Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp17 nke 5 p. 5
  • Ì Nwere Mmụọ Ozi Na-eche Gị Nche?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Nwere Mmụọ Ozi Na-eche Gị Nche?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ì Nwere Mmụọ Ozi Na-eche Gị Nche?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ozi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ndị Mmụọ Ozi Otú Ha Si Emetụta Ndụ Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Otú Ndị Mmụọ Ozi Pụrụ Isi Nyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
wp17 nke 5 p. 5

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | NDỊ MMỤỌ OZI HÀ DỊ ADỊ N’EZIOKWU?

Ì Nwere Mmụọ Ozi Na-eche Gị Nche?

Baịbụl anaghị akụzi na onye ọ bụla nwere mmụọ ozi na-eche ya nche. Ma, e nwere mgbe Jizọs sịrị: “Hụnụ na unu eledaghị otu n’ime ndị a dị nta [ya bụ, ndị na-eso ụzọ Kraịst] anya, n’ihi na ana m asị unu na ndị mmụọ ozi ha ndị nọ n’eluigwe na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe mgbe niile.” (Matiu 18:10) Ihe a o kwuru apụtaghị na onye ọ bụla nwere mmụọ ozi na-eche ya nche. Kama, ihe Jizọs na-ekwu bụ na ndị mmụọ ozi nwere mmasị n’ebe onye ọ bụla n’ime ndị na-eso ụzọ ya nọ. N’ihi ya, ndị na-efe Chineke otú ọ chọrọ anaghị eme ihe ga-emerụ ha ahụ́ ma ọ bụ ihe ga-ata isi ha, na-eche na ndị mmụọ ozi Chineke ga-echebe ha.

Ọ̀ pụtara na ndị mmụọ ozi anaghị enyere ndị mmadụ aka? Mba. (Abụ Ọma 91:11) Ụfọdụ ndị kwetasiri ike na Chineke ejitụla ndị mmụọ ozi ya chebe ha ma ọ bụ duzie ha. Kenneth anyị kwuru gbasara ya ná mbido Ụlọ Nche a bụ otu n’ime ha. Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị asịrịrị na ọ bụ ndị mmụọ ozi mere ka Kenneth kpọọ nwaanyị ahụ n’ekwentị, ma ihe o kwuru nwere ike ịbụ eziokwu. Ndịàmà Jehova na-ahụkarị ihe gosiri na ndị mmụọ ozi na-enyere ha aka mgbe ha na-ekwusa ozi ọma. Ma, ebe ọ bụ na anyị anaghị ahụ ndị mmụọ ozi anya, anyị agaghị ekwuli ihe niile banyere otú Chineke si eji ha enyere ndị mmadụ aka n’ihe dị iche iche. N’ihi ya, ọ gaghị adị njọ ma anyị kelee Onye Pụrụ Ime Ihe Niile maka otú ọ bụla o si nyere anyị aka.​—⁠Ndị Kọlọsi 3:15; Jems 1:​17, 18.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya