌMỤMỤ NKE 29

Ọdịdị Ụda Olu

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Mee ka ụda olu gị ka mma, ọ bụghị site n’iṅomi onye ọzọ, kama site n’iku ume n’ụzọ kwesịrị ekwesị na ime ka uru ahụ́ gị ghara ikwedo ekwedo.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Ọdịdị ụda olu dị mma na-enyere ndị ọzọ aka inwe ahụ́ iru ala na iji obi ụtọ na-ege gị ntị. Ọdịdị ụda olu na-adịghị mma na-egbochi nzirịta ozi, ọ pụkwara ime ka ike gwụ ma ọkà okwu ma ndị na-ege ntị.

Ọ BỤGHỊ nanị ihe e kwuru kamakwa otú e si kwuo ya na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ ndị mmadụ. Ọ bụrụ na onye na-agwa gị okwu nwere ụda olu dị ụtọ, nke ịhụnanya, nke enyi, na nke obiọma, ọ́ bụghị eziokwu na ị ga-enwe mmasị ige ya ntị karịa otú ị ga-esi ege ma ọ bụrụ na ụda olu ya adịghị egosi ịhụnanya ma ọ bụ na-ada ike ike?

Ịzụlite ọdịdị ụda olu dị mma abụghị nanị okwu metụtara otú e si emepụta ụda olu. Ọ pụkwara imetụta ụdị onye mmadụ bụ. Ka mmadụ na-enwekwu ihe ọmụma ma na-etinye eziokwu Bible n’ọrụ, a na-ahụ mgbanwe n’otú o si ekwu okwu. Ụda olu ya na-egosipụta àgwà nsọpụrụ Chineke ndị dị ka ịhụnanya, ọṅụ, na obiọma. (Gal. 5:22, 23) Mgbe o nwere ezi nchegbu banyere ndị ọzọ, ọ na-apụta ìhè n’ụda olu ya. Mgbe obi ekele nọchiri mmụọ ime mkpesa mgbe nile, ma okwu ọ na-ekwu ma ụda olu ya na-egosipụta ya. (Abụ Ákwá 3:39-42; 1 Tim. 1:12; Jud 16) Ọbụna mgbe ị na-adịghị aghọta asụsụ a na-asụ, ọ bụrụ na mmadụ na-ekwu okwu n’ụzọ na-egosi na ọ dị nganga, na ọ dịghị anabata echiche nke ndị ọzọ, na ọ na-eme nkatọ, ma nwee obi ọjọọ, onye ọzọ ana-ekwukwa okwu n’ụzọ na-egosi na ọ dị umeala n’obi, na o nwere ndidi, nwee obiọma, ma na-ahụ n’anya, ọ gaghị esiri gị ike ịhụ ihe dị iche.

N’ọnọdụ ụfọdụ ọdịdị ụda olu na-adịghị mma pụrụ ịbụ n’ihi ọrịa nke mebiri nkọlọ mmadụ ma ọ bụ nkwarụ e ketara eketa. Nsogbu ndị dị otú ahụ pụrụ ịdị nnọọ njọ nke na a gaghị edozicha ha kpam kpam n’ime usoro ihe a. Otú ọ dị, dị ka ọ na-adịkarị, ịmụta ụzọ isi jiri akụkụ ahụ́ ndị na-enye aka n’ikwu okwu eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị pụrụ ime ka ọ ka mma.

Ná mmalite ọ dị mkpa ịghọta na ọdịdị ụda olu ndị mmadụ na-adị iche iche. Ebumnobi gị ekwesịghị ịbụ ịzụlite ụda olu nke yiri nke onye ọzọ. Kama nke ahụ, zụlite ikike ụda olu nke gị, nakwa ọdịdị ya dị nnọọ iche. Gịnị pụrụ inyere gị aka ime nke a? E nwere isi ihe abụọ dị mkpa.

Chịkwaa Otú I Si Eku Ume n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị. Iji jiri ụda olu gị mee ihe n’ụzọ kasị mma, ọ dị gị mkpa ikute ume nke ọma na ịchịkwa otú i si eku ume n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ma i meghị ha, ụda olu gị pụrụ ịbụ nke na-adịghị ike, okwu gị nwekwara ike ịdị na-akwụsị n’ike.

Akụkụ kasị buo ibu n’akpa ume abụghị n’elu elu obi; ebe a na-eyi nanị ka o buru ibu karị n’ihi ọkpụkpụ ndị di n’ubu. Kama ịbụ ebe ahụ, akpa ume sakarịsịrị mbara kpọmkwem n’elu uru ahụ́ nke kewara obi na akpakpuru. N’ịbụ nke e jikọtara ya na ngụgụ ndị dị n’ala ala, uru ahụ́ ahụ na-ekewa obi na akpakpuru.

Ọ bụrụ na ọ bụ nanị mpaghara elu elu nke akpa ume gị ka ị na-ekuju ume ma i kuo ume, n’oge na-adịghị anya ị gaghị enwekwa ume. Ụda olu gị agaghị adị ike, ike ga-agwụkwa gị ngwa ngwa. Iji na-ekute ume nke ọma, ọ dị mkpa ka ị nọrọ ọdụ ma ọ bụ guzoro kwem ma welaa ubu gị azụ. Na-etinyesi mgbalị ike izere ịgbasa nanị mpaghara elu elu nke obi gị mgbe i kuuru ume iji kwuo okwu. Buru ụzọ kujuo ume ná mpaghara ala ala nke akpa ume gị. Mgbe akụkụ a juru, mpaghara ala ala nke ngụgụ gị ga-agbasa. N’otu oge ahụ, uru ahụ́ ahụ na-ekewa obi na akpakpuru ga-agbadata, jiri nwayọọ nudatụ akpakpuru na eriri afọ gị nke ga-eme ka ájị i kere ma ọ bụ ihe ọzọ i yi n’elu afọ gị jidekwuo gị ejide. Ma akpa ume gị adịghị ebe ahụ; ngụgụ gị kpuchigidere ya. Iji chọpụta n’onwe gị, tụkwasị otu aka n’akụkụ nke ọ bụla nke mpaghara ala ala nke ngụgụ gị. Ugbu a kumie ume. Ọ bụrụ na ị na-eku ume nke ọma, afọ gị agaghị na-abakpu ime, ubu gị ana-alakwa elu. Kama nke ahụ, ị ga-achọpụta na ngụgụ gị na-alatụ elu, na-enupụtakwa enupụta.

Ọzọ, rụọ ọrụ n’ikupụta ume. Ekwela ka ikuku ahụ laa n’iyi site n’ikupụ ya ngwa ngwa. Jiri nwayọọ nwayọọ kupụ ya. Anwala ịchịkwa ya site n’ịkpachi akpịrị gị. N’oge na-adịghị anya nke a ga-akpata inwe olu gbakara agbaka ma ọ bụ nke na-ada elu elu gabiga ókè. Ndado nke uru ahụ́ nke afọ gị na uru ahụ́ dị n’agbata ngụgụ gị na-adado ya na-eme ka ikuku ahụ pụọ, ebe uru ahụ́ ahụ na-ekewa obi na akpakpuru na-achịkwa otú a ga-ekupuru ya ọsọ ọsọ.

Ihe osise ndị dị na peeji nke 183

Dị nnọọ ka onye na-agba ọsọ si anata ọzụzụ iji gbaa ọsọ, otú a ka ọkà okwu pụrụ isi mụta ịchịkwa iku ume ya otú kwesịrị ekwesị site n’ịmụ ya amụ. Guzoro ọtọ ma welaa ubu gị azụ, kujuo ume ná mpaghara ala ala nke akpa ume gị, jirikwa nwayọọ na-ekupụ ya ka i ji nwayọọ nwayọọ na-agụ otu, abụọ, ruo ókè ị pụrụ ịgụru n’otu nku ume. Mgbe ahụ mụgharịa ịgụpụta ihe agụpụta ka ị nọkwa na-eku ume otú ahụ.

Mee Ka Uru Ahụ́ Ndị Kwedoro Ekwedo Ghara Ikwedokwa Ekwedo. Ihe ọzọ dị mkpa iji nwee ọdịdị ụda olu dị mma bụ nke a—tụsara ahụ́! Ọ na-eju anya n’ezie ịhụ ọganihu ị pụrụ inwe site n’ịmụta ịtụsara ahụ́ mgbe ị na-ekwu okwu. Obi na ahụ́ aghaghị iru mmadụ ala, n’ihi na obi erughị ala na-eme ka uru ahụ́ kwedo ekwedo.

Mee ka obi ruo gị ala site n’inwe echiche ziri ezi banyere ndị na-ege gị ntị. Ọ bụrụ na ndị a bụ ndị ị na-ezute n’ozi ubi, cheta na ọ bụrụgodị na ọ bụ nanị ọnwa ole na ole ka ị mụworo Bible, ọ dị ihe ndị bara uru ị maara banyere nzube Jehova bụ́ ndị ị pụrụ iso ha kerịta. Ị na-akpọtụkwara ha n’ihi na enyemaka dị ha mkpa, ma hà maara ma ọ bụ na ha amaghị. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ị na-ekwu okwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ihe ka ukwuu ná ndị na-ege gị ntị bụ ndị Jehova. Ha bụ ndị enyi gị, ha chọkwara ka i nwee ihe ịga nke ọma. Ọ dịghị ndị ọ bụla n’ụwa na-enwe ụdị ndị na-ege ntị dị otú ahụ, bụ́ ndị nwere omume enyi ma na-ahụ n’anya otú anyị na-enwe mgbe nile.

Mee ka uru ahụ́ ndị dị n’akpịrị gị ghara ikwedo ekwedo site n’itinye uche gị n’uru ahụ́ ndị ahụ na ilezi anya na-eme ka ikwedo ekwedo ha belata. Cheta na akwara ụda olu gị na-ama jijiji mgbe ikuku gafeere n’akụkụ ha. Ụda olu na-agbanwe mgbe uru ahụ́ ndị dị n’akpịrị kwedosikwuru ike ma ọ bụ ghara ikwedo ekwedo, dị nnọọ ka ụda nke ụbọ akwara si agbanwe mgbe e kwesikwuru ya ike ma ọ bụ tọghekwuo ya. Mgbe i mere ka akwara ụda olu gị ghara ikwedo ekwedo, ụda olu gị na-adalata. Ime ka uru ahụ́ ndị dị n’akpịrị ghara ikwedo ekwedo na-enyekwa aka ime ka oghere nke pụtara n’imi ghere oghe, nke a ga-enwekwa mmetụta kpọmkwem n’ọdịdị ụda olu gị.

Mee ka ahụ́ dum ruo gị ala—ikpere gị, aka gị, ubu gị, olu gị. Nke a ga-eme ka ụda olu gị pụtakwuo bụ́ nke dị mkpa iji mee ka olu gị nwee ike ịgate aka. Ụda olu na-apụtakwu mgbe ahụ́ gị dum yiri ibé osisi na-ewepụtakwu ụda, ma ahụ́ erughị ala na-egbochi nke a. Ụda olu, bụ́ nke a na-emepụta na nkọlọ, na-adarucha ọ bụghị nanị n’oghere imi kamakwa n’ọkpụkpụ obi, ezé, okpo ọnụ, na oghere ndị si n’okpokoro isi pụta n’imi. Ihe a nile pụrụ ịtụnye ụtụ n’otú ụda olu si adapụta. Ọ bụrụ na ị tụkwasị ihe dị arọ́ n’ibé osisi na-ewepụta ụda ụbọ akwara, ụda ya agaghị na-adapụta adapụta; ibé osisi ahụ aghaghị ịnọrọ onwe ya ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka ụda na-adapụta otú kwesịrịnụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa ọkpụkpụ ndị dị anyị n’ahụ́, bụ́ ndị uru ahụ́ jidesiri ike. Mgbe ụda olu na-adapụta adapụta ị ga-enwe ike ịgbanwe olu gị otú kwesịrị ekwesị ma gosipụta ụdị mmetụta dị iche iche. Ị ga-enwe ike ịgwa ìgwè mmadụ buru ibu okwu n’adọgbughị onwe gị.

OTÚ E SI EMEPỤTA OKWU

Isi ihe na-eme ka ụda okwu nile pụta bụ ikuku ị na-esi n’akpa ume gị ekupụta. Akpa ume na-arụ ọrụ dị ka ékò nke na-esi n’opi ikuku afụnye ikuku na nkọlọ, ma ọ bụ igbe okwu, nke dị n’etiti akpịrị gị. N’ime igbe okwu gị, e nwere n’akụkụ ya abụọ, ntakịrị uru ahụ́ abụọ a na-akpọ akwara ụda olu. Ọ bụ ha bụ isi ihe na-emepụta ụda. Uru ahụ́ ndị a na-emeghe ma na-emechi oghere ahụ ikuku na-esi abanye na nkọlọ iji kwe ka ikuku banye na iji gbochie ihe ndị a na-achọghị ka ha ghara ịbanye n’akpa ume. Mgbe a na-eku ume nkịtị, a naghị emepụta ụda ọ bụla mgbe ikuku na-agafere akwara ụda olu ndị ahụ. Ma mgbe mmadụ chọrọ ikwu okwu, uru ahụ́ na-eme ka akwara ụda olu ndị ahụ kwedosie ike, ha na-amakwa jijiji ka e ji ike na-eme ka ikuku nke si n’akpa ume na-agafere ha. Nke a na-eme ka e nwee ụda.

Ọ bụrụ na e kwedosikwuo akwara ụda olu ndị ahụ ike, ha ga na-ama jijiji ngwa ngwa karị, ụda ha na-emepụta ga-adịkwa elu karị. N’aka nke ọzọ, ruo n’ókè akwara ndị ahụ na-ekwedoghị ekwedo, otú a ka ụda olu ga-adịru ala. Mgbe ọ gafesịrị nkọlọ, ụda ahụ na-abanye n’akụkụ elu elu nke akpịrị, nke a na-akpọ nwa nkọlọ. Ọ na-abanyezi n’ọnụ na n’oghere imi. N’ebe ahụ, a na-agbakwụnye ụmụ obere ụda bụ́ ndị na-agbanwetụ ụda ahụ bụ́ isi ma mee ka ọ na-adasikwu ike. Okpo ọnụ nakwa ire, ezé, egbugbere ọnụ, na agbà na-ejikọ aka kewasịa ụda ahụ, bụ́ nke na-adapụta dị ka okwu a pụrụ ịghọta aghọta.

Ụda olu mmadụ bụ ihe ịtụnanya, nke na-enweghị ngwá ọrụ mmadụ mere ya na ya hà n’iji ya eme ụdị ihe dị iche iche. A pụrụ iji ya gosipụta ụdị mmetụta dị iche iche malite n’ịhụnanya dị nro ruo n’oké ịkpọasị obi ọjọọ. Mgbe a mụtara iji ya eme ihe ma zụọ ya nke ọma, ụda olu pụrụ inwe ihe ruru ụdị ìgwè ụda atọ, a pụkwara iji ya ọ bụghị nanị gụọ egwú mara mma kamakwa kwuo okwu n’ụzọ na-akpali akpali.

IMERI IHE ISI IKE ỤFỌDỤ KPỌMKWEM

Ụda olu na-adịghị ike. Ụda olu dị nro abụkebeghị ụda olu na-adịghị ike. Ọ bụrụ na o nwere ọtụtụ ụmụ obere ụda ndị dị ụtọ, ndị ọzọ pụrụ inwe obi ụtọ ịdị na-anụ ya. Ma iji dị irè, ụda olu aghaghị ịdasi ụda ike otú kwesịrịnụ.

Iji mee ka ụda olu gị na-agatekwu aka, ọ dị gị mkpa ime ka ọ na-adapụtakwu. Nke ahụ na-achọ ịmụta ime ka ahụ́ dum ruo gị ala, dị ka e si kọwaa ya n’ihe ọmụmụ a. Ilezi anya na-eme ka ahụ́ ruo gị ala nakwa ịdị na-agụ egwú n’emepeghị ọnụ pụrụ inye aka. Egbugbere ọnụ kwesịrị ịdị na-emetụ ibe ha nanị ntakịrị ntakịrị, ọ bụghị imetụsi ya ike. Ka ị na-agụ egwú n’emepeghị ọnụ, nwee mmetụta nke ịma jijiji n’isi gị na n’obi gị.

Mgbe ụfọdụ, ụda olu mmadụ pụrụ ịbụ nke na-adịghị ike ma ọ bụ nke gbakara agbaka n’ihi na ahụ́ adịghị ya ma ọ bụ na o highị ụra nke ọma. O doro anya na ọ bụrụ na ọnọdụ ahụ aka mma, ụda olu ya ga-adịkwu mma.

Ụda olu nke dị oké elu. Akwara ụda olu ikwedosikwu ike na-eme ka ọdịdị ụda olu dị elu. Ụda olu gbakara agbaka na-eme ka ahụ́ ghara iru ndị na-ege ntị ala. Site n’ime ka uru ahụ́ ndị dị n’akpịrị ghara ikwedo ekwedo iji belata nkwedosi ike nke akwara ụda olu, ị pụrụ iwetulata ọdịdị ụda olu ahụ. Mara ụma na-eme ya, na-eme ya ná mkparịta ụka ị na-enwe kwa ụbọchị. Iku ume nke ọma na-enyekwa aka.

Ụda olu nke na-ada n’imi n’imi. Ihe na-akpata nsogbu a mgbe ụfọdụ bụ imi nsụchi, ma ọ naghị abụ ya mgbe nile. Mgbe ụfọdụ site n’ime ka uru ahụ́ ndị dị n’akpịrị na n’ọnụ kwedo ekwedo, mmadụ na-emechi oghere pụtara n’imi nke ga-eme na ikuku agaghị enwe ike ịdị na-agafe na ya n’enweghị ihe mgbochi. Nke a na-akpata ikwu n’imi n’imi. Iji zere nke a, ọ dị mkpa inwe ahụ́ iru ala.

Ụda olu dị ike. Ụda olu dị otú ahụ adịghị eme ka e nwee nkwurịta okwu enyi na enyi. Ọ pụrụ ime ka ndị ọzọ jikere maka ịgwa ha okwu ọjọọ.

Mgbe ụfọdụ, otu ihe dị mkpa bụ ịnọgide na-eme mgbalị ịgbanwe ụdị onye mmadụ bụ. (Kọl. 3:8, 12) Ọ bụrụ na e meela nke ahụ, itinye ụkpụrụ ndị metụtara imepụta ụda olu n’ọrụ pụrụ inye aka. Mee ka ma akpịrị ma agbà gị nwee ntụsara ahụ́. Nke a ga-eme ka olu gị dị ụtọ karị, ọ ga-egbochikwa imebi ya site n’ime ka o si n’ezé gị na-agafere.

ỤZỌ ISI MEZIWANYE IHE

  • Zụlite àgwà Onye Kraịst.

  • Mụgharịa iku ume otú kwesịrị ekwesị, na-ekuju ume ná mpaghara ala ala nke akpa ume gị.

  • Mgbe ị na-ekwu okwu, mee ka uru ahụ́ gị ghara ikwedo ekwedo—akpịrị gị, olu gị, ubu gị, ahụ́ gị dum.

IHE OMUME: (1) Were minit ole na ole kwa ụbọchị ruo otu izu mụgharịa iku ume n’ụzọ nke na ị na-ekuju ume ná mpaghara ala ala nke akpa ume gị. (2) Ọ dịkarịa ala otu ugboro kwa ụbọchị ruo otu izu, mara ụma na-eme ka uru ahụ́ ndị dị n’akpịrị gị ghara ikwedo ekwedo mgbe ị na-ekwu okwu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya