Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 8/15 p. 27-30
  • Ụzọ Ndị Kraịst Pụrụ Isi Nyere Ndị Agadi Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Ndị Kraịst Pụrụ Isi Nyere Ndị Agadi Aka
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Inyeaka Raara Onwe Ya Nye
  • Ime Nhazi Bara Oké Uru
  • Mgbe Ọnwụ Yiri Ihe A Na-apụghị Izere Ezere
  • Ibu Ọrụ nke Anyị Na-enwekọ
  • Ezinụlọ Ndị Kraịst Na-enyere Ndị Agadi Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Jehova Na-echeta Ndị Ọrịa Na Ndị Agadi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ilekọta Ndị Agadi—Ọrụ Dịịrị Ndị Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Igosi Ndị Agadi Ịhụnanya Ndị Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 8/15 p. 27-30

Ụzọ Ndị Kraịst Pụrụ Isi Nyere Ndị Agadi Aka

“IKE agwụghị anyị n’obi; kama a sị na ọ bụ ezie na mmadụ elu ahụ anyị na-ere ure, ma a na-eme ka mmadụ ime anyị bụrụ ihe ọhụrụ kwa ụbọchị. . . . Anya anyị adịghị ele ihe a na-ahụ anya, kama ihe a na-adịghị ahụ anya: n’ihi na ihe a na-ahụ anya na-adịru nwa oge; ma ihe a na-adịghị ahụ anya dị ebighị ebi.” Otú ahụ ka Pọl onyeozi kwuru n’akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ndị Kọrint.—2 Ndị Kọrint 4:16-18.

N’oge ochie, ndị ikom na ndị inyom nke okwukwe lekwasịrị anya ha n’ihe a na-adịghị ahụ anya, ndị gụnyere ihe nile nke Chineke ha, bụ́ Jehova, kweworo nkwa ime n’oge ya a kara aka. N’akwụkwọ Ndị Hibru, Pọl jara ndị dị otú ahụ mma, bụ́ ndị jigidere okwukwe ha ruo n’oge ọnwụ ha—ụfọdụ n’ime kakwara ezigbo nká. Ọ na-ezo aka n’ebe ha nọ dị ka ihe nlereanya nye anyị, na-asị: “Ndị a nile nwụrụ n’ụzọ okwukwe, ebe ha anataghị nkwa ahụ, kama ha hụrụ ha rịị, sikwa n’ebe dị anya kelee ha.”—Ndị Hibru 11:13.

Taa anyị nọ ezigbo nso ná mmezu nke nkwa ndị a. Ma anyị nwere ndị ọrịa na ndị agadi n’etiti anyị bụ́ ndị na-ejighị n’aka na ha ga-anọ ndụ n’onwe ha ịhụ ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a. Eleghị anya ụfọdụ n’ime ndị a ga-anwụ n’okwukwe n’ahụghị ka nkwa ahụ nile mezuru n’oge ha ka nọ ndụ ugbu a. Nye ndị dị otú ahụ okwu Pọl kwuru ná 2 Ndị Kọrint 4:16-18, bụ oké agbamume.

Jehova na-echeta ndị ya nile na-anọgidesi ike n’ihe, gụnyere ndị ọrịa na ndị agadi. (Ndị Hibru 6:10) E kwuru okwu ọma banyere ndị meworo agadi kwesịrị ntụkwasị obi n’ọtụtụ ebe na Bible, n’Iwu Mosis, e kwukwara okwu n’ụzọ pụrụ iche banyere nsọpụrụ e kwesịrị inye ndị agadi. (Levitikọs 19:32; Abụ Ọma 92:12-15; Ilu 16:31) N’etiti ndị Kraịst oge gboo, e mesoro ndị agadi omume ná nkwanye ùgwù. (1 Timoti 5:1-3; 1 Pita 5:5) Otu akwụkwọ Bible nwere nkọwa mara mma banyere nlekọta ịhụnanya na iji onwe onye achụ àjà na-emetụ n’obi nke otu nwa agbọghọ gosiri nne di ya meworo agadi. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, akwụkwọ ahụ bu aha nke nwa agbọghọ ahụ, bụ́ Rut.

Onye Inyeaka Raara Onwe Ya Nye

Ndụ bụ ihe dị ilu nye Naomi ahụ meworo agadi. Oké ụnwụ amanyewo ya, nakwa obere ezinụlọ ya, ịhapụ ndị enyi na ihe nketa na Juda ma biri n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Jọdan n’ala Moab. N’ebe a ka di Naomi nwụrụ, na-ahapụ nanị ya na ụmụ ha ndị nwoke abụọ. Ndị a, mgbe oge na-aga, tolitere wee lụọ nwunye, ma mgbe ahụ ha onwe ha nwụkwara. A hapụrụ Naomi n’enweghị onye nketa nke ga-elekọta ya anya.

O mewo agadi nke ukwuu ịlụgharị di, ndụ yikwara nke olileanya na-adịghị. N’achọghị ọdịmma onwe ya nanị, ọ chọrọ izilaga Rut na Ọpa, bụ́ ndị nwunye nke ụmụ ya abụọ nwụrụ anwụ, n’ụlọ nne ha ka ha nwee ike ịchọtara onwe ha di. Nanị ya ga-alaghachi n’ala ebe a mụrụ ya. Taakwa, ụfọdụ ndị meworo agadi na-enwe mmetụta ịda mbà n’obi, karịsịa ma ọ bụrụ na ndị ha hụrụ n’anya anwụnahụwo ha. Dị ka Naomi, ha pụrụ inwe mkpa nke onye ga-elekọta ha, ma ha achọghị ịbụ ibu arọ.

Otú ọ dị, Rut agbahapụghị nne di ya. Ọ hụrụ agadi nwanyị a n’anya, ọ hụkwara Jehova n’anya, bụ́ Chineke nke Naomi na-efe. (Rut 1:16) Ya mere ha abụọ zọpụrụ ije ịlaghachi Juda. N’ala ahụ, e nwere ndokwa ịhụnanya dị n’ime Iwu Jehova nke na ndị ogbenye pụrụ ịchịkọta, ma ọ bụ iwekọta, ihe ọ bụla a hapụrụ n’ubi mgbe e wesịrị ihe n’ubi. Rut, bụ́ onye ka na-eto eto, wepụtara onwe ya ịrụ ọrụ nke a, na-asị: “Biko, ka m jee.” Ọ rụrụ ọrụ n’enweghị ike ọgwụgwụ maka ha abụọ.—Rut 2:2, 17, 18.

Ikwesị ntụkwasị obi na ịhụnanya Rut nye Jehova bụ ihe agbamume siri ike nye Naomi, bụ́ onye malitere iche echiche n’ụzọ ziri ezi na n’ụzọ ịrụpụta ihe. Ihe ọmụma ya banyere Iwu ahụ na ọdịnala nke mba ya bara uru ugbu a. O nyere onye inyeaka ya nke raara onwe ya nye ndụmọdụ amamihe ka nwa agbọghọ ahụ, site n’alụmdi na nwunye nkuchi, nwee ike inwetaghachi ihe nketa nke ezinụlọ ahụ ma mụta nwa nwoke nke ga-eme ka usoro ezinụlọ ahụ dịgide. (Rut, isi nke 3) Rut bụ ihe nlereanya mara mma nye ndị ahụ na-achụ àjà iji lekọta ndị ọrịa ma ọ bụ ndị agadi. (Rut 2:10-12) N’ime ọgbakọ taa, a pụrụ ime ihe dị ukwuu n’otu aka ahụ iji nyere ndị ọrịa na ndị agadi aka. N’ụzọ dị aṅaa?

Ime Nhazi Bara Oké Uru

N’ọgbakọ ndị Kraịst oge gboo, e depụtara aha ndị di ha nwụrụ nọ ná mkpa nke nkwado ihe onwunwe. (1 Timoti 5:9, 10) N’otu aka ahụ taa, n’ọnọdụ ụfọdụ ndị okenye pụrụ idepụta aha ndị ọrịa na ndị agadi bụ́ ndị nọ ná mkpa nlebara anya pụrụ iche. N’ọgbakọ ụfọdụ a gwawo otu onye okenye ka ọ na-ahụ maka nke a dị ka ibu ọrụ ya pụrụ iche. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị agadi, dị ka Naomi, bụ ndị na-adịghị enwekarị mmasị ịchọ enyemaka, ọ ga-adị mkpa ka nwanna dị otú ahụ nwee nkà n’ịtụle ọnọdụ nakwa—n’ụzọ akọ na ezi uche—na-ejide n’aka na e mere ihe ndị dị mkpa. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịchọpụta ma Ụlọ Nzukọ Alaeze ò nwere ndokwa ndị dị mma maka ndị ọrịa na ndị agadi. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, ọ pụrụ ịtụle ihe ndị dị ka ebe mkpọda maka oche nkwagharị, ụlọ mposi kwesịrị ekwesị, ihe a na-akwụnye ná ntị maka ndị ịnụ ihe na-esiri ike, nakwa ebe a pụrụ ịdọwa oche ndị pụrụ iche. Nwanna nke a pụkwara ijide n’aka na ndị nile na-adịghị enwe ike ịbịa n’Ụlọ Nzukọ Alaeze pụrụ ịgbaziri tepu a kpọnyere nzukọ e mere ma ọ bụ gere ha site n’eriri telifon.

Ọ pụkwara ịdị mkpa ime nhazi maka ụgbọ njem iji bịa nzukọ na mgbakọ dị iche iche. Otu nwanna nwanyị meworo agadi nwere nsogbu n’ihi na onye na-akpọ ya abịa nzukọ mgbe nile anọghị ya. Ọ kpọrọ ọtụtụ ndị na telifon tupu o mesịa chọta onye butere ya, mesịakwa jiri n’ihi nke ahụ chee na ya bụ ibu arọ. Ime ndokwa inwe onye okenye nke pụrụ ịhụ maka ihe nile dị otú ahụ gaara eme ka mmechuihu ya ahụ dịrị mfe.

Okenye nke a pụkwara ịjụ ezinụlọ dị iche iche ma hà ga-eke ya eke ịdị na-eleta ndị agadi. N’ụzọ dị otú a ụmụaka ga-amụta na ilekọta ndị agadi bụ akụkụ nke ndụ onye Kraịst. Ọ dị mma ka ụmụaka mụta ibu ibu ọrụ nke a. (1 Timoti 5:4) Otu onye nlekọta sekit kwuru, sị: “N’ahụmahụ m, nanị ụmụaka ma ọ bụ ndị na-eto eto ole na ole na-eleta ndị agadi ma ọ bụ ndị ọrịa dị ka ihe si ha n’obi.” Eleghị anya ha adịghị eche nnọọ echiche banyere ya, ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ha amaghị ihe ha ga-eme ma ọ bụ kwuo; ndị mụrụ ụmụ pụrụ ịkụziri ha nke a.

Otú ọ dị, cheta na ihe ka ọtụtụ ná ndị agadi ga-enwe ekele ibu ụzọ mara na ọ dị onye enyi nke gaje ịbịa. Nke a na-enye ha ọṅụ buru ibu nke ịtụ anya onye ọbịa. Ọ bụrụ na ndị ọbịa ahụ eweta ihe a ga-eji megharịa ọnụ, dị ka kọfị ma ọ bụ achịcha, ma hichasịa ihe nile ngwa ngwa mgbe e mesịrị, a na-ezere inye onye agadi ahụ ibu ọrụ ọzọ. Otu di na nwunye meworo agadi, ndị ka gbasiri ike, nwere otu ụbọchị a kara aka n’izu ọ bụla nke ha na-akwaju obere nkata e ji eme mkpapụ ma pụọ ije leta ọtụtụ ndị agadi nọ n’ọgbakọ ha. A na-enwe ekele dị ukwuu maka nleta ha.

Maka abamuru nke ndị agadi, ọtụtụ ọgbakọ na-enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ n’oge ehihie. N’otu ebe a jụrụ ezinụlọ ụfọdụ na ndị nkwusa na-alụbeghị nwunye ma ọ bụ di ma hà ga-adị njikere ma nwee ike ịkwado otu ìgwè dị otú ahụ, ihe si na ya pụta bụ otu ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ebe ndị agadi na ndị na-eto eto pụrụ ilekọtarịta onwe ha anya.

E kwesịghị ịhapụ ndị okenye ka nanị ha na-ebute ụzọ n’akụkụ nke a. Anyị nile aghaghị ịmata mkpa nke ndị ọrịa na ndị agadi. Anyị pụrụ ikele ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma wepụta oge iso ha kwurịta okwu. A pụrụ ịnabata ọkpụkpọ òkù maka mkpakọrịta ntụsara ahụ. Ma ọ bụ anyị pụrụ ịkpọ ha òkù isonyere anyị ná mkpapụ ma ọ bụ ọbụna ezumike. Otu Onyeàmà na-akpọkarị ndị nkwusa meworo agadi iso ya n’ụgbọ ala ya mgbe ọ na-aga ná nnukwu obodo n’oge mgbagharị azụmahịa ya. Ọ dị mkpa inyere ndị agadi aka ịnọgide na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị so n’ihe a na-eme. Ekwela ka ha gawara onwe ha, dị ka Naomi chọrọ ime, bụ́ nke ga-eme ka usoro ịka nká ma ọ bụ ọrịa agadi gaa ngwa ngwa karị.

Ndị na-eto eto bụ́ ndị nwere ọrụsị ma ọ bụ na-arịa ọrịa chọkwara nlebara anya. Otu Onyeàmà nke nwere ụmụ atọ na-arịa ọrịa na-enweghị ngwọta, nke abụọ n’ime ha nwụworo kemgbe, sịrị: “Ọ pụrụ isiri ọgbakọ ike ịnọgide na-egosi nlekọta mgbe mmadụ nwere ọrịa nke nọtere aka. Gịnị ma i kenye ụfọdụ ndị nkwusa na-eto eto a tụkwasịrị obi ka ha soro enyi ha nke na-adịghị ebilinwu n’àkwà na-atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị ma na-agụ otu isiakwụkwọ sitere na Bible kwa ụbọchị? Ndị na-eto eto, tinyere ndị ọsụ ụzọ, pụrụ ike ya eke.”

Mgbe Ọnwụ Yiri Ihe A Na-apụghị Izere Ezere

Ndị ohu Jehova anọgidewo na-eji obi ike eche ọnwụ ihu, ma ọ̀ bụ n’ihi ọrịa ma ọ bụ n’ihi mkpagbu. Mgbe ndị nọ ná mkpagbu malitere iche na ọnwụ pụrụ ịdị nso, ọ bụ ihe a na-ahụ ná ndụ ha inwe mmetụta uche dị iche iche. Mgbe ha nwụrụ, ndị ikwu ha ga-agabigakwa oge ime mgbanwe, iru újú, na nnakwere. Ya mere ọ na-adịkarị mma ka ndị ọrịa na-ekwulite okwu banyere ọnwụ, dị ka Jekọb, Devid, na Pọl mere.—Jenesis, isi nke 48 na 49; 1 Ndị Eze 2:1-10; 2 Timoti 4:6-8.

Otu Onyeàmà bụ́ dọkịta dere, sị: “Anyị aghaghị ịdị na-ekwu okwu banyere isiokwu a. Kemgbe m malitere ọrụ m, ahụtụbeghị ebe o meere onye ọrịa ihe ọma izochiri ya eziokwu ahụ bụ na ọ na-arịa ọrịa ga-egbu ya.” Otú o sina dị, ọ dị mkpa ka anyị ghọta ihe onye ọrịa ahụ n’onwe ya chọrọ ịmara, na mgbe ọ chọrọ iji mara nke a. Ụfọdụ ndị ọrịa na-egosi n’ụzọ doro anya na ha maara banyere ịdị nso nke ọnwụ ha, ọ dịkwa mkpa ka ha na-atụle echiche na mmetụta ha banyere nke a. Ọ na-eyi ka ndị ọzọ hà na-emesi ike inwe olileanya, ọ ga-adịkwa mma ka ndị enyi soro ha na-enwe olileanya.—Tụlee Ndị Rom 12:12-15.

Onye nọ n’ọnụ ọnwụ pụrụ inwe ike ọgwụgwụ ma ọ bụ mgbagwoju anya nke na ọ na-esiri ya ike ikpe ekpere. Eleghị anya ọ ga-akasị onye ọrịa dị otú ahụ obi ịmara site ná Ndị Rom 8:26, 27 na Chineke na-aghọta “ịsụ ude a na-apụghị ikwu.” Jehova maara na n’okpuru nrụgide dị otú ahụ mmadụ pụrụ inwe ihe isi ike n’ịchọta ihe ọ ga-ekwu n’ekpere.

Mgbe o kwere omume ọ dị mkpa isoro onye ọrịa kpee ekpere. Otu nwanna na-akọ, sị: “Mgbe nne m na-anwụ, bụrụkwa onye na-enweghị ume ikwu okwu, o gosipụtara site n’ịpịachi aka ya na ya chọrọ ka anyị soro ya kpee ekpere. Mgbe anyị kpesịrị ekpere, anyị bụrụ otu n’ime abụ Alaeze, n’ihi na nne m abụwo onye egwú na-amasị mgbe nile. Na mbụ, anyị abụpụtaghị ya abụpụta, e mesịa anyị ji olu dị nwayọọ na-abụpụta okwu ya. O doro anya na ọ tọrọ ya ụtọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na abụ ndị a nke anyị na-abụ ná ndụ anyị dị ka Ndịàmà Jehova nwere mmetụta ndị pụrụ isiri anyị ike ikwupụta ma ọ bụghị na anyị bụrụ ha.”

Ikwunyere onye na-anwụ anwụ okwu chọrọ ịhụnanya, akọ, na mmetụta. Onye ọbịa pụrụ ịkwadebe isiokwu ndị na-ewuli elu ma na-agba okwukwe ume ndị ọ ga-ekwu, o kwesịkwara ịmụrụ anya iji zere ikwu okwu na-adịghị mma banyere ndị ọzọ na nsogbu ha. Ọzọ, e kwesịrị ịhazi oge a ga-anọru ná nleta ahụ ịbụ nke ezi uche dị na ya na nke kwekọrọ ekwekọ. Ọ bụrụ na onye ọrịa ahụ yiri ka ọ̀ maghị onwe ya, ọ dị mma icheta na ọ ka pụrụ inwe ike ịnụ ihe ihe a na-ekwu. Ya mere lezie anya banyere ihe ị na-ekwu.

Ibu Ọrụ nke Anyị Na-enwekọ

Ilekọta ndị ọrịa na ndị agadi bụ ibu ọrụ dị arọ. Nye ndị ahụ nọ onye ọrịa ahụ nso karịsịa, ọ bụ ọrụ siri ike, ma n’anụ ahụ ma ná mmetụta uche. Nghọta na enyemaka sitere n’aka ndị ọzọ n’ọgbakọ dị mkpa ma kwesị ekwesị nye ha. Ndị na-elekọta ndị òtù ezinụlọ ma ọ bụ kwere ekwe ibe ha na-arịa ọrịa na-eme ihe ziri ezi, ọbụna ma à sị na ọ pụtara ịhapụ nzukọ ụfọdụ ma ọ bụ na òkè ha na-ekere n’ozi ubi adalata n’oge ụfọdụ. (Tụlee 1 Timoti 5:8.) A ga-agba ha ume site n’àgwà nghọta nke ndị nọ n’ọgbakọ. Mgbe ụfọdụ, nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị pụrụ inwe ike iweghara ọrụ ahụ nwa oge ka onye ọ bụ ọrụ ya inye nlekọta ahụ nwee ike ịga nzukọ ma ọ bụ itinye hour ole na ole na-enye ume ọhụrụ n’ọrụ nkwusa.

Otú ọ dị, ọ bụrụ na gị onwe gị bụ onye ahụ na-arịa ọrịa, ị pụrụ ime ihe. Enweghị olileanya na enweghị enyemaka n’ihe banyere nrịanrịa gị pụrụ ime ka obi jọọ gị njọ, ma obi ịdị njọ na-ekewapụ mmadụ n’ebe ndị ọzọ nọ ma na-achụpụ ndị ọzọ. Kama nke ahụ ị pụrụ ịgbalị ikwupụta ekele ma na-enye nkwado. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:18) Na-ekpere ndị ọzọ nọ n’ihe mgbu ekpere. (Ndị Kọlọsi 4:12) Na-atụgharị uche n’eziokwu ndị dị ebube nke Bible, sorokwa ndị ọbịa na-atụle ndị a. (Abụ Ọma 71:17, 18) Na-achọsi ike ịmata banyere ọganihu na-agba okwukwe ume nke ndị Chineke. (Abụ Ọma 48:12-14) Na-enye Jehova ekele maka ihe obi ụtọ ndị a na-emenụ. Ịtụgharị uche n’ihe ndị dị otú ahụ pụrụ, dị ka anyanwụ na-ada ada nke na-achapụta ọbụna ìhè nke dị omimi ma na-ekpo ọkụ karịa anyanwụ nke oge ehihie, inye oge ikpeazụ nke ndụ anyị ịma mma nile pụrụ iche.

Anyị nile kwesịrị ịgba mbọ ijigide olileanya ahụ nke na-eche uche anyị nche dị ka okpu agha, karịsịa n’oge ule. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:8) Ọ dị mma ịtụgharị uche n’olileanya mbilite n’ọnwụ nakwa ntọala ya siri ike. Anyị pụrụ ilepụ anya n’ọdịnihu site ná mmesi obi ike nakwa n’ịtụsi anya ike n’ụbọchị ahụ mgbe a na-agaghị enwe ọrịa ma ọ bụ adịghị ike ọzọ n’ihi ime agadi. Mgbe ahụ, ahụ ga-adị onye ọ bụla mma. Ọbụna ndị nwụrụ anwụ ga-alọghachi. (Jọn 5:28, 29) Ihe ndị a “a na-adịghị ahụ anya” ka anyị na-eji anya nke okwukwe anyị na obi anyị na-ahụ. Ya adịla mgbe ị ga-ewepụ anya gị na ha.—Aịsaịa 25:8; 33:24; Mkpughe 21:3, 4.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya