Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jy isi 10 p. 28-p. 29 para. 7
  • Ezinụlọ Jizọs Hà Agaa Jeruselem

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ezinụlọ Jizọs Hà Agaa Jeruselem
  • Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Njem Ndị A Gara na Jerusalem
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
  • Mgbe Jizọs Dị Afọ Iri na Abụọ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Mgbe Nwata Bụ́ Jizọs Nọ n’Ụlọ Nsọ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Jizọs Mụtara Irube Isi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
jy isi 10 p. 28-p. 29 para. 7
Mgbe Jizọs nọ n’ụlọ nsọ na-ajụ ndị nkụzi ndị Juu ajụjụ n’oge ọ dị afọ iri na abụọ

ISI NKE 10

Ezinụlọ Jizọs Hà Agaa Jeruselem

LUK 2:40-52

  • JIZỌS NỌ NA-AJỤ NDỊ NKUZI OKPUKPE AJỤJỤ MGBE Ọ DỊ AFỌ IRI NA ABỤỌ

  • JIZỌS KPỌRỌ JEHOVA “NNA M”

O ruola oge opupu ihe ubi. Ọ bụ oge a ka ndị ezinụlọ Josef na ndị ikwu na ndị enyi ha ji aga Jeruselem kwa afọ. Ha na-aga ebe ahụ maka Ememme Ngabiga e kwuru n’Iwu Mozis ka ha na-eme. (Diuterọnọmi 16:16) Isi Nazaret gaa Jeruselem dị ihe dị ka otu narị na iri kilomita abụọ. Ọ na-abụ oge obi ụtọ, onye ọ bụla na-esokwa akwadebe maka ememme a. Jizọs dị afọ iri na abụọ ugbu a, ọ na-atụsikwa anya ike ka oge ememme a ruo n’ihi na ọ na-eme ka o nwee ike ịna-aga n’ụlọ nsọ Chineke.

Jizọs na ezinụlọ ya ewereghị Ememme Ngabiga a ka naanị ihe otu ụbọchị. Ụbọchị na-eso Ememme Ngabiga bụ mbido Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko nke a na-eme ụbọchị asaa. (Mak 14:1) A na-ewere ya na o so n’ihe a na-eme n’oge Ememme Ngabiga. Ma isi Nazaret gaa Jeruselem, ma ịnọ na Jeruselem, ma ịlaghachi n’ụlọ ha, na-ewe Jizọs hà izu abụọ. Ma, nke afọ a were ha ihe karịtụrụ izu abụọ n’ihi otu ihe Jizọs mere. Ha chọpụtara ihe ahụ o mere mgbe ha nọ n’okporo ụzọ, si Jeruselem na-alaghachi.

NJEM NA-ENYE ỌṄỤ

Mgbe Jizọs na ndị ezinụlọ ya na-aga Jeruselem

Ịga Jeruselem maka ememme atọ a na-eme kwa afọ na-enye ndị niile gara ya ọṅụ. (Diuterọnọmi 16:15) N’oge ndị a Jizọs na-eso aga Jeruselem, ọ na-ahụ ebe ndị ọzọ dị na Jeruselem, na-amụtakwa ọtụtụ ihe gbasara ha. Ya na ndị ọzọ na-efekwa Chineke, ndị si ebe ndị ọzọ, na-ahụkwa. N’eziokwu, ọ bụ njem a na-anaghị echefu echefu.

Mgbe ha nọ na-ala, Josef na Meri chere na Jizọs so ndị ikwu na ndị enyi ha na-ala. Ma, mgbe ha kwụsịrị ebe ha ga-ehi ụra abalị, ha ahụghị ya. Ha gara chọọ ya ebe ndị ikwu ha na ndị enyi ha nọ, ma ọ nọghị ebe ahụ. Ha chọrọ ya ebe ahụ niile, ma ha ahụghị ya. Josef na Meri laghachiziri Jeruselem ka ha chọọ ya ebe ahụ.

Ha chọrọ ya n’ụbọchị mbụ, ha ahụghị ya, chọọkwa ya n’ụbọchị nke abụọ, ma ha ahụghị ya. N’ikpeazụ, n’ụbọchị nke atọ, ha hụrụ ya n’otu n’ime ụlọ ndị dị n’ụlọ nsọ. Ha hụrụ Jizọs ka ya na ndị nkụzi okpukpe ndị Juu nọ. Ọ nọ na-ege ha ntị, na-ajụkwa ha ajụjụ. Ụdị amamihe Jizọs nwere jukwara ndị nkụzi ahụ anya.

Mgbe Josef na Meri mechara hụ Jizọs

Meri jụrụ ya, sị: “Nwa m, gịnị mere i ji meso anyị otú a? Lee, mụ na nna gị chị obi n’aka na-achọgharị gị.”—Luk 2:48.

O juru Jizọs anya na ha amaghị ebe ọ nọ. Ọ jụrụ ha sị: “Gịnị mere unu ji na-achọgharị m? Ọ̀ bụ na unu amaghị na m ga-anọ n’ụlọ Nna m?”—Luk 2:49.

Ugbu a ha chọtara ya, o sooro ha laghachi Nazaret. Ọ nọgidekwara na-erubere ha isi. Ọ nọkwa na-enwekwu amamihe, na-etokwukwa eto. N’agbanyeghị na ọ ka dị obere, ihe ya nọ na-amasị ma Chineke ma ndị mmadụ. N’eziokwu, si mgbe Jizọs bụ nwata gawa, ọ bụ onye e ji ama atụ ma n’ihe gbasara ofufe Chineke ma n’irubere ndị mụrụ ya isi.

  • Olee ebe Jizọs na ndị ezinụlọ ya na-aga mgbe niile n’oge opupu ihe ubi, gịnịkwa mere ha ji aga ya?

  • Mgbe Jizọs dị afọ iri na abụọ, gịnị ka Josef na Meri chọpụtara mgbe ha si Jeruselem na-ala, oleekwa ebe ha mechara hụ ya?

  • N’akụkọ a, olee ezigbo àgwà Jizọs kpara ndị na-eto eto kwesịrị iṅomi?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya