Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
MEE 2-8
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 SAMUEL 27-29
“Ihe Ndị Devid Na-eme n’Oge Agha”
it-1 41
Ekish
Mgbe Devid na-agba ọsọ ka Sọl ghara igbu ya, o nwere ugboro abụọ ọ gbakwuuru Ekish ka o chebe ya. Na nke mbụ ọ gbakwuuru ya, ụfọdụ matara Devid nakwa na o nwere ike ịbụ onye iro ha. N’ihi ya, Devid mewere ka onye isi na-adịghị mma. Eze Ekish chere na ọ bụ onye ara ma hapụ ya ka ọ laa. (1 Sam. 21:10-15; Okwu Mmeghe Abụ Ọma 34; Okwu Mmeghe Abụ Ọma 56) Na nke abụọ, Devid na narị ndị agha ya isii (600) nakwa ndị ezinụlọ ha gakwuuru Ekish, ya enyekwa ha Ziklag ka ha biri na ya. N’ime otu afọ na ọnwa anọ ha biri ebe ahụ, ha ghọgburu Ekish ma mee ka o kweta nọ ọ bụ obodo ndị dị na Juda ka ha na-aga alụso agha. Ma ndị ha na-aga alụso agha bụ ndị Geshọ, ndị Gazaịt, na ndị Amalek. (1 Sam. 27:1-12) Ekish chere na ha na ya kwụ nke na ọ họpụtadịrị Devid ka ọ na-eche ya nche mgbe ndị Filistia na-ejikere ịga lụso Eze Sọl agha. Ọ bụ mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka ha gawa ka ndị isi ndị Filistia siri ọnwụ na Devid na ndị agha ya agaghị eso ha. Ekish gwaziri ha ka ha laghachi Ziklag. (1 Sam. 28:2; 29:1-11) Mgbe Devid ghọrọ eze ma lụso ndị Gat agha, ọ ga-abụ na e gbughị Ekish, n’ihi na Ekish dị ndụ mgbe Solomọn na-achị.—1 Eze 2:39-41.
it-2 245 ¶6
Ụgha
Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kagburu mmadụ ibu ihe ọjọọ n’obi ghaa ụgha, ma ọ pụtaghị na iwu ji mmadụ ịgwa onye ọzọ eziokwu ma ọ bụrụ na onye ahụ ekwesịghị ịma ihe ahụ. Jizọs Kraịst dụrụ anyị ọdụ, sị: “Unu enyela nkịta ihe dị nsọ, unu atụpụkwarala ézì nkume pel unu, ka ha wee ghara ịzọ ha ụkwụ ma tụgharịa dọrie unu.” (Mat. 7:6) Ọ bụ ya mere na mgbe ụfọdụ, Jizọs anaghị azacha ndị mmadụ ihe niile ha jụrụ ya ma ọ bụkwanụ ya aghara ịza ha kpọmkwem ihe ha jụrụ ya, ọ bụrụ na ọ ga-akpata nsogbu. (Mat. 15:1-6; 21:23-27; Jọn 7:3-10) N’ihi ya, e kwesịghịkwa iwere ya na Ebreham, Aịzik, Rehab, na Ịlaịsha mere ihe ọjọọ mgbe ha duhiere ndị na-anaghị efe Jehova ma ọ bụ ghara ịgwa ha ihe niile banyere ihe ha jụrụ ha.—Jen. 12:10-19; Jen. 20; Jen. 26:1-10; Josh. 2:1-6; Jems 2:25; 2 Eze 6:11-23.
MEE 16-22
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 369 ¶2
Nwanne
Ndị ha na ibe ha na-achụ otu ihe ma ọ bụ na-eme otu ihe na-akpọkwa onwe ha “nwanne.” Dị ka ihe atụ, Haịram eze obodo Taya kpọrọ Eze Solomọn nwanne ya, ọ bụghị naanị n’ihi na ha abụọ bụcha eze, kama o nwekwara ike ịbụ n’ihi na Solomọn chọrọ ka o butere ya osisi na ihe ndị ọzọ ọ ga-eji arụ ụlọ nsọ, yanwa enweekwa mmasị ibuga ha. (1 Eze 9:13; 5:1-12) Devid kwuru, sị: “Ọ bụ ihe dị mma, bụrụkwa ihe na-eme obi ụtọ ma ụmụnne bikọta ọnụ ma ịrị n’otu.” Ọ na-egosi na ọ bụghị naanị na mmadụ na ibe ya bụ otu ọbara na-eme ka ha dịrị n’otu nakwa n’udo. (Ọma 133:1) Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe mere Devid ji kpọọ Jonatan nwanne ya abụghị n’ihi na nne ma ọ bụ nna ji ha, kama ọ bụ n’ihi na ha hụrụ ibe ha n’anya, nweekwa mmasị n’otu ihe. (2 Sam. 1:26) A na-asịkwa na mmadụ na ibe ya bụ nwanne ma ọ bụrụ na ha na-akpa otu àgwà ma ọ bụ na-eme otu ihe, ya bụrụgodị ihe ọjọọ.—Ilu 18:9.
MEE 30–JUN 5
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-2 206 ¶2
Oge Ikpeazụ
Amụma Belam. Ọ bụ tupu ndị Izrel abanye n’Ala Nkwa ahụ ka Belam onye amụma gwara Belak eze Moab, sị: “Bịa ka m gwa gị ihe ndị a [ya bụ, ndị Izrel] ga-eme ndị obodo gị ná ngwụcha ụbọchị ndị a. . . . Kpakpando ga-esi na Jekọb pụta, mkpanaka eze ga-esikwa n’Izrel pụta. Ọ ga-etiwa egedege ihu Moab, tiwaakwa okpokoro isi nke ụmụ mbibi niile.” (Ọnụ Ọgụ. 24:14-17, na ihe e dere n’ala ala peeji amaokwu nke 14) N’oge mbụ amụma a mezuru, ọ bụ Eze Devid bụ “kpakpando” ahụ meriri ndị Moab. (2 Sam. 8:2) Ihe a gosiri na “ngwụcha ụbọchị ndị a” e kwuru okwu ya n’amụma a malitere mgbe Devid ghọrọ Eze. Ebe ọ bụ na Devid nọchiri anya Jizọs mgbe ọ ga-abụ Eze Mezaya, amụma a ga-emezukwa n’isi Jizọs mgbe ọ ga-emeri ndị iro ya.—Aịza. 9:7; Ọma 2:8, 9.
JUN 6-12
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 266
Afụ Ọnụ
Mba Izrel na ọtụtụ mba ndị ọzọ dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ụwa n’oge ochie weere nwoke ịgba afụ ọnụ ka ihe e ji ama nwoke e kwesịrị ịkwanyere ùgwù. Chineke nyere ndị Izrel iwu ka ha ghara ịkpụ “ajị ndị dị n’akụkụ ntì” ha, nakwa afụ ọnụ ha. (Lev. 19:27; 21:5) Ọ ga-abụ na ihe mere o ji sị ha akpụla ya bụ maka na ịkpụ afụ ọnụ bụ ihe e ji mara ụfọdụ ndị na-ekpere arụsị n’oge ahụ.
JUN 13-19
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
it-1 590 ¶1
Devid
Jehova nọ na-ahụ ihe niile na-emenụ. Ọ gbakwara ihe ọjọọ ahụ Devid mere n’anwụ. Ọ bụrụ na Jehova kwere ka ụmụ mmadụ jiri ihe e dere n’Iwu Mosis kpee Devid na Bat-shiba ikpe, a gaara egbu ha abụọ maka mmehie ha. Nwa ahụ Bat-shiba dị ime ya gaara esokwa ya anwụ. (Diut. 5:18; 22:22) Ma Jehova ji aka ya kpee ikpe ahụ, ma meere Devid ebere n’ihi ọgbụgba ndụ Alaeze ahụ. (2 Sam. 7:11-16) O nwekwara ike ịbụ na ihe mere o ji meere ya ebere bụ maka na Devid emeerela onye ọzọ ebere, (1 Sam. 24:4-7; i nwere ike ịtụle Jems 2:13) nakwa maka na ha chegharịrị ná mmehie ha. (Ọma 51:1-4) Ma ọ pụtaghị na ha ataghị ahụhụ ọ bụla n’ihi mmehie ha. Jehova gwara Netan onye amụma ka ọ gwa Devid, sị: “M ga-eme ka ọdachi dakwasị gị. N’ụlọ gị ka ọ ga-esi dakwasị gị.”—2 Sam. 12:1-12.
JUN 20-26
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 SAMUEL 13-14
“Amnọn Kpatara Ọdachi n’Ihi Ịchọ Naanị Ọdịmma Onwe Ya”
it-1 32
Absalọm
E Gbuo Amnọn. Tema bụ́ nwanne Absalọm nke nwaanyị mara ezigbote mma. Amnọn bụ́ onye otu nna ji ha na ya nwewara mmasị n’ebe ọ nọ. Ọ tọrọ Tema. Amnọn mere ka ahụ́ adịghị ya, meekwa ka nna ha kweta ka Tema bịa n’ụlọ ya siere ya nri. Mgbe ọ bịara, o dinara ya n’ike. Mgbe Amnọn dinachara ya, ọ bịara kpọ ya ezigbo asị, nke na otú o si kpọ ya asị karịrị otú o si hụ ya n’anya na mbụ. Ọ gwakwara onye na-ejere ya ozi ka ọ kpọpụ ya n’èzí. Tema dọwara uwe pụrụ iche o yi e ji amata ụmụ eze ndị na-amaghị nwoke, wụọkwa ntụ n’isi ya. Mgbe Absalọm nwanne ya nwoke hụrụ ya n’ụzọ, ọ ghọtara ihe mere ya ozugbo ma jụọ ya ma ọ̀ bụ Amnọn mere ya ihe ahụ. Ihe a o kwuru gosiri na ọ mabu na obi Amnọn dị n’ebe nwanne ya nwaanyị nọ. Absalọm gwara ya ka ọ gbachi nkịtị, ma kpọrọ ya, ya na ya ebirizie n’ụlọ ya.—2 Sam. 13:1-20.
it-1 33 ¶1
Absalọm
Mgbe afọ abụọ gachara, oge e ji akpacha ajị atụrụ ruru. Oge ahụ bụ oge ememme. Absalọm haziri oriri na Bel-hezọ nke dị ihe dị ka kilomita iri abụọ na abụọ ma e si n’Ebe Ugwu Jeruselem gawa ya. Ọ kpọrọ Eze Devid na ụmụ eze ndị nwoke niile ka ha bịa oriri ahụ. Ma Devid nna ya ekweghị aga. Ọ rịọsiri ya ike ka o zitezie Amnọn bụ́ ọkpara ya ka ọ nọchite anya ya. (Ilu 10:18) N’oriri ahụ, mgbe “obi tọwara Amnọn ụtọ n’ihi mmanya ọ ṅụrụ,” Absalọm gwara ndị na-ejere ya ozi ka ha gbuo ya. Ụmụ eze ndị nke ọzọ gbara ọsọ laghachi Jeruselem, Absalọm agbaakwa ọsọ gbakwuru nna nna ya bụ́ onye Siria n’alaeze Geshọ nke dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Oké Osimiri Galili. (2 Sam. 13:23-38) “Mma agha” ahụ Netan onye amụma buru amụma ya abatala “n’ezinụlọ” Devid. Ọ gaghịkwa apụ apụ n’oge niile ọ dị ndụ.—2 Sam. 12:10.
JUN 27–JULAỊ 3
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 2 SAMUEL 15-17
“Absalọm Dị Mpako. Ọ Bụ Ya Mere O Ji Chọọ Ịnara Nna Ya Ọchịchị”
it-1 860
Onye Na-agba Ọsọ n’Ihu Ụgbọ Ịnyịnya
Ná mba ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ụwa n’oge ochie, a na-enwekarị ndị na-agba ọsọ n’ihu ịnyịnya eze iji mee ka a mara na ọ na-abịa, nakwa iji meere ya ihe ndị ọzọ. (1 Sam. 8:11) Absalọm na Adọnaịja họpụtara mmadụ iri ise ka ha na-agba ọsọ n’ihu ịnyịnya ha. Ha mere ihe a ka e nwee ike na-akwanyere ha ùgwù ka ndị eze, nakwa ka o yie ka iwu ọ̀ kwadoro nnupụisi ha.—2 Sam. 15:1; 1 Eze 1:5.
it-1 1083-1084
Hebrọn
Absalọm nwa Devid laghachiri Hebrọn mgbe afọ ụfọdụ gachara. Ọ gbalịrị ịnara nna ya ọchịchị, mana ọ kụrụ afọ n’ala. (2 Sam. 15:7-10) Hebrọn bụbu isi obodo Juda, bụrụkwa ebe a mụrụ Absalọm. Ọ ga-abụ ya mere o ji kpebie ịnọ n’obodo ahụ malite mbọ ọ na-agba ịnara nna ya ọchịchị. Mgbe e mechara, Eze Rehoboam bụ́ nwa nwa Devid rụghachiri Hebrọn. (2 Ihe 11:5-10) Mgbe ndị Babịlọn bibichara Juda, oge ụfọdụ agaakwa, ndị Juu ha dọọrọ n’agha laghachiri n’obodo ahụ. Ụfọdụ n’ime ha gara biri na Hebrọn (Kiriat-aba).—Nehe. 11:25.