Jehova Na-enye Ọkịka nke Ike
1 Ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke ije ozi dị nsọ—ozi ndị Kraịst—ka e nyeworo ndị nile na-eso ụzọ Jisọs. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Ma ezughị okè mmadụ na nrụgide nke usoro ihe dị ugbu a pụrụ ime ka anyị lee onwe anyị anya mgbe ụfọdụ dị ka ndị na-erutụdịghị eru.
2 Mgbe nke a mere, akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara ndị Kraịst e tere mmanụ bi na Kọrint pụrụ ịkasi anyị obi. O dere: “Anyị nwere akụ̀ a n’ite ájá.” (2 Kọr. 4:7) Obi siri Pọl ike: “Ebe anyị nwere ije ozi a . . . , ike agwụghị anyị n’obi.” (2 Kọr. 4:1) N’ezie, ọ bụ ihe ịma aka nye onye ọ bụla n’ime anyị, ma ọ̀ bụ onye e tere mmanụ ma ò so ‘n’atụrụ ọzọ’ ahụ, ịnọgide na-akpọsa ozi ọma ahụ ‘n’enweghị ike ọgwụgwụ n’obi.’ Ike sitere n’aka Chineke, onye na-enye “ọkịka nke ike,” dị anyị mkpa.—Jọn 10:16; 2 Kọr. 4:7b.
3 N’ụzọ na-agba ume, ọtụtụ Ndịàmà bụ ndị na-ekwusa ozi ọma na-anụ ọkụ n’obi n’agbanyeghị ịbụ ndị na-aghaghị ịgbaso mkpagbu dị ilu, ajọ nsogbu ahụ ike, ma ọ bụ enweghị ego zuuru ha mgba. Anyị nile aghaghị ịmara na ọrụ anyị nke ime nkwusa nwere nkwado Jehova. Kama ikwere ka nkụda aka ma ọ bụ ụjọ belata mkpebi anyị ime nkwusa, ka anyị “dị ike n’ime Onyenwe anyị, ya na n’ime ịdị ike nke ike Ya.”—Efe. 6:10; Ilu 24:10.
4 Otú E Si Enweta Ike Chineke: Nọgidesie ike n’ekpere, na-arịọ maka enyemaka na ike Chineke. (Rom 12:12; Fil. 4:6, 7) Mgbe ahụ, site n’obi gị nile, tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enye ọkịka nke ike. (Ilu 3:5) Gụọ akụkọ ndụ ndị nke oge a na magazin anyị, n’ihi na ha na-enye ihe àmà na Jehova na-enyere ndị ohu ya aka taa idi ọnwụnwa. Na-akparu ụmụnna nọ n’ọgbakọ nso, ahapụkwala nzukọ nke ọgbakọ.—Rom 1:11, 12; Hib. 10:24, 25.
5 Ka anyị mee ihe nile anyị nwere ike ime iji debe onwe anyị n’ọnọdụ ịnata ike Jehova—ọkịka nke ike, nke ahụkwa ga-enyere anyị aka ime ka ike ghara ịgwụ anyị n’ọrụ ahụ kasị mkpa nke ime nkwusa Alaeze.