Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
SEPTEMBA 4-10
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EZIKIEL 42-45
“E Weghachiri Ofufe Dị Ọcha”
it-2-E 1082 ¶2
Ụlọ Nsọ
Ọhụụ ụlọ nsọ Ezikiel. N’afọ 593 T.O.N.K., ya bụ, afọ iri na anọ ebibichara Jeruselem na ụlọ nsọ Sọlọmọn dị n’ime ya. A kpọgara onye nchụàjà bụ́ Ezikiel onye amụma n’otu ugwu dị nnọọ elu, ebe ọ nọ hụ ụlọ nsọ ukwuu nke Jehova. (Ezik. 40:1, 2) A gwara Ezikiel ka ọ kọọrọ “ụlọ Izrel” ihe niile ọ hụrụ iji mee ka ihere mee ndị Juu niile a dọọrọ n’agha ka ha nwee ike ichegharị, nakwa iji kasie ndị kwesịrị ntụkwasi obi n’ime ha obi. (Ezik. 40:4; 43:10, 11) Ọhụụ ahụ mere ka ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị e ji tụọ ụlọ nsọ ahụ doo anya. Ihe ọtụtụ e ji tụọ ihe n’ọhụụ ahụ bụ okporo ahịhia “amị” (okporo ahịhịa amị ahụ dị ihe dị ka mita atọ n’ogologo) na “kubit” (otu kubit dị ihe dị ka amaụkwụ abụọ n’ogologo). (Ezik. 40:5) Otú e si kọwaa ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ụlọ nsọ ahụ mere ka ụfọdụ ndị chee na ihe mere e ji gosi Ezikiel ụlọ nsọ ahụ n’ọhụụ bụ ka Zerubabel lere anya na ya rụọ ụlọ nsọ ahụ o mechara rụọ mgbe ndị juu si ná ndọrọ n’agha lọta. Ma, o nweghị ihe gosiri na ihe a ha chere mere eme.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2-E 467 ¶4
Aha
Ndị Izrel ebighị ndụ otú gosiri na ha bụ mba Chineke kpọkwasịrị aha ya, nke a mere ka e metọọ aha Chineke. (Ezik. 43:8; Emọs 2:7) Ntaramahụhụ Chineke nyere ndị Izrel n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi n’ebe ọ nọ, mekwara ka mba dị iche iche kwutọọ aha ya. (Tulee Ọma 74:10, 18; Aịza. 52:5.) Ebe mba ndị ahụ na-amaghị na ọ bụ Jehova na-enye ndị Izrel ntaramahụhụ maka njehie ha, ha chere na ahụhụ ndị Izrel na-ata bụ maka na Jehova enwelighị ike ichebe ndị na-efe ya. Iji mee ka a kwụsị ịkọcha aha ya, Jehova mere ihe ozugbo n’ihi aha ya. Ọ kpọghachịtara ndị Izrel fọrọnụ n’ala ha.—Ezik. 36:22-24.
it-2-E 140
Ikpe Ziri Ezi
N’ihi ya, Jehova na-achọkarị ka ndị na-achọ inweta ihu ọma ya gbalịa ka ha mata iwu ya ma na-eme ihe o kwuru. (Aịza. 1:17, 18; 10:1, 2; Jere. 7:5-7; 21:12; 22:3, 4; Ezik. 45:9, 10; Emọs 5:15; Maị. 3:9-12; 6:8; Zek. 7:9-12)
SEPTEMBA 11-17
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2-E 1001
Nwa nke Mmadụ
Ebe okwu a bụ́ “nwa nke mmadụ” kacha pụta N’akwụkwọ nsọ Hibru bụ n’akwụkwọ Ezikiel. N’akwụkwọ Ezikiel, Chineke kpọrọ onye amụma a “nwa nke mmadụ” ihe karịrị ugboro iri itoolu. (Ezik. 2: 1, 3, 6, 8) Ihe mere e ji kpọọ ya aha a bụ ka a mara na ọ bụ mmadụ nkịtị. Aha a mekwuru ka o doo anya na o nwere nnukwute ihe dị iche n’etiti onye amụma a bụ́ mmadụ na-ekwuchite ọnụ Chineke, na onye bụ Isi Iyi nke ihe ndị o buru n’amụma, bụ́ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. A kpọkwara Daniel onye amụma aha a n’akwụkwọ Daniel 8:17.
SEPTEMBA 18-24
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2-E 382
Mishak
E nwere ihe atọ ọ ga-abụ ya mere ha ji lee ihe oriri eze anya ka ihe ‘ga-emerụ’ ha: (1) Ndị Babịlon na-eri anụmanụ ndị ahụ iwu Mozis kwuru na ha adịghị ọcha; (2) ha anaghị akpachapụ anya ka ha hụ na anụmanụ ndị ahụ gbapụrụ ọbara nke ọma, ha na-anyagbukwa ụfọdụ anyagbu; (3) ọtụtụ mgbe, ndị a na-ekpere arụsị na-ebu ụzọ chụọrọ chi ha anụ ndị ahụ n’àjà. Ha weekwara iri anụ ndị ahụ ka ife chi ha dị iche iche ofufe.—Dan. 1:8; tulee 1 Kọr. 10:18-20, 28.
SEPTEMBA 25–ỌKTOBA 1
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
w88 10/1 30 ¶3-5
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Mgbe a kpọbatara onye Hibru ahụ aha ya bụ Daniel, eze kwughachiri ihe ọ ga-emere ya. Ọ sịrị na a ga-eyiwe ya uwe na-acha odo odo, yinye ya ihe olu ọlaedo n’olu, meekwa ka ọ bụrụ onye nke atọ n’alaeze ya. Ma, onye amụma ahụ ji nkwanye ùgwù zaghachi, sị: “Jide onyinye gị, werekwa ụgwọ ọrụ gị nye ndị ọzọ. Otú ọ dị, m ga-agụrụ eze ihe a e dere, m ga-akọkwara ya isi ya.”—Daniel 5:17.
N’ihi ya, Daniel achọghị ka enye ya ngarị ma ọ bụ kwụọ ya ụgwọ maka nkọwa ya. Ọ sịrị na eze ahụ nwere ike ijide onyinye ya ma ọ bụkwanụ nye ya onye ọzọ. Ihe mere Daniel ga-eji akọwa ihe ahụ e dere abughi maka ka ọ nweta ihe, kama, ọ bụ n’ihi na ezi Chineke bụ́ Jehova, onye ihe o kpere n’ikpe n’isi Babịlọn na-aghaghị imezu.
Dị ka anyị gụrụ na Daniel 5:29, ozugbo Daniel gụchara ihe ahụ e dere, kọwaakwa ya, eze nyere iwu ka enye ya ihe ndị ahụ n’agbanyeghi na Daniel achọghị ha. Daniel ejighi aka ya yiri uwe na ihe olu ndị ahụ, kama, ọ bụ ndị na-ejere eze ozi yiwere Daniel ihe ndị ahụ n’ihi na Eze Belsheza nyere iwu ha ka mee otú ahụ. Ma, ihe a merenụ anaghị emegide na ihe e kwuru na Daniel 5:17, ebe onye amụma ahụ mere ka o doo anya na ihe mere ọ ga-eji akọwa ihe ahụ a bụghị maka ihe ndị eze ga enye ya.