Ngwọta Zuru Ụwa Ọnụ—Ò Kwere Omume?
NDỊ ọkachamara kwere na ụkwara nta (TB) bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ nke chọrọ ngwọta zuru ụwa ọnụ. E nweghị mba nanị ya pụrụ ịkwụsị TB, ebe ọ bụ na ọtụtụ nde mmadụ na-agabiga ókèala mba dị iche iche kwa izu.
Ọtụtụ chere na njikọ aka nke mba dị iche iche na-achọ ka mba ndị bara ọgaranya nyere mba ndị dara ogbenye aka, bụ́ ndị TB kasị akpa aka ọjọọ. Dị ka Dr. Arata Kochi na-ekwu, “ọ bụ maka ọdịmma mba ndị bara ọgaranya inyere mba ndị na-emepechaghị emepe aka ịlụso ụkwara nta ọgụ, tupu mba nke ha aghọọ ọgbọ agha ya.”
Ma mba ndị bara ọgaranya, n’ịbụ ndị ihe ha na-ahụ dị ka ihe ndị kasị mkpa na-enye nsogbu, agbagabeghị ịga nye aka. Ụfọdụ mba ndị dara ogbenye n’onwe ha na-elegharakarị nlekọta ahụ ike anya, kama nke ahụ na-asụnye ego ná ngwá agha ha. Ka ọ na-erule n’etiti 1996, nanị 10 pasent nke ndị na-arịa TB n’ụwa ka e ji atụmatụ DOTS na-agwọ, bụ́ nke dị nnọọ nta iji gbochie mgbasa ọrịa ahụ ịka njọ.
WHO na-ekwu, sị: “Ihe ọmụma na ọgwụ ndị na-adịghị oké ọnụ e ji agwọ TB adịwo eri ọtụtụ iri afọ. Ihe ụwa chọrọ ugbu a bụ ibu agha site n’aka ndị ike dị n’aka, ndị nwere mmetụta na ọmịiko, bụ́ ndị ga-ahụ na e ji ọgwụ ndị a mee ihe n’ụzọ dị irè n’ụwa nile.”
Mmeri Gaje Ịbịa
Ànyị pụrụ iji obi ike legara ụmụ mmadụ nwere ikike na mmetụta anya ịgwọta nsogbu ahụ? Ọbụ abụ ahụ so dee Bible site n’ike mmụọ nsọ dere, sị: “Unu atụkwasịla obi n’ahụ ndị a maara aha ha, ma ọ bụ n’ahụ nwa nke mmadụ, onye ọ na-adịghị nzọpụta o nwere.” Mgbe ahụ, ònye ka anyị pụrụ ịtụkwasị obi? Akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Onye ihe na-agara nke ọma ka onye ahụ bụ nke Chineke nke Jekọb bụ Onye na-enyere ya aka, nke olileanya ya dịkwasị Jehova, bụ́ Chineke ya: Onye meworo eluigwe na ụwa, na oké osimiri, na ihe nile nke dị n’ime ha.”—Abụ Ọma 146:3, 5, 6.
Dị ka Omenkà na Onye Okike nke ụwa, Jehova Chineke nwere ma ike ma amamihe iji kwụsị ọrịa. Ò nwere ọmịiko? Site n’ọnụ onye amụma ya e nyere ike mmụọ nsọ, Jehova na-ekwe nkwa, sị: “M ga-enwekwa ọmịiko n’ahụ [ndị m], dị ka mmadụ si enwe ọmịiko n’ahụ nwa ya nke na-efe ya.”—Malakaị 3:17.
Isiakwụkwọ ikpeazụ nke Bible na-akọwa otu ọhụụ e nyere Jọn onyeozi. Ọ hụrụ ‘osisi nke ndụ, na-amị ụzọ mkpụrụ iri na abụọ, na-enye mkpụrụ ya n’ọnwa n’ọnwa.’ Osisi ihe atụ ndị a na mkpụrụ ha na-enye na-ese onyinyo ndokwa Chineke nke ga-eme ka ụmụ mmadụ na-erube isi nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala.—Mkpughe 22:2.
N’ịga n’ihu, Jọn dere, sị: “Akwụkwọ osisi ahụ bụ ihe ime ka ahụ dị mba nile ike.” Akwụkwọ ihe atụ ahụ na-ese onyinyo ngọzi sitere n’aka Chineke nke ga-arụpụta ọgwụgwọ nke ihe a kpọrọ mmadụ, ma n’ime mmụọ ma n’anụ ahụ. N’ihi ya, anyị pụrụ ijide n’aka na n’ụwa ọhụrụ nke ezi omume n’okpuru ịchịisi Chineke, a ga-emeri TB kpam kpam, ruokwa mgbe ebighị ebi.—Mkpughe 21:3, 4.
[Foto dị na peeji nke 8, 9]
Chineke na-ekwe nkwa ngwọta na-adịgide adịgide maka ihe a kpọrọ mmadụ