Ụzọ Ọhụrụ E Si Alụ Ọgụ Megide Ụkwara Nta
ỤKWARA nta (TB) bụ ọrịa na-efe efe kasị dị anya o gbuwere mmadụ, ọ ka bụkwa ajọ ihe na-eyi ahụ ike egwu nke na Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) jiri ya tụnyere bọmbụ a haziri oge mgbawa ya. “Anyị nwere ntakịrị oge,” ka otu akụkọ nke òtù WHO banyere ọrịa TB na-adọ aka ná ntị ya. Ọ bụrụ na mmadụ akwụsịghị bọmbụ a ịgbawa, otu ụbọchị ha pụrụ iche ọrịa nke na-adịghị anabata ọgwụ ihu bụ́ nke “ikuku na-ekesa, ma bụrụ nke ga-afọdụ nke nta ka ọ ghara inwe ọgwụgwọ dị ka ọrịa AIDS.” Oge eruola, ka òtù WHO na-agba ume, ịghọta ike ibibi ihe nke ọrịa TB nwere. “Onye ọ bụla na-eku ume, n’ụwa nile . . . , kwesịrị ịdị na-echegbu onwe ya banyere ihe ize ndụ a.”
Ọ̀ bụ ikwubiga okwu ókè? Ọ dịghị ma ọlị. Chetụdị otú ụra ga-esi pụọ ụwa n’anya ma ọ bụrụ na otu ọrịa achọọ ịgbasa n’ụzọ na-enweghị nchịkwa na ikpochapụ ndị nile bi na Canada, dị ka ihe atụ, n’ime afọ iri! Ọ bụ ezie na nke a na-ada ka akụkọ ifo, ọ na-eyi egwu n’ezie. N’ụwa nile, ọrịa TB na-egbu ndị mmadụ karịa ndị ọrịa AIDS, ịba, na ọrịa ndị a na-arịa n’ebe okpomọkụ na-egbu ma a gụkọta ha nile: mmadụ 8,000 kwa ụbọchị. Ihe dị ka nde mmadụ 20 na-arịa TB nke ọjọọ ya ugbu a, ọ pụkwara igbu ihe dị ka nde mmadụ 30 n’ime afọ iri na-abịanụ—ọnụ ọgụgụ karịrị ọnụ ọgụgụ ndị bi na Canada.—Lee igbe bụ́ “Aka Ọrịa TB Ji Ụwa Nile,” dị na peji nke 24.
Ka Anyị Gazie n’Akụkọ Ọma
Otú ọ dị, taa olileanya dị. Mgbe afọ iri nke ime nnwale gasịrị, ndị nnyocha achọpụtawo otu ụzọ a pụrụ isi belata ọrịa TB site n’igbu mmadụ aghara aghara gaa n’ịbụ nke a chịkwara achịkwa. Dr. Hiroshi Nakajima, onye bụbu ọga kpata kpata nke òtù WHO, kpọrọ ụzọ ọhụrụ a “otu n’ime ọganihu kasị mkpa e nweworo n’ihe banyere ahụ ike ọha na eze n’afọ iri a.” Dr. Arata Kochi, bụ́ onyeisi nke Ihe Omume Ụwa Maka Ọrịa TB nke òtù WHO, na-ekwukwa na ọ na-eme ka ‘ịkwụsị ntiwapụ nke ọrịa TB’ kwe omume na nke mbụ ya. Gịnị kpatara oké obi ụtọ a nile? Otu usoro a na-akpọ DOTS.
DOTS bụ aha ndebiri nke usoro ọgwụgwọ ilekwasị ndị a na-agwọ anya kpọmkwem ná mkpirikpi oge. Ọ bụ usoro nlekọta ahụ ike pụrụ ịgwọ ihe ka ọtụtụ ná ndị na-arịa TB n’ime ọnwa isii ma ọ bụ asatọ n’anọghị otu ụbọchị n’ụlọ ọgwụ. Usoro DOTS na-adabere n’ihe ise maka inwe ihe ịga nke ọma. Ọ bụrụ na e meghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị ahụ, ka òtù WHO na-ekwu, ịgwọta ndị na-arịa TB “agaghị enwe isi.” Gịnị bụ ihe ndị a?
● 1. Kpọmkwem: Ọrịa TB nke kasị dị ize ndụ bụ nke a na-achọpụtaghị. N’ihi ya, òtù WHO na-emesi ya ike na tupu ha emewe ihe ọ bụla, ndị ọrụ ahụ ike kwesịrị itinye mgbalị ha kpọmkwem n’ịmata ndị na-arịa TB na-efe efe.
● 2. Ilekwasị Ndị A Na-agwọ Anya: Ihe nke abụọ so n’usoro DOTS na-eme ka ndị ọrụ ahụ ike—ọ bụghị onye ọrịa—hụ na a gwọrọ ọrịa ahụ. Ndị ọrụ ahụ ike ma ọ bụ ndị ọrụ afọ ofufo a zụrụ azụ, dị ka ndị na-ere ihe n’ụlọ ahịa, ndị nkụzi, ma ọ bụ ndị rịaburu TB, na-elekwasị ndị ọrịa anya ka ha na-aṅụ nke ọ bụla n’ime ọgwụ TB ahụ. “Ndị na-elekwasị ndị ọrịa anya” dị mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma n’ihi na otu isi ihe mere ọrịa TB ji dịgide ruo taa bụ na ndị na-arịa ya na-akwụsị ịṅụ ọgwụ ha oké ngwa ngwa. (Lee igbe bụ́ “N’ihi Gịnị Ka O Ji Na-agbasawanye—Ọzọ?” dị na peji nke 24) Mgbe ha ṅụrụ ọgwụ ruo nanị izu ole na ole, ha na-amalite ịgbake ma kwụsị ịṅụ ọgwụ ha. Ma, a ghaghị ịṅụgide ọgwụ ahụ ruo ọnwa isii ma ọ bụ asatọ iji gbuo nje ọrịa TB nile dị n’ahụ.
● 3. Usoro Ọgwụgwọ: N’ime ọnwa isii ma ọ bụ asatọ a, ndị ọrụ ahụ ike na-arịba mmetụta usoro ọgwụgwọ ahụ na-enwe àmà ma na-edekọ ọganihu onye ọrịa ahụ. N’ụzọ dị otú ahụ, ha na-ejide n’aka na a gwọrọ ndị ọrịa ahụ kpam kpam, na ha apụghịkwa ibufe ndị ọzọ ọrịa ahụ.
● 4. Ná Mkpirikpi Oge: Ịṅụ ngwakọta ọgwụ na ókè kwesịrị ekwesị nke ọgwụ TB, bụ́ nke a maara dị ka iji ọgwụ agwọ ọrịa ná mkpirikpi oge, ruo ogologo oge e kwuru bụ ihe nke anọ so n’usoro DOTS. Ọgwụ ndị a a gwakọtara ọnụ ezuola igbu nje ọrịa TB.a A ghaghị inwe ọgwụ ndị ahụ mgbe nile ka a ghara ịkwụsịtụ ọgwụgwọ ahụ mgbe ọ bụla.
● 5. !: Òtù WHO na-edenye akara iti mkpu n’azụ DOTS! iji gosi ihe nke ise so n’usoro DOTS. Ọ na-anọchi anya ego nkwado na ụkpụrụ ndị ezi uche dị na ha. Òtù WHO na-agba ụlọ ọrụ ahụ ike dị iche iche ume ka ha nweta nkwado ego site n’aka gọọmenti na òtù ndị na-esoghị n’ọchịchị na ka ha mee ka ịgwọ ọrịa TB soro n’usoro nlekọta ahụ ike e nwere ná mba ha.
N’ihe banyere iwepụta ego, usoro DOTS na-amasị ndị na-atụpụta ụkpụrụ bụ́ ndị na-ahụ maka ego. Ụlọ Akụ Ụwa ekwuwo na usoro DOTS bụ “otu n’ime ụzọ ndị na-adịghị efu oké ego e si alụso . . . ọrịa ọgụ.” Ngụkọta nke ego ọ na-efu iji usoro ahụ mee ihe ná mba ndị dara ogbenye, ka òtù WHO na-agbakọ, bụ ihe dị ka $100 n’isi otu onye ọrịa. “O sikata ike ka nke a karịa cent 10 (U.S.) n’isi otu onye ná mba ndị ka na-emepe emepe, bụ́ nke a pụrụ ịkwụli ọbụna n’ọnọdụ akụ̀ na ụba kasị njọ.” Otú ọ dị, efughị oké ego ya adịghị eme ka ọ ghara ịba nnukwu uru.
Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ọ Dịruru Irè?
Ndị nnọchiteanya òtù WHO mara ọkwa na March 1997 na agbasochaghị usoro DOTS “mere ntiwapụ nke ọrịa TB n’ụwa nile ji kwụrụ otu ebe na nke mbụ ya kemgbe ọtụtụ afọ iri.” “N’ebe ndị e ji usoro DOTS eme ihe, ọ fọrọ nke nta ka ọnụ ọgụgụ ndị a na-agwọta mụbaa okpukpu abụọ.” Nnwale a nwalere usoro DOTS n’ógbè ndị ọrịa TB juru eju egosilarị na usoro ahụ dị irè. Tụlee akụkọ ole na ole na-egosi ihe ịga nke ọma òtù WHO kọrọ.
N’India “e ji usoro DOTS mee ihe n’ógbè e jiri mee ihe ngosi bụ́ ndị nwere ihe karịrị nde mmadụ 12. . . . Ugbu a a na-agwọ mmadụ 4 n’ime mmadụ 5 ọ bụla na-arịa ụkwara nta.” N’ihe omume e jiri mee nnwale nke gụnyere otu nde mmadụ na Bangladesh, “a gwọrọ pasent 87 [nke ndị na-arịa TB].” N’otu àgwàetiti dị n’Indonesia, otu ihe omume usoro DOTS “na-agwọ mmadụ 9 n’ime mmadụ 10 na-arịa nke na-efe efe.” Na China, ihe omume nnwale ndị e mere “nwere ezigbo ihe ịga nke ọma,” na-agwọ ihe ruru pasent 94. N’otu obodo dị na South Africa, “a na-agwọ ihe karịrị pasent 80 [nke ndị na-arịa TB] n’ụzọ na-aga nke ọma.” N’oge na-adịbeghị anya, a malitekwara usoro DOTS na New York City, na-enwe ezigbo ihe si na ya pụta.
Ihe ndị a chọpụtara site ná nnwale ndị e mere n’ọtụtụ mba, ka Dr. Kochi na-ekwubi, na-egosi na ‘a pụrụ iji usoro ahụ mee ihe n’ebe nile, ọ pụkwara ịgwọ ọnụ ọgụgụ ruru pasent 85 ma ọ bụ karịa.’
Ọ Gbasaghị nke Ukwuu—Ma E Nwere Ọganihu
Ebe ọ bụ usoro ọgwụgwọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ pụrụ imeri otu n’ime ihe ndị na-efe efe kasị egbu mmadụ n’ụzọ dị mfe na n’ụzọ na-agaghị efu ego, ị pụrụ ịtụ anya ka usoro DOTS na-agbasa nke ukwuu. “Ma,” ka otu onye ọrụ òtù WHO na-ekwu, “n’ụzọ na-eju anya, mba ole na ole ji usoro na-adịghị efu oké ego nke òtù WHO nwapụtara maka ịchịkwa ọrịa TB na-eme ihe.” N’ezie, ná mmalite afọ 1996, nanị mba 34 jiri usoro ahụ mee ihe n’ụwa nile.
Ka o sina dị, e nwere ọganihu. Tupu afọ 1993, mgbe òtù WHO kwuru ka e mee ihe ngwa ngwa banyere ọrịa TB n’ụwa nile, ọ bụ nanị otu onye n’ime mmadụ 50 ọ bụla na-arịa TB ka e jiri usoro DOTS gwọọ. Taa nkezi ahụ bụ otu onye n’ime mmadụ 10 ọ bụla. Dị ka a kọrọ, na 1998 ihe dị ka mba 96 ji usoro DOTS na-eme ihe. Ọ bụrụ na mba ndị ọzọ ejiri usoro DOTS mee ihe, ‘a ga-ebelata ọnụ ọgụgụ ndị na-arịa TB kwa afọ ka ọ bụrụ ọkara n’ime nanị afọ iri.’ Dr. Kochi na-ekwu, sị: “Anyị nwere ndokwa nlekọta ahụ ike a nwapụtaworo ịdị irè ya chọrọ nanị ka e jiri ya mee ihe n’ebe nile.”
Ebe mmadụ nwere ihe ọmụma na ngwá ọrụ iji lụsoo ọrịa TB ọgụ n’ụzọ gara nke ọma, nanị ihe a na-enweghị bụ ‘ndị ga-ahụ na e ji ọgwụ ndị a eme ihe n’ụwa nile.’ Ka a sịkwa ihe mere na n’otu mbipụta e dere maka ndị dibịa bekee na ndị ọrụ ahụ ike ndị ọzọ n’ụwa nile, òtù WHO jụrụ, sị: “Gịnị ka anyị nile na-eche?”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọgwụ ndị ahụ gụnyere isoniazid, rifampin, pyrazinamide, streptomycin, na ethambutol.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 23]
Kwa sekọnd, otu onye na-ebute ụkwara nta n’ụwa
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 23]
‘Ọgwụ ndị na-azọpụta ndụ dọrọ ebe ọtụtụ nde mmadụ na-anwụ.’
Dr. Arata Kochi
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 25]
“Usoro DOTS ga-abụ ọganihu kasị mkpa e nwere n’ihe banyere ahụ ike ọha na eze n’afọ iri a.”
Ozi òtù WHO gbasara
[Igbe dị na peeji nke 24]
N’ihi Gịnị Ka O Ji Na-agbasawanye—ỌZỌ?
A chọpụtara ihe e ji agwọ ụkwara nta (TB) ihe karịrị iri afọ anọ gara aga. Kemgbe ahụ, ọrịa TB egbuwo ihe karịrị nde mmadụ 120, ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ 3 ọzọ ga-anwụ n’afọ a. Gịnị mere ọrịa TB ji ka nọgide na-egbu ọtụtụ ndị mmadụ ebe e nwere ihe e ji agwọ ya? Ọ bụ n’ihi ihe atọ bụ́ isi: nleghara anya, HIV/AIDS, na ọrịa TB na-adịghị anabata ọtụtụ ọgwụ.
Nleghara Anya. Anya ndị mmadụ dị n’ọrịa ndị na-efe efe dị ka ọrịa AIDS na Ebola. Otú ọ dị, na 1995, mgbe ọ bụla Ebola gburu otu onye, ọrịa TB na-egbu mmadụ 12,000. N’eziokwu, ọrịa TB juru nnọọ ná mba ndị ka na-emepe emepe nke na ndị nọ n’ebe ndị ahụ na-ewerezi ya dị ka ihe dị otú o kwesịrị. N’otu mgbe ahụ, ná mba ndị bara ọgaranya karị, a hapụwo ọrịa TB ka ọ gbasaa ọbụna ka ọgwụ ndị dị irè n’ịgwọ ya dọrọ. Nleghara anya a zuru ụwa ọnụ bụ mmehie ihe na-akpata ọnwụ. Ka nchegbu ụwa na-enwe banyere ọrịa TB na-ebelata, nje ọrịa TB nọ na-agbasa n’ike n’ike. Taa ha na-awakpo ọtụtụ ndị nọ n’ọtụtụ mba karịa ka ha wakpotụworo n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.
HIV⁄AIDS. Ọrịa TB na-eso nje HIV and ọrịa AIDS na-agakọ. Mgbe ndị mmadụ butere nje HIV—nke na-ebelata usoro ahụ ha ji alụso ọrịa ọgụ—ha na-eji okpukpu 30 yikarịa ka hà ga-ebute ọrịa TB. Ka a sịkwa ihe mere na ntiwapụ nke nje HIV n’ụwa nile ugbu a akpatawokwa mmụba n’ọnụ ọgụgụ ndị na-arịa ọrịa TB! A na-eme atụmatụ na ọrịa TB gburu mmadụ 266,000 bu nje HIV na 1997. “Ndị a bụ ndị ikom na ndị inyom,” ka Peter Piot na-ekwu, bụ́ onyeisi nke Ihe Omume E Jikọrọ Ọnụ nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka HIV/AIDS, “na-eriteghị uru n’ọgwụ TB ndị na-adịghị efu oké ego bụ́ ndị dị ha mkpa iji gwọọ ụkwara nta ha.”
Ọrịa TB Na-adịghị Anabata Ọtụtụ Ọgwụ. “Nje ndị bụ ọnyịrị ọnwụ,” ndị ọgwụ nje mmadụ mepụtara na-adịghị egbu, bụ ụdị ihe a na-ahụ n’akụkọ sayensị e chepụtara echepụta, ma n’ihe banyere ọrịa TB, ha na-aghọwanye ihe na-eme eme. Ọ pụrụ ịbụ na ihe karịrị nde mmadụ 50 ebutelarị ọrịa TB na-adịghị anabata ọtụtụ ọgwụ (MDR). Ndị ọrịa na-akwụsị ịṅụ ọgwụ ha mgbe izu ole na ole gasịrị n’ihi na ha agbakewala, n’ihi na ọgwụ ha agwụla, ma ọ bụ n’ihi otú ọha mmadụ si ele ọrịa ahụ anya ọjọọ, adịghị egbu nje ọrịa TB nile dị n’ahụ ha. Dị ka ihe atụ, n’otu mba dị n’Esia mmadụ 2 n’ime mmadụ 3 ọ bụla na-arịa TB na-akwụsị ịṅụ ọgwụ ngwa ngwa. Mgbe ha dara ọrịa ọzọ, ọ pụrụ ịka sie ike ịgwọ ọrịa ahụ n’ihi na nje ndị na-anwụghị na-abịa ọgụ ma karịa ọgwụ TB ọ bụla ike. N’ihi ya, onye ahụ na-arịa ya ga-arịawazi ụdị ọrịa TB a na-apụghị ịgwọ agwọ—ha na onye ọ bụla ha bufere ya. Ozugbo ụdị TB nke a na-adịghị anabata ọtụtụ ọgwụ gbasara, anyị na-eche ajụjụ siri ike ihu, Mmadụ ọ̀ ga-enwe ike ịkwụsị mgbasa ya?
[Igbe dị na peeji nke 24]
Aka Ọrịa TB Ji Ụwa Nile
Ntiwapụ nke ụkwara nta (TB) na-agbasawanye, na-efu ego karị, na-egbukwa mmadụ karị kwa afọ. Akụkọ Òtù Ahụ Ike Ụwa nwetara kọrọ otú ọrịa ogbu na nzuzo a si na-agbasa. Ndị a bụ ụfọdụ ihe atụ: “Pakistan anọwo na-alụso ụkwara nta ọgụ n’enweghị ihe ịga nke ọma.” “Ụkwara nta abịaghachila ọgụ na Thailand.” “Taa, ụkwara nta so n’ihe ndị kasị akpata ọrịa na ọnwụ na Brazil.” “Ụkwara nta ka jisiri ndị Mexico aka ike.” Na Russia “ndị na-arịa TB na-aba ụba nke ukwuu.” N’Ethiopia “ụkwara nta na-agbasa ná mba ahụ dum.” “South Africa nwere otu n’ime ọnụ ọgụgụ kasị elu e nwere n’ihe ndekọ nke ndị na-arịa TB n’ụwa.”
Ọ bụ ezie na mmadụ 95 n’ime mmadụ 100 ọ bụla na-arịa TB bi ná mba ndị ka daa ogbenye n’ụwa, ọrịa TB na-ejisikwa mba ndị bara ọgaranya aka ike karị. United States nwere mmụba dị ukwuu nke ndị a kọrọ na ha rịara TB ná mmalite afọ ndị 1990. Odeakụkọ bụ́ Valery Gartseff si United States na-ekwu na ọrịa TB “alọghachila ọzọ iti ndị America ihe otiti.” N’otu aka ahụ, Dr. Jaap Broekmans, onyeisi nke Royal Netherlands TB Association, kwuru n’oge na-adịbeghị anya na ntiwapụ nke ọrịa TB ‘amalitewo ịka njọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe na n’akụkụ dị iche iche nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe.’ N’abụghị ihe iju anya, akwụkwọ akụkọ bụ́ Science, nke August 22, 1997, na-ekwu na “ụkwara nta ka bụ ihe bụ́ isi na-eyi ahụ ike egwu.”
[Igbe dị na peeji nke 26]
A Chọpụta Ụkpụrụ Ọrịa TB Ji Arụ Ọrụ
N’oge na-adịbeghị anya ndị nnyocha enwewo ike idekọ ụkpụrụ nile dị ná mkpụrụ ndụ ihe nketa nke nje bacteria na-akpata ụkwara nta (TB) ji arụ ọrụ. Ihe a a rụzuru kara akara “ihe ọhụrụ n’ọgụ a na-alụso otu n’ime ihe ndị kasị egbu ihe a kpọrọ mmadụ,” ka Dr. Douglas Young, nke Imperial College School of Medicine dị na London, na-ekwu. Òtù Ahụ Ike Ụwa na-akọ na nchọpụta a “pụrụ ịba uru nke ukwuu ná nnyocha a ga-eme n’ọdịnihu banyere ọgwụ TB na ọgwụ ndị e ji egbochi ya.”—The TB Treatment Observer, September 15, 1998.
[Foto ndị dị na peeji nke 25]
Ngwakọta ọgwụ ndị a pụrụ igbu nje ọrịa TB
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Foto Òtù WHO, dị na Geneva nyere
Foto: WHO/Thierry Falise
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
Ọ na-ewe nanị $100 iji gwọọ onye na-arịa ya
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Foto: WHO/Thierry Falise
Foto òtù WHO, dị na Geneva nyere
[Ebe E Si Nweta Foto Ndi Dị na peeji 23]
Foto: WHO/Thierry Falise
Foto òtù WHO, dị na Geneva nyere
Foto: WHO/Thierry Falise