AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 IHE E MERE 33-36
Jehova Na-agbaghara Onye Ji Obi Ya Niile Chegharịa
Nke E Biri Ebi
MANASE
Jehova hapụrụ ndị Asiria ka ha tụọ ya ịgà, kpụrụ ya gaa Babịlọn
TUPU A KPỤRỤ YA
Ọ rụụrụ chi ụgha dị iche iche ebe ịchụàjà
O ji ụmụ ya chụọ àjà
O gburu ndị aka ha dị ọcha
O mere ka ndị obodo ya niile na-eme mgbaasị
MGBE O SI BABỊLỌN LỌTA
O wedara onwe ya ala
Ọ rịọrọ Jehova mgbaghara, chụọkwara ya àjà
O bibiri ebe ịchụàjà ọ rụụrụ chi ụgha dị iche iche
Ọ gbara ndị Izrel ume ka ha fewe Jehova
JOSAYA
MGBE Ọ NA-ACHỊ
O fere Jehova
O mere ka Juda na Jeruselem kwụsị ikpere arụsị
Ọ rụziri ụlọ Jehova, chọtakwa akwụkwọ Iwu Jehova