Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 8/8 p. 13-19
  • Dịkwuo Ogologo Ndụ ma Nwee Ahụ Ịdị Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Dịkwuo Ogologo Ndụ ma Nwee Ahụ Ịdị Mma
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịmata Ihe Mgbochi Ndị Ahụ
  • Àgwà Ndị Na-emetụta Ndụ Gị
  • Gburugburu Ebe Obibi Na-akpata Mgbanwe
  • E Nwere—Nlekọta Ahụ Ike Dị Ọnụ Ala nke Nwere Ọ̀tụ̀tụ̀ Ọgwụgwọ Dị Elu
  • Ụzọ Ọhụrụ E Si Alụ Ọgụ Megide Ụkwara Nta
    Teta!—1999
  • Mmeri na Ọdachi
    Teta!—1998
  • Ngwọta Zuru Ụwa Ọnụ—Ò Kwere Omume?
    Teta!—1998
  • Àgwà Na-agbanwe Agbanwe n’Ebe Ime Agadi Dị
    Teta!—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 8/8 p. 13-19

Dịkwuo Ogologo Ndụ ma Nwee Ahụ Ịdị Mma

KA E were ya na ndụ mmadụ bụ ọsọ asọmpi—ọsọ ndị na-agba ya na-awụfe ọtụtụ ihe mgbochi. Ndị nile na-agba ọsọ na-amalite ọsọ ahụ n’otu oge; ma ka ha na-awụfe ma na-akụtụ ụkwụ n’ihe mgbochi ndị ahụ, ndị ahụ na-agba ọsọ na-ala azụ, ọnụ ọgụgụ na-ebuwanye ibu na-akwụsịkwa.

N’otu aka ahụ, ndụ mmadụ nwere mmalite na ihe mgbochi ndị dị elu ka ọ na-aga n’ihu. Mmadụ na-ezute ihe mgbochi otu otu ná ndụ ya. Nke ọ bụla ọ wụfere na-eme ka ike gwụkwuo ya, ka oge na-agakwa, ọ na-akwụsị. Ka ihe mgbochi ndị ahụ na-adị elu karị, otú ahụ ka ọ ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya, ma ọ bụ nwụọ. Ọ bụrụ na mmadụ bi ná mba mepere emepe, ebe a na-akwụsị bụ ihe dị ka n’afọ 75. A na-akpọ oge a nkezi oge ndụ mmadụ—nke a pụrụ iji tụnyere ebe ihe ka ọtụtụ ná ndị na-agba ọsọ na-agbaru n’ezie.a (Tụlee Abụ Ọma 90:10.) Otú ọ dị, ụfọdụ ndị mmadụ na-agbafe ya, ọbụna ole na ole na-eru ihe e chere na ọ bụ oge ndụ mmadụ kasị ogologo, bụ́ 115 ruo 120—ihe siri ike a na-adịghị ahụkebe nke na ọ na-abụ isi akụkọ.

Ịmata Ihe Mgbochi Ndị Ahụ

Ugbu a ndị mmadụ pụrụ ịnọgide n’ọsọ ahụ ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu abụọ karịa otú ha pụrụ ịnọru na ya ná mmalite narị afọ a. N’ihi gịnị? N’ụzọ bụ́ isi, n’ihi na mmadụ enwewo ike iwetulata ihe mgbochi ndị ahụ. Otú ọ dị, gịnị bụ ihe mgbochi ndị a? À pụkwara ọbụna iwetulatakwu ha?

Otu ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike ọha na eze nke Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) kọwara na ụfọdụ n’ime ihe mgbochi ndị ahụ, ma ọ bụ ihe ndị na-emetụta afọ ndụ mmadụ nwere ike iru bụ àgwà, gburugburu ebe obibi, na nlekọta ahụ ike.b N’ihi ya, ka àgwà gị na-adị mma karị, gburugburu ebe obibi gị ana-adị mma karị, nlekọta ahụ ike gị ana-adịkwa mma karị, otú ahụ ka ihe mgbochi ndị ahụ ga-adị ala karị, otú ahụ ka ndụ gị pụkwara ịdị ogologo karị. Ọ bụ ezie na ọnọdụ ndị mmadụ dịgasị nnọọ iche, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile—site n’onyeisi ụlọ akụ̀ na Sydney ruo n’onye na-ere ihe n’okporo ámá na São Paulo—pụrụ ime ihe iji wetulata ihe mgbochi ndị ahụ ná ndụ ya. N’ụzọ dị aṅaa?

Àgwà Ndị Na-emetụta Ndụ Gị

“Ọ bụghị nanị na ndị nwere àgwà na-akwalite ahụ ike karị na-adị ogologo ndụ karị, kama n’ebe ndị dị otú ahụ nọ, nkwarụ na-ewerekwa ọnọdụ n’oge dị n’ihu nanị n’ime afọ ole na ole n’oge ọgwụgwụ nke ndụ ha,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New England Journal of Medicine na-akọ. N’ezie, a pụrụ iwetulata ihe mgbochi nke mbụ site n’ịgbanwe àgwà ndị dị ka iri nri, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, ihi ụra, ise siga, na imega ahụ. Were àgwà mmega ahụ dị ka ihe atụ.

Àgwà mmega ahụ. Mmega ahụ na-agabigaghị ókè na-aba nnọọ uru. (Lee igbe bụ́ “Mmega Ahụ Hà Aṅaa na Ụdị Dị Aṅaa?”) Nnyocha na-egosi na mmega ahụ ndị dị mfe a nọ n’ụlọ ma ọ bụ gburugburu ya na-eme na-enyere ndị mere agadi aka, gụnyere ‘ndị kasị mee agadi,’ inwetaghachi ume na ike. Dị ka ihe atụ, otu ìgwè ndị mere okenye dị site n’afọ 72 ruo 98 chọpụtara na ha pụrụ ịgasikwu ike na ịrịgo steepụ n’ụzọ dị mfe karị mgbe ha nwesịrị mmega ahụ nke ibuli ihe dị arọ ruo nanị izu iri. Ọ bụghị ihe ijuanya! Nnwale ndị e mere mgbe ihe omume mmega ahụ ahụ gasịrị gosiri na ikike uru ahụ nke ndị ahụ keere òkè na ya jiri ihe karịrị okpukpu abụọ mụbaa. Ìgwè ọzọ nke ihe ka ọtụtụ ná ndị mejupụtara ya bụ ndị inyom dị ihe ruru afọ 70 bụ́ ndị na-anọkarị otu ebe, megara ahụ ugboro abụọ n’izu. Mgbe otu afọ gasịrị, uru ahụ ha bukwuru ibu, nwekwuokwa ume, harakwuokwa nhata n’ịdị arọ, ọkpụkpụ ha adịkwuokwa arọ. “Mgbe anyị malitere, anyị na-atụ egwu na anyị ga-adọbi akwara, dọwaa uru ahụ,” ka ọkà mmụta ahụ mmadụ bụ́ Miriam Nelson, bụ́ onye mere nnyocha ahụ, kwuru. “Kama nke ahụ ndị inyom ahụ sikwuru ike, nwekwuo ahụ ike.”

N’ịchịkọta ihe ndị a chọpụtara n’ọtụtụ ihe ọmụmụ sayensị ndị e mere n’ihe banyere ime agadi na imega ahụ, otu akwụkwọ na-ekwu, sị: “Imega ahụ na-adọla usoro ime agadi azụ, na-agbatị ndụ, ma na-ebelata oge ịdabere n’onye ọzọ bụ́ nke na-ebutekarị ọnwụ ụzọ.”

Àgwà iji ụbụrụ eme ihe. Ilu ahụ bụ́ “Ma i jighị ya mee ihe o funahụ gị” yiri ka ọ dabara adaba ọ bụghị nanị n’ihe banyere uru ahụ kamakwa n’uche. Ọ bụ ezie na ichefu ihe na-aka ime agadi akara, nnyocha Ụlọ Ọrụ Mba Na-ahụ Maka Ime Agadi nke United States mere na-egosi na ụbụrụ ndị mere okenye na-anọgide na-adị nkọ ịnagide mmetụta nke ime agadi. N’ihi ya, prọfesọ ná nkà mmụta akwara ozi bụ́ Dr. Antonio R. Damasio na-ekwubi, sị: “Ndị mere okenye pụrụ ịnọgide na-ebi nnọọ ndụ nwere nzube ma nwee ụbụrụ dị mma.” Gịnị na-eme ka ụbụrụ ndị mere okenye nọgide na-adị nkọ?

Ụbụrụ nwere 100 ijeri mkpụrụ ndụ, ma ọ bụ akwara ozi ụbụrụ, na ọtụtụ puku ijeri ihe ndị jikọtara ha. Ihe ndị a jikọtara ha na-arụ ọrụ dị ka eriri telifon na-enyere akwara ozi ụbụrụ aka ‘ịgwarịta’ ibe ha okwu iji mee ka e nweta, tinyere ihe ndị ọzọ, ikike ncheta. Ka ụbụrụ na-eme ochie, akwara ozi ya na-anwụ. (Lee igbe bụ́ “Echiche Ọhụrụ Banyere Mkpụrụ Ndụ Ụbụrụ.”) Ma, ụbụrụ ndị mere okenye nwere ike idochi akwara ozi ya ndị nwụrụ anwụ. Mgbe ọ bụla akwara ozi ụbụrụ nwụrụ, ndị dị ya nso ga-eme ihe site n’ijikọta onwe ha ọzọ n’akwara ozi ụbụrụ ndị ọzọ na ịrụ ọrụ dịịrị akwara ozi ahụ nwụrụ anwụ. N’ụzọ dị otú ahụ, ụbụrụ na-ewere ibu ọrụ dịịrị otu akụkụ ya nyefee akụkụ ya ọzọ. N’ihi ya, ọtụtụ ndị mere okenye na-arụzu otu ọrụ ụbụrụ ndị ahụ ndị na-emebeghị okenye na-arụzu ma ha pụrụ iji akụkụ ụbụrụ ndị dị iche na-eme otú ahụ. N’akụkụ ụfọdụ, ụbụrụ ndị mere okenye na-arụtụ ọrụ dị ka onye bụ́ aka ochie n’ịpịa tennis bụ́ onye na-eji nkà ndị ọ pụrụ ịbụ na ndị malitere ịpịa tennis ọhụrụ enweghị edochi anya adịkwaghị gara gara ya. Ma, n’agbanyeghị iji nkà ndị dị iche na nke ndị ọ tọrọ, onye ahụ bụ́ aka ochie na-enwetakwa akara.

Gịni ka ndị mere okenye pụrụ ime iji nọgide na-enweta akara ahụ? Mgbe o nyochasịrị ihe karịrị 1,000 mmadụ dị site n’afọ 70 ruo 80, onye na-enyocha nkà mmụta ime agadi bụ́ Dr. Marilyn Albert chọpụtara na iji ụbụrụ eme ihe bụ otu n’ime ihe ndị na-ekpebi ìgwè ndị mere agadi na-adịghị etufu nkà ọgụgụ isi ha. (Lee igbe bụ́ “Ime Ka Uche Na-adị Nkọ.”) Iji ụbụrụ eme ihe na-eme ka ‘eriri telifon’ nke ụbụrụ ghara ịnwụ. N’aka nke ọzọ, ka ndị ọkachamara na-ekwu, mkpọchi ụbụrụ na-amalite “mgbe ndị mmadụ lara ezumike nká, kpebie ịghara ịchụso ihe ụwa n’ike, ma kwuo na ọ dịghịkwa ha mkpa ịmata ihe na-aga n’ụwa.”—Inside the Brain.

Ya mere akụkọ ọma e nwere bụ, ka ọkachamara n’ihe banyere ime agadi bụ́ Dr. Jack Rowe na-akọwa, na “ihe ndị anyị pụrụ ịchịkwa ma ọ bụ imezi kwesịrị ịkwalite ike anyị nwere ime agadi n’ụzọ na-aga nke ọma.” Ọzọkwa, oge adịghị agafe agafe ịmalite ịzụlite àgwà ndị dị mma. “Ọ bụrụgodi na i nwewo àgwà ọjọọ n’ihe gbasara ahụ ike n’ihe ka ọtụtụ ná ndụ gị ma gbanwee mgbe i mere okenye,” ka otu onye na-eme nnyocha na-ekwu, “ị ka kwesịrị inweta ma ọ dịghị ihe ọzọ ụfọdụ ụgwọ ọrụ nke ụzọ ndụ dị mma.”

Gburugburu Ebe Obibi Na-akpata Mgbanwe

Ọ bụrụ na a kpọrọ nwatakịrị nwanyị a mụrụ taa na London gaghachi London nke Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, afọ ndụ ọ ga-enwe ike iru agaghị eru ọkara nke ihe ọ bụ taa. Ihe ga-akpata ọdịiche ahụ abụghị mgbanwe mberede nke ọnọdụ anụ ahụ nwatakịrị ahụ, kama ọ bụ mgbanwe mberede n’ịdị elu nke ihe mgbochi abụọ ọzọ—gburugburu ebe obibi na nlekọta ahụ ike. Buru ụzọ tụlee gburugburu ebe obibi.

Ebe mmadụ bi. N’oge gara aga, ebe mmadụ bi—dị ka ihe atụ, ụlọ ya—bụ oké ihe ize ndụ nye ahụ ike. Otú ọ dị, n’ime iri afọ ndị na-adịbeghị anya, e belatawo ihe ize ndụ ndị gburugburu ebe obibi na-akpata. Idebe ihe ọcha karị, mmiri dị ọcha karị, mbelata e belatakwara ahụhụ ndị dị n’ebe obibi emewo ka gburugburu ebe obibi mmadụ ka mma, kwalite ahụ ike ya, ma gbatịkwuo ndụ ya. N’ihi ya, ugbu a n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa, mmadụ pụrụ ịgbaru ebe dị anya karị.c Ma, iwetulata ihe mgbochi a karịrị nanị itinye paịpụ mmiri n’ime ụlọ. Ọ gụnyekwara ịnọgide na-enwe ọha mmadụ na okpukpe dị mma.

Ọha mmadụ. Ihe mejupụtara ọha mmadụ bụ ụmụ mmadụ—ndị gị na ha bi, na-arụkọ ọrụ, na-erikọ nri, na-efekọ ofufe, ma na-egwurikọ egwu. Ebe i bi na-adị mma karị mgbe ị na-enweta mmiri dị ọcha; n’otu aka ahụ, ọha mmadụ pụrụ ịdị mma karị mgbe i nwere ndị enyi i jiri kpọrọ ihe, nanị ịkpọtụ otu ihe bụ́ isi aha. Inwe ike ịkọrọ ndị ọzọ ọṅụ na iru újú, atụmanya na nkụda mmụọ gị na-ewetulata ihe mgbochi nke gburugburu ebe obibi gị ma na-enyere gị aka ịgbate aka karị.

Otú ọ dị, emeghị nke ahụ nwekwara ihe na-esi na ya apụta. Enweghị enyi pụrụ ịkpata owu ọmụma na ikewapụ onwe onye iche n’ebe ọha na eze nọ. Ọ na-eyi ka ị ga-akpọnwụ ma ị nọrọ n’anụghị okwu ndị mmadụ gbara gị gburugburu, nke na-egosi na ha na-eche banyere gị. Otu nwanyị bi n’ebe obibi ndị agadi deere enyi ya akwụkwọ, sị: “Adị m afọ 82, anọwokwa m n’ebe obibi a ruo ogologo afọ 16. Ha na-emeta anyị mma, ma owu ọmụma dị na ya na-esi ike ịnagide mgbe ụfọdụ.” Ọ dị mwute ikwu na ọnọdụ nwanyị a yiri nke ọtụtụ ndị mere okenye, karịsịa ná mba ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ. Ha na-ebikarị n’etiti ndị na-ekwe ka ha nọrọ ma ghara inwe ekele maka ha. Dị ka ihe na-esi na ya apụta, “owu ọmụma bụ otu n’ime ọnọdụ ndị bụ́ isi na-eyi ọdịmma ndị agadi egwu mgbe nile ná mba ndị mepere emepe,” ka James Calleja, nke Ụlọ Ọrụ Mba Nile Na-ahụ Maka Ime Agadi, na-ekwu.

N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ na ị gaghi enwe ike iwepụ ọnọdụ ndị pụrụ ime ka i nwee owu ọmụma—dị ka ezumike nká a manyere amanye, enwechakwaghị ike ịgagharị agagharị, enwekwaghị ndị bụworo enyi gị eri ogologo oge, ma ọ bụ ọnwụ onye òtù ọlụlụ—ma ị ka pụrụ ime ihe ụfọdụ iji wetulata ihe mgbochi a ka o ruo ebe ị pụrụ ịwụfeli. Ná mmalite, buru n’uche na ọ bụghị ime agadi na-akpata owu ọmụma; owu na-amakwa ụfọdụ ndị na-eto eto. Ọ bụghị ime agadi butere nsogbu ahụ—ọ bụ ikewapụ onwe onye iche n’ebe ọha na eze nọ. Gịnị ka ị pụrụ ime iji lụsoo ikewapụ onwe gị ọgụ?

“Mee ka ndị mmadụ na-enwe obi ụtọ ịnọnyere gị,” ka otu agadi nwanyị di ya nwụrụ na-adụ ọdụ ya. “Ọ bụ mmadụ ole na ole na-enwe mmasị iso onye na-ewe iwe ọsọ ọsọ akpakọrịta. Ọ dị gị mkpa ịgbalị inwe ihu ọchị. Ọ bụ eziokwu na nke ahụ na-achọ mgbalị, ma ume ị na-etinye na-arụpụta ezigbo ihe. Obiọma na-amụta obiọma.” Ọ na-ekwukwasị: “Iji jide n’aka na m nwere isiokwu nkwurịta okwu ụfọdụ mụ na ndị m na-ezute ga-ekwurịta, ma okenye ma nwata, m na-agbalị ịmata ihe na-emenụ site n’ịgụ magazin ndị na-enye ihe ọmụma na ige akụkọ ụwa.”

Ndị a bụ ụfọdụ aro ndị ọzọ: Mụta inwe mmasị n’ihe na-amasị ndị ọzọ. Jụọ ajụjụ. Na-emesapụ aka ruo ókè kwere gị mee. Ọ bụrụ na i nweghị ihe onwunwe, ị pụrụ inye onwe gị; obi ụtọ dị n’inye ihe. Na-ede akwụkwọ ozi. Malite ihe omume ntụrụndụ. Na-aza òkù ịga leta ndị ọzọ ma ọ bụ isoro ha mee mkpapụ. Na-edebe ebe obibi gị ọcha, na-emekwa ya ka ọ dị ndị ọbịa ụtọ n’anya. Jekwuru ndị nọ ná mkpa ma nyere ha aka.

Okpukpe. Ọtụtụ ihe àmà na-ebuwanye ibu na-egosi na ihe omume okpukpe na-enyere ndị mere okenye aka ịchọta “nzube na abamuru ná ndụ” na inweta “obi ụtọ,” “echiche nke ịba uru,” “afọ ojuju ka ukwuu ná ndụ,” na “echiche nke ịbụ akụkụ nke ọha na eze na nke ahụ ịdị mma.” N’ihi gịnị? Akwụkwọ bụ́ Later Life—The Realities of Aging na-akọwa, sị: “Okpukpe na-eme ka ndị mmadụ nweta nkwenkwe banyere ndụ nakwa usoro omume, ụkpụrụ, na nkwenkwe ndị na-enyere ha aka ịtụle na ịghọta ndị gbara ha gburugburu.” Ọzọkwa, ihe omume okpukpe na-eme ka ndị mere okenye rute ndị ọzọ nso ma si otú a “belata ohere ha nwere ikewapụ onwe ha iche n’ebe ọha na eze nọ na inwe owu ọmụma.”

Nye Louise na Evelyn, ndị inyom abụọ di ha nwụrụ dị afọ 80, bụrụkwa ndị òtù nke otu ọgbakọ nke Ndịàmà Jehova, nnyocha ndị a na-akwado nnọọ ihe ha mawooro eri ọtụtụ iri afọ. “N’ụlọ Nzukọ Alaeze anyị,d m na-eso ndị ọzọ ekwurịta okwu, ma okenye ma nwata,” ka Louise na-ekwu. “Nzukọ ndị ahụ na-akụzi ihe. Mgbe anyị na-akpakọrịta ma nzukọ mechie, anyị na-achịkwa ọchị ruru n’obi. Ọ na-abụ oge obi ụtọ.” Evelyn na-eritekwa uru n’ihe omume okpukpe ya. “Ịga soro ndị mmadụ bi n’agbata obi anyị kwurịta banyere Bible,” ka ọ na-ekwu, “na-eme ka m ghara ikewapụ onwe m iche. Ma karịsịa nke ahụ, ọ na-eme m obi ụtọ. Inyere ndị ọzọ aka ịbịa mara ezi nzube nke ndụ bụ ọrụ na-enye afọ ojuju.”

N’ụzọ doro anya, Louise na Evelyn nwere nzube ná ndụ. Mmetụta nke ahụ ịdị mma ha na-enwe na-ewetulata ihe mgbochi nke abụọ—gburugburu ebe obibi—ma na-enyere ha aka ịnọgide na-aga n’ihu.—Tụlee Abụ Ọma 92:13, 14.

E Nwere—Nlekọta Ahụ Ike Dị Ọnụ Ala nke Nwere Ọ̀tụ̀tụ̀ Ọgwụgwọ Dị Elu

Ọganihu e nwere na sayensị ọgwụ na ahụ ike na narị afọ a ewetulatawo nnọọ ihe mgbochi nke atọ, bụ́ nlekọta ahụ ike—ma ọ bụghị n’ụwa nile. N’ọtụtụ mba ndị dara ogbenye, ka The World Health Report 1998 na-ekwu, “afọ ndụ mmadụ nwere ike iru dalatara adalata n’ezie n’agbata afọ 1975-1995.” Ọga kpata kpata nke òtù WHO kwuru na “mmadụ 3 n’ime 4 nọ ná mba ndị kasị bụrụ ndị na-emepeghị emepe taa na-anwụ tupu ha eruo afọ 50—ọnụ ọgụgụ afọ ndụ mmadụ nwere ike iru n’ụwa nile n’ọkara narị afọ gara aga.”

N’agbanyeghị nke ahụ, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị mere okenye na ndị na-emebeghị okenye nọ ná mba ndị dara ogbenye na-ewetulata ihe mgbochi a site n’iji nlekọta ahụ ike e nwere na nke a pụrụ ịkwụ ụgwọ ya eme ihe. Were ụzọ ọhụrụ e si agwọ ụkwara nta (TB) dị ka ihe atụ.

N’ụwa nile, ọrịa TB na-egbu ndị mmadụ karịa ndị ọrịa AIDS, ịba, na ọrịa ndị a na-arịa n’ebe okpomọkụ na-egbu ma a gụkọta ha—mmadụ 8,000 kwa ụbọchị. N’ime 100 mmadụ ọ bụla na-arịa TB, 95 bi ná mba ndị na-emepe emepe nke ụwa. Ihe dị ka nde mmadụ 20 na-arịa TB nke ọjọọ ya ugbu a, ọ pụkwara igbu ihe dị ka nde mmadụ 30 n’ime afọ iri na-abịanụ, ọnụ ọgụgụ hà ka ọnụ ọgụgụ ndị bi na Bolivia, Cambodia, na Malawi ma a gụkọta ha.

Ka a sịkwa ihe mere obi ji dị òtù WHO ụtọ ịma ọkwa na 1997 na ya achọtawo ụzọ isi gwọọ ọrịa TB n’ime ọnwa isii n’enweghị mkpa nke ịnọ n’ụlọ ọgwụ ma ọ bụ nke nlekọta ahụ ike bụ́ ọkpọka. “Na nke mbụ ya,” ka The TB Treatment Observer, bụ́ akwụkwọ òtù WHO, kwuru, “ụwa nwere ngwá ọrụ a nwapụtara anwapụta na usoro isi kwụsị ntiwapụ nke ọrịa TB ọ bụghị nanị ná mba ndị bara ọgaranya, kamakwa ná mba ndị kasị daa ogbenye.” A na-akpọ usoro a—nke ụfọdụ kọwara dị ka “ọganihu kasị ukwuu e nwere n’ihe banyere ahụ ike n’iri afọ a”—DOTS.e

Ọ bụ ezie na ego usoro a na-efu erughị nnọọ nke ọgwụ ọrịa TB dịbu adị na-efu, o yiri ka ọ ga-arụpụta ezigbo ihe, nke ka nke nye ndị bi ná mba ndị na-emepe emepe. “Ọ dịghị usoro ọgwụgwọ ọrịa TB ọzọ nweworo ọ̀tụ̀tụ̀ ọgwụgwọ dị elu otú ahụ n’akwụsịghị akwụsị,” ka Dr. Arata Kochi, bụ́ onyeisi nke Ihe Omume Ụwa Maka Ọrịa TB nke Òtù WHO na-ekwu. “Usoro DOTS nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ọgwụgwọ dị elu ruo ihe dị ka pasent 95, ọbụna ná mba ndị kasị daa ogbenye.” Mgbe ọ na-erule ná ngwụsị nke afọ 1997, a gbasowo usoro DOTS ná mba 89. Taa ọnụ ọgụgụ ahụ arịruwo 96. Òtù WHO nwere olileanya na usoro a ga-eruru ọtụtụ nde ndị ogbenye ọzọ nọ ná mba ndị kasị bụrụ ndị na-emepeghị emepe, si otú a mee ka ha nwee ike iwetulata ihe mgbochi nke atọ dị n’ọsọ ndụ ahụ.

Site n’ịgbanwe àgwà ya, imeziwanye gburugburu ebe obibi ya, na imeziwanye nlekọta ahụ ike ya, n’ezie mmadụ enwewo ike ịgbatịkwu nkezi oge ndụ na afọ ndụ o nwere ike iru. Ajụjụ bụ, Mmadụ ọ̀ pụkwara otu ụbọchị ịgbatịkwu oge ndụ mmadụ kasị ogologo—ikekwe ọbụna ịdị ndụ na-enweghị ọgwụgwụ?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ ezie na a na-agbanwerịta okwu ahụ bụ́ “afọ ndụ mmadụ nwere ike iru” na “nkezi oge ndụ” mgbe e ji ha na-eme ihe, e nwere ihe dị iche n’ime ha abụọ. “Afọ ndụ mmadụ nwere ike iru” na-ezo aka n’afọ ole mmadụ pụrụ ịtụ anya na ọ ga-agbaru, ebe “nkezi oge ndụ” na-ezo aka ná nkezi afọ nke ndị mejupụtara ọnụ ọgụgụ mmadụ na-adịru ndụ n’ezie. N’ihi ya, a na-adabere ná nkezi oge ndụ agbakọ afọ ndụ mmadụ nwere ike iru.

b Tinyere ihe ndị a a pụrụ ịchịkwa achịkwa, o doro anya na mkpụrụ ndụ ihe nketa a na-apụghị ịgbanwe agbanwe nke mmadụ ketara eketa na-emetụta ahụ ike ya na ogologo ndụ ya. A ga-atụle nke a n’isiokwu na-esonụ.

c Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ụzọ isi mee ka gburugburu ebe obibi ka mma site n’ime ihe ndị dị mfe, lee isiokwu bụ́ “Imeri Ihe Ịma Aka nke Ịdị Ọcha” na “Ihe Na-ekpebi Ahụ Ike Gị—Ihe Ị Pụrụ Ime,” dị ná mbipụta Teta! nke February 8, 1990, na nke April 8, 1995.

d A na-akpọ ebe Ndịàmà Jehova na-anọ enwe nzukọ ha kwa izu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nzukọ ndị a ghere oghe nye ọha na eze, a naghịkwa ana ụtụ.

e DOTS bụ aha ndebiri nke usoro ọgwụgwọ ilekwasị ndị a na-agwọ anya kpọmkwem ná mkpirikpi oge. Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere usoro DOTS, lee isiokwu bụ́ “Ụzọ Ọhụrụ E Si Alụ Ọgụ Megide Ụkwara Nta,” dị na Teta! nke June 8, 1999.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 14]

MMEGA AHỤ HÀ AṄAA NA ỤDỊ DỊ AṄAA?

“Minit 30 nke mmega ahụ na-agabigaghị ókè kwa ụbọchị bụ ihe mgbaru ọsọ dị mma,” ka Ụlọ Ọrụ Mba Na-ahụ Maka Ime Agadi (NIA) na-ekwu. Ma ọ dịghị mkpa na ị ga-emega ahụ ruo minit 30 otu mgbe. A na-ekwu na iji mkpirikpi oge atọ ndị nke ọ bụla ruru minit 10 megaa ahụ na-aba uru dịkwa ka iji otu oge ruru minit 30 nwee otu ụdị mmega ahụ ahụ. Ụdị mmega ahụ dị aṅaa ka ị pụrụ inwe? Akwụkwọ nta nke NIA bụ́ Don’t Take It Easy: Exercise! (Emerela Onwe Gị Ebere: Megaa Ahụ!) na-atụ aro, sị: “Imegatụ ahụ, dị ka ịrịgo steepụ kama ịbanye ígwè mbugo, ma ọ bụ ịga ije kama ịkwọ ụgbọ ala, pụrụ izu minit 30 nke mmega ahụ n’otu ụbọchị. Ị pụrụ ịkpakọta akwụkwọ osisi, isoro ụmụaka na-egwuri egwu nke ọma, ịkọ ubi, na ọbụna ịrụ ọrụ ụlọ n’ụzọ ga-ezu ngụkọta ọnụ ọgụgụ oge gị kwa ụbọchị.” Otú ọ dị, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịgwa dọkịta gị tupu ị malite inwe otu usoro mmega ahụ.

[Foto]

Mmega ahụ na-agabigaghị ókè pụrụ inyere onye agadi aka inwetaghachi ike na ume

[Igbe/Foto dị na peeji nke 15]

IME KA UCHE NA-ADỊ NKỌ

Nnyocha sayensị ndị e mere ọtụtụ puku ndị mere okenye gosipụtara ọtụtụ ihe ndị na-enye aka eme ka uche onye mere okenye dịrị nkọ. Ha gụnyere “ikere ókè dị ukwuu n’ịgụ ihe, ime njem, ihe omume ọdịbendị, mmụta, na ịba òtù ọha na eze na nke ndị gụrụ akwụkwọ.” “Na-eme ọtụtụ ihe dịgasị iche ị pụrụ ime.” “Na-arụ ọrụ gị. Alala ezumike nká.” “Gbanyụọ TV.” “Malite otu ihe ọmụmụ.” E kweere na ihe omume ndị dị otú ahụ abụghị nanị na ọ na-akwali mmụọ kamakwa ọ na-ejikọtaghachi akwara ozi ụbụrụ.

[Foto]

Iji ụbụrụ eme ihe na-enye aka eme ka uche dịrị nkọ

[Igbe/Foto dị na peeji nke 16]

ARO BANYERE AHỤ IKE MAKA NDỊ AGADI

Ụlọ Ọrụ Mba Na-ahụ Maka Ime Agadi, bụ́ akụkụ nke Ngalaba Ahụ Ike na Ije Ozi Ọha na Eze nke United States, na-ekwu na “a pụrụ ịmụbawanye ohere inwe ahụ ike na ịdị ogologo ndụ” site n’ịgbaso ndụmọdụ ezi uche dị na ya, dị ka nke na-esonụ:

● Na-eri nri na-edozi ahụ, gụnyere mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri.

● Ọ bụrụ na ị na-aṅụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya, aṅụbigala ya ókè.

● Esela siga. Oge adịghị agafe ịkwụsị.

● Na-emega ahụ mgbe nile. Gwa dọkịta tupu ị malite inwe otu usoro mmega ahụ.

● Na-akpọtụrụ ezinụlọ na ndị enyi gị.

● Na-ekeresi ókè ike n’ọrụ, egwuregwu, na n’iso ọha na eze.

● Nwee echiche ziri ezi banyere ndụ.

● Na-eme ihe ndị na-eme ka i nwee obi ụtọ.

● Na-aga ka e lee gị ahụ mgbe mgbe.

[Igbe dị na peeji nke 17]

ECHICHE ỌHỤRỤ BANYERE MKPỤRỤ NDỤ ỤBỤRỤ

“Anyị na-echebu na n’ebe nile n’ụbụrụ gị mkpụrụ ndụ ụbụrụ gị na-anwụ kwa ụbọchị ná ndụ gị,” ka Dr. Marilyn Albert, bụ́ prọfesọ nkà mmụta ọrịa uche na nkà mmụta akwara ozi ụbụrụ, na-ekwu. “Nke ahụ abụghị nnọọ eziokwu—ụfọdụ n’ime ha na-anwụ ka ị na-eme agadi otú o kwesịrị, ma ọ bụchaghị nke ukwuu, ọ na-abụkwa n’akụkụ ụfọdụ nke ụbụrụ.” Ọzọkwa, ihe ndị a chọpụtara na nso nso a na-egosi na ọbụna echiche e nweworo eri ogologo oge na ụmụ mmadụ apụghị inweta mkpụrụ ndụ ndị ọhụrụ bụ, ma ọ dịghị nnọọ ihe ọzọ, “echiche gabigara nnọọ ókè,” ka magazin bụ́ Scientific American nke November 1998 na-akọ. Ndị ọkà mmụta akwara ozi ụbụrụ na-ekwu na ugbu a ha enwetawo ọtụtụ ihe àmà na-egosi na ọbụna ndị agadi “na-emepụta ọtụtụ narị akwara ozi ụbụrụ ọhụrụ.”

[Igbe dị na peeji nke 19]

Ọ̀ BỤ IME OKENYE NA INWE AMAMIHE KARỊ?

“Ọ́ bụghị n’ime ndị kara nká ka amamihe dị nakwa nghọta n’ụbọchị ndụ dị ogologo?” ka Bible na-ajụ. (Job 12:12, NW) Gịnị bụ azịza ya? Ndị nnyocha nyochara ndị mere okenye iji tụọ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ àgwà ndị dị ka “nghọta, echiche ziri ezi, echiche na ikike ịtụle ụkpụrụ abụọ dị iche ma chọpụta usoro ndị dị mma e ji edozi nsogbu.” Dị ka U.S.News & World Report si kwuo, nnyocha ahụ gosiri na “ndị mere okenye na-akarị ndị na-emebeghị okenye n’akụkụ ọ bụla nke amamihe, na-enye ndụmọdụ e cheere echiche, nke siri ike karị.” Nnyocha na-egosikwa na “ọ bụ ezie na ọ na-ewe ndị mere okenye oge ime mkpebi karịa ndị ntorobịa, ọ na-akakarị mma.” N’ihi ya, dị ka akwụkwọ Bible bụ́ Job na-egosi, n’ezie afọ ndụ bụ amamihe.

[Foto dị na peeji nke 13]

Ndụ mmadụ yiri ọsọ asọmpi jupụtara n’ihe mgbochi

[Foto dị na peeji nke 17]

“Mee ka ndị mmadụ na-enwe obi ụtọ ịnọnyere gị,” ka otu nwanyị di ya nwụrụ na-adụ ọdụ ya

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

“Inyere ndị ọzọ aka ịbịa mara ezi nzube nke ndụ bụ ọrụ na-enye afọ ojuju.”—Evelyn

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

“N’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, m na-eso ndị ọzọ ekwurịta okwu, ma okenye ma nwata.”—Louise

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya