Ọnụ Ọgụgụ Na-anwụ nke Hà Ka nke Agha
MGBE Marilyn dị afọ 23 tara ahụ ma nwee mmetụta nke oké ike ọgwụgwụ, o chere na ọ pụrụ inwe ihe jikọrọ ya na ime ọ tụụrụ n’oge na-adịbeghị anya. Ụkwara kwakwara ya ruo ogologo oge, bụ́ nke ọ kọọrọ dọkịta ya. Ọ sịrị na ọ bụ ọrịa nke oghere iku ume ma depụta ọgwụ nje. E mesịa, mgbe ọsụsọ abalị ndị ahụ malitere, Marilyn bịara nwee nnọọ oké nchegbu. Ọ gaghachiri na nke dọkịta ya, bụ́ onye meere ya ndokwa ka e see obi ya foto X ray.
Ihe X ray ahụ gosiri chọrọ ka e mee ihe ozugbo, ma a pụghị iji fon nweta Marilyn. “Dọkịta ahụ enwetawo mama m ma gwa ya na m na-arịasi ọrịa ike,” ka Marilyn kwuru. “Mama m bịara ịchọ m ma gwa m ka m gaa na nke [dọkịta] ahụ ozugbo. Dọkịta ahụ zigara m n’ụlọ ọgwụ ebe e sere m X ray ọzọ, ha nyekwara m àkwà.”
Ọ wụrụ Marilyn akpata oyi n’ahụ ịnụ na ya na-arịa ụkwara nta (TB). O chere na ya ga-anwụ, ma mgbe e jisịrị ọgwụ TB gwọọ ya, o nwetaghachiri onwe ya n’oge na-adịghị anya.
Ijuanya Marilyn n’ịbụ onye na-arịa TB kwere nghọta. Ruo na nso nso a, ọbụna ọtụtụ ndị ọkachamara ahụ ike chere na e meriwo TB n’akụkụ ụwa ndị mepere emepe. “Echere m na o sorowo ihe otiti ahụ nwụọ,” ka otu onye nlekọta ndị ọrịa n’otu ụlọ ahụ ike dị na London kwuru. “Ma mgbe m bịara ịrụ ọrụ n’ebe a, achọpụtara m na ọ dị nnọọ ndụ ma na-akpa ike n’ime obodo.”
N’ebe ndị TB na-adịkwaghị, ọ laghachiwo; n’ebe ọ dịgideworo, ọ kawo njọ. Kama ịbụ nke e meriri, TB bụ ogbu mmadụ dị nnọọ ka agha na ụnwụ nri. Tụlee:
◼ N’agbanyeghị oké ọganihu n’ọgwụ ọgbara ọhụrụ, eri ihe karịrị otu narị afọ gara aga TB akpọgawo ihe dị ka nde mmadụ 200 n’ili.
◼ Ihe ruru ijeri mmadụ abụọ—otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị bi n’ụwa—ebuteworị nje TB bụ́ bacillus, bụ́ otu ụdị nke nje bacteria. Ọzọkwa, onye ọzọ na-ebute TB kwa sekọnd!
◼ Na 1995 ọnụ ọgụgụ mmadụ TB ha pụtaworo ìhè bụ ihe dị ka nde 22. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde atọ nwụrụ, ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ n’akụkụ ụwa ndị ka na-emepe emepe.
Ebe e nwere ọgwụ ndị siri ike iji lụsoo TB ọgụ, gịnị mere ọrịa a ji nọgide na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti? Ọ̀ dị mgbe a ga-emeri ya? È nwere ụzọ ọ bụla ị ga-esi chebe onwe gị n’ebe ọ dị? Isiokwu ndị na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
New Jersey Medical School —National Tuberculosis Center