Njikọ Aka Na-egbu Egbu
LAA azụ na 1959, ndị ọrụ ahụ ike na United States buru amụma na a ga-ekpochapụ ụkwara nta (TB) n’oge na-adịghị anya. N’ezie, n’afọ ndị sochirinụ ọrịa ahụ belatara ngwa ngwa nke na ndị mmadụ chere na a chịkwawo ya. Ma TB alọghachila, ọ chọtawokwa onye nkwado na-egbu egbu—HIV, bụ́ nje virus nke na-ebelata ikike usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ ma na-akpatakarị AIDS.
Ọ bụ ezie na ihe karịrị ijeri mmadụ abụọ—ihe dị ka otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị bi n’ụwa—bu nje TB, mgbe mbụ ha butere ya ndị a nwere ohere dị nanị pasent 10 nke ibute ọrịa ahụ n’ogologo ndụ ha nile. Ọ dị mma ịmara na ndị bu nje HIV nwere ihe ize ndụ dị pasent 8 kwa afọ nke ibute nje TB siri ike. N’ihi ya, ka ọtụtụ ndị mmadụ karị na-ebute HIV, ọtụtụ ndị ọzọ nọ n’ihe ize ndụ dị nso nke ibute TB.
Dr. Richard J. O’Brien nke WHO (Òtù Ahụ Ike Ụwa) na-ekwu na n’ime afọ ndị na-adịbeghị anya e nwewo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ịrị elu pasent 15 ná ndị na-arịa TB na United States. Ọ na-ekwu na nke a bụ “n’ụzọ buru ibu n’ihi mmekọrịta dị n’etiti HIV na TB.” Otú ọ dị, iyi egwu ahụ kasị njọ ná mba ndị ka na-emepe emepe. A na-ahụ pasent 90 zuru ezu nke nde ndị ọhụrụ asatọ na-arịa ya n’afọ ọ bụla ná mba ndị kasị daa ogbenye, ihe dịkwa ka nde atọ nke ndị ọrịa a na-anwụ.
Gburugburu ụwa, ihe dị ka nde mmadụ 4.4 na-agbaso ọrịa abụọ ahụ na-egbu egbu mgba. WHO na-ebu amụma na n’ọdịnihu dị nso, TB ga na-egbu otu nde mmadụ kwa afọ n’etiti ndị bu HIV. “Ntiwapụ ọrịa abụọ a ejikọwo aka ghọọ ihe kasị njọ na-eyi ahụ ike ọha na eze egwu n’afọ iri a,” ka Peter Piot, bụ́ ọga kpata kpata nke Ihe Omume E Jikọrọ Ọnụ nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka HIV/AIDS, kwuru.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 19]
New Jersey Medical School —National Tuberculosis Center