Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/98 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka January

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka January
  • Ozi Alaeze Anyi—1998
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite January 5
  • Izu Na-amalite January 12
  • Izu Na-amalite January 19
  • Izu Na-amalite January 26
Ozi Alaeze Anyi—1998
km 1/98 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka January

Izu Na-amalite January 5

Abụ 10

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

17 min: “Na-enwe Obi Ụtọ n’Ịgba Àmà Zuru Ezu.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Mee ka ihe ndị dị mkpa maka iche ihe n’ihu mmadụ n’ụzọ dị irè pụta ìhè: (1) Kelee ekele enyi, (2) kwuo okwu ma ọ bụ jụọ ajụjụ banyere okwu a kpụ n’ọnụ na-adọrọ mmasị, (3) hota akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ekwesị, (4) dọrọkwa mmasị gaa n’akwụkwọ a na-enyefe. Mee ka onye nkwusa ruru eru mee ihe ngosi maka ọbịbịa mbụ a tụrụ aro ya tinyere nletaghachi kwekọrọnụ.

20 min: Jikere Ugbu A Ịkwado Iwu Chineke Banyere Ọbara. Okenye ruru eru atụlee ịdị mkpa nke idejupụta kaadị Advance Medical Directive/Release. Nduzi e dere n’ike mmụọ nsọ n’Abụ Ọma 19:7 na-egosi na Ọrụ 15:28, 29 bụ nkwupụta nke iwu Chineke zuru okè banyere ọbara. Ndị ji iguzosi ike n’ihe na-efe ya na-agbalị idebe iwu ahụ. Akwụkwọ a na-eme ka a mara mkpebi gị ime otú ahụ, ọ na-ekwuchitekwara gị ọnụ gị mgbe ị na-apụghị ikwuru onwe gị okwu. (Tụlee Ilu 22:3.) Kaadị ọhụrụ na-egosi nkwupụta gị dị ọhụrụ nke ịjụ ịnara ọbara. Agbasasịa nzukọ a, a ga-enye Ndịàmà e mere baptism chọrọ kaadị ọhụrụ otu, ndị nwekwara obere ụmụaka a na-emebeghị baptism ga-anata otu Identity Card maka nwatakịrị ọ bụla. A gaghị edejupụta kaadị ndị a n’uhuruchi a. E kwesịrị iji nlezianya dejupụta ha n’ụlọ ma A GAGHỊ abịanye aka na ha. Ịbịanye aka, ịgba akaebe, na ide ụbọchị n’ime kaadị nile ga-abụ ma e nwesịa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-esonụ, n’okpuru nlekọta nke onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ. Nke a ga-eme ka e jide n’aka na ndị nile nọ n’ìgwè ya chọrọ idejupụta ntụzi nlekọta ahụ ike a nwetara enyemaka dị mkpa. Ndị na-abịanye aka dị ka ndị akaebe kwesịrị n’ezie ịhụ onye nwe kaadị ahụ mgbe ọ na-abịanye aka na ya. Ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ/ndị okenye ga-enyere onye ọ bụla na-anọghị ya n’oge ahụ aka nke nwekwara mmasị idejupụta na ịbịanye aka na kaadị ná Nzukọ Ije Ozi na-esonụ ruo mgbe ndị nkwusa nile e mere baptism dejupụtasịrị kaadị ha nke ọma. (Tụleghachi akwụkwọ ozi October 15, 1991.) Site n’ime ka okwu sitere na kaadị a daba n’ọnọdụ na ihe ha kwenyere, ndị nkwusa a na-emebeghị baptism pụrụ idejupụta okwu nduzi nke ha bụ́ nke ha na ụmụ ha ga-eji na-eme ihe.

Abụ 142 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 12

Abụ 125

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kọwapụta atụmatụ ozi ubi maka ngwụsị izu.

15 min: “Eleghị Mmadụ Anya n’Ihu n’Ozi Anyị.” Ajụjụ na azịza. Mee ka akụkụ isiokwu a kasị metụta ókèala unu kpọmkwem pụta ìhè.

20 min: “Jehova Na-enye Ọkịka nke Ike.” Ajụjụ na azịza. (Lee w90-IB 7/15 19, paragraf nke 15-16.) Mee ka ụfọdụ kọọ ahụmahụ na-agba ume ndị na-egosi otú Jehova siworo mee ka ha sie ike.

Abụ 81 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 19

Abụ 1

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

20 min: Ọmụmụ Ihe Ezinụlọ nke Na-enye Ọṅụ. Di na nwunye ekwurịta banyere mkpa ime mmụọ nke ezinụlọ ha. N’inwe nchegbu banyere mmetụta ụwa ndị na-adịkwasị ụmụ ha n’ụzọ dị njọ, ha na-ahụ ịdị mkpa nke iwusi ọnọdụ ime mmụọ nke ụmụ ha ike ma kweta na ọmụmụ ihe ezinụlọ ha echibeghị anya na ọ naghị adịkarịkwa irè. Ha atụlekọta aro a tụrụ n’Ụlọ Nche nke August 1, 1997, peji nke 26-29, maka otú e si eduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ dị irè. Ha abụọ ekpebisie ike ileru anya iji chebe ọdịmma ime mmụọ nke ụmụ ha.

Abụ 146 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 26

Abụ 187

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụleghachi akwụkwọ a ga-enyefe na February. Kwuo otu ọkpụrụkpụ ihe ma ọ bụ abụọ sitere n’akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ nke ga-enye aka mgbe a na-enyefe ya.

15 min: “Kwanyere Ebe Ofufe Jehova Ùgwù.” Ajụjụ na azịza. Okwu onye okenye ga-ekwu, bụ́ onye kwesịrị iji ọmịiko gosi otú okwu a si metụta ógbè ha.

18 min: Inye Akụkọ nke Òkè Anyị Na-ekere n’Ịgba Àmà Zuru Ụwa Ọnụ. (Dabere n’akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 100-102, 106-110) Okwu na nkwurịta okwu nke odeakwụkwọ ga-eme. Mgbe o gosichara ihe atụ Akwụkwọ Nsọ maka inye akụkọ nke ọrụ anyị, ọ kpọọ ndị ohu na-eje ozi abụọ ịtụleghachi isiokwu nta bụ́ “Ihe Mere Anyị Ji Enye Akụkọ Ozi Ubi Anyị.” Mgbe ahụ odeakwụkwọ ekwusie okwu ike n’ịdị mkpa nke inye akụkọ ozi zuru ezu n’egbughị oge. Ọ kọwapụta ihe kpatara inwe ihe mgbaru ọsọ onwe onye ji baa uru, na-emechi site n’okwu ịgba ume banyere ngọzi na-abịara ndị na-ekere òkè zuru ezu n’ọrụ ime nkwusa.

Abụ 189 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya