IHE ỌMỤMỤ NKE 44
Iji Ajụjụ Eme Ihe n’Ụzọ Dị Irè
N’IHI na ajụjụ na-achọ nzaghachi—ma è ji ọnụ zaa ya ma è ji uche zaa ya—ha na-enye aka ime ka ndị na-ege gị ntị na-esonye. Ajụjụ pụrụ inyere gị aka ịmalite mkparịta ụka na inwe nkwurịta okwu na-akpali akpali. Dị ka ọkà okwu na onye ozizi, ị pụrụ iji ajụjụ kpasuo mmasị, nyere mmadụ aka ịtụgharị uche n’otu isiokwu, ma ọ bụ mesie ihe ị na-ekwu ike. Mgbe i jiri ajụjụ mee ihe nke ọma, ị na-agba ndị ọzọ ume ichesi echiche ike kama ịdị na-ege nanị ntị. Nwee nzube, jụọkwa ajụjụ gị n’ụzọ ga-enyere gị aka imezu ya.
Iji Kpasuo Mkparịta Ụka. Mgbe ị nọ n’ozi ubi, mụrụ anya ịhụ ohere ị ga-eji gwa ndị mmadụ ka ha kwuo ihe dị ha n’obi ma ọ bụrụ na ha dị njikere ime otú ahụ.
Ọtụtụ Ndịàmà na-amalite mkparịta ụka na-adọrọ mmasị nanị site n’ịjụ, sị, “Ì chetụwo . . . ?” Mgbe ha họọrọ ajụjụ ndị mmadụ na-eche banyere ya n’ezie, ọ na-afọ nke nta ka ọ bụrụ na ha aghaghị inweta obi ụtọ n’ozi ubi. Ọ bụrụgodị na onye nke ọzọ echetụbeghị echiche banyere ajụjụ ahụ, ọ pụrụ ịkpali ọchịchọ ịmata ihe. Ọ dị ọtụtụ okwu a pụrụ ịmalite site n’iji okwu ndị dị ka “Gịnị ka i chere . . . ?,” “Olee otú . . . [ọ] dị gị?,” na “Ì kwere . . . ?” eme ihe.
Mgbe Filip onye na-ezisa ozi ọma gakwuuru onye ọrụ gọọmenti Etiopia bụ́ onye na-agụpụta amụma Aịzaịa, nanị ihe Filip mere bụ ịjụ, sị: “Ị̀ maara [ma ọ bụ ị̀ na-aghọta] n’ezie ihe ị na-agụ?” (Ọrụ 8:30) Ajụjụ a mepeere Filip ụzọ ịkọwa eziokwu dị iche iche banyere Jizọs Kraịst. N’iji ajụjụ yiri ya eme ihe, ụfọdụ Ndịàmà nke oge a achọtawo ndị ọ na-agụ agụụ n’ezie inweta nghọta doro anya nke eziokwu Bible.
Ozugbo e nyere ha ohere ikwu uche ha, ọtụtụ ndị ga-enwe mmasị ige gị ntị. Mgbe ị jụsịrị ajụjụ, ṅaa ntị nke ọma. Nwee omume obiọma kama ịkatọ ya mgbe ị na-egosi na ị nụrụ ihe onye ahụ zara. Jaa ya mma mgbe ị pụrụ iji obi eziokwu mee otú ahụ. N’otu oge, mgbe otu onye odeakwụkwọ ‘zara ajụjụ n’ụzọ na-egosi ọgụgụ isi,’ Jizọs jara ya mma, na-asị: “Ị nọghị n’ebe dị anya n’ebe alaeze Chineke dị.” (Mak 12:34) Ọ bụrụgodị na i kweghị n’echiche onye ahụ, ị pụrụ ikele ya maka ikwu uche ya. Ihe o kwuru pụrụ ime ka ị mata àgwà i kwesịrị iburu n’uche ka i so ya na-ekerịta eziokwu Bible.
Iji Webata Echiche Ndị Dị Mkpa. Mgbe ị na-agwa otu ìgwè okwu ma ọ bụ soro otu onye na-enwe mkparịta ụka, gbalịa iji ajụjụ webata echiche ndị dị mkpa. Jide n’aka na ajụjụ gị na-emetụta ihe ndị na-amasị ndị na-ege gị ntị n’ezie. Ị pụkwara ịjụ ajụjụ ndị na-akpali ọchịchọ ịmata ihe n’ihi na azịza ha adịchaghị mfe. Ọ bụrụ na ị kwụsịtụ mgbe ị jụsịrị ajụjụ, ndị na-ege gị ntị yiri ka ha ga-egekwu ntị karị n’ihe ga-esochi ya.
N’otu oge, Maịka onye amụma jiri ọtụtụ ajụjụ mee ihe. Mgbe ọ jụsịrị ihe Chineke na-atụ anya ya n’aka ndị na-efe ya, onye amụma ahụ jụkwasịrị ajụjụ anọ, nke nke ọ bụla n’ime ha nwere ihe pụrụ ịbụ azịza ya. Ajụjụ ahụ nile na-enye aka ịkwadebe ndị na-agụ ya maka azịza nwere ihe mmụta nke o ji mechie akụkụ ahụ ná nkwurịta okwu ya. (Maị. 6:6-8) Ị̀ pụrụ ime ihe yiri ya mgbe ị na-ezi ihe? Nwalee ya.
Iji Tụgharịa Uche n’Otu Isiokwu. A pụrụ iji ajụjụ nyere ndị ọzọ aka ịghọta otú otu arụmụka si na-aga. Jehova mere nke a mgbe ọ na-agwa Izrel otu nkwupụta okwu dị mkpa, dị ka e gosiri na Malakaị 1:2-10. O bu ụzọ gwa ha, sị: “Ahụwo m unu n’anya.” Ha ejighị ịhụnanya ahụ kpọrọ ihe, ya mere, ọ jụrụ, sị: “Ịsọ, ọ́ bụghị nwanne Jekọb?” Jehova zoziri aka n’ịtọgbọrọ n’efu nke Edọm dị ka ihe àmà na-egosi na Chineke ahụghị mba ahụ n’anya n’ihi ajọ omume ha. O nyeziri ihe atụ ndị e ji ajụjụ tigwaa iji mesie ike ojiji Izrel na-ejighị ịhụnanya ya kpọrọ ihe otú kwesịrị ekwesị. Ọ jụrụ ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị ahụ dị ka a ga-asị na ọ bụ ndị nchụàjà ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi na-ajụ ha. Ajụjụ ndị ọzọ bụ ajụjụ Jehova jụrụ ndị nchụàjà ahụ. Nkwurịta okwu ahụ na-emetụ n’ahụ́ ma na-adọrọ mmasị anyị; ihe ndị o kwuru enweghị mgbagha; a pụghịkwa ichefu ozi ya echefu.
Ndị ọkà okwu ụfọdụ na-eji ajụjụ eme ihe n’ụzọ dị irè n’otu ụzọ ahụ. Ọ bụ ezie na e nwere ike a gaghị atụ anya iji ọnụ zaa ya, uche ndị na-ege ntị na-adị na ya, dị ka hà na-enwe nkwurịta okwu.
Mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ Bible, anyị na-eji ụzọ ga-eme ka onye a na-amụrụ ihe na-etinye ọnụ na-eme ihe. N’ezie, a na-arụpụta ihe ka mma ma ọ bụrụ na onye ahụ a na-amụrụ ihe adịghị agụpụta azịza ndị e biri ebi. N’olu obiọma, jiri ajụjụ ntụkwasị soro onye ahụ a na-amụrụ ihe tụgharịa uche. A bịa n’echiche ndị bụ́ isi, gbaa ya ume ime ka azịza ya dabere na Bible. Ị pụkwara ịjụ, sị: “Olee otú ihe anyị na-atụle si kwekọọ n’isi ihe nke ọzọ anyị mụworo? Gịnị mere o ji dị mkpa? Olee otú o kwesịrị isi metụta ndụ anyị?” Ụzọ dị otú ahụ dị irè karịa nanị ikwupụta ihe ndị i kwenyere ma ọ bụ gị onwe gị inye nkọwa sara mbara. N’ụzọ dị otú a, ị na-enyere onye ahụ a na-amụrụ ihe aka iji ‘ikike iche echiche’ ya na-efe Chineke.—Rom 12:1.
Ọ bụrụ na onye a na-amụrụ ihe aghọtaghị otu ihe, nwee ndidi. Ọ pụrụ ịbụ na ọ na-agbalị iji ihe ị na-ekwu atụnyere ihe o kwenyere na ya kemgbe ọtụtụ afọ. Isi n’ụzọ ọzọ webata isiokwu ahụ pụrụ inye aka. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ ọ na-adị mkpa isi n’otu ụzọ tụlee ya. Jiri Akwụkwọ Nsọ na-eme ihe nke ọma. Jiri ihe atụ na-eme ihe. Tinyere ihe ndị a, jiri ajụjụ ndị dị mfe ndị na-achọ ka onye ahụ tụgharịa uche n’ihe àmà e nwere na-eme ihe.
Iji Dọpụta Ihe Dị Ya n’Obi. Mgbe ndị mmadụ zara ajụjụ, ọ bụghị mgbe nile ka ha na-ekwu ihe dị ha n’obi n’ezie. Ha pụrụ nanị ịza ihe ha chere na ọ bụ ihe ị chọrọ ka ha zaa. A chọrọ nghọta. (Ilu 20:5) Dị ka Jizọs mere, ị pụrụ ịjụ, sị: “Ì kwere nke a?”—Jọn 11:26.
Mgbe ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs were iwe ma gbahapụ ya n’ihi ihe o kwuru, Jizọs gwara ndịozi ya ka ha kwuo obi ha. Ọ jụrụ, sị: “Unu onwe unu, ùnu chọkwuru ịla?” Pita kwupụtara echiche ha, na-asị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-agakwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi; anyị ekwerewokwa ma mara na ị bụ Onye Nsọ nke Chineke.” (Jọn 6:67-69) N’oge ọzọ, Jizọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ònye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke mmadụ bụ?” O ji ajụjụ nke chọrọ ka ha kwuo ihe dị ha onwe ha n’obi sochie ya. “Ma, unu onwe unu, ònye ka unu na-asị na m bụ?” Ná nzaghachi, Pịta sịrị: “Ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara nke Chineke dị ndụ.”—Mat. 16:13-16.
Mgbe ị na-eduzi ọmụmụ Bible, ị pụrụ ịchọpụta na ọ na-aba uru isi otú ahụ mee ihe n’okwu ụfọdụ. Ị pụrụ ịjụ, sị: “Gịnị ka ụmụ akwụkwọ ibe gị (ma ọ bụ ndị ọrụ ibe gị) na-eche banyere okwu a?” Mgbe ahụ ị pụrụ ịjụ, sị: “Olee ihe i chere banyere ya?” Mgbe ị matara ihe mmadụ na-eche n’ezie, nke a ga-eme ka o kwe gị omume inye aka n’ụzọ kasịnụ dị ka onye ozizi.
Iji Mesikwuo Ihe Ike. A pụkwara iji ajụjụ mesikwuo echiche dị iche iche ike. Pọl onyeozi mere ya, dị ka e dekọrọ ná Ndị Rom 8:31, 32: “Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị? Onye ahụ nke na-azọghị ọbụna Ọkpara nke ya kama nyefee ya maka anyị nile, gịnị mere ya na ya na-agaghịkwa eji obiọma nye anyị ihe nile ọzọ?” Rịba ama na, na nke ọ bụla, ajụjụ ahụ dabeere ná nkebi ahịrịokwu bu ya ụzọ kpọmkwem.
Mgbe o detusịrị ihe banyere ikpe Jehova megide eze Babilọn, Aịzaịa onye amụma gosipụtara nkwenye siri ike site n’ịgbakwụnye, sị: “Jehova nke usuu nile nke ndị agha ezubewo; ònye ga-emebikwa ya? aka Ya esetịwokwa; ònye ga-emekwa ka ọ laghachi azụ?” (Aịsa. 14:27) Dabere n’ihe ha na-ekwu maka ya, ajụjụ ndị dị otú ahụ na-egosi na a pụghị ịgbagha ihe ahụ a na-ekwu. Ọ dịghị azịza a na-atụ anya ya.
Iji Kpughee Echiche Na-ezighị Ezi. Ajụjụ ndị e ji nlezianya chepụta bụkwa ngwá ọrụ dị ike iji kpughee echiche na-ezighị ezi. Tupu ọ gwọọ otu nwoke, Jizọs jụrụ ndị Farisii na ndị ụfọdụ bụ́ ọkachamara n’Iwu ahụ, sị: “Iwu ọ̀ kwadoro ịgwọ ọrịa n’ụbọchị izu ike ka ọ kwadoghị?” Mgbe ọ gwọsịrị ya, ọ jụrụ ha ajụjụ ọzọ: “Ònye n’ime unu, ma ọ bụrụ na nwa ya nwoke ma ọ bụ oké ehi ya adaba n’olulu mmiri, bụ́ onye na-agaghị adọpụta ya ozugbo ahụ n’ụbọchị izu ike?” (Luk 14:1-6) Ọ tụghị anya azịza ọ bụla, ọ dịghịkwa ihe ha zara. Ajụjụ ndị ahụ kpughere echiche ha na-ezighị ezi.
Mgbe ụfọdụ, ọbụna ezi Ndị Kraịst pụrụ inwe echiche na-ezighị ezi. Ụfọdụ ndị na Kọrint nke narị afọ mbụ na-akpụpụ ụmụnna ha n’ụlọikpe iji dozie nsogbu ndị ha gaara enwe ike idozi n’onwe ha. Gịnị ka Pọl onyeozi mere banyere okwu ahụ? Ọ jụrụ ọtụtụ ajụjụ ndị a kapịrị ọnụ iji gbazie echiche ha.—1 Kọr. 6:1-8.
Site n’ịdị na-eme ya mgbe nile, ị pụrụ ịmụta iji ajụjụ na-eme ihe n’ụzọ dị irè. Otú ọ dị, cheta inwe nkwanye ùgwù, karịsịa mgbe ị na-agwa ndị tọrọ gị, ndị ị na-amaghị nke ọma, na ndị nọ n’ọkwá ọchịchị okwu. Jiri ajụjụ kụzie eziokwu Bible n’ụzọ na-adọrọ mmasị.