Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/98 p. 1
  • Kwanyere Ebe Ofufe Jehova Ùgwù

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kwanyere Ebe Ofufe Jehova Ùgwù
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Na-akwanyere Ebe Ofufe Gị Ùgwù?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Na-ebinụ Obi n’Ụzọ Kwesịrị Ozi Ọma Ahụ
    Ozi Alaeze Anyi—1995
  • Ebe A Ka Anyị Na-anọ Efe Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ịkwanyere Nnọkọ Anyị Ndị Dị Nsọ Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 1/98 p. 1

Kwanyere Ebe Ofufe Jehova Ùgwù

1 Mgbe anyị bụ ndị ọbịa n’ụlọ mmadụ, anyị na-akwanyere ihe onwunwe onye ahụ ùgwù, n’emeghị ihe ọ bụla imebi ya, anyị anaghịkwa emeghasị ihe omume ezinụlọ ndị dị n’usoro. Lee ka nke a kwesịrị isi bụrụkwuo eziokwu mgbe anyị bụ ndị ọbịa Jehova! Anyị kwesịrị ịmata otú anyị ga-esi bie obi n’ezinụlọ ya. (Abụ Ọma 15:1; 1 Tim. 3:15) Ma à na-enwe nzukọ ndị Kraịst anyị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, n’ebe obibi mmadụ, ma ọ bụ n’ụlọ ọha na eze, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị na-akwanyere ebe ofufe anyị ùgwù dị ka ọ bụ ụlọ Jehova, onye “ebube Ya dị n’elu ụwa na eluigwe.”—Abụ Ọma 148:13.

2 Ụmụnna ụfọdụ na-egosi enweghị nkwanye ùgwù ná nzukọ site n’ime ụzụ ma ọ bụ site n’ime ka a ga-asị na ihe ọmụma a na-enye adịghị mkpa. Ndị toworo eto ole na ole na-enwe mkparịta ụka na-enweghị isi n’ebe mbata, veranda, ụlọ mposi, ma ọ bụ n’èzí Ụlọ Nzụkọ Alaeze mgbe nzukọ na-aga n’ihu. Mgbe a hapụrụ nwatakịrị toturu eto ilekọta nke ọ tọrọ, mgbe ụfọdụ ha abụọ na-ebido igwuri egwu wee rite ntakịrị uru n’usoro ihe omume. A hụwo ndị ntorobịa ụfọdụ n’èzí Ụlọ Nzụkọ Alaeze mgbe a gbasasịrị nzukọ, ka ha na-egwuri egwu, na-eme oké mkpọtụ, ọbụna na-agba ibe ha ihe ndị yiri karat. Mgbe ụfọdụ, ha na-emere ndị agbata obi mkpọtụ ma ọ bụ na-anọchiri ụgbọ ụzọ n’ebe ndọwa ụgbọala ma ọ bụ n’okporo ámá.

3 Ụzọ Isi Zere Enweghị Nkwanye Ùgwù: Ịghọta ịdị ùgwù na ịdị nsọ nke ofufe anyị, obi abụọ adịghị ya na anyị agaghị achọ ịdọpụ uche ndị ọzọ site n’ịgba izu, iri nri, ịta chịngọm, isapegharị akwụkwọ, ịga n’ụlọ mposi mgbe ọ na-adịghị mkpa, ma ọ bụ inwe àgwà ịbịa nzukọ n’azụ oge. Ndị mụrụ ụmụ nwere nkwanye ùgwù na ekele adịghị ahapụ ụmụ ha ka ha na-emetọ ala, oche, ma ọ bụ ahụ ájá nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ụlọ ebe a na-enwe ọmụmụ akwụkwọ. N’enweghị obi abụọ anyị nile kwere na e nweghị ohere ma ọlị maka ụdị ọ bụla nke ihe ihere, ikwu okwu nzuzu, ma ọ bụ okwu na-abaghị n’ihe ná nzukọ anyị.—Efe. 5:4.

4 Ọ bụrụ na anyị na-echeta mgbe nile nzube nke nzukọ ndị Kraịst anyị, anyị ga-ejide n’aka na anyị na ụmụ anyị ga-egosi nkwanye ùgwù kwesịrị ekwesị maka ofufe Jehova n’ebe anyị ‘họpụtaworo iguzo.’—Abụ Ọma 84:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya