Ụkwara Nta Alọghachi!
KEMGBE afọ ndị 1950, ọnụ ọgụgụ ndị na-arịa ụkwara nta (TB) ji ọ̀tụ̀tụ̀ nke pasent 5 kwa afọ belata na United States. Otú ọ dị, kemgbe 1985, e nwewo mmụba nke pasent 18 ná ndị a kọrọ na ha na-arịa TB. Ọbụna nke ka enye nsogbu bụ mpụta nke ụdị ọhụrụ nke ọrịa ahụ, bụ́ nke na-adịghị anakwere ọgwụgwọ e ji ọgwụ na-agwọ. Ugbu a TB na-egbu ihe e mere atụmatụ ya ịbụ nde mmadụ atọ kwa afọ. Gịnị mere agha a na-alụso TB ji aghọ ọgụ na-enweghị isi?
Otu ihe mere ya bụ na ọtụtụ ndị ọrịa adịghị nnọọ anara ọgwụgwọ ha ruo oge a chọrọ—na-abụkarị ọnwa isii ruo ọnwa itoolu. Dị ka ihe atụ, na New York City, otu ihe ọmụmụ kpughere na 89 pasent nke otu ìgwè nke ihe dị ka 200 ndị ọrịa nwere TB siri ike anarazughị ọgwụgwọ ha. “Nke ahụ na-atụ oké ụjọ,” ka Dr. Lee Reichman, onye isi oche nke Òtù Akpa Ume nke America na-ekwu, “n’ihi na ndị ahụ (a) agajeghị ịbụ ndị a gwọrọ, (b) ikekwe ha ga-amalitekwa ịrịa TB nke na-anagide ọgwụ ndị a na-ejikarị eme ihe.” Ma ndị a bu ọrịa nke a pụrụ imetụta ihe karịrị ahụ ike nke ha. “Site n’anarazughị ọgwụgwọ ha,” ka Dr. Reichman na-agbakwụnye, “ha pụrụ ibufe ya ndị ọzọ.” O doro anya na nke a bụ ihe so na-akpata nde asatọ ọhụrụ a na-eme atụmatụ ịbụ ndị na-arịa ọrịa ahụ bụ́ ndị a na-enyocha n’ụwa nile kwa afọ.
Ndị mmụta Bible ghọtara na ‘ajọ ọrịa na-efe efe n’ebe dị iche iche’ bụ otu akụkụ nke ihe àmà na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe nke a. (Luk 21:11; 2 Timoti 3:1) Gịnị ga-esochi? Ụwa ọhụrụ, ebe “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) Ee, Jehova Chineke na-ekwe nkwa, ọ bụghị ahụ efe nwa oge, kama ntọhapụ na-adịgide adịgide pụọ n’ọrịa na ọnwụ.—Mkpughe 21:1-4.