Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • cf isi 18 p. 182-191
  • “Na-eso M”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Na-eso M”
  • ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndụ Jizọs Bi n’Eluigwe Kemgbe Ọ Hapụrụ Ụwa
  • Iwe na Ọṅụ nke Eze Bụ́ Mesaya
  • Ndị Ji Ikwesị Ntụkwasị Obi Na-ejere Eze ahụ Ozi Na-enweta Ngọzi
  • Jizọs Kraịst Ònye Ka Ọ Bụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ị̀ Ga-anara Ịhụnanya Jisọs?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Olee Ihe Mere Anyị Ga-eji Na-eso “Kraịst”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’
cf isi 18 p. 182-191

ISI NKE IRI NA ASATỌ

“Na-eso M”

1-3. (a) Olee otú Jizọs si hapụ ndịozi ya, gịnịkwa mere na nke a adịghị mwute? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ịmụ banyere ndụ Jizọs bi n’eluigwe kemgbe ọ laghachiri ebe ahụ?

NDỊ ikom iri na otu guzokọta ọnụ n’otu ugwu. Ha ji ịhụnanya na mmasị na-ele onye mere ha iri na abụọ anya. Ọ dị ka mmadụ. Ma, n’ezie, ọ bụ Jizọs, mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ. Ugbu a, ọ ghọghachila onye kasị ike n’ime ụmụ Jehova ndị bụ́ mmụọ. Jizọs kpọkọtara ndịozi ya ka ya na ha nọkọọ nke ikpeazụ ya n’ebe a n’Ugwu Oliv.

2 Ugwu a bụ otu n’ime obere ugwu ndị jupụtara na nkume ndị na-acha nzụ nzụ, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Jeruselem ma a gafee Ndagwurugwu Kidrọn. N’ezie, ọ na-echetara Jizọs ọtụtụ ihe. Ọ bụ ná mkpọda ugwu a ka Betani dị, bụ́ ebe Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ. N’izu ole na ole gara aga, Jizọs si Betfeji nke dị nso gbara ịnyịnya banye Jeruselem dị ka onye nwere mmeri. Ma eleghị anya, ọ bụkwa n’Ugwu Oliv ka ogige Getsemeni dị, bụ́ ebe Jizọs nọ na-echegbu onwe ya ruo ọtụtụ awa tupu e jide ya. Ọ bụkwa n’otu ugwu a ka Jizọs na-akwadebe ugbu a ịhapụ ndị enyi ya na ndị na-eso ụzọ ya, ndị ha na ya kasị kpachie anya. O ji obiọma gwa ha okwu ikpeazụ ọ chọrọ ịgwa ha. Mgbe ahụ, o si n’ụwa gbagowe! Ndịozi ya guzoro n’ebe ahụ n’emegharịghị ahụ́, na-ele Nna ha ukwu ha hụrụ n’anya ka ọ na-abanye na mbara ígwé. N’ikpeazụ, ígwé ojii kpuchiri ya ka ha ghara ịhụkwa ya. Ha ahụghịkwa ya anya ọzọ.—Ọrụ 1:6-12.

3 Ì chere na otú akụkọ a si gwụ adịchaghị mma, na otú o si hapụ ha dị mwute? I kwesịghị iche otú ahụ. N’ezie, dị ka ndị mmụọ ozi abụọ chetaara ndịozi ahụ, akụkọ banyere Jizọs agwụbeghị. (Ọrụ 1:10, 11) N’ọtụtụ ụzọ, ọlịla ọ lawara n’eluigwe bụ naanị mmalite. Okwu Chineke ahapụghị ịgwa anyị ihe ọzọ mere Jizọs. Ịmụ banyere ndụ Jizọs bi n’eluigwe kemgbe ọ hapụrụ ụwa dị mkpa. N’ihi gịnị? Cheta okwu Jizọs gwara Pita, sị: “Na-eso m.” (Jọn 21:19, 22) Anyị niile kwesịrị irube isi n’iwu ahụ, ọ bụghị naanị dị ka ihe anyị kpebiri ime nwa oge, kama dị ka otú anyị ga-esi na-ebi ndụ. Iji mee nke a, anyị kwesịrị ịghọta ihe Nna anyị ukwu na-eme ugbu a na ọrụ e nyere ya n’eluigwe.

Ndụ Jizọs Bi n’Eluigwe Kemgbe Ọ Hapụrụ Ụwa

4. Olee otú Baịbụl si buru ụzọ kpughee ihe ga-eme n’eluigwe mgbe Jizọs laghachiri ebe ahụ?

4 Akwụkwọ Nsọ akọghị ihe mere mgbe Jizọs ruru n’eluigwe, otú e si nabata ya, na ọṅụ ya na Nna ya nwere mgbe ọ lakwuuru Ya. Otú ọ dị, Baịbụl bu ụzọ kpughee ihe ga-eme n’eluigwe obere oge Jizọs laghachiri n’ebe ahụ. Ndị Juu ahụwo ka a na-eme ememme dị nsọ kwa afọ ruo ihe karịrị narị afọ iri na ise. Otu ụbọchị n’afọ ọ bụla, nnukwu onye nchụàjà na-abanye n’Ebe Kasị Nsọ n’ụlọ nsọ ka o fesa ọbara anụ ndị e ji chụọ àjà n’Ụbọchị Ikpuchi Mmehie n’ihu igbe ọgbụgba ndụ. N’ụbọchị ahụ, nnukwu onye nchụàjà nọchiri anya Mesaya. Mgbe Jizọs laghachiri n’eluigwe, o mezuru naanị otu ugboro ihe e ji ememme ahụ buo amụma ya. Ọ batara n’ihu Jehova, bụ́ ebe dị ebube n’eluigwe—ebe kasị nsọ n’eluigwe na ụwa—wee chee uru nke àjà mgbapụta ya n’ihu Nna ya. (Ndị Hibru 9:11, 12, 24) Jehova ọ̀ nabatara ya?

5, 6. (a) Olee ihe gosiri na Jehova nabatara àjà mgbapụta Kraịst? (b) Olee ndị na-erite uru n’àjà mgbapụta ahụ, oleekwa otú ha si erite uru ahụ?

5 Anyị ga-ahụ azịza ya site n’ịtụle ihe mere ụbọchị ole na ole mgbe Jizọs rịgosịịrị n’eluigwe. Obere ìgwè Ndị Kraịst ndị dị otu narị mmadụ na iri abụọ zukọtara na Jeruselem n’otu ọnụ ụlọ nke dị n’elu otu ụlọ elu. Na mberede, ụzụ nke dị ka oké ifufe nke na-efesi ike juru ebe ahụ. Ihe dị ka ire ọkụ pụtara n’elu isi ha, ha wee jupụta na mmụọ nsọ. Ha wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche. (Ọrụ 2:1-4) Ihe a merenụ gosiri na a mụwo mba ọhụrụ, ya bụ, Izrel ime mmụọ, nke bụ́ ‘agbụrụ ọhụrụ nke Chineke họọrọ’ na “òtù ndị nchụàjà bụ́ ndị eze” ka ha wee na-eme uche Chineke n’ụwa. (1 Pita 2:9) O doro anya na Jehova bụ́ Chineke nabatara àjà mgbapụta Kraịst, ọ masịkwara ya. Mmụọ nsọ a ọ wụkwasịrị ha bụ otu n’ime ngọzi mbụ bịaara ha n’ihi ihe mgbapụta ahụ.

6 Kemgbe ahụ, ihe mgbapụta ahụ Kraịst nyere abaworo ndị na-eso ụzọ ya uru n’ụwa dum. Ma ànyị so ‘n’ìgwè atụrụ nta’ e tere mmanụ, bụ́ ndị ha na Kraịst ga-achị n’eluigwe, ma ànyị so ‘n’atụrụ ọzọ,’ bụ́ ndị ga-adị ndụ n’ụwa mgbe ọ ga na-achị, àjà ahụ ọ chụrụ ga-abara anyị uru. (Luk 12:32; Jọn 10:16) Ọ bụ ya mere ka anyị nwee olileanya. Ọ bụ ya na-emekwa ka a gbaghara anyị mmehie anyị. Ọ bụrụhaala na anyị anọgide ‘na-enwe okwukwe’ n’ihe mgbapụta ahụ, na-eso Jizọs kwa ụbọchị, anyị pụrụ inwe akọ na uche dị ọcha, na olileanya magburu onwe ya maka ọdịnihu.—Jọn 3:16.

7. Olee ikike e nyere Jizọs mgbe ọ laghachiri n’eluigwe, oleekwa otú anyị pụrụ isi na-akwado ya?

7 Olee ihe Jizọs na-eme n’eluigwe kemgbe ahụ ọ laghachiri ebe ahụ? O nwere ikike dị ukwuu. (Matiu 28:18) N’ezie, Jehova họpụtara ya ka ọ chịwa ọgbakọ Ndị Kraịst, nke bụ́ ọrụ o ji ịhụnanya na-arụ n’ụzọ ziri ezi. (Ndị Kọlọsi 1:13) Dị ka e buru n’amụma, Jizọs emewo ka e nwee ndị ikom ruru eru ndị ga na-egboro ìgwè atụrụ ya mkpa ha. (Ndị Efesọs 4:8) Dị ka ihe atụ, ọ họọrọ Pọl ka ọ bụrụ “onyeozi nke ndị mba ọzọ,” zipụ ya ka ọ gaa kwusaa ozi ọma n’ala ndị dị anya. (Ndị Rom 11:13; 1 Timoti 2:7) Mgbe narị afọ mbụ gwụchawara, Jizọs zigaara ọgbakọ asaa ndị dị n’ógbè ndị Rom dị n’Eshia ozi ịja mma, dụọ ha ọdụ, gbaziekwa ha. (Mkpughe, isi nke abụọ na nke atọ) Ị̀ ghọtara na Jizọs bụ Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst? (Ndị Efesọs 5:23) Iji nọgide na-eso ya, i kwesịrị ịgba ndị nọ n’ọgbakọ unu ume ka ha na-erube isi, na-anabatakwa ntụziaka.

8, 9. Olee ikike e nyere Jizọs n’afọ 1914, oleekwa otú nke ahụ kwesịrị isi metụta mkpebi anyị na-eme?

8 E nyekwuru Jizọs ikike n’afọ 1914. N’afọ ahụ, a họpụtara ya ka ọ bụrụ Eze nke Alaeze Mesaya nke Jehova. Mgbe Jizọs malitere ịchị, ‘agha dara n’eluigwe.’ Gịnị si na ya pụta? A chụdara Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. Nke a mere ka e nwee oge ahụhụ. Agha, ime mpụ, oké ụjọ, ọrịa, ala ọma jijiji, na ụnwụ, nke juru ebe niile, nke mekpọworo ụmụ mmadụ ọnụ n’oge a, na-echetara anyị na Jizọs na-achị n’eluigwe ugbu a. Setan ka bụ “onye na-achị ụwa a.” Ma, “o nwere oge dị mkpirikpi.” (Mkpughe 12:7-12; Jọn 12:31; Matiu 24:3-7; Luk 21:11) Otú ọ dị, Jizọs na-enye ndị mmadụ n’ụwa dum ohere ịnabata ọchịchị Ya.

9 Ọ dị mkpa ka anyị kwadoo Eze ahụ bụ́ Mesaya. Ná mkpebi niile anyị na-eme kwa ụbọchị, anyị kwesịrị ịchọ ime ihe dị ya mma, ọ bụghị ime ihe dị ụwa a rụrụ arụ mma. Ka “Eze nke ndị eze” a na-eleru ụmụ mmadụ anya, iwe na ọṅụ na-ejupụta obi ezi omume ya. (Mkpughe 19:16) N’ihi gịnị?

Iwe na Ọṅụ nke Eze Bụ́ Mesaya

10. Olee ụdị onye Jizọs bụ, ma, olee ihe mere iwe ezi omume ji ju Nna anyị ukwu obi?

10 Dị ka Nna ya, Nna anyị ukwu bụ onye obi ụtọ. (1 Timoti 1:11) Mgbe Jizọs bụ mmadụ, ọ bụghị onye na-akatọ ndị mmadụ. Ọ bụghịkwa onye ọ na-esi ike ime ihe dị ya mma. N’agbanyeghị nke a, e nwere ọtụtụ ihe na-eme n’ụwa taa ndị na-aghaghị ime ka iwe ezi omume ju ya obi. N’ezie, ọ na-eweso òtù okpukpe niile iwe bụ́ ndị na-ekwu n’ọnụ efu na ha na-anọchite anya ya. O buru nke a n’amụma, sị: ‘Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, “Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,” ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya. Ọtụtụ mmadụ ga-asị m n’ụbọchị ahụ, “Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, ọ̀ bụ na anyị . . arụghị ọtụtụ ọrụ dị ike n’aha gị?” Ma mgbe ahụ, m ga-ekwupụtara ha, sị: Ọ dịghị mgbe m maara unu! Sinụ n’ebe m nọ pụọ, unu ndị ọrụ mmebi iwu.’—Matiu 7:21-23.

11-13. Gịnị mere okwu siri ike Jizọs gwara ndị na-arụ “ọtụtụ ọrụ dị ike” n’aha ya pụrụ iji ju ụfọdụ ndị anya, ma, gịnị mere iwe ji ewe ya? Nye ihe atụ.

11 Okwu ndị ahụ pụrụ iju ọtụtụ ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst anya. Gịnị mere Jizọs ji gwa ndị na-arụ “ọtụtụ ọrụ dị ike” n’aha ya ụdị okwu a? Chọọchị ndị so na Krisendọm akwadowo òtù dị iche iche na-emepụrụ ndị ụwa na-atụ n’ọnụ, nyere ndị ogbenye aka, wuo ụlọ ọgwụ na ụlọ akwụkwọ, rụọkwa ọtụtụ ọrụ ndị ọzọ. Iji mata ihe mere Jizọs ji eweso ha iwe, tụlee ihe atụ a.

12 Otu nne na nna chọrọ ịga njem. Ma, ha apụghị ịkpọrọ ụmụ ha gaa. Ya mere, ha kpọtara onye ga-elekọtara ha ụmụ ha, kwụọkwa ya ụgwọ. Ha nyere onye ahụ ntụziaka doro anya, sị: “Lekọtara anyị ụmụ anyị. Na-enye ha nri. Na-asa ha ahụ́. Ekwela ka ihe ọ bụla merụọ ha ahụ́.” Ma, mgbe nne na nna ahụ lọtara, o juru ha anya ịhụ na agụụ na-agụgbu ụmụ ha. Ha ruru unyi, na-arịa ọrịa. Ha na-ahụsikwa anya. Ha na-akwa ákwá ka onye ahụ na-elekọta ha lebara ha anya. Ma, ọ tụpụrụghị ha ọnụ. N’ihi gịnị? Ọ rịkwasịrị n’elu ubube, na-ehichasị windo. Nne na nna ahụ were iwe wee jụọ ya ihe mere o ji leghara ụmụaka ahụ anya. Ọ gwara ha, sị: “Leenụ ọrụ niile m rụrụ! Ọ̀ bụ na windo unu adịghị ọcha? E nwekwara ebe ndị m rụziri n’ụlọ unu! M mere ihe a niile n’ihi unu!” Obi ọ̀ ga-adajụ nne na nna ahụ? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ dịghị mgbe ha gwara ya ka ọ rụọ ọrụ ndị ahụ; ihe ha chọrọ naanị bụ ka o lekọta ụmụ ha. Iwe were ha maka na ọ jụrụ ime ihe ha gwara ya.

13 Krisendọm emewo ihe yiri ihe onye ahụ na-elekọta ụmụaka mere. Jizọs nyere ndị nnọchiteanya ya ntụziaka ka ha na-enye ndị mmadụ nri ime mmụọ site n’ịkụziri ha eziokwu nke Okwu Chineke na inyere ha aka ka ha dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ. (Jọn 21:15-17) Ma, Krisendọm kụrụ afọ n’ala. Ha erubeghị isi ná ntụziaka ya. Ha hapụrụ ndị mmadụ ka agụụ ime mmụọ na-agụgbu ha, ebe ozizi ụgha mere ka ha nọrọ ná mgbagwoju anya, ha amaghịkwa eziokwu bụ́ isi nke Baịbụl. (Aịzaya 65:13; Emọs 8:11) Ọbụna mgbalị ha na-eme ka ụwa a dị mma apụghị ime ka isi ha kpachaara anya na-enupụ zie ezi. N’ezie, ụwa ochie Setan dị ka ụlọ a ga-akwatu akwatu! Okwu Chineke mere ka o doo anya na a ga-ebibi ụwa ochie a n’oge na-adịghị anya.—1 Jọn 2:15-17.

14. Olee ọrụ na-eme ka Jizọs nwee obi ụtọ taa, n’ihi gịnịkwa?

14 N’aka nke ọzọ, ọ ghaghị ịbụ na obi na-atọ Jizọs ụtọ nke ukwuu ma ọ bụrụ na o si n’eluigwe ledata anya wee hụ na ọtụtụ nde mmadụ na-arụ ọrụ ime ndị na-eso ụzọ nke o nyere ndị na-eso ụzọ ya ka ha rụwa mgbe ọ na-ahapụ ụwa. (Matiu 28:19, 20) Lee ihe ùgwù ọ bụ ime ka Mesaya ahụ bụ́ Eze nwee aṅụrị! Ka anyị kpebisie ike na anyị agaghị ada mbà n’inyere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” aka. (Matiu 24:45) Mmadụ ole na ole ndị a e tere mmanụ adịghị ka ndị ụkọchukwu Krisendọm. Ha rubeere Jizọs isi ma na-eduzi ọrụ ikwusa ọma, jirikwa ikwesị ntụkwasị obi na-enye atụrụ Kraịst nri.

15, 16. (a) Olee otú obi dị Jizọs banyere enweghị ịhụnanya nke juru ebe niile taa, oleekwa otú anyị si mara nke a? (b) Olee otú Krisendọm si kpasuo Jizọs iwe?

15 O doro anyị anya na Eze a na-ewe iwe mgbe ọ hụrụ enweghị ịhụnanya nke juru n’ụwa taa. Anyị pụrụ icheta otú ndị Farisii si katọọ Jizọs maka na ọ gwọrọ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike. Obi kpọrọ ha nkụ, ha na-agbakwa isi akwara, nke na naanị ihe ha maara bụ otú ahụ ha si akọwa Iwu Mozis na iwu ha a na-edeghị ede. Ọrụ ebube Jizọs rụrụ baara ndị mmadụ uru nke ukwuu! Ma, ọṅụ na ahụ́ iru ala ọrụ ebube ahụ mere ka ndị mmadụ nwee na otú o si mee ka okwukwe ha sie ike emetụghị ndị ikom ahụ n’obi. Olee otú Jizọs si lee ha anya? Otu mgbe, o ‘lere anya gburugburu n’iwe, o wee wute ya nke ukwuu na ha bụ ndị ihe na-adịghị emetụ n’obi.’—Mak 3:5.

16 Taa, Jizọs na-ahụ ọtụtụ ihe ndị ‘na-ewute ya nke ukwuu’ karị. Ịgbaso ọdịnala na ozizi ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị emeela ka ndị ndú Krisendọm kpuo ìsì. Ozi ọma alaeze Chineke a na-ekwusa na-akpasukwa ha iwe. N’ọtụtụ ebe n’ụwa, ndị ụkọchukwu akpataworo Ndị Kraịst ahụ ji ezi obi na-agbalị izisa ozi ahụ Kraịst kwusara mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ. (Jọn 16:2; Mkpughe 18:4, 24) Ọtụtụ mgbe, ndị ụkọchukwu ahụ na-agbakwa ndị òtù ha ume ka ha gaa agha gbuo ndị ọzọ—dị ka à ga-asị na ime otú ahụ ga-amasị Jizọs Kraịst!

17. Olee otú ezi ndị na-eso ụzọ Jizọs si eme ka obi ya ṅụrịa?

17 Ezi ndị na-eso Jizọs na-eme ihe dị iche. Ha na-ahụ mmadụ ibe ha n’anya. Ha na-ekwusara “ụdị mmadụ niile” ozi ọma dị nnọọ ka Jizọs mere, n’agbanyeghị mmegide. (1 Timoti 2:4) Otú ha si ahụ ibe ha n’anya pụrụ iche; ịhụnanya bụ isi ihe e ji amata ha. (Jọn 13:34, 35) Ebe ha na-eji ịhụnanya, nsọpụrụ, na nkwanye ùgwù emeso Ndị Kraịst ibe ha ihe, n’ezie, ha na-eso Jizọs—na-emekwa ka obi Mesaya ahụ bụ́ Eze ṅụrịa!

18. Olee ihe na-ewute Nna anyị ukwu, ma olee otú anyị pụrụ isi mee ya obi ụtọ?

18 Ka anyị chetakwa na ọ na-ewute Nna anyị ukwu mgbe ọ bụla ndị na-eso ụzọ ya na-atachighị obi, mgbe ha kwere ka ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova nọ jụọ oyi nakwa mgbe ha dara mbà ghara ijekwara Ya ozi. (Mkpughe 2:4, 5) Otú ọ dị, ndị tachiri obi ruo ọgwụgwụ na-eme ka obi tọọ Jizọs ụtọ. (Matiu 24:13) Ya mere, ka anyị gbalịa mgbe niile iburu iwu ahụ Kraịst nyere n’obi, sị: “Na-eso m.” (Jọn 21:19) Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ngọzi ndị Mesaya ahụ bụ́ Eze ga-enye ndị tachiri obi ruo ọgwụgwụ.

Ndị Ji Ikwesị Ntụkwasị Obi Na-ejere Eze ahụ Ozi Na-enweta Ngọzi

19, 20. (a) Olee ngọzi a na-enweta ugbu a n’iso Jizọs? (b) Olee otú iso Kraịst pụrụ isi gbooro anyị mkpa anyị nwere maka nna?

19 Iso Jizọs bụ ụzọ mmadụ pụrụ isi bie ndụ bara uru n’ezie ugbu a. Ọ bụrụ na anyị anabata Kraịst dị ka Nna anyị ukwu, na-agbaso ntụziaka ya, werekwa ihe nlereanya ya dị ka ihe na-eduzi anyị, anyị ga-enweta akụ̀ nke ndị mmadụ n’ụwa dum na-achọgharị n’efu. Anyị ga-enwe ọrụ nke ga-eme ka ndụ anyị nwee nzube na ezinụlọ nke bụ́ ndị kwere ekwe ibe anyị ndị e jikọrọ anyị na ha n’ezi ihe nkekọ bụ́ ịhụnanya, nweekwa akọ na uche dị ọcha, na obi iru ala. E kwuo ya ná nkenke, ndụ anyị ga-abụ nke obi ụtọ na nke na-eju afọ. A ka nwekwara uru ndị ọzọ anyị ga-erite.

20 Jehova nyere Jizọs ka ọ bụụrụ ndị nwere olileanya ibi ndụ ebighị ebi n’ụwa “Nna Mgbe Ebighị Ebi.” E ji Jizọs dochie anya nna ụmụ mmadụ, bụ́ Adam, onye tinyere ụmụ ya niile ná nsogbu. (Aịzaya 9:6, 7) Ọ bụrụ na anyị anabata Jizọs dị ka “Nna Mgbe Ebighị Ebi” anyị, nwee okwukwe n’ebe ọ nọ, anyị ga-enwe olileanya ndụ ebighị ebi e ji n’aka. Anyị ga-esikwa otú ahụ bịaruo Jehova bụ́ Chineke nso karị. Dị ka anyị mụtara, anyị ịgba mbọ iso ihe nlereanya Jizọs kwa ụbọchị bụ ụzọ kasị mma anyị pụrụ isi rube isi n’iwu a nke si n’aka Chineke: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.”—Ndị Efesọs 5:1.

21. Olee otú ndị na-eso ụzọ Kraịst si enwupụta ìhè n’ụwa a gbara ọchịchịrị?

21 Ka anyị na-eṅomi Jizọs na Nna ya, bụ́ Jehova, anyị na-enwe ihe ùgwù magburu onwe ya. Anyị na-enwupụta ìhè. N’ụwa nke ọchịchịrị kpuchiri, bụ́ ebe Setan na-eduhie ọtụtụ ijeri mmadụ, ha ana-eṅomikwa àgwà ya, anyị onwe anyị bụ́ ndị na-eso Kraịst na-eme ka ìhè na-enwusi ike n’ebe niile, ya bụ, ìhè nke eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ, ìhè nke àgwà ọma Ndị Kraịst, ìhè nke ezi ọṅụ, ezi udo, na ezi ịhụnanya. Anyị na-abịarukwu Jehova nso, nke bụ́ ihe mgbaru ọsọ kasị mkpa, ebumnobi kasịnụ, nke onye ọ bụla e kere eke kwesịrị inwe.

Ihe Osise dị na peeji nke 190

22, 23. (a) Olee ngọzi ndị na-esosi Jizọs ike ga-enweta n’ọdịnihu? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

22 Cheekwa echiche banyere ihe Jehova chọrọ imere gị n’ọdịnihu site n’aka Mesaya ya bụ́ Eze. N’oge na-adịghị anya, Eze ahụ ga-ebuso ajọ usoro ihe Setan agha ezi omume. E ji n’aka na Jizọs ga-emeri! (Mkpughe 19:11-15) E mesịa, Kraịst ga-amalite Ọchịchị Otu Puku Afọ ọ ga-achị ụwa. Ọchịchị ọ ga-anọ n’eluigwe na-achị ga-eme ka ụmụ mmadụ niile kwesịrị ntụkwasị obi rite uru n’ihe mgbapụta ahụ, mee ka ha zuo okè. Jiri anya nke uche gị hụrụ ebe i nwere ezi ahụ́ ike, dịrị ka okorobịa ma ọ bụ agbọghọbịa ma gbasie ike, were obi ụtọ soro ezinụlọ ụmụ mmadụ dị n’otu na-arụ ọrụ iji mee ka ụwa a bụrụ paradaịs! Mgbe Ọchịchị Otu Puku Afọ ahụ gwụrụ, Jizọs ga-enyefe ọchịchị n’aka Nna ya. (1 Ndị Kọrịnt 15:24) Ọ bụrụ na i sosie Kraịst ike, ọ ga-eme ka i nweta ngọzi magburu onwe ya nke ị na-apụghị ichetụdị n’echiche, ya bụ, “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke”! (Ndị Rom 8:21) N’ezie, anyị ga-enweta ngọzi niile Adam na Iv nweburu ma tufuo. Anyị ga-aghọ ụmụ Jehova ndị ikom na ndị inyom ndị nọ n’ụwa, nwere onwe anyị kpamkpam nke na mmehie Adam agakwaghị emetụta anyị. N’eziokwu, “ọnwụ agaghị adị ọzọ.”—Mkpughe 21:4.

23 Ì chetara nwa okorobịa ahụ na-achị achị nke bara ọgaranya anyị tụlere ihe banyere ya n’Isi nke Mbụ? Ọ zaghị òkù ahụ Jizọs kpọrọ ya, sị: ‘Bịa bụrụ onye na-eso ụzọ m.’ (Mak 10:17-22) Ya adịla mgbe ị ga-emehie ihe otú ahụ o mere! Jiri ọṅụ na ịnụ ọkụ n’obi za òkù ahụ Jizọs kpọrọ. Kpebisie ike ịtachi obi, ịnọgide na-eso Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ kwa ụbọchị, kwa afọ, ka i wee dịrị ndụ hụ mgbe ọ ga-emesị mezuo nzube niile nke Jehova n’ụzọ dị ebube!

Olee Otú Ị Pụrụ Isi Soro Jizọs?

  • Olee ihe ga-enyere gị aka ime ka echiche gị kwekọọ na nke Kraịst?—1 Ndị Kọrịnt 2:13-16.

  • Olee ụzọ dị iche iche i bu n’obi isi sochie Jizọs anya?—1 Pita 2:21.

  • Gịnị ka ị ga-eme ka ịhụnanya ị hụrụ Jizọs ghara ịjụ oyi?—Mkpughe 3:14-18.

  • Olee otú ị pụrụ isi gosi na ị chọrọ n’ezie ka Kraịst chịa ụwa n’oge na-adịghị anya?—Mkpughe 22:17, 20.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya