Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 4/1 p. 16-21
  • “Toonụ Ja”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Toonụ Ja”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Lee Eze Mesaịa Ahụ!
  • Olee Otú “Ọgwụgwụ Ihe Nile” ahụ Ga-esi Abịa?
  • Oge Inye Ja Otuto
  • Toonụ Jaa Maka Ikpe Ya Nile!
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Nye Eze nke Mgbe Ebighị Ebi Otuto!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Mgbapụta Ná Mkpughe Nke Jisọs Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Olee Mgbe Mbibi Ụwa E Buru Amụma Ya Ga-abịa?
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 4/1 p. 16-21

“Toonụ Ja”

“Ka ihe ọ bụla nke na-eku ume too Ja.”—ABỤ ỌMA 150:6.

1, 2. (a) Ruo n’ókè hà aṅaa ka ezi Iso Ụzọ Kraịst baruru ụba na narị afọ mbụ? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka ndị ozi ahụ nyewororị? (ch) Olee otú ndapụ n’ezi ofufe si malite?

JISỌS haziri ndị na-eso ụzọ ya ịghọ ọgbakọ ndị Kraịst, nke bara ụba na narị afọ mbụ. N’agbanyeghị mmegide okpukpe dị ilu, ‘ozi ọma ahụ bụ nke e kwusara n’etiti ihe nile e kere eke nke dị n’okpuru eluigwe.’ (Ndị Kọlọsi 1:23) Ma mgbe ọnwụ nke ndị ozi Jisọs Kraịst gasịrị, Setan jiri aghụghọ kpalie ndapụ n’ezi ofufe.

2 Ndị ozi ahụ ebuworị ụzọ nye ịdọ aka ná ntị banyere nke a. Dị ka ihe atụ, Pọl gwara ndị okenye sitere Efesọs, sị: “[Na-elezinụ, NW] onwe unu na ìgwè atụrụ nta nile, nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị na-elekọta ya anya n’etiti ya, ka unu na-azụ nzukọ Chineke dị ka atụrụ, nke O ji ọbara nke [Ọkpara, NW] Ya onwe ya zụtara Onwe ya. Mụ onwe m matara na mgbe m lasịrị agụ jọgburu onwe ha ga-aba n’etiti unu, ghara imere ìgwè atụrụ ebere; ndị ikom ga-esitekwa n’etiti unu onwe unu bilie, na-ekwu ihe dị iche iche na-eduhie mmadụ ụzọ, ka ha dọpụ ndị na-eso ụzọ Jisọs iso ha n’azụ.” (Ọrụ 20:28-30; leekwa 2 Pita 2:1-3; 1 Jọn 2:18, 19.) Ya mere, na narị afọ nke anọ, Iso Ụzọ Kraịst dapụrụ n’ezi ofufe na Alaeze Ukwu Rom malitere imekọ ihe ọnụ. Narị afọ ole na ole n’ihu, Alaeze Ukwu Rom Dị Nsọ, n’isoro popu nke Rom jikọta aka, malitere ịchị akụkụ dị ukwuu nke ihe a kpọrọ mmadụ. Mgbe oge na-aga, Mgbanwe Ndị Protestant nupụrụ isi megide ajọ imebiga ihe ókè nke Chọọchị Katọlik, ma o weghachighị ezi Iso Ụzọ Kraịst.

3. (a) Olee mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka e si kwusaara ihe nile e kere eke ozi ọma ahụ? (b) Atụmanya ndị dị aṅaa dabeere na Bible ka e mezuru na 1914?

3 N’agbanyeghị nke a, ka ngwụsị nke narị afọ nke 19 na-eru nso, otu ìgwè nke ndị mmụta Bible nwere obi eziokwu maliteghachikwara ọrụ ịdị na-ekwusa na ịgbasara ‘ihe nile e kere eke n’okpuru eluigwe olileanya nke ozi ọma ahụ.’ Ná ndabere nke ọmụmụ ha mụrụ amụma Bible, ìgwè a tụrụ aka n’ihu ihe karịrị 30 afọ gaa n’afọ 1914 dị ka nke na-aka akara ọgwụgwụ nke “oge nke mba ọzọ,” “oge asaa,” ma ọ bụ 2,520 afọ, nke malitere ná mbibi nke Jerusalem na 607 T.O.A. (Luk 21:24; Daniel 4:16) Ná mmezu nke ihe ndị a tụrụ anya ha, 1914 ghọrọ oge e nwere oké mgbanwe n’ihe omume mmadụ n’elu ụwa. Ihe ndị dị oké mkpa werekwaara ọnọdụ n’eluigwe. Ọ bụ n’oge ahụ ka Eze nke mgbe ebighị ebi mere ka onye ya na ya na-abụkọ Eze, bụ́ Jisọs Kraịst, nọkwasị n’ocheeze eluigwe, ná nkwadebe maka ịzachapụ ajọ ihe nile n’elu ụwa nke a na iguzobeghachi Paradaịs.—Abụ Ọma 2:6, 8, 9; 110:1, 2, 5.

Lee Eze Mesaịa Ahụ!

4. Olee otú Jisọs si mee ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ihe aha ya bụ́ Maịkael pụtara?

4 Na 1914 Eze Mesaịa nke a, bụ́ Jisọs, malitere ọrụ. Na Bible a kpọkwara ya Maịkael, nke pụtara “Ònye Dị Ka Chineke?,” n’ihi na o zubere iwepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta. Dị ka e dekọrọ ná Mkpughe 12:7-12, Jọn onyeozi kọwara n’ọhụụ ihe gaje imenụ: “Agha wee pụta n’eluigwe: Maịkael na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide dragọn ahụ; dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya wee buo agha; ha enweghịkwa ike, a hụghịkwa ọnọdụ ha ọzọ n’eluigwe. E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdakwa ndị mmụọ ozi ya, ha na ya.” Ọdịda dị ukwuu n’ezie!

5, 6. (a) Ka 1914 gasịrị, nkwupụta okwu dị aṅaa na-akpali akpali ka e mere site n’eluigwe? (b) Olee otú Matiu 24:3-13 si kwekọọ na nke a?

5 Olu dara oké ụda n’eluigwe ekwupụtazie, sị: “Ugbu a ka ọ bịaworo, bụ́ nzọpụta ahụ, na ike ahụ, na alaeze Chineke anyị, na ịchịisi nke Kraịst Ya: n’ihi na a chụdara onye ahụ nke na-ebo ụmụnna anyị ebubo, onye na-ebo ha ebubo n’ihu Chineke anyị ehihie na abalị. Ndị ahụ [ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi] wee merie ya n’ihi ọbara Nwa atụrụ ahụ [Jisọs Kraịst], na n’ihi okwu àmà ha; ha ahụghịkwa ndụ ha n’anya ruo ọnwụ.” Nke a pụtara mgbapụta nye ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe, bụ́ ndị nweworo okwukwe n’àjà mgbapụta dị oké ọnụ ahịa nke Jisọs.—Ilu 10:2; 2 Pita 2:9.

6 Olu ahụ dara ụda n’eluigwe gara n’ihu ikwu, sị: “N’ihi nke a, ka obi na-atọ unu ụtọ, unu eluigwe nile, na unu ndị bi n’ime ha. Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” “Ahụhụ” ahụ e si otú a buo amụma ya maka ụwa a apụtawo ìhè n’agha ụwa ndị ahụ, ụnwụ nri, ọrịa na-efe efe, ala ọma jijiji, na mmebi iwu nke tiworo ụwa ihe otiti na narị afọ a. Dị ka Matiu 24:3-13 na-akọ, Jisọs buru amụma na ihe ndị a ga-abụ akụkụ nke ‘ihe ịrịba ama nke ọgwụgwụ oge a.’ Ná mmezu amụma, kemgbe 1914 ihe a kpọrọ mmadụ atawo ahụhụ na-enweghị atụ n’akụkọ ihe mere eme nile gara aga nke mmadụ n’ụwa.

7. N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji eji ịdị ngwa eme nkwusa?

7 N’ọgbọ a nke ahụhụ Setan, ihe a kpọrọ mmadụ ọ pụrụ ịchọta olileanya maka ọdịnihu? Eenụ, n’ihi na Matiu 12:21 na-ekwu banyere Jisọs, sị: “Ọ bụkwa n’aha Ya ka mba nile ga-atụkwasị obi”! Ọnọdụ nhụjuanya ndị dị n’etiti mba nile na-aka akara ọ bụghị nanị ‘ihe ịrịba ama nke ọgwụgwụ oge a’ kamakwa ‘ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Jisọs’ dị ka Eze eluigwe nke Alaeze Mesaịa ahụ. Banyere Alaeze ahụ, Jisọs gara n’ihu na-asị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Olee otu ndị n’elu ụwa taa na-ekwusa olileanya dị ebube nke ọchịchị Alaeze Chineke? Ndịàmà Jehova! N’ịdị ngwa, ha na-akpọsa n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ na Alaeze Chineke nke ezi omume na udo agaala iweghara ihe omume nke ụwa. Ị̀ na-ekere òkè n’ozi a? Ị pụghị inwe ihe ùgwù karịrị nke ahụ!—2 Timoti 4:2, 5.

Olee Otú “Ọgwụgwụ Ihe Nile” ahụ Ga-esi Abịa?

8, 9. (a) Olee otú ikpe si malite “n’ụlọ Chineke”? (b) Olee otú Krisendọm siworo mebie Okwu Chineke?

8 Ihe a kpọrọ mmadụ abanyela n’oge ikpe. A na-agwa anyị na 1 Pita 4:17 na ikpe malitere “n’ụlọ Chineke”—ikpe nke ndị sịrị na ha bụ nzukọ nke ndị Kraịst nke o doro anya na ọ nọwo na-aga n’ihu kemgbe “mgbe ikpeazụ” ahụ malitere site n’ogbugbu e gburu ndị mmadụ n’Agha Ụwa Mbụ n’oge 1914-1918. Olee otú ihe siworo gaara Krisendọm n’ikpe a? Ọ dị mma, tụlee nguzo nke chọọchị dị iche iche n’ịkwado agha dị iche iche kemgbe 1914. Ọ̀ bụ na e jiribeghị “ọbara nke mkpụrụ obi nke ndị ogbenye na-emeghị ihe ọjọọ” ndị ha rabanyere n’ọgbọ agha metọọ ndị ụkọchukwu?—Jeremaịa 2:34.

9 Dị ka Matiu 26:52 si kwuo, Jisọs kwuru, sị: “Mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” Lee ka nke a siworo bụrụ eziokwu n’agha dị iche iche nke narị afọ a! Ndị ụkọchukwu agbawo ụmụ okorobịa ume igbu ụmụ okorobịa ndị ọzọ, ọbụna ndị so n’òtù okpukpe nke ha—ndị Katọlik na-egbu ndị Katọlik, ndị Protestant na-egbukwa ndị Protestant. E buliwo ịhụ mba n’anya elu karịa Chineke na Kraịst. Na nso nso a, n’ụfọdụ mba Africa, e butewo nkekọ agbụrụ ụzọ tupu ụkpụrụ Bible. Na Rwanda, ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị bi ebe ahụ bụ ndị Katọlik, e gburu ọkara nde mmadụ ma ọ dịkarịa ala n’ime ihe ike agbụrụ. Popu kwetara n’akwụkwọ akụkọ Vatican bụ́ L’Osservatore Romano, sị: “Nke a bụ mgbukpọ agbụrụ doro anya, nke n’ụzọ dị mwute, ọ bụ ọbụna ndị Katọlik kpatara.”—Tụlee Aịsaịa 59:2, 3; Maịka 4:3, 5.

10. Olee ihe e kpere n’ikpe nke Jehova ga-emezu n’ahụ okpukpe ụgha?

10 Olee otú Eze nke mgbe ebighị ebi si were okpukpe ndị na-agba ndị mmadụ ume igbu ibe ha ma ọ bụ na-ele nanị n’anya ka ndị òtù ha na-egbu ndị òtù ha ndị ọzọ? Banyere Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ usoro okpukpe ụgha zuru ụwa ọnụ, Mkpughe 18:21, 24 na-agwa anyị, sị: “Otu mmụọ ozi nke dị ike wee buru nkume, dị ka oké nkume igwe nri, wee tụba ya n’ime oké osimiri, sị, Otú a ka a ga-atụda Babilọn, bụ́ obodo ukwu ahụ, n’oké ọdịda, a gaghị ahụkwa ya ọzọ ma ọlị. Ọ bụkwa n’ime ya ka a hụrụ ọbara nke ndị amụma na nke ndị nsọ, na nke ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.”

11. Oké ihe ọjọọ ndị dị aṅaa nọworo na-eme n’ime Krisendọm?

11 Ná mmezu nke amụma Bible, ihe ndị dị oké njọ anọwo na-eme n’ime Krisendọm. (Tụlee Jeremaịa 5:30, 31; 23:14.) N’ụzọ dị ukwuu n’ihi àgwà mere otú ọ masịrị gị nke ndị ụkọchukwu, ìgwè atụrụ ha jupụtara n’omume rụrụ arụ. Na United States, nke e weere na ọ bụ mba ndị Kraịst, ihe dị ka ọkara nke alụmdi na nwunye nile na-atọsa n’ịgba alụkwaghịm. Ntụrụ ime nke ndị afọ iri na ụma (ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na afọ iri na itoolu) na ndina ụdị onwe enweghị nchịkwa n’etiti ndị òtù chọọchị. Ndị ụkọchukwu nọ na-emetọ ụmụaka na-eto eto n’ụzọ mmekọahụ—ọtụtụ ugboro. E kwuwo na nkwụghachi ụgwọ nke ụlọikpe kpebiri bụ́ ndị metụtara okwu ikpe ndị a pụrụ ifu Chọọchị Katọlik dị na United States otu ijeri dollar n’ime afọ iri. Krisendọm elegharawo ịdọ aka ná ntị Pọl onyeozi nke dị ná 1 Ndị Kọrint 6:9, 10 anya: “Ma ọ bụ ùnu amataghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke? Unu ekwela ka e duhie unu: ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ha agaghị eketa alaeze Chineke.”

12. (a) Olee otú Eze nke mgbe ebighị ebi ga-esi mee ihe megide Babilọn Ukwu ahụ? (b) N’ụzọ dị iche na Krisendọm, n’ihi gịnị ka ndị Chineke ga-eji kwee ukwe “Haleluya” ndị ahụ?

12 N’isi nso, Eze nke mgbe ebighị ebi, bụ́ Jehova, n’ime ihe site n’aka Onye Isi Agha ya nke eluigwe, bụ́ Kraịst Jisọs, ga-atọhapụ oké mkpagbu ahụ. Nke mbụ, Krisendọm na alaka ndị ọzọ nile nke Babilọn Ukwu ahụ ga-enweta mmezu nke ihe Jehova kpere n’ikpe. (Mkpughe 17:16, 17) Ha egosiwo onwe ha dị ka ndị na-ekwesịghị inweta nzọpụta ahụ nke Jehova nyeworo site n’àjà mgbapụta nke Jisọs. Ha eledawo aha nsọ Chineke anya. (Tụlee Ezikiel 39:7.) Lee ihe ịkwa emo ọ bụ na ha na-ekwe ukwe “Haleluya” n’agbadagba ụlọ okpukpe ha ndị gburu ego! Ha na-ewepụ aha dị oké ọnụ ahịa nke Jehova ná nsụgharị Bible ha ma yie ka ha chefuru eziokwu bụ́ na “Haleluya” pụtara “Toonụ Ja”—ebe “Ja” bụ ndebiri nke “Jehova.” N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Mkpughe 19:1-6 dekọrọ ukwe “Haleluya” nke a gaje ikwe n’isi nso iji mee ememe nke Chineke imezu ihe e kpere n’ikpe n’ahụ Babilọn Ukwu ahụ.

13, 14. (a) Olee ihe omume ndị dị ịrịba ama ga-esochi? (b) Gịnị bụ ihe obi ụtọ ga-abịara ụmụ mmadụ na-atụ egwu Chineke?

13 Ihe ọzọ ga-esochi bụ ‘ọbịbịa’ Jisọs ikwupụta na imezu ihe e kpere n’ikpe n’ahụ mba nile na ndị nile. Ya onwe ya buru n’amụma, sị: “Mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ [Kraịst Jisọs] ga-abịa n’ebube Ya, Ya na ndị mmụọ ozi nile, mgbe ahụ ka Ọ ga-anọkwasị n’ocheeze [nke ikpe] nke ebube Ya: ma n’ihu Ya ka a ga-eme ka mba nile [dị n’elu ụwa] zukọọ: Ọ ga-ekewapụtakwa ha, otu n’ahụ ibe ya, dị ka onye na-azụ atụrụ na-ekewapụta atụrụ n’ụmụ ewu: Ọ ga-edebekwa atụrụ n’aka nri Ya, ma ụmụ ewu n’aka ekpe. Mgbe ahụ Eze ahụ ga-asị ndị nọ n’aka nri Ya, Bịanụ, ndị a gọziri agọzi nke Nna m, ketanụ alaeze e doziwooro unu site na ntọala nke ụwa.” (Matiu 25:31-34) Amaokwu nke 46 na-aga n’ihu ịkọ na òtù ụmụ ewu ahụ “ga-apụ jee baa n’ahụhụ mmehie ebighị ebi: ma ndị ezi omume ga-aba ná ndụ ebighị ebi.”

14 Akwụkwọ Bible bụ́ Mkpughe na-akọwa otú “Eze kachasị ndị eze nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile,” Onyenwe anyị bi n’eluigwe, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-esi gbabaa n’ọgbọ agha n’Amagedọn, na-ebibi akụkụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na azụmahịa nke usoro ihe Setan. Otú a Kraịst ga-awụpụworị “ọnụma nke iwe Chineke Onye pụrụ ime ihe nile” n’ógbè elu ala nile nke Setan. Ka ‘ihe mbụ ndị a nile na-agabiga,’ a ga-eduru ụmụ mmadụ na-atụ egwu Chineke banye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ dị ebube ebe Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.”—Mkpughe 19:11-16; 21:3-5.

Oge Inye Ja Otuto

15, 16. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa na anyị ṅara ntị n’okwu amụma Jehova? (b) Gịnị ka ndị ozi na ndị amụma na-egosi na anyị aghaghị ime maka nzọpụta, gịnịkwa ka nke a pụrụ ịpụtara ọtụtụ ìgwè mmadụ taa?

15 Oge a ga-emezu ihe e kpere n’ikpe dị nso! Ya mere, anyị ga-eme nke ọma ịṅa ntị n’okwu amụma nke Eze nke mgbe ebighị ebi ahụ. Nye ndị ozizi na omenala nile nke okpukpe ụgha ka ji aka, olu si n’eluigwe na-ekwupụta, sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile.” Ma ole ebe ka ndị gbapụrụnụ na-aghaghị ịga? A pụrụ inwe nanị otu eziokwu, n’ihi ya nanị otu ezi okpukpe. (Mkpughe 18:4; Jọn 8:31, 32; 14:6; 17:3) Anyị inweta ndụ ebighị ebi dabeere n’ịchọta okpukpe ahụ na irubere Chineke ya isi. Bible na-eduzi anyị gaa n’ebe ọ nọ n’Abụ Ọma 83:18, nke na-agụ, sị: “Gị, nanị onye aha ya bụ JEHOVA, bụ onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.”—King James Version.

16 Otú ọ dị, ọ dị anyị mkpa ime ihe karịrị nanị ịmara aha nke Eze nke mgbe ebighị ebi. Ọ dị anyị mkpa ịmụ Bible na ịmụta banyere àgwà na nzube ya ndị dị ebube. Mgbe ahụ ọ dị anyị mkpa ime uche ya n’oge a, dị ka e gosiri ná Ndị Rom 10:9-13. Pọl onyeozi hotara ihe ndị amụma ahụ e nyere ike mmụọ nsọ kwuru ma kwubie, sị: “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị, a ga-azọpụta ya.” (Joel 2:32; Zefanaịa 3:9) Zọpụta? Ee, n’ihi na a ga-anapụta ọtụtụ ndị taa bụ́ ndị nwere okwukwe ná ndokwa mgbapụta nke Jehova site na Kraịst n’oké mkpagbu ahụ na-abịanụ, mgbe e mezuru ihe e kpere n’ikpe n’ahụ ụwa rụrụ arụ nke Setan.—Mkpughe 7:9, 10, 14.

17. Olee olileanya dị ebube nke kwesịrị ịkpali anyị isonye ugbu a n’ịbụ abụ nke Mosis na nke Nwa Atụrụ ahụ?

17 Gịnị bụ uche Chineke maka ndị na-ele anya ịlanarị? Ọ bụ ka anyị sonye ọbụna ugbu a n’ịbụ abụ Mosis na nke Nwa Atụrụ ahụ, na-eto Eze nke mgbe ebighị ebi n’atụmanya nke mmeri ya. Anyị na-eme nke a site n’ịgwa ndị ọzọ banyere nzube ya ndị dị ebube. Ka anyị na-aga n’ihu n’ịghọta Bible, anyị na-arara ndụ anyị nye Eze nke mgbe ebighị ebi. Nke a ga-eduje n’anyị ịdị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi n’okpuru ndokwa nke Eze a dị ike na-akọwa, dị ka ọ dị n’Aịsaịa 65:17, 18, sị: “N’ihi na, lee, M gaje ike eluigwe ọhụrụ [Alaeze Mesaịa nke Jisọs] na ụwa ọhụrụ [òtù ọhụrụ nke ihe a kpọrọ mmadụ nke ezi omume]: a gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi. Ma otú ọ dị, ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwanụ egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke Mụ onwe m na-eke.”

18, 19. (a) Gịnị ka okwu Devid ndị dị n’Abụ Ọma 145 kwesịrị ịkpali anyị ime? (b) Gịnị ka anyị pụrụ iji obi ike tụọ anya ya site n’aka Jehova?

18 Devid onye ọbụ abụ ji okwu ndị a kọwaa Eze nke mgbe ebighị ebi ahụ: “Onye ukwu ka Jehova bụ, Ọ bụkwa onye a na-eto nke ukwuu; ọ dịghịkwa ngwupụta ala dịịrị ịdị ukwuu Ya.” (Abụ Ọma 145:3) A pụghị igwupụta ịdị ukwuu ya dịkwa ka a na-apụghị igwupụta nsọtụ nke mbara igwe na mgbe ebighị ebi! (Ndị Rom 11:33) Ka anyị na-aga n’ihu na-anara ihe ọmụma nke Onye Okike anyị na ndokwa mgbapụta ya site n’Ọkpara ya, bụ́ Kraịst Jisọs, anyị ga-achọ ito Eze anyị nke mgbe ebighị ebi n’ụzọ na-abawanye ụba. Anyị ga-achọ ime dị ka Abụ Ọma 145:11-13 na-ekwu: “Nsọpụrụ nke alaeze Gị ka ha na-ekwupụta, ọ bụ ịdị ike Gị ka ha na-ekwu okwu banyere ya; ime ka ụmụ mmadụ mara ịdị ike Ya nile, na nsọpụrụ nke ịma mma nke alaeze Ya. Alaeze Gị bụ alaeze ruo mgbe nile ebighị ebi, ọchịchị Gị dịkwa n’ọgbọ nile.”

19 Anyị pụrụ iji obi ike na-atụ anya na Chineke anyị ga-emezu nkwa ya: “Ị na-asaghe aka Gị, Ị na-ewerekwa ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.” Eze nke mgbe ebighị ebi ga-eji nwayọọ duru anyị gafee ọgwụgwụ nke mgbe ikpeazụ ndị a, n’ihi na Devid mesiri anyị obi ike, sị: “Jehova na-edebe ndị nile na-ahụ Ya n’anya; ma ndị nile na-emebi iwu ka Ọ ga-ekpochapụ.”—Abụ Ọma 145:16, 20.

20. Olee otú i si azaghachi n’ọkpụkpọ òkù nke Eze nke mgbe ebighị ebi ahụ, dị ka e kwupụtara ya n’abụ ọma ise ndị ikpeazụ?

20 Nke ọ bụla n’ime abụ ọma ise ndị ikpeazụ dị n’ime Bible jiri ọkpụkpọ òkù “Haleluja” meghee ma mechie. N’ihi ya, Abụ Ọma 146 na-akpọ anyị òkù, sị: “Toonụ Ja. Mkpụrụ obi m, too Jehova. M ga-eto Jehova n’ogologo ndụ m nile: m ga-abụku Chineke abụ ọma mgbe m nọ na-adị ndụ.” Ị̀ ga-aza òkù ahụ? N’ezie i kwesịrị ịchọ ito ya! Ka i soro ná ndị ahụ a kọwara n’Abụ Ọma 148:12, 13, sị: “Ma ụmụ okorobịa ma ụmụ agbọghọ; ndị agadi, ha na ụmụntakịrị: ka ha too aha Jehova; n’ihi na e mewo ka aha Ya dị elu, nanị ya: ebube Ya dị n’elu ụwa na eluigwe.” Ka anyị jiri obi anyị dum zaghachi n’òkù ahụ bụ́: “Toonụ Ja.” N’ijikọ aka ọnụ, ka anyị too Eze nke mgbe ebighị ebi!

Gịnị Bụ Azịza Gị?

◻ Banyere gịnị ka ndị ozi Jisọs buru ụzọ dọọ aka ná ntị?

◻ Malite na 1914, ihe omume ndị dị aṅaa kpọmkwem werewooro ọnọdụ?

◻ Olee ihe ndị e kpere n’ikpe ndị Jehova na-ejikere imezu?

◻ N’ihi gịnị ka ugbu a ji bụrụ oge kasị mkpa iji too Eze nke mgbe ebighị ebi?

[Igbe dị na peeji nke 19]

Ọgbọ Ọdachi A nke Ọgba Aghara

Ọtụtụ ndị ekwetawo na oge nke ọgba aghara bịara ná mmalite narị afọ nke 20. Dị ka ihe atụ, n’okwu mmalite nke akwụkwọ bụ́ Pandaemonium, nke Onye Ome Iwu Daniel Patrick Moynihan sitere United States dere, nke e bipụtara na 1993, otu ihe e kwuru banyere “ọdachi nke 1914” na-agụ, sị: “Agha bịara ụwa wee gbanwee—kpam kpam. Taa e nwere nanị mba asatọ n’ụwa ndị dịrị na 1914, ndị na-agbanwebeghịkwa ụdị gọọmenti ha site n’ime ihe ike kemgbe ahụ. . . . N’ime ihe dị ka 170 fọdụrụnụ ndị dị ugbu a, n’agbanyeghị na a ka kepụtara ụfọdụ n’oge na-adịbeghị anya, ha ahụsiela anya nke ukwuu n’ọgba aghara ndị e nwere na nso nso a.” N’ezie, ọgbọ dịnụ kemgbe 1914 ahụwo ọdachi kwuru ọdachi!

Akwụkwọ ọzọ e bipụtakwara na 1993 bụ Out of Control—Global Turmoil on the Eve of the Twenty-First Century. Onye dere ya bụ Zbigniew Brzezinski, onye bụbu onye isi nke Kansụl Mba Na-ahụ Maka Nchebe na United States. Ọ na-ede, sị: “N’ọtụtụ okwu e kwuru, e toro mmalite nke narị afọ nke iri abụọ dị ka ezi mmalite nke Ọgbọ nke Iji Nghọta Eme Ihe. . . . N’adịghị ka nkwa ya, narị afọ nke iri abụọ ghọrọ narị afọ nke kasị jupụta n’ọbara na ịkpọasị, narị afọ nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke echiche hiere ụzọ na igbu ndị mmadụ n’ụzọ jọgburu onwe ya. A haziri mmekpọ ọnụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-enweghị atụ, a haziri igbu mmadụ n’ìgwè n’ìgwè. Ọdịiche dị n’etiti ikike sayensị nwere ime ihe ọma na ihe ọjọọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke a wụpụtara n’ezie na-awụ akpata oyi n’ahụ. E nwetụbeghị n’akụkọ ihe mere eme mgbe igbu mmadụ jupụtara n’ụwa otú a, e bibitụbeghị ọtụtụ ndụ otú a, e nwetụbeghị mgbe e ji ụdị ime mgbalị nọgidere na-aga n’ihu nke e chere ihu n’otu ebe chụsoo mbibi nke mmadụ n’ihi ihe mgbaru ọsọ mpako ndị dị otú ahụ.” Lee otú nke ahụ si bụrụ eziokwu!

[Foto dị na peeji nke 17]

Maịkael chụdara Setan na usuu ndị mmụọ ọjọọ ya n’elu ala mgbe e guzobesịrị Alaeze ahụ na 1914

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya