IHE NDỊ E JI ONYINYE I NYERE EME
Isi na Zoom Enwe Ọmụmụ Ihe Otú Ga-eme Ka Onye Ọ Bụla Na-ahụ Ibe Ya
JUN 26, 2020
Ọtụtụ ndị gọọmenti nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa ekwuola ka ndị mmadụ ghara ịna-anọ ibe ha nso. Ha anaghị ekwekwa ka ndị mmadụ zukọta ọnụ n’otu ebe. Ndịàmà Jehova na-erube isi n’iwu a gọọmenti tiri, ma ha chọkwara ịna-efekọ Jehova ọnụ otú ga-eme ka ha ghara ibute ma ọ bụ bufee ndị ọzọ ọria korona. Ihe ha meziri iji nwee ike ifekọ Chineke ọnụ bụ na ọtụtụ ọgbakọ na-eji app ndị dị ka Zoom na-enwe ọmụmụ ihe ha. Zoom na-eme ka ha na-ahụ ibe ha mgbe ha na-amụ ihe.
Ka anyị nwee ike ịna-enwechi ọmụmụ ihe anya, Òtù Na-achị Isi kwadoro ka e jiri ego ndị e nyere n’onyinye zụta Zoom ọgbakọ dị iche iche ga-eji na-amụ ihe. Ndokwa a ha mere abaarala ọtụtụ ọgbakọ uru. N’ihi na ụfọdụ n’ime ha agaghị akwụli ihe dị ka puku naịra asaa ma ọ bụ karịa, nke bụ́ ego e ji azụta app ga-eme ka ụmụnna na-ahụ ibe ha mgbe ha na-amụ ihe. Ọgbakọ ndị ahụ na-ejibu app ndị a na-anaghị akwụ ụgwọ ya amụ ihe. App ndị ahụ nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ ole a kapịrị ọnụ ga-esonye n’ọmụmụ ihe n’otu mgbe. Ụdị nke ahụ nwekwara ike ime ka ọ dịrị ndị ọjọọ mfe ịwabata n’ọmụmụ ihe ahụ. Ma Zoom a nzukọ Jehova zụtara abaarala ọgbakọ ndị na-eji ya amụ ihe ezigbo uru. O meela ka e nwee ọtụtụ ndị na-esonye n’ọmụmụ ihe, meekwa ka a ghara ịna-atụ ụjọ maka ndị ọjọọ ịwabata. Ka ọ dị ugbu a, ihe karịrị puku ọgbakọ iri isii na ise, ndị si n’ihe karịrị mba otu narị na iri asaa, na-eji ya amụ ihe.
Ọgbakọ Kairagi dị n’obodo Manado, nke dị n’ebe ugwu Sulawesi, Indoneshia, kwụsịrị iji app ndị a na-anaghị akwụ ụgwọ ya amụ ihe ma na-ejizi Zoom a nzukọ a zụtara na-amụ ihe. Nwanna Hadi Santoso kwuru, sị: “Ụmụnna ndị na-amachaghị otú e si apị ekwentị na-eritezi uru n’ọmụmụ ihe nke ukwuu ugbu a, n’ihi na Zoom a nzukọ Jehova zụtara anaghị eme ọ rụgide ọrụ ya akwụsị.”
Nwanna Lester Jijón, Jr. onye bụ́ okenye n’Ọgbakọ Guayakanes Oeste nke dị n’Ekwedọ, kwuru, sị: “Ebe ọ bụ na ọtụtụ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị dara ogbenye, ọ gaara esiri ụfọdụ ọgbakọ ike inwetali Zoom ha ga-eji na-amụ ihe nke ga-eme ka ọgbakọ niile sonye n’ọmụmụ ihe ahụ. Ma ekele dịrị Jehova maka ime ka nzukọ ya nweta Zoom anyị ga-eji na-amụ ihe. Ugbu a, anyị nweziri ike ịkpọ ọtụtụ mmadụ ka ha bịa ọmụmụ ihe anyị na-echegbughị onwe anyị na anyị nwere ike gafee ọnụ ọgụgụ mmadụ ole kwesịrị isonye n’ọmụmụ ihe n’otu mgbe.”
Nwanna Johnson Mwanza, bụ́ okenye n’Ọgbakọ Ngwerere North dị na Lusaka, Zambia, sịrị: “Ọtụtụ ụmụnna ekwuola ọtụtụ ugboro na ‘Zoom a nzukọ Jehova nwetara emeela ka ha na ụmụnna ha dịkwuo ná mma meekwa ka ha mara na Jehova hụrụ ha n’anya ma na-elekọtakwa ha.’”
Ego e ji zụta Zoom a anyị ji amụ ihe bụ ego nzukọ Jehova wepụtara maka ịgbatara ndị ọdachi dakwasịrị ọsọ enyemaka. O sokwa n’onyinye ụmụnna nyere maka ọrụ zuru ụwa ọnụ. E si n’adres Ịntanet anyị bụ́ donate.jw.org nye ọtụtụ n’ime ego ndị ahụ n’onyinye. Unu emeela maka otú unu si jiri mmesapụ aka na-enye onyinye. A na-ejikwa onyinye ndị a agbatara ụmụnna anyị n’ụwa niile ọsọ enyemaka.—2 Ndị Kọrint 8:14.